Aisaia 5:1-30

Lesson 349 - Junior

Memory Verse
“Ahuhu gādiri ndi nākpọ ihe ọjọ ezi ihe, ndi nākpọ kwa ezi ihe ihe ọjọ; ndi nētinye ọchichiri n’ọnọdu ìhè, na ìhè n’ọnọdu ọchichiri” (Aisaia 5:20).
Notes

Àkụ Dị Ókéọnụahịa nke Chineke

Chineke hụrụ ndị Ya arọpụtara n’anya, bụ ndị Israel. Otù mgbe Ọ kpọrọ ha “ihe nke aka Ya” (Abù Ọma 135:4). Ọ sịrị, “Achirim udọ madụ, bú ihenhiegide ihu-n’anya, adọ ha” (Hosea 11:4). Mgbe mba Israel siri n’ịbụorù n’Ijipt pụta, Chineke sịrị, “Ebu-kwa-ram unu n’elu nkù ugo, me ka unu biakutem” (Ọpupu 19:4). Lee otú Ọ hụrụ Israel n’anya.

Ma Israel náenweghị obiekele echigharịwo pụọ site n’ịhụn’anya ahụ, wee feè arụsị kama ifè Chineke òfùfè. Ha aghọtaghị omimi nke eziihe O meworo ha; ha wee jụ irubere Ya isi.

Abụ Aisaia

Otù ụbọchị Chineke gwara Aisaia Onyeamụma ka o chetara Ụmụ Israel ihe niile Ya mewooro ha site n’otù abụ. “Biko, ka m’bùara onye ihe-ya nātọm utọ nke-uku abù nke onye ihe-ya nātọm utọ banyere ubi-vine ya.” Jisọs bụ “onye ihe-ya nātọ” Chineke “utọ nke-uku,” O jikwara Israel tụnyere ubivine dị n’ugwu ntà nke bụ ezi ókèala, ubivine nke agbara ogige gburugburu.

Chineke enyewo Israel Ala Kenean, gwa kwa ha nnọọ ebe ókèala ha dị. Ókèala ahụ bụ ogige nke Aisaia bụrụabụ banyere ya. Eburuwo ụzọ kwee Abraham ala ahụ ná mkwà; emesịa, n’oge ọchịchị Eze Solomom, ụmụmmadụ ebiriwo n’ọtụtụ ebe nime ala ahụ. Ọ bụrụ na ndị Israel rubeere Chineke isi, ọ dịghị onye garaapụ ịnapụ ha ala ahụ.

Chineke ewepụwo “nkume” niile (maọbụ ndị náekpere arụsị) site “n’ubi-vine” ahụ. Ọ chụpụwo ndị náekpere arụsị tupu ndi Israel abàta mgbe ahụ ha bàra na Kenean. Chineke chọrọ ka náánị Ụmụ Israel biri n’ebe ahụ. Ọ bụrụ na ha mere ihe Chineke gwara ha ka ha mee, ha gara enweworị ọgan’iru ná ndụ ha, náemeri onyeiro ọ bụla.

Mkpụrụ vine Ọhịa

Chineke gụrụ Ndị Ya dịka “vine kachasi nma” nke Ya. Ọ kụwo ha n’Ala Kenean, were kwa eziihe niile mee ka afọ ju ha. Ma n’ihi na Israel agbakụtawo Chineke azụ, ka O ji kwue sị, “Ọ we le anya na ọ gāmi nkpuru-vine, ma ọ miri nkpuru-vine ọhia.” Lee óké ihemwute nke a bụ!

Chee échìchè otú ọ gaadị gị ọ bụrụ na ị nyere onwegị nsogbu nke iwere aka tụtụpụ nkume dị n’otù ala; wee gbaa ya ogige gburugburu wee kụọ kwa mkpụrụ vine dị ókéọnụahịa, dozie kwa ebe ịnara mmanya vine maka ịpịcha mkpụrụ vine; emesịa mgbe ị lụsịrị ọlụ niile ahụ, mgbe ị bịara ịghọrọ mkpụrụ, ịchọpụta na ihe ịhụrụ bụ náánị mkpụrụ vine ọhịa. Ị gaghị enweta ihe ọ bụla n’ihi óké ọlụ gị niile na ego ị mefuworo. Ọ bàghị úrù ọ bụla. Ọ gaadị gị ka i mee ihe ahụ Onye nọ n’abụ a mere: dọkasịa ogige ahụ kwee kwa ka ahịhịa na anụmanụ were ọnọdụ n’ebe ahụ.

Ikpé Ziriezi

Chineke mere nkeọma mgbe Ọ sịrị Israel na Juda kpeeikpe ahụ: “Gini ka agēme ubivine nkem ọzọ, nke m’nēmegh nime ya” Ị pụrụ icheta ihe ọ bụla ọzọ Ọ gaemeworị ka ubivine a wee mịa mkpụrụ?

