Aisaia 6:1-13.

Lesson 350 - Junior

Memory Verse
“N’ihi nka Jisus, ka Ọ we site n’ọbara nke ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n’azu ọnụ-uzọ-ama nke obodo” (Ndi Hibru 13:12).
Notes

Ọlụ Nke Aisaia

Chineke nwere ọlụ ririnne nke Aisaia gaalụ. Chineke akpọwo ya ịdọ Ụmụ Israel akanántị banyere ikpé gaadakwasị ha n’ihi mmehie niile ha; na ịgwa kwa ha banyere Jisọs, Mesaia ahụ, onye gaabịa ịnapụta ndị fọdụrụ n’ụlọ Israel. Ọ bụghị náánị na Aisaia gaekwuokwu banyere ọbịabịa mbụ nke Jisọs, dịka o mere mgbe o dere sị: “N’ihi na amuworo ayi otù nwa otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n’ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mgbe nile ebigh-ebi, Onye-isi Udo;” ma Aisaia kwu-kwa-ra okwu banyere mgbe Jisọs gaachị n’elu ụwa nke a n’oge Ọchịchị Puku Arọ. “Obi gātọ ọzara na ala kpọrọ nku utọ; ala ihe nādigh gēteghari kwa egwú ọñu, gbawa kwa okoko-ọhia dika rose” (Aisaia 35:1). “Ka obi tọ unu utọ, tèghari-kwa-nu egwú ọñụ rue mgbe ebigh-ebi n’ihi ihe nke Mu onwem nēkè: n’ihi na, le, M’nēkè Jerusalem ibu ihe ntèghari-egwú-ọñụ, ndi-ya kwa, ibu ihe obi-utọ. … agagh-anu kwa olu ikwaákwá nime ya ọzọ, ma-ọbu olu iti-nkpu” (Aisaia 65:18, 19).

Njikere Maka Ọlụ

Tupu Aisaia enweeike iburu óké amụma niile ahụ chee n’iru ndị ahụ, agaghị ijikere obi nke ya onweya. Ọ bụ ezie na azọpụtawo Aisaia tupu ya amalite ibu amụma. N’ọnọdụ nke onye agụrụ n’onye eziomume ahụ ọ kwupụtaworị ọtụtụ amụma maramma, o kwusawokwara Ụmụ Israel. Ma n’ihi ọlụ dị ukwu karị, nke agaje ịlụ, ọlụ imemmụọ dị omimi karị dị mkpà nye Aisaia -- nke a bụ odudonsọ.

Aisaia amalitewo ọlụ ya nke ibu amụma n’oge ọchịchị nke Eze bụ Uzaia. Eze a ekwesịwo ntụkwasịobi ọtụtụ arọ; ma mgbe ọchịchị ya naabịaru ọgwụgwụ ọ nupuuru Chineke isi, wee ghọọ onye ekpenta. Anyị amụwo na ọ naabụkarị ihe náeme na mgbe eze ọ bụla mehiere, ọtụtụ ndị nọ n’okpuru ọchịchị ya gaesoro ihearụ o debere. Ya mere anyị matara na mgbe Uzaia bụ Eze nwụrụ, Ụmụ Israel adịwo ala nime mmụọ.

Ikpeekpere N’ihi Israel

Aisaia jere nime Ụlọukwu ikpeekpere. N’ezie ekpere dị Ụmụ Israel mkpà nke ukwu. Ewo Chineke, nyere Israel aka ichègharị! Mee ebere Onyenwe anyị!

Ka ọ naekpeekpere, ebube nke Chineke bịakwasịrị ya o wee hụ ọhụ nke Onyenwe anyị ka Ọ naanọkwasị n’ocheeze, dị elu nke ebuliwokwara elu, ụsụ Ya jupụtakwara Ụlọukwu ahụ.

Mgbe anyị nwere ibuarọ n’ezie ikpeekpere n’ihi ndịọzọ, maọbụ n’ihi ọlụ nke Onyenwe anyị, Chineke naadọru anyị nso Ya karị, anyị naenwe kwa mmetụta ntà nke ebube Ya. Anyị naenwe mmetụta nke ịkpá nso Ya ka anyị naalụrụ Ya ọlụ.

