Ọlu Ndi-ozi 20:1-38

Lesson 347 - Junior

Memory Verse
“Ọ buru na onye ọ bula nēzì unu ozi ọzọ tụkwasi nke unu natara, ya buru anathema” (Ndi Galetia 1:9).
Notes

Idebe Okwukwe Ahụ

Pọl naabịaru ná mmechi nke njém mkwusa ya nke atọ. Azọpụtawo ọtụtụ mmadụ site ná mkwusa ya; ma ebe ọ bụla o jere enwewo kwa ndị náemegide Oziọma nke ọ naekwusa.

Ijéozi nke Pọl abụghị nke dị mfé maọlị. Onyenwe anyị dọrọ yarị akanántị mgbe Ọ kpọrọ Pọl na ọtụtụ ahụhụ naechere ya n’iru. Ma Pọl ekweghị ka nke ahụ kwụsị mkwusa ya maọlị. Náagbanyeghị mkpagbu niile ahụ ọ nagideworo, ọ pụrụ ikwu n’ọgwụgwụ nke ndụ ya sị, “Edebesiwom okwukwe ahu.”

Ọ dịwo ọtụtụ ndị mkwusa bụ ụmụokorọbịa ndị malitere n’obiike na ịnụọkụn’obi ikwusa Okwu niile nke Chineke; ma n’oge ikpeazụ nke ndụ ha, óké agụụ ahụ ha nwere ikwusa Okwu ahụ niile wee funarị ha. Lee otú obi anyị juppụtara n’ekele na anyị nwere ihenlereanya nke ndụ Pọl, náegosipụta na apụrụ ijigide otù ịnụn’ọkụ na ịnọgidesiike ahụ rue n’ọgwụgwụ ndụ anyị. Anyị naekele Chineke n’ihi ihenlereanya anyị nwekwara n’oge nke -- ndị kwesịworo ntụkwasịobi rue ọnwụ.

Pọl alụwo ọlụ Chineke kpọrọ ya ka ọ lụọ, náagbanyeghị ma ụmụmmadụ ha chọrọ ịña ya ntị maọbụ na ha achọghị. Ọ sịrị: “Egwu emeghm ka m’ghara ikọrọ unu ìzù niile nke Chineke.”

Otù Ízù Na Troas

Pọl na ndịenyi ya anọwo ụbọchị asaa na Troas, n’ụbọchị Ụkọ ha na ndịọzọ náesoụzọ Jisọs nke obodo ahụ wee zukọọ ifèòfùfè. Ndịa enwewo náánị ohere ntà ịnụ olu Pọl, n’ihi nke a o nwere ọtụtụ ihe ịgwa ha. Okwu Chineke o kwuru gara n’iru rue n’etiti abalị. Ọ dị otù nwaokorọbịa náapụghị ịmụrụ anya. Ọ naanọdụ na window; mgbe ọ rarụkwara o si na window ahụ dapụ. Ọ bụ n’ụlọelu nke atọ ka ha nọ, o wee nwụa site n’ọdịda ahụ. N’ezie, nzukọ ahụ niile tụrụ ụzụ. Otú ọ dị, Pọl nwere okwukwe na Chineke gaenyeghachị nwaokorọbịa ahụ ndụ. O mere dịka Elaija na Elaisha meworo mgbe ha kpọghachirị mmadụ site na ndị nwụrụanwụ: ọ “dakwasi ya,” wee makụọ ya, wee were obi ya niile kpeeekpere. O jiri nwayọ gwa ndị ahụ sị, “Unu atula ùzù; n’ihi na ndu-ya di nime ya.” O mewo ka o si n’ọnwụ dị ndụ ọzọ site n’aha Jisọs Kraist, onye Pọl naahụ ahụhụ n’ihi Ya jikere kwa ka egbuo ya.

N’ijéozi niile nke Pọl, isiokwu nke mkwusa ya bụ Jisọs Kraist, Ọkpara dị nsọ nke Chineke. N’ihi óké ntụkwasịobi o nwere na Jisọs, ọ pụrụ ịlu ọlụebube site n’aha Ya.

Ọ dịghị Okwu Dị Ụtọ

Pọl anọwo ọtụtụ oge n’Efesọs, ọ chọkwara ka ya na ndịokenye nke nzukọ ahụ kparịta kwa ụkà otù úgbò ọzọ. Ọ matara na ya agaghị ahụ ha ọzọ, ya mere ọ kpọkọtara ha ka o nye ha ndụmọdụ ikpeazụ, ịdọ ha akanántị banyere iheizendụ dị n’iru.

Pọl ekwusawo na aghaghị ịmụ mmadụ ọzọ. Ọ dọwo ụmụmmadụ akanántị megide mmehie n’ụdị ọ bụla, megide ikpere arụsị, megide kwa ndị náagbalị ịbànye n’Eluigwe site n’ịlụọlụ ọma karịa ikwere na Jisọs. Ọ gwaghị ha “ihe dị ụtọ” náánị iji nweta iruọma ha mee kwa onweya onye amaama n’etiti ha. Ihe banyere mkpụrụobi ha bụ ihe dị ya mkpà. Ọ matara na ndị niile geworo ya ntị gaeguzo n’iru Jisọs otù ụbọchị ka ewee kpee ha ikpe. Ọ bụrụ na ha enwereghị onweha site ná mmehie, agachụbà ha n’ahụhụ ebighịebi.

