Lesson 345 - Junior
Memory Verse
“Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M’nēme ka aru-gi di ike” (2 Ndi Eze 20:5).Notes
Otù Ozi
Hezekaia natara ozi dị iche. Ọ bụ Aisaia, onye amụma nke Jehova wetara ozi ahụ. Ozi ahụ sitere n’ebe Chineke nọ. Hezekaia naarịaọrịa mgbe Aisaia jere hụ ya. Mgbe Hezekaia nụrụ ozi ahụ o chigharịrị iru ya chee mgbidi iru, wee kwaaákwá kpee kwa ekpere. Gịnị bụ ụdị ozi pụrụ imetụta eze riinne otú a?
Okwu Jehova ruru Hezekaia ntị bụ, “Nye ulo-gi iwu,” n’ihi na ọ gaje ịnwụanwụ. Ọtụtụ mmadụ adịghịamata mgbe ha gaanwụ. Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nọọọdụ ịbịa, ọnwụ bụ ihe mmadụ niile gaagabiga. Baịbụl náasị “ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mgbe, ma mgbe nka gasiri ikpé eso ya” (Ndi Hibru 9:27). Ebe ọ bụ na anyị amataghị mgbe Onyenwe anyị gaabịa maọbụ mgbe anyị gaanwụ, o kwesịrị ka anyị debe ụlọ anyị na ndụ anyị n’usoro mgbe niile.
Ì chèrè na ị gaanọ ná njikere izute Jisọs ọ bụrụ na ị kpacharawo anya rapụ ikwupụta maọbụ rịo mgbaghara nke mmehie gị? Ị gaachọ iji ndụ nke jupụtara ná mmehie na eguzogideghị na mkwà niile i kwere wee zute Jisọs? Ọ gaadị Onyenwe anyị ụtọ ka ndụ anyị bụrụ ihe edoziri ka anyị debe kwa ya otú ahụ.
Ekpere
Tupu Hezekaia akpọọ ndịorù ya inye ha iwu ikpeazụ na ikwu ihe niile ọ chọrọ, o chigharịrị iru ya chee mgbidi iru kpee kwa ekpere. Anyị naecheta na Ehab dinara n’ihendina ya chigharịa iru ya (I Ndi Eze 21:4). Ehab gbarụrụ iru o righị kwa nri. Obi atọghị ya ụtọ n’ihi na o nwetaghị ihe ọ chọrọ. Ma Hezekaia chịgharịrị che mgbidi iru ka o wee chefue ndịọzọ niile nọ n’ụlọ ahu wee nọdụ náánị ya n’ekpere. Otùaka ahụ taa anyị pụrụ imechi ntị na anya anyị pụọ n’ebe ihe niile dị anyị gburugburu nọ wee che échìchè banyere Jisọs, ekpere Ya, náánị anyị na Ya ewee nọdụ. N’oge mkpà, ọtụtụ NdịKraist ekupuwo ume ekpere mgbe ohere náadịghị igbu ikpere n’ala. N’ebe ọlụ, n’ebe igwuegwú, na ebe ndịọzọ gbara ha gburugburu, ọtụtụ NdịKraist amụtawo ịnọ náánị ha na Onyenwe anyị ka ha naekpeekpere nime obi ha.
Mgbe ọ natasịrị ozi ahụ, ihe mbụ Hezekaia mere bụ ikpeekpere. Ọ bụrụ na ozi dị otú a abịara ụfọdụ mmadụ, ha nwereike chọọ ibuụzọ sị ndịenyi ha niile nọdụ mma, maọbụ gụọ ego ha, maọbụ dozie ụzọ ha, maọbụ rịọ ụfọdụ arịrịọ ikpeazụ ha. Hezekaia kpereekpere. Náarụghịụkà Hezekaia naekpeekpere ọtụtụ ugbò n’ihi na ọ hụrụ Onyenwe anyị n’anya. Ihe ọ hụrụ n’anya buru ụzọ bata n’obi ya. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Onyenwe anyị n’anya, anyị gaecheta ikpeekpere tupu ihe niile ọzọ. OnyeKraist náekpeekpere mgbe o tetara n’ụra n’ụtụtụ; ihe ikpeazụ ọ naeme n’abalị bụ ikpeekpere; ọ naekpeekpere tupu ya erienri, tupu ya alụọọlụ, na tupu ya egwueegwú. OnyeKraist naekpeekpere banyere nsogbu maọbụ iheụtọ dapụtaara ya n’ụbọchị. Ọ dịghị mkpà na ekpere niile a gaabụ nke etiri mkpu, kama ha nwere ike isite n’obi anyị náapụ nwayọ nwayọ.
