Aisaia 1:1-31

Lesson 348 - Junior

Memory Verse
“Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe JEHOVA nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhei dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi” (Aisaia 1:18).
Notes

Ozi Nke Onyenwe anyị

Aisaia bụ Onyeamụma malitere iheodide ya site n’okwu ndịa: “Nurunu, elu-igwe, gi uwa, ña kwa nti, n’ihi JEHOVA ekwuwo okwu.” Aisaia ji ozi sitere n’ọnụ Onyenwe anyị bịakwute ndị Israel.

Ndịeze anọ, ndịọma na ndịọjọọ, chịrịọchịchị n’oge ndụ Aisaia na Juda. Ọ naenwe ọñụ ná ngọzi Chineke mgbe niile Juda naefè Chineke; ọ hụkwara ahụhụ nke mmehie mba ahụ mgbe ndị ahụ fèrè arụsị òfùfè. Ma mgbe niile o kwuruokwu niile Chineke sịrị ya kwue. Okwukwe ya adaghị, ọbụná mgbe onyeọchịchị nke ala ahụ na ndị niile nọ n’okpuru ya chịgharịrị pụọ n’ebe Onyenwe anyị nọ, Chineke eziwo ya ozi ọ gaezi, ọ naekwu kwa ya ma ndị ahụ ha chọrọ igentị maọbụ na ha achọghị.

Uzaia na Hezekaia bụ ndịeze dị mma náajụ Aisaia ihe Chineke kwuru. Ha chọrọ ịmara ihe bụ uche Chineke, Aisaia naenyere ha aka idozi ndị ahụ kuzikwara ha ifè Chineke òfùfè. Mgbe ahụ Chineke gaagọzi ala ahụ, onye ọ bụla gaenwe kwa obiụtọ ifè Jehova òfùfè.

Enweghị Obiekele

Oge ụfọdụ dị dịka n’oge mmalite nke ọchịchị Uzaia, mgbe ndị ahụ jọrọnjọ nke ukwu. Chineke ewerewo nleruanya zụlite ha, náachọ ka ha hu Ya n’anya. Ọ gbalịwo ọ bụghị náánị iduzi ha dịka otù mba, kama O jiwo nlekọta dị nrò lekọta ha dịka nna. Lee otú o wutere Chineke n’obi mgbe ha chigharịrị megide Ya! Ọbụná anụmanụ náadịghị ekwuokwu naamata nlekọ nke onyenweya karịa ka Israel mere n’ebe Chineke nọ. “Ehi mara onye-nwe-ya, inyinya-ibu ma-kwa-ra ebe-ọzụzụ-anu nke onye-nwe-ya: ma Israel amagh, ndim atukwasigh uche.” Ha aghọtaghị ọbuná na ngọzi niile ha naenwe ọñụ na ya sitere n’ebe Chineke nọ bịa. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ha kelere Ya.

Enweghị obiekele abụghị náánị ihe dị njọ nime ndị Israel. Ọ bụrụ na ụmụmmadụ asọpụrụghị Chineke na iwu Ya, ha naenwe náánị nsọpụrụ dị ntà nye iwu niile ọzọ. Ha jọrọnjọ rue na Chineke sịrị na ọ dịghị izuòkè dị nime ha. Ọ dị ka arụ ha o jupụtara ná mmerụ na ọnyá nke anaekechighịekechi. Ọ gaabụworị ihe jọrọnjọ ọ bụrụ na ọ bụ ọnyá n’anụaru ka ha nwere, ma ọ bụ obi ha jupụtara ná mmehie. N’ihi mmehie ha, Chineke enyewo ohere ka adọrọ ụfọdụ nime ha n’agha.

Ọtụtụ arọ gaworoaga ka Chineke gwararị Ụmụ Israel na ọ bụrụ na ha erubereghị Ya isi na Ya gaeme ka ha bụrụ ọdụ mba ndịọzọ gaabụ kwa isi. Chee échìchè banyere ya! Ndị nke Chineke arọpụtara, ndị Ọ chọworo ka ha bụrụ isi, ha garaabụwokwarị ọ bụrụ na ha rubeere Chineke isi, ma ha bụ ọdụ, ebe mba ndị náamaghị Chineke naaga n’iru n’isi.