Ị pụrụ icheta ihe ọ bụla ọzọ Chineke gaemeworo ndị Ya bụ Israel ka ha wee bụrụ mba nwere ọgan’iru? O si n’Ijipt kpọpụta ha mgbe ha bụ náánị mba nọ n’òrù; O debere ha n’ala náamị mkpụrụ ebe akụworo ihe, nye kwa ha ụlọ ewuworo ewu ka ha biri nime ya. Ọ chụpụrụ ndiirọ ha n’iru ha. Ọ gwara ha na ha gaabụ isi, na mba niile ọzọ gaabụ ọdụ. O nyere ha ezi okpukpé, Chineke naanụ náaza kwa ekpere ha. Ihe niile a ka Chineke mewooro ndị Ya.

Ma mgbe Chineke chọrọ ka ha meere Ya ihe -- ikwusa nzọpụta nye ụwa -- ha wee jụ, wee fee arụsị òfùfè. Ha chefuru Chineke, obi ha wee jupụta n’ihe ọjọọ mgbe niile. Ha enweghị obiọma ọbụná n’ebe ibe ha nọ. “Ọ we le anya ikpe ziri ezi, ma, le, nwusi-ọbara; Ọ lere anya ezi omume, ma, le, iti-nkpu.” Ndụ ha wee tọgbọrọ n’efu dịka ala ahụ mgbe Chineke náeziteghị mmiriòzùzò.

Enweghị Mmiriòzùzò

Chineke adọwo ha rịị akanántị site na mgbe ha rapụrụ Ijipt banyere ihe gaeme ọ bụrụ na ha ewezuga onweha site n’ebe Ya nọ. Otù ihe bụ na Ya gaakwụsị mmiriòzùzò. Chineke naekwe ka mmiri zoo mgbe Ọ chọrọ; ọ bụrụ kwa na Ọ kwụsị ya, anyị agaghị enwe mmiriòzùzò. Ọ dịghị ihe ọ bụla gaetó ọ bụrụ na mmiri adịghị, ya mere ala Kenean ghọrọ ebe tọgbọrọ n’efu. Ọ dịghị onye chọkwara ibi na ya, ndị Israel kwa (emesịa kpọọ ndi Juu) wee kwapụ. O siiri ndị Arab ike ọbụná ịchọta ahịhịa ịnyịnyaibu na camel ha niile, ọtụtụ nime ha wee pịakọọ ụlọikwú ha pụọ. Ya mere ebe ahụ kwesịrị ịbụ ubivine náamị mkpụrụ wee bụrụ ọzara náadịghị amị mkpụrụ. Ọtụtụ narị arọ ala Palestain tọgbọrọ nkịtị, dịka ahụhụ nye Ụmụ Israel n’ihi na ha jụrụ Kraist.

Ịhụn’anya Chineke Nye Anyị

Ugbu a ka anyị tụlee ihe Chineke mewooro anyị. O zitere Jisọs bụ Ọkpara Ya Ọ hụrụ n’anya, ịnwụ n’ihi anyị. Iwu Ya bụ, “Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu” Onye ọ bụla emewo mmehie wee kwesị kwa ịnwụ, ma Jisọs nyere Onweya ịnwụ n’ọnọdụ anyị. Cheè otú anyị kwesịrị inwe obiekele na Jisọs kwere iburu ahụhụ anyị. Ma anyị agaghị ijikwere ịbịakute Ya ka ewee zọpụta anyị, ma ọbụghị otú ahụ anyị gaata ahụhụ.

Ọtụtụ ìgwè mmadụ nọ taa bụ ndị náachọghị ka azọpụta ha. Jisọs naakwaákwá n’ihi ha dịka Ọ kwara n’ihi Jerusalem náenupụisi: “Jerusalem, Jerusalem, … ọtutu mgbe ole ka M’chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n’okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi!” (Matiu 23:37). Ọzọ kwa Ọ naajụ sị, “Gini ka agēme … ọzọ, nke m’nēmegh?” Gịnị ọzọ ka Jisọs gaeme ka ndịmmehie wee bịarue nchègharị ka O wee nye kwa ha ọnọdụ n’Eluigwe?

Ịdọakanántị Nye Anyị

Jisọs bịara n’ụwa igosi ụmụmmadụ otú ha gaesi biendụ. Baịbụl naagwa anyị otú O si bie, Ọ chọkwara ka anyị dị ka Ya. Anyị apụghị ịsị na anyị amaghị otú anyị gaesi mee. O nyere anyị Okwu Ya edepụtaworo ikuziri anyị banyere ihe ọ bụla gaadapụta ná ndụ a.

Site kwa n’ọnwụ Ya na Kalvarị, na Ọbara Ọ wụsịrị, O nyere anyị ike ibindụ náenweghị mmehie. Gịnị ọzọ ka Ọ gaemeworị?