Ichèta
Gịnị ka Hezekaia kwuru n’ekpere ya? Ọ gwara Chineke ka O cheta otú ya jègharịworo n’iru Ya. Hezekaia matara na Chineke naahụ omume anyị niile. Mgbe ụfọdụ ndịenyi anyị, ndị mụrụ anyị, na ndị nkuzi adịghị ahụ maọbụ mata ihe anyị meworo, ma Chineke naahụ náamata kwa. Ụfọdụ mmadụ gaachọ ka Chineke chefue ihe ha meworo. Hezekaia rịọrọ Chineke ka O cheta ha. Ọ sịghị ka echeta otú ya mesoworo èzínaụlọ ya maọbụ ndị agbataobi ya maọbụ ndịiro ya. O tikughị Chineke ka o debe kwa ndụ ya nwa oge. Ọ sịrị, JEHOVA, biko, cheta otú m’jeghariworo n’iru Gi n’ezi-okwu na n’obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n’anya-Gi ka m’meworo.”
Mgbe Hezekaia kpesịrịekpere, ọ kwara ákwá dị ilu. Ọ bụ nwaokorọbịa, o rubeghị iri arọanọ (40). Jehova emewo ka o nwee ọgan’iru na ndụ ya, ọchịchị ya dị kwa mma. Náarụghịụkà Hezekaia kwara ákwá n’ihi na ọ gaachọ ịnọgide kwa nwa oge ka o wee lụọọlụ karịa nye ndị ya nye kwa Chineke ya.
Ozi Ezighachiri
Tupu Aisaia Onyeamụma apụo site n’obí eze Onyenwe anyị gwara ya ka ọ laghachikwuru Hezekaia zie ya ozi ọzọ. N’oge a Jehova gwara Aisaia ka ọ gwa Hezekaia na Ya gatụkwasị arọ iri na ise ná ndụ ya. Aisaia chigharịrị ngwangwa wee zie ozi nke Onyenwe anyi ziri ya. Ụfọdụ mmadụ garaala azụ izi ozi nke abụọ ahụ ebe ọ bụ na nke mbụ agaghịemezu. Dịka Jona onye agwara ka ọ kpọsaa okwu megide Nineve! Ọ sịrị, “Ọ fọduru ọgu ubọchi abua, ewe kwatue Nineve” (Jona 3:4). Ma akwatughị Nineve n’ihi na ndị ahụ wedara onwe-ha ala, tikue Chineke, chègharịa kwa. “O we jọ Jona njọ nke-uku” mgbe ihe ahụ o kwuru náemezughị. O nweghị ịhụn’anya n’ebe mkpụrụobi ndị bi na Nineve nọ bụ ndị agaraebibi ọ bụrụ na ha ekpeghịekpere.
Ọzịzá
Mgbe Hezekaia kpereekpere, Jehova sịrị, “Anuwom ekpere-gi, ahuwom anya-miri-gi: le, M’nēme ka aru-gi di ike.” Nke a bụ ọzịzá nke ekpere ya. Hezekaia natara karịa ka ọ rịọrọ. Ewezuga ọgwụgwọ nke arụ ya, ekwere Hezekaia mkwà nnapụta site n’aka eze Asiria, na nchébé nke obodo ahụ. N’ihi na Hezekaia kpereekpere, ọ purụ inwe olileanya ọgwụgwọ site n’ọrịa ya, naarọ atụkwasịrị ná ndụ ya, na udo n’ebe onyeiro ya nọ.