Cheè échìchè ihe Aisaia gaetufuworị ọ bụrụ na ọ sịrị na Ụmụ Israel niile jọgburu onwe ha, ọ baghị kwa úrù ikpere ha ekpere. Ọ bụrụ na ha achọghị ka azọpụta ha, gịnị mere ọ gaeji nye onwe ya nsogbu banyere ya. Ọ bụrụ na ọ kwuru otú ahụ, ọ gaghịejeworị n’Ụlọukwu ná ekpeekpere, ọ gaghị ahụ kwa ebube Chineke maọlị.

Náagbanyeghị otú obi ụmụmmadụ ejila sieike, ọ bụ ọlụ dịrị OnyeKraist ikpesiekpere ike nye Chineke maka nzọputa ha, na inweike Chineke nke ukwu ná ndụ ha onweha rue na onyemmehie gaahụta ya. Ụfọdụ mgbe ekpedatawo ntute n’ebe ụmụmmadụ leworo anya na olileanya adịghị kwa na agaazọpụta onye ọ bụla.

“Dị ike!

Ekwula na, “Ụbọchị dị njọ. Ònye ka agaata ụta?

Wee kụkụba aka naekwughị okwu – o ihe-ihere!

Bilie, kwue okwu, n’obiike, n’aha Chineke.”

Ebube Chineke

Ọ bụghị náánị n’Aisaia hụrụ Onyenwe anyị n’ọhụ, kama ọ hụrụ ndị seraph náeguzo n’elu ocheeze Chineke. Ha bụ ihe ekèreekè nke Aisaia náahụbeghị mbụ. Nke ọ bụla nwere nkù isi. Abụọ ka ha ji ekpuchi iru ha. Ha ghọtara ịdịnsọ nke Chineke, ọ gaabụ kwa na ha gụrụ onweha na ndị náekwesịghị ilekwasị Ya anya.

Mgbe anyị malitere inwe mmetụta nke ịdịnsọ Onyenwe anyị, anyị gaenwe mmetụta nke ekwesịghịekwesị anyị ịbụ ndị anaakpọ ndịenyì maọbụ ụmụnne Ya (Ndi Hibru 2:11). “Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; na nwa nke madu, na I nēleta ya?” (Abù Ọma 8:4) Mgbe anyị nọ n’ụlọ Chineke anyị kwesịrị icheta na anyị gaeme omume n’ụzọ náagaghị eweta asọpụrụghị Ya.

Ndị seraph ahụ ji nkù abụọ náekpuchi ụkwụ ha. Ha ji kwa nkù abụọ fọdụrụ náefé ngwangwa imezu ihe Chineke gwara ha.

Ka ndị seraph ndịa naefégharị n’ocheeze Chineke, ha naabụ abụ otù onye náasị ibe ya, “Nsọ, nsọ, nsọ, ka JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha di: ùjú uwa nile bu ebube-Ya.” Ọ bụrụ náánị na ụmụmmadụ gaeto Onyenwe anyị, ha gaenwe mmetụta nke ebube dị n’ebe niile. Iru Ya nọ n’ụwa niile, ebe ọ bụla mmadụ chọkwara ikpeekpere, Ọ gaanọ kwa n’ebe ahụ ịza. Chineke chọrọ ka mmadụ náeto Ya. Ụsụ niile nke Eluigwe naeto Chineke.

Ka ndị seraph ahụ naabụ, ebube Chineke wee jupụta Ụlọukwu ahụ dịka anwụrụọkụ. Ọbụná ntọala niile nke mbataụzọ Ụlọukwu wee mee mkpatụ site n’ike batara n’ebe ahụ. Ị pụrụ ịhụ otú o si metụ Aisaia mgbe ọ hụrụ ebube na ike niile ahụ? N’ezie o metụrụ ya na ya ekwesịghịekwesị. Obodo Israel jupụtakwara ná mmehie n’oge a! Gịnị mere Chineke ji gosi ha Onweya n’ebube ra otú a? Aisaia wee hụ mkpà ọ dị ya inwe obi dị ọcha karị n’onweya. O wee were obi dị umeala kpọkue Chineke ka O nyere ya aka.