Ịnwụọnwụ n’ihi Ndịiro Ya

Mgbe ụfọdụ ị nụwo na mmadụ nyere ndụ ya n’ihi enyì ya. Ma ị gaghị eleanya na mmadụ gaanwụ n’ihi onyeiro ya. Nke a ka Jisọs mere. Pọl Onyeozi naagwa anyị sị: “Ọ di ike na otù onye gānwu n’ihi onye ezi omume: … Ma Chineke nēme ka ihu-n’anya nke aka Ya n’ebe ayi nọ puta ìhè, n’ihi na, mgbe ayi nọ nābu ndi-nmehie, Kraist nwuru n’ihi ayi” (Ndi Rom 5:7, 8). Jisọs nwụrụ n’ihi ndịiro Ya n’ihi na Ọ hụrụ ha n’anya, chọọ kwa ka ha nwee nzọpụta.

Ọ bụ na anyị agaghị eme ọsọsọ ịza òkù Ya? O mewo ihe Ọ pụrụ ime ịzọpụta anyị n’ọkụmmụọ ebighịebi. Ọ naakpọ òkù sị: “Biko bianu, ka ayi rurita uka, bu ihe JEHOVA nāsi: ọ buru na nmehie-unu adi ka uwe uhie, ọ bu dika snow ka ha gādi ọcha” (Aisaia 1:18).

Ntaramaahụhụ N’ihi Nnupuisi

Okwu ikpé ahụ Chineke kwuru megide Israel gaadịkwasị kwa onye ọ bụla naewezuga onweya n’ebe Ọ nọ. Ọ sịrị: “Ahuhu gādiri ndi nēbili n’isi-ututu igbaso ihe-ọñụñụ nābà n’anya; ndi nānọ ogologo mgbe n’anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku!” Ụfọdụ mmadụ chère na ọ dịghị ihe dị njọ n’ịñụmmanya naegbuegbu ma ọ bụrụ na ha añụbigaghị ya óké; ma onye amụma ahụ sịkwara, “Ahuhu gādiri ndi-dike n’iñu manya-vine, ndi bu kwa dìnkpà n’itigwa ihe-ọñụñụ nābà n’anya.” Ọbụná ma asị na ha dị ike ịñụ mmanya o wee bụrụ na ọ gaghị abà ha n’anya, ọ ka bụ kwa iheọjọọ. Ọkụalammụọ emewo onweya ka ọ saa mbara ịnagide ndịmmehie dị otú ahụ, na ọtụtụ ndịọzọ.

Chineke sịrị na edoziri ọkụalammụọ na mbụ n’ihi ekwensu na ndịozi ya: ma ọ bụrụ na ụmụmmadụ gaajụ ka azọpụta ha, ha onweha kwa gaaga n’ebe ahụ.

Chineke kwukwara na ahụhụ gaadịrị ndị naakpọ eziihe iheọjọọ, ndị naakpọ kwa iheọjọọ eziihe. Ọtụtụ iheọjọọ dị ugbu a nke ụmụmmadụ naakpọ mmehie nwere nsọpụrụ. Ma cheta na ọ bụrụ na Chineke sị na ihe jọrọnjọ, ọ bụ ihe ọjọọ, náagbanyeghị ihe ụmụmmadụ kwuru banyere ya.

Chineke sịkwara na ahụhụ gaadịrị ndị naanara iheiringo ikpuchi mmehie -- ndị “nāgu onye nēmebi iwu n’onye ezi omume n’ihi iringo.” Mgbe anyị naagụ banyere mmehie dị n’oge ndị Israel, ya na mmehie nke ụmụmmadụ naeme n’oge a bụ otù ihe. “N’ihi nka ka iwe JEHOVA di ọku n’aru ndi-Ya.”

Anyị achọghị ka nke ọ bụla nime ikpé na ahụhụ niile a dakwasị anyị, ya mere ka anyị nye Chineke obi anyị ugbu a anyị ka bụ ụmụokorọbịa na agbọghọbịa. Ka anyị were nleruanya náejéijè ụbọchị niile nke ndụ anyị, n’irubeisi n’Okwu Ya, ka anyị wee nwee ọñụ ná ngọzi niile n’ụwa a ma nweta ihe niile O jeworo idoziri ndị hụrụ Ya n’anya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka eji tụnyere Israel n’abụ a?
  2. Kọwaa ihe Chineke meere ubivine Ya.
  3. Gịnị ka Ọ hụrụ mgbe Ọ chọrọ mkpụrụ n’elu ya?
  4. Gịnị ka “nkume niile” ahụ naanọchị anya ya?
  5. Gịnị bụ ahụhụ dakwasịrị ubivine ahụ?
  6. Gịnị ka Jisọs mewooro anyị?
  7. Gịnị mere ọkụalammụọ jiworo mee “ka ọchịchọ nkpụrụobi ya saa mbara?”
  8. Kpọọ aha ihe ụfọdụ Chineke kwuru na ahụhụ gaadịrị.
  9. Ònye gaabụ onyeikpé n’etiti Chineke na ubivine Ya?