Gịnị garaeme ọ bụrụ na Pọl agwaghị ha na aghaghị ịzọpụta ha site ná mmehie? Ha gaefu, amamikpé gaadịkwara ya. Ma Pọl pụrụ ikwu sị, “Otú egwu nēmeghm ka m’ghara ikọrọ unu otù ihe n’ihe niile bara unu urù.” O kwu-kwa-ra sị, “Adim ọcha n’ebe ọbara madu nile di.”

Ndịnché

Lee óké afọojuju ọ naaghaghị inwe mgbe ọ matara na ya emewo ihe niile ya pụrụ ime iji nyere ha aka ka azọpụta ha! Ha apụghi ibili n’ụbọchị ikpé tụọ ya aka n’ebubo náasị, “Ị gwaghịm ma-ọlị.”

Otù mgbe otù onyeamụma dere na ọ bụrụ na onyenché adọghị ụmụmmadụ akanántị na nsogbu naabịa, ndị ahụ wee hụọ ahụhụ, Chineke gaajụta ọbara ha n’aka onyenché. Pọl adọwo ndị Efesọs akanántị na ụgwọọlụ nke mmehie bụ ọnwụ, na ha aghaghị kwa ichègharị nwee kwa nzọpụta ka ha wee baa n’Eluigwe; ya mere ọbara ha adịghị kwa ya n’isi.

Agụ Jọgburu Onweha

Ndị nọ ná nzukọ Efesọs ekwerewo na mkwusa Pọl, azọpụtawo kwa ha, ma nke ahụ abụghị ọgwụgwụ nke ọgụ ahụ megide ekwensu. Pọl dọrọ ha akanántị na mgbe ya lasịrị “agụ jọgburu onwe-ya” gaabịa n’etiti ha, “ghara imere aturu ebere.”

Ọ bụghị banyere anụmanụ ka ọ naekwu, kama ndịmkwusa ụgha ndị gaabịa n’etiti ha ibibi ihe Pọl kwusawooro. Pọl sịrị: “Asi kwa na ayi onwe-ayi, ma-ọbu mọ-ozi nke sitere n’elu-igwe, gēzi unu ozi-ọma ọzọ tukwasi ozi-ọma nke ayi ziri unu, ya buru anathema” (Ndi Galetia 1:8).Ọ matara na ndị náejéozi gaabịa ndị gaasị na ọ dịghị mkpà ịmụ mmadụ ọzọ. Ụfọdụ gaasị na mmadụ pụrụ inweta nzọpụta na odudonsọ otù mgbe. Ụfọdụ gaasị na ọ dịghị mkpà idoziụzọ anyị nye ndị anyị mejọworo. Ihe ndịa, na ọtụtụ ndịọzọ gaabụ òzìzí ụgha. Onye náekwusa ụdị ihe ahụ gaabụ onye abụrụọnụ.

Ejiri Ọbara Ya Gbata

Nzukọ ahụ dị ókéọnụahịa nye Pọl. O jikeererị inye ndụ ya ka ndị ahụ wee nwee nzọpụta. Ma nzukọ ahụ ka dị ókéọnụahịa nye Onyenwe anyị, n’ihi na O jiri Ọbara nke Onwe ya zụta ya. Ọ dịghị ọnụahịa ọzọ ruru iji kwụọụgwọ mmehie anyị. O were Jisọs ịwụsị Ọbara Ya ka O wee kwụọụgwọ mgbapụta anyị, ya mere anyị dị ókéọnụahịa n’anya Ya.

Iheagha Nke Ekwensu

Ọ bụghị náánị na ndịmkwusa ụgha gaabata ná nzukọ ha ịgbalị idubà ha n’ụzọ ka mfé, kama ụfọdụ n’etiti ha gaagọnarị okwukwe ahụ. Ha gaaghọ ndị mpako, ha gaachọ ka ụmụmmadụ hụ ha n’anya sọpụrụ kwa ha karịa Jisọs na ndị Ya arọpụtara ijéozi. Ha gaachọ ịgwá ndị ahụ okwu ireụtọ wee nweta mkwagide ha site n’iringo, wee dọrọ ha pụọ site ná nzukọ isoro òzìzí ọhụụ.

Nke a emeghị náánị ná nzukọ dị n’Efesọs. Otù nime iheagha ekwensu naejikarị ebuso ndịKraist agha bụ mpako. Ọ naabịakwute onye náeguzosiike nime mmụọ wee malite ịgwá ya nwayọ nwayọ ná ntị ya na ọ dị mma nkeukwu náalụ kwa ọtụtụ ezi ọlu. O nwekwara ike tụkwasị na ọ dịghị onye maara mkpà ihe ọ naeme dị, na o kwesịrị ka ọ dọrọ ndị gaamata mkpà ezi ọlụ niile ọ naalụ dị nye onweya.