Ekpere náagbanwere anyị ihe taa dịka o meere Hezekaia. Ihe mere Hezekaia n’anụarụ pụkwara ime nime mmụọ. Nime Baịbụl anyị naagụ na “nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu” (Ezikiel 18:20), na “ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu” (Ndi Rom 6:23). Ya mere ndị anaazọpụtabeghị “nọ n’ọnwu site na ndahie nile unu na nmehie nile unu” (Ndi Efesọs 2:1), ha gaefu kwa ebighịebi. Ma onye anaazọpụtabeghị nwereike ikpeekpere, ọnọdụ ha n’ebe Chineke nọ gaagbanwe kwa. Ọgwụgwọ dịrị mkpụrụobi nke ọrịa mmehie naarịa. Ọtụtụ ngọzị ka apụrụ ịtụkwasịrị ha ná ndụ ha, ha na Onyenwe anyị na ndị Ya gaanọ kwa ebịghịebi. Ekpere ọ gbanwewo ihe ọ bụla ná ndụ gị, n’anụarụ maọbu nime mmụọ?
Irubeisi
Aisaia nyere iwu ka eweta mbadamba fig, nke eweere tụkwasị n’elu iheofifi Hezekaia. Hezekaia natara ọgwụgwọ n’ihi na o rubereisi n’okwu onyeamụma nke Jehova. Mgbe niile ka Chineke naachọ okwukwe na nrubeisi n’aka anyị. Mgbe ụfọdụ Chineke naachọ ka anyị mee otù ihe iji gosipụta okwukwe anyị n’ebe Ọ nọ. Enwere ụfọdụ ihendepụta na Baịbụl ebe Onyenwe anyị chọrọ ka mmadụ gosipụta okwukwe ya site n’irubeisi tupu agwọọ ọrịa ya. Jisọs sịrị nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụakpọnwụ “Setipu aka-gi.” Ka nwoke ahụ mere otú ahụ, ewee mee ka aka ya “di ka ọ di mbu” (Mak 3:5). Otù nwoke akụkụ arụ ya nwụrụanwụ ka agwara ka o bilie jegharị kwa. Nwoke ahụ wee “bilie, la n’ulo-ya” (Matiu 9:7). Agwọrọ ya!
Ndị ekpenta iri ka enyere ndụmọdụ ka ha jee gosi ndị nchụàjà onweya, nke dị dịka Iwu si dị (Levitikọs 14:2). “O we rue, mgbe ha nāga, na emere ka aru ha di ọcha” (Luk 17:14). Jisọs gwara otù nwoke kpuruìsì sị “je sa miri n’ọdọ-miri ntà nke Sailoam.” N’otù ụzọ nke anyị náapụghị ịkọwa o jeruru n’ọdọmmiri ntà Sailoam. O jere “sa miri, bia kwa nāhu uzọ” (Jọn 9:7).
N’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ anyị aghghị igosipụta okwukwe anyị nwere na Jisọs. Ọ sịrị: “Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n’ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu” (Mak 11:24). Otú a site n’irubere Chineke isi na okwukwe nime Ya, anyị pụrụ ịnata ọzịzá nye ekpere anyị.
Ihe iribaàmà Dị Icheiche
Mgbe Hezekaia kpereekpere rubekwara onyeamụma isi, enyere ya iheàmà na Chineke gaagwọ ya. Anyanwụ wee laa azụ nzọụkwụ iri. Hezekaia sịrị na ọ gaabụ ihe “dị nfe” ka anyanwụ gaa n’iru nzọụkwụ iri wee daa ọsọsọ. Nke kasị, karịa inye Chineke otuto, ụmụmmadụ gaagbalị inye ya nkọwa -- na igweoji ekpuchiwo anyanwụ, na ọbụ na iru eluigwe mere ka ọ dị ka ọ lawo. Ụfọdụ mmadụ naechèpụta ihe ụfọdụ pụrụ iche iji kọwaa ọlụ nke Chineke kama ikwere na Chineke naalụọlụ ịrịbaàmà.