Akwụsịrị Ikpé

Asị na enweghị mmadụ olenaole náasọpụrụ Chineke, dịka Aisaia, gbasasịrị n’obodo ahụ niile, Chineke gaebibiworị ha niile dịka O mere Sọdọm na Gọmọra. Ọkụ na brimstone zokwasịrị obodo ọjọọ abụọ ahụ n’ihi óké mmehie ha.

Ọ bụ náánị n’ihi mmadụ olenaole náasọpụrụ Chineke nọ n’ụwa taa ka eji náejide mwụpụ nke iwe Chineke. Ndịmmehie ekwesịghị ịnata ngọzi ọ bụla nke Chineke. Ha naenupụrụ Ya isi, náekwujọ Ya. were kwa iwu Ya náeme iheọchị. Ma ọtụtụ naechè na ha gaabà n’Eluigwe n’ọnọdụ dị otú ahụ. Ha naechè na ọ bụrụ na ha esoro ụdị nke otù okpukpé ọ bụla, Chineke gaanabata ha, náagbanyeghị otú ha si bie ndụ.

Chineke gwara Ụmụ Israel kpọmkwem ihe O chère banyere ụdị nke okpukpé mgbe obi náezighịezi n’ebe Ya nọ. Ọ jụrụ ajụjụ sị: “N’ihi gini ka unu nāchurum ọtutu aja-unu? afọ ejuwom n’àjà-nsure-ọku nile eji ebulu chu, na abuba umu-ehi emere ka ha ma abuba; … unu ebubata-kwa-la onyinye-inata-iru-ọma ọzọ nke bu ihe-efu; ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ, ihe-árú ka ọ burum; ọnwa ọhu na ubọchi-izu-ike, ikpọ nkpọkọta, -- apughm inagide ajọ omume na ubọchi mgbochi.” Ọ gaewe karịa náánị ijé n’ụlọụkọ n’Ụbọchịụkọ, ịbụabụ, ikwuokwu ọma banyere Jisọs, maọbụ ikpé ogologo ekpere, ka O wee nabata anyị. Ọ sịrị: “Mgbe unu nēkpe ọtutu ekpere, M’gagh-adi nānu: aka-unu juputara n’ọbara.”

Nke ahụ apụtaghị na Ọ gaghịanụ ekpere onyemmehie. Ọ bụrụ na onye ọ bụla echègharịa wee rịọ mgbaghara, Chineke gaaza. “Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I digh-eleda ya anya.” Ma mmadụ agaghị ichigharị site n’omume ọjọọ ya niile ka ewee zọpụta ya.

Emerụrụ Obodo Nsọ Ahụ

Oge adịworị mgbe obodo Jerusalem dị nsọ. Otù mgbe Devid dere sị: “Site na Zaion (Jerusalem). bú ebe mazuru nma, ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.” Nke ahụ bụ ọchịchọ nke Chineke n’ihi Obodo Nsọ Ya. Izuòkè nke obodo ahụ n’oge ahụ ka apụrụ iji tụnyere otù oge, n’ihi na oge gaabia n’oge Ọchịchị Puku Arọ mgbe ọ gaabu Obodo Nsọ n’ezie. Mgbe ahụ “Ha agagh-eme ihe ọjọ, ha agagh-ebibi kwa, n’ugwu nsọm nile, ka JEHOVA siri” (Aisaia 65:25).