Mgbe anyị hụtara mkpà ọ dị anyị inweta inyeaka Chineke, mgbe ahụ O gaapụ inyere anyị aka. Mgbe anyị bịakwutere Ya n’obi dị umeala, Ọ naanụ ákwá anyị náaza kwa ekpere anyị.

Ịdịọcha N’obi

Ka Aisaia naekpeekpere, otù seraph weere otù nkume dị ọkụ site n’ebe ịchụàjà, wee fekuru Aisaia, wee detụ ya n’egbugbereọnụ ya, náasị: “Le, nka emetuwo egbugbere-ọnụ-gi abua; ewe wezuga ajọ omume-gi, kpuchi kwa nmehie-gi.”

Mmehie niile nke Aisaia, ihe ọjọọ niile o meworo, ka agbagharaworo mgbe azọpụtara ya. Ma ụdị nke mmehie, nke anaekwukarị ihe banyere ya na Baịbụl dịka otù (mmehie), ka nọ nime ya. Ọ dị mkpà ka edoo ya nsọ. Odudonsọ naazụchapụ, maọbụ náasachapụ obi.

Mgbe Devid mehiere o kpereekpere ka echichapụ omume ya niile. N’ụzọ ọzọ “Gbaghara mmehie niile m’meworo.” O wee tụkwasị “Sucham nke-ọma dika ákwà ka ajọ omumem pua nimem, me kwa ka m’si na nmehiem di ọcha” (Abù Ọma 51:1, 2). Nke ahụ naatụ odudonsọ aka, ịdịọcha nke obi.

Aisaia anụwo ka ndị seraph ahụ naabụ abụ banyere ịdịnsọ nke Chineke. Ọ bụrụ na ọ gaefè Chineke n’ụzọ anaanara nkeọma, ọ ghaghị kwa ịdịnsọ. Aha ọzọ anaakpọ odudonsọ bụ ịdịnsọ.

Chineke sịrị, “Unu gādi nsọ; n’ihi na nsọ ka Mu onwem di” (I Pita 1:16). Chineke naele anyị anya ka anyị dị nsọ ná ndụ dị ugbu a. Ọ ñụụrụ Abraham iyi sị, “Ikwenye ayi, ebe adọputaworo ayi n’aka ndi-iro-ayi, ka ayi nēkpere Ya nātugh egwu, n’obi ọcha na ezi omume n’iru Ya ubọchi-ayi nile” (Luk 1:73-75). Ọnwụ adịghị edo mmadụ nsọ.

Nnọnye Nke Atọnimeotù

Ka anyị rịba àmà na Atọnimeotù dị Nsọ pụtara ìhè n’ebe a. Ndị seraph ahụ naabụ abụ sị, “Nsọ nsọ, nsọ” na-eto Nna na Ọkpara, na Mmụọ Nsọ. Mgbe Onyenwe anyị kwuruokwu, Ọ sịrị, “Ònye ka M’gēziga,” wee tụkwasị kwa, “ònye gēje-kwa-ra ayi” Ọ karịrị otù onye nọ n’ebe ahụ.

Ụfọdụ gaasị na Jisọs anọghị rue mgbe ahụ amụrụ Ya na Bethlehem. Ma Jọn Onyeozi, mgbe ọ naekwu banyere mnwapụta nke a Aisaia nwere nime Ụlọukwu, sịrị na Jisọs nọ n’ebe ahụ. Jọn kwuru banyere iheịrịbaàmà niile Jisọs naalụ mgbe Ọ nọ n’ụwa, o wee sị na ndị ahụ agaghị ekwere Ya dịka ha náekwenyereghị Aisaia ọtụtụ narị arọ garaaga tupu oge a. Aisaia ekwuwo sị: “Ọ mewo ka anya-ha kpue ìsì, Ọ me-kwa-ra ka obi-ha me etili; ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, ghara kwa ichighari, ka M’ghara kwa ime ka aru di ha ike” (Jọn 12:40). Jọn sịrị: “Ihe ndia ka Aisaia kwuru, n’ihi na ọ huru ebube-Ya; o kwu kwara okwu banyere Ya (Jisọs)” (Jọn 12:41). Ya mere Mmụọ Nsọ ekpugheworo Jọn na Jisọs nọrị n’Ụlọukwu mgbe edoro Aisaia nsọ, ọtụtụ narị arọ garaaga tupu amụọ Jisọs na Bethlehem.