Náarụghịụkà ndị nọ n’ụlọ Hezekaia guzoro n’akụkụ nrigo náele ya ka Aisaia naekpeekpere. Chineke zara! Onyonyo nọ n’elu ebe nrigo Ehaz bụ na Hezekaia wee laa azụ nzọụkwụ iri. N’ezie anyanwụ lara azụ nkeji iri anọ wee malite kwa ịga otú ọ naaga!
Chineke lụrụ ọlụ iribaàmà ọzọ site n’ịgwọ Hezekaia site n’ọrịa gaabụwọrị nke jọgbụrụ onweya. Ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ nwụọ. ma nime náánị ụbọchị atọ o nweeike ijé n’ụlọnzụkọ!
Otuto Nye Chineke
Mgbe arụ dịsịrị Hezekaia ike, o dere abụ inye Chineke ekele. O kwuru banyere ọrịa ya na ya kpọkukwara Onyenwe anyị. Hezekaia sịrị: “Gini ka m’gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onweya me-kwa-ra ya” (Aisaia 38:15). Ihe o kwuru pụtara na ọ bụghị náánị na Chineke kwere mkwà kama Chineke emezuwo kwa mkwà ahụ.
Ọtụtụ mkwà dịrị anyị na Baịbụl taa. Mgbe anyị kweere, rube kwa isi, Chineke gaemezu mkwà niile ahụ nime ndụ anyị. Chineke kwere Abraham mkwà nke anaapụghị ime n’ebe mmadụ nọ, na ihe olileanya náadịghị na ya. Ma Abraham kweere Chineke. “O jigh kwa ekwegh-ekwe nwe obi abua n’ebe nkwà Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka ọ nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto, nēkwuzu kwa na ihe Ọ kwereri ná nkwà, Ọ puru ime kwa” (Ndi Rom 4:20, 21).
Hezekaia nyere Chineke otuto na Ọ napụtara ndụ ya. O nyere Chineke ekele n’ihi ọgwụgwọ ahụ. Hezekaia sịrị: “N’ihi na ala-mọ adigh-ekele Gi, dika m’si eme ta” (Aisaia 38:18, 19). Hezekaia dere ọbụná abụ ụfọdụ nke ekele na otuto nye Chineke nke eji efèòfùfè, “ụbọ-akwaram nile ka ayi ganākpọ ubọchi nile nke ndu-ayi n’ulo JEHOVA” (Aisaia 38:20).
Otù Ule
Mgbe Onyenwe anyị mere ka anyanwụ laa azụ nkeji irianọ, ala niile matara na ihe náadịghịeme mbụ emewo. Mgbe náaadịghị anya okwu gbasara gburugburu “banyere ihe-ebube nke mere n’ala.” Eze nke obodo dị anya bụ Babịlon zigara Hezekaia ndịozi na onyinye. N’oge a Chineke rapụrụ Hezekaia “inwa ya, ka O we mara ihe nile di n’obi ya” (2 Ihe Emere 32:31). Hezekaia anwapụtawo Chineke, ugbu a Chineke naanwapụta Hezekaia.
Ndịisi nke Babịlon wee wetara Hezekaia onyinye, akwụkwọozi na oziekele. Hezekaia chọrọ okwu ireụtọ nke otuto na iheebube. Ọ tụkwasịrị ndịụkọ ahụ obi. Ha niile wee soro jègharịa n’obí eze niile, hụ àkụ niile nke ọlaọcha na ọlaedo, na nkume dị ókéọnụ. Hezekaia mere ka ha bànye n’ebe ọ naedebe iheagha niile ha ji chéré onweha. O nweghị kwa iheagha ọ bụla ọzọ zoroezo ugbu a n’ihi na o meghewo ulo ya nye ndị agbataobi ya. Ha wee jezue n’ala ahụ niile, Hezekaia naanyaisi náegosi ha àkụnaụba ya niile, náagbalị ime ihe gaatọ ndị Babịlon ahụ ụtọ.
