Ọlu Ndi-ozi 19:21-41; Matiu 10:6-28; Luk 21:12-19

Lesson 346 - Senior

Memory Verse
“Madu nile gākpọ kwa unu asi n’ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Matiu 10:22).
Notes

N’ihi Onyenwe anyị

Ọ bụrụ na Onyenwe anyị anọọọdụ, ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa nọ n’Ụlọakwụkwọ Ụbọchịụkọ taa gaenwe ọlụ ha ganaalụ dịka ndị amụrụ n’obodo a, ọbụná ugbu a ụfọdụ nwereike náechè échìchè banyee ọlụ ha gaalụ n’ọdịniru. Mmadụ nwereike rọrọ ọlụ gaeme ka ọ baa úrù n’ọlụ nke Onyenwe anyị. Ọtụtụ nime ndịkom na ndịnyom naenye ụfọdụ oge ha ugbu a n’ọlụ Onyenwe anyị enwetawo ọzùzù n’ọlụ nke aka ha. Ụfọdụ ji ọlụ ndịa náazụ onweha. Mgbe Onyenwe anyị kpọrọ ha ịlụrụ Ya ọlụ, ọtụtụ ka akpọworo ịlụ otù ụdị ọlụ ahụ. Ụfọdụ naenye ụfọdụ nime oge ha, talent ha, na amamihe ha mgbe ohere dapụtara, ma ndịọzọ nwere ohere inye oge ha niile n’ijéozi nke Onyenwe anyị.

Mgbe ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa naatụgharịuche banyere ọlụ ha gaalụ na ndụ, ọ gaghị atọ Onyenwe anyị ụtọ ma ha rọrọ ọlụ pụrụ ịba úrù n’ijéozi nke Onyenwe anyị? Mgbe mmadụ chọrọ Chineke, náefè kwa Ya, onye ahụ naenwe agụụ ịlụrụ Onyenwe anyị ọlụ. Mgbe mmadụ hụrụ Chineke n’anya, ọ naachọ inye Onyenwe anyị ụfọdụ oge ya, talent ya, na amamihe ya.

Otù Ọkpụ Ụzụ Ọlaọcha

Ndị ọlụ nkà dị n’Efesọs ndị náakpụ náedozi kwa ọla dị icheiche were ha náeme iheịchọmma na ihe ọzọ dị icheiche bara úrù, ma ha adịghị ebiri Onyenwe anyị ndụ, ha adịghi alụ kwara Ya ọlụ. Karịa nke ahụ, ọlụ ha naalụ bụ nye ekwensu, n’ihi na ha naeme arụsị dị icheiche. Dimitriọs bụ ọkpụụzụ ọlaọcha nke Efesọs. Ọ pụrụ ime ihe bara úrù ma ọ rọọrọ ịkpụ arụsị, n’ihi na site n’ime nke a ọ pụrụ inweta ego buruibu. Ọ bụghị náánị na ọ naalụrụ ekwensu ọlụ n’ụzọ dị otú ahụ, kama ọ naeweta kwara NdịKraist nsogbu.

Mgbe Pọl naekwusa Oziọma n’Efesọs, Dimitriọs kpaliri aghara. Ọ kpọrọ nzukọ nke ndị niile bụ ụzụ ọlaọcha naakpụ arụsị. Ọ gwara ndị òtù ya niile okwu, náechetara ha na ha naenweta àkụ site n’ịkpụ arụsị. Dimitriọs gwara ha na ha ahụwo nụ kwa otú Pọl kwusawooro ndị ahụ. Ọtụtụ ndị nọ n’Efesọs na akụkụ ọzọ dị icheiche nke Esia ekwerewo n’Oziọma, ha adịghịefè kwa arụsị òfùfè. Ihe bụ isi mkpesa Dimitriọs bụ na ọlụ ha gaanọ ná nsogbu. Ọ bụrụ na ụmụmmadụ arapụ ikpere arụsị ndị náeme arụsị agaghịadị mkpà. Mmụọ nke onweonye bụ ihe kpatara Dimitriọs ji kpalie aghara ahụ. N’ụzọ nke ọzọ ọ rịọrọ ha ka ha rubeisi n’òfùfè ha ka ewee ghara ịrapụ ụlọ arụsị ha o wee bibie.