Ịza Òkù Ahụ

Ọ bụ mnwapụta dị ebube nye Aisaia inweta iruọma Chineke n’ụzọ pụrụ iche otú a; ma ọ gaghị enweta ebube na ngọzi niile ahụ náánị onweya. Enyere ya nke a inye ike na amamihe ịgwá Israel daghachiworo azụ banyere Onyenwe anyị. Ngwangwa ọ natara ngọzi ahụ, ọ nụrụ olu Onyenwe anyị ka Ọ naasị, “Ònye ka M’gēziga, ònye gēje-kwa-ra ayi?” Ọ zara otù mgbe ahụ sị, “Lem; zigam.” Ọ ka nwekwara mmetụta na ya ekwesịghịekwesị, ma ọ bụrụ na ọlụ dị agaalụ ọ gaalụ ya.

Ọ gaghịadị mfé. Ndị ahụ agaghị ege Aisaia ntị. Ọtụtụ mgbe ọ gaechè na mkwusa ya bụ n’efu. Ma Chineke agwawo ya ka o jee, o wee rubeisi. N’ihi ọchịchọ mmehie nke ndị ahụ nwere, ha agaghịenwe ike ịhụ ịmamma ọ bụla nke Oziọma. Ha agaghị enweike ịnụ ozi ọñụ nke nzọpụta. Ha gaeme ka obi ha sieike ka Mmụọ Chineke wee ghara ịbata. Ma otú ọ dị Aisaia aghaghị ikwusa.

Rùe Olemgbe?

Aisaia matara na ọ gaabụ ibuarọ, o wee jụọ sị, “Rùe ole mgbe?” Rùe olemgbe ka Israel gaanọgide ịhụahụhụ n’ihi mmehie ya? Rùe olemgbe ka ha gaanọgide ịjụ ozi nke Chineke? Ndị Juu ahụjuwo anya ọtụtụ narị arọ site na mgbe ahụ, ma ha ka nọ náajụ sị, “Rùe ole mgbe?” Rùe olemgbe ka ọ gaabụ tutu ha amata Mesaia ha O wee bịa iwetara ha nnapụta?

Achụsara ndị Juu site n’ala Palestain mgbe ha kpọgbusịrị Jisọs n’obe. Mmiriòzùzò wee kwụsị izo n’ala ha, n’ihi nke a iheoriri wee dị ụkọ. Ụlọ niile wee ghọọ mkpọmkpọ ebe dịka Aisaia kwuru na ọ gaadị.

“Ọ buru na otù uzọ n’uzọ iri afọdu nime ya, aghagh irechapu kwa ya ọzọ (ma otù uzọ n’uzọ iri gāfọdu nime ya, ọ gālaghachi kwa)” Aisaia sịrị na ụfọdụ gaalaghachịta. Jisọs sịrị: “Ndi mba ọzọ gāzọda Jerusalem n’ala, rue mgbe oge nke mba ọzọ gēmezu” (Luk 21:24).

Ọ fọdụrụ ntakịrị ka emezue oge nke ndị mbaọzọ. Mmiriòzùzò amalitewo kwa izo na Palestain, ndi Juu naalata kwa site n’akụkụ niile nke ụwa ịbịa biri n’Ala Nsọ ahụ. Anaemezu Okwu Chineke.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kpọọ aha ụfọdụ eziihe Aisaia bụrụ amụma banyere ha.
  2. Gịnị bụ njikere nke obi dị mkpà ná ndụ Aisaia tupu ya amalite ọlụ a dị mkpà?
  3. Òlee ebe Aisaia nọ mgbe ọ hụrụ ọhụ ahụ?
  4. Gịnị ka Aisaia hụrụ?
  5. Òlee otú o dị metụta ya mgbe ọ hụrụ ebube niile ahụ?
  6. Gịnị ka seraph ahụ mere Aisaia? Gịnị kwa ka o kwuru?
  7. Gịnị bụ aha ọzọ anaakpọ odudonsọ?
  8. Òlee otú anyị si mata na anyị pụrụ ịdịnsọ na ndụ a?
  9. Òlee otú anyị si mata na Jisọs nọ nime Ụlọukwu n’oge a tupu amụọ Ya na Bethlehem?