Ma chee échìchè banyere ọnọdụ Jerusalem n’oge Aisaia dere ihe a! “Ò si-kwa-ra aña ghọ nwayi nākwa iko, bú obodo ahu kwesiri ntukwasi-obi? obodo ahu nke juputara n’ikpé ziri ezi! Ezi omume nānọri ọnọdu-abali nime ya, ma ugbu a ndi-ogbu-madu.” Chee échìchè banyere nke a! N’Obodo Nsọ Chineke, ebe Ọ chọrọ náánị eziomume na ihe ziriezi, ka ọtụtụ mmebiiwu jupụtara. “Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n’ebe M’nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-iro; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n’anya, nāgbaso kwa ihe nkwughachi: ọ digh nwa-ngbei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpé nke nwayi di-ya nwuru adigh-ebiakute kwa ha.” Ndị nọ n’ọnọdụ dị elu kwesịrị inyere ndị ogbenye na ndịnyom di ha nwụrụ aka jupụtara n’omume ịnara iheiringo. Ha hụrụ ịnara onyinye n’anya nkeukwu, náalụ kwa ọlụ maka úrù nke onwe ha karịa inyere ndịọzọ aka bụ ndị chọrọ inyeaka ha.

Chineke hụrụ ihe niile ahụ. Chineke naahụ kwa ndị náakpagbu mmadụ taa. Ọ sịwo kwa na otù ụbọchị mpịakọta naabịa. Agaeme ka ndị náemebiiwu baa n’ikpé n’ihi omume ọjọọ ha.

Amụma Aisaia buru banyere obodo Jerusalem metụtara oge Ọchịchị Puku Arọ. Mgbe ahụ ka agaakpọ Jerusalem obodo eziomume, obodo kwesịrịntụkwasịobi. Ndịikpé emerụrụ emerụ agaghịadị kwa; ndị naadụọdụ gaadị kwa dịka ha dịrị n’oge Devid sịrị: “Site na Zaion, bú ebe mazuru nma, ka Chineke nwuputaworo ka ìhè” (Abù Ọma 50:2).

Ime Eziihe

Chineke kwesịrịntụkwasịobi nye Israel daghachiworo azụ wee gwa ha otú ha gaesi chọta iruọma n’ebe Chineke nọ. Aisaia gwara ha sị: “Rapunu ime ihe ọjọ: mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.”

Ịrapụ ime iheọjọọ náánị ezughị. Mmadụ nwereike ichègharị site n’omume ọjọọ ya niile, wee nọdụ jikọta aka ya, náañụrịọñụ na ya adịghị kwa ka ndị naemebiiwu. Nke ahu agaghị ewetara ya ụgwọọlụ ọ bụla. Onye ahụ agaghị kwa ịmụta ime eziihe. Anyị agaghị igosi ụwa site n’ọlụ anyị na Chineke emewo ka mgbanwe dị n’obi anyị.

Ọ bụghị mgbe niile ka ọlụ niile ahụ naabụ ikwusaokwu Chineke, ekpere, ịbụabụ, na ikwu ihe banyere Jisọs. Mgbe niile ka Onyenwe anyị naewelite isiokwu banyere imere ndị ogbenye na ndị náadịghiike ebere. Onye dere Abù Ọma dere sị: “Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye nwere uche n’imeso onye nēnweghi ike: n’ubọchi ihe ọjọ JEHOVA gēme ka ọ wepuga onwe-ya” (Abù Ọma 41:1).

Chineke Naarụrịta Ụkà

Otù nime amaokwu kachasị ukwu dị nime Akwụkwọnsọ ka anaachọta n’isi mbụ a nke Akwụkwọ Aisaia: “Biko bianu, ka ayi rurita uka, bú ihe JEHOVA nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha; ọ buru na ha acha uhie uhie dika ogho uhie, ọ bu dika aji ọcha ka ha gādi.” Che échìchè otú obiọma na ebere Chineke ra! Ọ bụghị iwu na Ọ gaegosi ebere. Mmadụ emehiewo megide Chineke, wee bụrụ kwa onye kwesịrị ịnwụọnwụ n’ihi mmehie ya. Ma Chineke naagbasa aka Ya n’ebere náakpọ òkù sị. “Bianu.” Bịa ugbu a. Edebela ịchọ nzọpụta rue mgbe ọzọ. Echi nwereike ghara ịbịa. “Le, ugbu a bu oge anānara madu nke-ọma; le, ugbu a bu ubọchi nzọputa” (2 Ndi Kọrint 6:2).