Eziokwu

N’okwu Dimitriọs n’iru ndịụzụ, ọ gbaraàmà banyere ọlụ na mkwusa Pọl. Eleghịanya náechèghị ime otú ahụ, o kweere na mkwusa nke Oziọma ahụ n’ihi na “óké ìgwè madu” ka anaeme ka ha chigharịa wee bụrụ ndịkwereekwe. Dịka okwu Dimitriọs si dị, Pọl ekwuwo na “ihe eji aka me abugh chi.” Pọl kwuru eziokwu. N’ihi na o kwusara eziokwu, emere ka ndị kwereekwe nwere onweha site n’okwukwe ụgha ha kweworo. Ọ bụ eziokwu gaeme ka ụmụmmadụ nwere onweha.

Jisọs gwara ndị Juu kwere na Ya sị: Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n’okwum, unu bu ndi nēso uzọm n’ezie; unu gāmara kwa ezi-okwu, ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n’orù” (Jọn 8:31, 32).

Ndị ahụ gere Dimitriọs ntị ahụghị eziokwu n’anya rue na ha gaarpụ okpukpé ugha na aghụghọ, rapụ kwa ọlụ ha nke bụ ime arụsị. Ònye gaachọ ifè chi náapụghị ichebe ụlọukwu ya?

Aghara

Okwu nke Dimitriọs kpaliri ndịụzụ ọlaọcha. Ha rapụrụ nzukọ ahụ n’itimkpu na iwe. Mgbe náadịghị anya ha kpaliri aghara n’obodo ahụ niile. Ọgbaaghara dapụtara, ndị ahụ náagbaaghara ahụ wee jide Gaiọs na Aristakọs, ndịkom abuọ ha na Pọl naeso n’ijè. Ha wee were otù obi nubà nime ebe anaekiri ihe, ebe ndị obodo ahụ naagbakọ. Lee óké ọgbaaghara! Ụfọdụ naekwu otù ihe! Ụfọdụ naekwu iheọzọ! Ọtụtụ ndị ahụ amataghị ihe mere ìgwè mmadụ ahụ ji gbakọọ. Ha amataghị ihe naeme, kama ha bịara ile anya.

Ndị ahụ kpaliri ọgbaaghara iwe naewe ndị jidere NdịKraist abụọ ahụ jikeere ịta ha ahụhụ. Náarụghịụka ha lereanya imenye ndị náesoụzọ Jisọs egwù ka ha wee rapụ obodo ahụ ghara kwa ikwusa ọzọ.

Ịhụn’anya Ụmụnna

Pọl chọrọ ịbànye n’etiti ìgwè mmadụ ahụ inyere ndịenyi ya nọ ná nsogbu aka. Ndịọzọ náesoụzọ Jisọs na ụfọdụ ndịisi nke Esia, bụ ndịenyi Pọl, ekweghị ka Pọl baa nime ụlọ ebe anaekiri ihe ka ndị ahụ naagbaaghara wee ghara ichịgharị megide ya onweya kwa. N’iru ihe izendụ a Pọl atụghị egwù ime ka ụmụmmadụ mata na ya bụ OnyeKraist. Ọ tụghị egwù ijé napụta ụmụnna ya, n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Jisọs sịrị na ịhụ ụmụnna n’anya bụ ihe náegosipụta na mmadụ bụ onye náesoụzọ ya. Ọ sịrị: “Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n’anya n’ebe ibe-unu nọ” (Jọn 13:35).

Aleksanda bàra n’etiti ìgwè mmadụ ahụ ebe ọ nagbalị ịnapụta mmadụ abụọ ahụ náesoụzọ Jisọs. O weliri aka ya ịkwụsị ụzụ ndị ahụ ka o wee nweeike ikwuokwu. Anyị naechèta na ndị Efesọs bụ Ndịmbaọzọ. Mgbe ha hụrụ Aleksanda bụ onye Juu, ha egeghị ya ntị. Ha malitere itimkpu rue ihe ra ka hour abụọ náeto arụsị ha, nke náapụghị ịnụihe náapụghị kwa inyere mmadụ aka.