Ụfọdụ mmadụ naasị, “Ga n’azum, Setan: … n’ihi na i digh-atukwasi uche-gi n’ihe Chineke, kama ọ bu n’ihe madu.” Ụdị ndị ahụ naedebe okwukwe ha nime Chineke na ndịndú Ọ rọpụtara. Ma ndị ọzọ gaegentị, mgbe náadịghịanya ha amalite ichè na eleghịanya ọ dịghị onye náahụta mkpà ihe ha naeme dị. Ọ bụrụ na ha apụghị ime ka nzukọ niile chee otú ha naechè, ha gaakpọrọ òtù ndị okwu dakọtaara ha na ha wee malite nzukọ ọhụụ. Otú ahụ ka ọtụtụ okpukpé ụgha siworo malite.

Jisọs sịrị na ọ bụrụ na ewelie Ya elu, Ya gaadọrọ mmadụ niile nye Onweya. Pọl kwusara Jisọs mgbe niile, ọ dịghị mgbe o weliri onweya. Ọ sịrị na ya abụwo orù Onyenwe anyị “n’obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa.”

Otù oge, otù òtù nwere nnọọ mmasị pụrụiche n’ebe Pọl nọ. Ndịọzọ nọ ná nzukọ ahụ rọọrọ onyeozi ọzọ aha ya bụ Apọlọs. Pọl jụrụ sị “Gini kwa bu Apọlọs? gini bu kwa Pọl? ndi nēje ozi, ndi unu si n’aka-ha kwere” na Jisọs (I Ndi Kọrint 3:5). O wee jụọ sị: “Ọ gābu na akpọgidere Pọl n’obe n’ihi unu? màọbu na emere unu baptism ibà n’aha Pọl?” (I Ndi Kọrint 1:13). Ọlụ anyị bụ ikwusa Jisọs, ma chefue ihe banyere mmadụ. N’ezie, anyị naasọpụrụ náakwanyekwara ha ùgwù bụ ndị náagwa anyị ihe banyere Jisọs; ma ka anyị cheta na Jisọs bụ óké Nkume nke ewukwasịrị okwukwe anyi n’elu Ya. Ọbụná asị na mmadụ niile daa. Ya onweya gaeguzo ebighịebi.

N’agbụ Nime Mmụọ

N’ihe ra ka arọ atọ Pọl dọrọ ndị ahụ akanántị banyere ihe izendụ niile dị n’iru. Ugbu a ọ ghaghi ịrapụ ha, o wee kpeeekpere ka Chineke chebe ha n’okpuru nchebe Ya dị nrò.

Ihe dị n’iru agaghị adịrị Pọl mfé. Ọ sịrị: “Mu onwem nāga Jerusalem n’agbu nime mọ nkem, nāmagh ihe ọ bula gābiakwasim n’ebe ahu: ọ bu nání na Mọ Nsọ nāgwasim ike n’obodo nile n’otù n’otù, nāsi na agbu na nkpagbu nādigide nēchem.” Ànyị pụrụ ịga n’iru n’agbamume dịka Pọl mere ọ bụrụ na anyị mata na ọ dịghị iheọzọ maọbụghị nsogbu dị n’iru anyị? O bụrụ na anyi matara na nime obodo niile anyị bàra na otù onye nọ gaachọ imeru anyị arụ? Ànyị gaanọgide n’ibu ozi nke nzọputa a?

Ànyị naagụ Oziọma n’ihe dị mkpà rue n’inye ndụ anyị n’ihi ya? Ọtụtụ puku mmadụ anaapụghị ịgụtaọnụ emewo otú ahụ si n’ọgbọ rue ọgbọ. Ha agụghị ndụ ha n’ihe dị ókéọnụahịa rue ọnwụ, ha pụkwara isoro Pọl kwue sị: “Nke fọduru bu na edebeworom okpu-eze nke ezi omume ahu, nke Onye-nwe-ayi, bú Onye ezi omume n’ikpe ikpé, gēnyeghachim n’ubọchi ahu: ma ọ bugh nání mu onwem, kama Ọ gēnyeghachi kwa ndi nile huworo ngọzị-ya n’anya” (2 Timọti 4:8).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Pọl kwuru banyere okwukwe ya mgbe ọ bịaruru n’ọgwụgwụ nke ndụ ya?
  2. “Ìzù Chineke” ra añaa ka Pọl kwusaworo?
  3. Gịnị mere nwaokorọbịa ahụ siri na window dapụ mgbe Pọl naekwuokwu Chineke rue etiti abalị?
  4. Gịnị ka Pọl kwuru banyere òzízí ọzọ karịa nke ahụ o kwusaworo?
  5. Gịnị mere nzukọ ji dị ókéọnụahịa nye Jisọs?
  6. Ònye ka Pọl naekwu banyere mgbe o kwuruokwu banyere agụ?
  7. Kpọọ aha otù iheagha nke ekwensu jọgburu onweya.
  8. Òlee otú ekwensu si anwa OnyeKraist ọnwụnwa?
  9. Òlee otú ịdịmkpà nke Oziọma ra nye Pọl?