“Ka ayi rurita uka.” Anyị enweghị ihengọpụ ọ bụla anyị gaeche n’iru Chineke na ọ bụ ihe kpatara anyị ji bụrụ ndịmmehie. Jisọs nwụrụ n’ihi mmehie anyị, Ọbara Ya gaasacha kwa anyị, anyị ewee dị ọcha karịa snow ngwangwa anyị rapụrụ mmehie anyị wee rịọ mgbaghara. Anyị agaghị enye iheọzọ maọbụghị onwe anyị; Ya onweya naenye ihe niile. Ma, Ọ naasị na anyị na Ya gaarụrịta ụka. Onyenwem Jisọs bụ Onyenzọpụta dị ebube!

N’oge ọzọ Onyenwe anyị jụrụ banyere Israel sị: “Gini ka agēme … ọzọ, nke m’nēmegh nime ya” (Aisaia 5:4). Jisọs nyere ihe niile ịzọpụta anyị site ná mmehie, ọbụná ma ndụ Ya. Ọ bụ na anyi ekwesịghị iwere ọsọ gbakwute Ya, naetimkpu ka emeere anyị ebere, náarịọ kwa mgbaghara? Òlee otú ụmụmmadụ si nwee ike iwezuga ịhụn’anya Chineke n’akụkụ?

Ọ bụghị náánị na Chineke naasachapụ mmehie kama Ọ naagọzi ndị niile náefè Ya òfùfè. “Ọ buru na unu ekwe, we nu, ezi ihe nke ala-unu ka unu gēri.” N’ezie ndị nke Chineke bụ ndị agọziriagọzi!

Ikpé Megide Ndị Nnupuisi

Mmadụ gaechè na mmadụ niile gaacho ka azọpụta ha ka ha wee nwee ọñụ na ngọzi niile nke Chineke. Ma ọtụtụ mmadụ achọghị. Ha naenupụrụ Chineke isi, wee chọọ ịga n’ụzọ nke aka ha. Nke a bụ ihe Chineke naasị ha: “Ọ buru na unu aju, we nupu isi, mma-agha gērichapu unu.” O me-kwa-ra ka ọ daa dịka okwu ikpeazụ mgbe ọ tụkwasịrị, “N’ihi na ọnu JEHOVA ekwuwo.” Okwu ọ bụla Chineke kwuru gaemezu.

Ikpé gaesoro okwu nke Aisaia ngwangwa bụ na mba naamaghị Chineke gaadọrọ Ụmụ Israel n’agha. Ma ikpé gaabịkwasị onyemmehie ọ bụla --- ma ọ bụghị n’ụwa a, ya abụrụ n’ụwa nke naabịa. Ọnwụ gasịa ikpé eso ya.

Taa Jisọs ka naasị: “Biko bianu, ka ayi rurita uka.” “Mọ Nsọ na nwayi ahu anālu ọhu nāsi kwa, bia. Onye nānu, ya si kwa, Bia. Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia: onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n’efu” (Nkpughe 22:17).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye ziri Aisaia ozi ahụ ka o zie Ụmụ Israel?
  2. •dị ndịeze dị añaa ka Uzaia na Hezekaia bụ?
  3. Òlee otú Chineke siworo mee Israel “ka ha toputa”?
  4. Òlee otú Chineke si were Ụmụ Isreal tụnyere anụụlọ?
  5. Gịnị mere Chineke achọghị àjà niile Ụmụ Israel naachụ?
  6. Ọnọdụ dị añaa ka Jerusalem nọ n’oge Aisaia dere iheodide a?
  7. Mgbe Chineke gwasịrị Ụmụ Israel mmehie ha, gịnị ka Ọ rịọrọ ndị ahụ ka ha mee?
  8. Gịnị gaeme ha ọ bụrụ na ha ajụ Ya?
  9. Gịnị ka Chineke kweworo ná mkwà nye ndị ziriezi na ndị náerubeisi?
  10. Gịnị ka O kweworo na mkwà nye ndị naechèta ndị ogbenye?