Ụzọ Mgbapụ

Chineke naele ihe ahụ náeme. O kweghị ka ndị ahụ merụa ndị náesoụzọ Ya arụ. O nyere ohere ka mkpagbu ahụ kwụsị otú ahụ; O wee rọpụtara ndị Ya ụzọ mgbapụ. Ndị nke Chineke guzoro nwayọ na n’omume dị mma, ha adịghị ka ndị ahụ náekpere arụsị bụ ndị wetara ọgbaaghara. Ha tụkwasịrị Chineke obi bụ Onye náenyere ndị Ya aka mgbe niile.

Odeakwụkwọ nke obodo, onye eleghịanya náabụghi otù onye nime ndị náesoụzọ Jisọs, gwara ndị obodo ya okwu. Ọ sịrị na mmadụ niile matara na ndị Efesọs naefè arụsị ahụ nke si n’Eluigwe (Jupiter) daa (ihe náabụghị eziokwu nke ha kweere). O nyere ha ndụmọdụ ịnọ nwayọ na “ighara ime ihe nēchègh-echè.” Ụlọikpé gaekpe ikpé ọ bụla ewebatara n’iru ya ọ bụrụ na okwu banyere iwu adapụta. Ọ bụrụ na Dimitriọs na ndị ụzụ ọlaọcha ndịọzọ nwere ihe megide ndịnáesoụzọ Jisọs, ha kwesịrị iwegara ya ndịisi. Otú ọ dị, odeakwụkwọ nke obodo kwuru na ndịkom ndịa abụghị ndị náezu ihe ụlọ chi ha abụghị kwa ndị naekwulu arụsị ha. Ha emeghị ihe ọ bụla megidere iwu. Ndị ahụ jidere ha n’usoro náadịghị dịka iwu si dị, náakpalị kwa aghara n’ihi ihe náabàghị n’ihe. Odeakwụkwọ nke obodo zilagara ìgwè mmadụ ahụ ka ndịisi wee ghara ịkpọ ha ka ha kwue ihe kpatara ha ji kpalie ọgbaaghara ahụ.

Mgbagbu

Òlee otú i chere obi ndịnáesoụzọ Jisọs gaadị banyere ihe a mere? Hà jikeere ịrapụ ịbụ NdịKraist n’ihi na ha nwetara ntakịrị mkpagbu? Náarụghịụkà ọ tụkwasịrị okwukwe n’obi ha. Ha atụkwasịwo Chineke obi, Ọ napụtawo kwa ha. Eleghịanya o metụrụ ha dịka o metụrụ ndịọzọ ahụ náesoụzọ Jisọs, ndị atụbara n’ụlọmkpọrọ n’ihi Kraist, ha wee “nābùku kwa Chineke abù” n’etiti abalị (Ọlu Ndi-ozi 16:25), na dịka Ndịozi ndị ñụrịrịọñụ “na aguru ha ná ndi kwesiri ka eme ha iheihere n’ihi Aha ahu” (Ọlu Ndi-ozi 5:41). Ndịkom ndịa echigharịghị azụ site n’iso Onyenwe anyị. Anyị chọpụtara na anaakpọ aha ha n’iheodide niile nke Pọl.

Njikere

Jisọs jikeere obi ndináesoụzọ Ya ịnagide mkpagbu, Ọ dọrọ ha akanántị na dịka akpọworo Ya asị otú ahụ ka agaakpọ ha asị dịka ndị náesoụzọ Ya; ọbụrụ na akpagburu Ya agaakpagbu ha. (Lee Jọn 15:18-20).