Ihengosi efù ahụ Hezekaia mere atọghị Chineke ụtọ. Ọ pụtara ìhè na o nyere onweya otuto o nyeghị Chineke otuto n’ihi ọgan’iru ya. “Ọ bugh dika nmeso emesoro ya ka Hezekaia nyeghachiri; n’ihi na obi-ya di elu” (2 Ihe Emere 32:25). N’oge ọnwụnwa, Hezekaia dara n’ihi na o nyeghị Chineke otuto na mbulielu.
Iwe Chineke
Ezigaara Hezekaia Aisaia Onyeamụma ọzọ. Hezekaia kweere na ndịkom Babịlon ahụwo ihe niile dị n’ụlọ ya, na ọ dịghị kwa ihe ọ bụla n’àkụ ya niile nke ya náegosịghị ha. Aisaia kwuru okwu nke Onyenwe anyị: “Ihe nile di n’ulo-gi, … agēburu ha je Babilon n’ihi na ọ tụkwasịwo ndikom ndia obi karia Chineke.
Mgbe Hezekaia wedara onweya site ná mpako nke obi ya, Chineke wezugara ikpé ahụ ka ọ ghara ịbịa n’oge ndụ Hezekaia. O kelere Chineke ekele na O nyere ya udo na eziokwu n’ụbọchi ya niile. Obi ya aghaghị ịdịworị arọ ịhụ na ya dara n’iru Chineke n’ule elere ya, na ọ bụ kwa ya gaakpata iruuju nke gaadị ná ndụ ụmụ ya.
Ndụ anyị taa pụrụ imetụta ndịọzọ -- nye ezi ihe maọbu ajọihe. Site n’ibindụ anyị nye Onyenwe anyị na inye Ya otuto, anyị pụrụ ịbụ ndị gaeme ka eziihe dị ná ndụ ndịọzọ. Ka anyị kwee ka ìhè anyị nwue n’iru mmadụ, ka ha wee nwee ike ịhụ ọlụ ọma anyi chọọ kwa ime otú ahụ; ka ha wee nye Chineke otuto site n’ibindụ ha nye Ya!
Òlee otú mmadụ pụrụ isi kwesị ntụkwasịobi nye Chineke n’ọnwụnwa? Job sịrị: “N’ihi na Ọ mawo uzọ m’nāga; mgbe Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m’gāputa. Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso; uzọ-Ya ka m’debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem. Adighm-apu kwa n’ihe enyere n’iwu nke egbugbere-ọnu-Ya; atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm” (Job 23:10-12).
Job chọpụtara na Chineke bụ ebemgbaba nke OnyeKraist n’oge ọ bụla nke mkpà. Ọ tụkwasịrị Chineke obi n’oge ule, ọ daghị kwa. Chineke ekwewo mkwà ịnọnyere ndị Ya. Chineke sịrị: “Ọ gākpọkum, M’gāza kwa ya; Mu onwem gānọnyere ya n’ahuhu: M’gādọpụta ya, sọpuru kwa ya” (Abù Ọma 91:15). Gụọ Jeremaia 17:7, 8, ihe Chineke gaemere ndị tụkwasịrị Ya obi.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Ònye bụ onyeamụma n’oge a?
- Ònye bụ eze Juda?
- Gịnị bụ ozi eze natara?
- Gịnị ka Hezekaia mere mgbe ọ nụrụ okwu nke onyeamụma?
- Gịnị mere eji debe Hezekaia ndụ?
- Arọ ole ka atụkwasịrị na ndụ Hezekaia?
- Gịnị bụ iheịrịbaàmà enyere Hezekaia?
- Kpọọ aha ọlụebube abụọ Chineke lụụrụ Hezekaia.
- Gịnị mere Hezekaia ji daa n’ule elere ya?
- Gịnị mere n’ihi ule ahụ ọ dara?