Ndịnáesoụzọ Jisọs matara na ha pụrụ ileanya mkpagbu, ma Chineke etinyewo udo na ịhụn’anya n’obi ha na ha gaenweike ịnagide ya. E, ọbụná ha naenye ekele n’ihi ya. Ebururị ụzọ dọọ Pọl akanántị na ọ gaahu óké ahụhu n’aka ndị mkpagbu. Ma mgbe ọ naahụ ahụhụ, ndịa bụ okwu ya: “Ọ buru na Chineke diri ayi, Ònye nēmegide ayi?” (Ndi Rom 8:31). Pọl sịrị na ọ dịghị ihe ọ bụla pụrụ ikewapụ ya site n’óké ịhụn’anya Chineke nke dị nime Kraist Jisọs. O kwere na ọ dịghị ahụhu dị ukwu karịa ka ya wee “rita Kraist n’urù.” Ọ sịrị: “Ka m’we mara Ya, na ike nke nbilite-n’ọnwu-Ya nile, n’ihi na anēme ka mu na Ya nwekọ otù udi n’ọnwu-Ya; ọ buru na uzọ ọ bula di m’gēsi ru isi na ndi nwuru anwu bilite” (Ndi Filipai 3:10, 11). Pọl chọrọ ịnọ ná njikere maka mbiliten’ọnwụ nke mbụ, ka o wee bụrụ kwa onyemmeri zuruòkè o jikeere ịhụahụhụ.

Mkwà Dị Icheiche

Ọtụtụ mkwà dị enyere ndị anaakpagbu n’ihi eziomume. Onyenwe anyị ekwewo mkwà ịnọnyere ha. Mmụọ Nsọ gaagwa ha ihe gaabụ àmà ha mgbe ha gaeguzo n’iru ndịisi. “Ya mere, zubenu n’obi-unu, na unu agagh-ebu uzọ tughari uche otú unu gāgọpu onwe-unu.”

Ndị niile hụrụ ahụhụ n’ihi eziomume gaeso kwa Kraist chịa. “Okwu a kwesiri ntukwasi-obi: N’ihi na asi na ayi soro Ya nwukọ ọnwu, ayi gēso kwa Ya dikọ ndu: asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze: asi na ayi gāgọnari Ya, Ya onwe-ya gāgọnari kwa ayi” (2 Timọti 2:11, 12). Otù ebe nime Akwụkwọnsọ kwuru banyere Ndị Agọziri-agọzi kwu-kwa-ra banyere mkpagbu: “Ngọzi nādiri ndi esogbuworo n’ihi ezi omume: n’ihi na ala-eze elu-igwe bu nke ndi ahu. Ngọzi nādiri unu mgbe ọ bula ha nāta unu uta, nēsogbu kwa unu, nēkwu kwa ajọ ihe nile di iche iche megide unu n’okwu-ugha, n’ihim. Ñurianu ọñụ, ka obi tọ kwa unu utọ nke-uku: n’ihi na ugwọ-ọlu-unu di ukwu n’elu-igwe: n’ihi na otú a ka ha sogburu ndi-amuma ndi buru unu uzọ” (Matiu 5:10-12).

N’oge nke anyị a, mgbe ụfọdụ ndị nke Chineke naezute ọnwụnwa. N’obodo anyị, o nwere ike ịbịa n’ụdị ebuboụgha, nkewapụ site n’èzínaụlọ anyị, maọbu imeso anyị omume náezighịezi. N’obodo ụfọdụ o nwereike ịbụ ihe banyere ọnwụ na ndụ. N’ụzọ ọ bụla o siri bịa, ka anyị nara ya ná ntachiobi, mara na anyị pụrụ igosi onweanyị ndị eziokwu nye Kraist na ụzọ Ya. Anyị amalitewo ibiri Kraist ndụ agaedubà kwa anyị n’Eluigwe ọ bụrụ na anyị kwesịrịntụkwasịobi. “Madu nile gākpọ kwa unu asì n’ihi aham: ma onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agāzọputa” (Matiu 10:22).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ Dimitriọs?
  2. Òlee otú o si tinye talent ya n’ọlụ?
  3. Gịnị mere obi ya ezughị ike banyere mkwusa Pọl?
  4. Gịnị mere eji jide ndị ha na Pọl so?
  5. Òlee otú esi rapụ ha?
  6. Gịnị bụ mkpagbu?
  7. Òlee ụzọ dị icheiche apụrụ isi kpagbue ndị náesoụzọ Kraist taa?
  8. Gịnị bụ mkpagbu?
  9. Gịnị bụ ufọdụ mkwà dịrị ndị anaakpagbu?
  10. Gịnị ka ekwere ndị gaenwe ntachiobi rue ọgwụgwụ na mkwà?