Aisaia 24:1-23; 26:19-21; 34:1-8.

Lesson 351 - Junior

Memory Verse
“Ebe-nzuzom na ọtam ka I bu: okwu-Gi ka m’chereworo” (Abù Ọma 119:114).
Notes

Okwu Chineke

Aisaia bụ onyeamụma. Ọ gwara Ụmụ Israel Okwu niile nke Onyenwe anyị, edekwara okwu ya nime Baịbụl n’ihi ọdịmma nke mmadụ niile. Chineke kpalịrị Aisaia ka o bue amụma banyere ihe ụfọdụ gaeme, ụfọdụ amụma Aisaia emezuwo kwarị. Aisaia buru amụma banyere ọmụmụ nke Onyenzọpụta. Ọ sịrị: “N’ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi” (Aisaia 9:6). Nke a mezuru mgbe amụrụ Jisọs. Aisaia kwukwara sị: “Ya onwe-ya bu onye amapúworo site ná njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n’ajọ omume nile nke ayi: ahuhu-nmehie nke udo-ayi di n’aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike” (Aisaia 53:5). Okwu niile a naatụ aka ná mkpọgide n’obi nke Jisọs nke mezuru ọtụtụ arọ garaaga mgbe ebusịrị amụma a.

Nke Agaemezu

Ụfọdụ amụma Aisaia ka anaemezubeghị. Aisaia na ndị amụma ndịọzọ buru amụma banyere Óké Mkpagbu. O mezubeghị ma ọ pụrụ ịbịakwasị ụwa na ndị nọ n’ụwa mgbe náadịghị anya.

Mkpagbu bụ ọnọdụ maọbụ oge ahụhụ na mmekpaarụ. Óké Mkpagbu ahụ gaadị ọjọọ nke ukwu na ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịdịndụ ọ bụrụ na emeghị ụbọchị niile ahụ ka ha dị mkpụmkpụ (Matiu 24:22). Aisaia sịrị na “madu ole-na-ole we fọdu.” Mkpagbu ahụ gaadị ukwu karịa oge ahụhụ ọ bụla ọzọ, “nke ihe dika ya akādigh site na nmalite uwa … ọ gagh-adi kwa ma-ọli” (Matiu 24:21). Óké Mkpagbu gaemetụta ndị niile nọ n’ụwa. Agaghị egosi ebere ọ bụla. Mmadụ niile gaahụ ahụhụ -- ndịọlụ na ndị weere ha n’ọlụ, ndị ahụ na ndị òzízí ụgha ha, ndị náereere na ndị náazụazụ, ndị ọgaranya na ndị ogbenye.

Ala Ịmajijiji

Òlee otú Óké Mkpagbu gaesi metụta ụwa na ndị bi nime ya? Ala n’onweya gaatọgbọrọ n’efu, ewee “lusasịa ya n’agha.” Ụwa gaanọ n’ọnọdụ ịlan’íyì, nlefuruanya, na mbibi. Óké alaọmajijiji gaadị. Aisaia sịrị: “Ntọala nile nke uwa ewe me nkpatu … ewezugasiwo uwa n’ọnọdu-ya. Uwa gāñaghari nke-uku dika onye ñubigaworo manya ókè, ọ gādaghari dika ulo-ọnọdụ-abali.”

“JEHOVA … nēkpùta kwa ya iru.” Ugwu na agweetiti niile ka agaewepụ “n’ọnọdu ha” (Nkpughe 6:14) agaghị ahụ kwa ha ọzọ (Nkpughe 16:20). Kpakpando niile gaadaru ala; ọnwa gaadizu “ka ọbara;” anyanwụ ga-aghọ oji dika ákwà-nkpe nēji nji nke eji aji anu kpa” (Nkpughe 6:12, 13). Aisaia sịrị: “Uwa eruwo újú kpọnwua, elu-uwa dum madu bi atalatawo kpọnwu kwa.”

Arapụrụ

Agaarapụ ndị ahụ na ala náenweghị nkasịobi. Ha gaada mbà ike agaghịadị kwa ha. Agaeme ka ndị mpako dị ala. “Emechiwo ulo nile ọ bula, ka madu we ghara ibata.” Ọ dịghị ọñụ maọbụ obiụtọ apụrụ ịchọta. Ọ dịghị obiụtọ agaenweta n’abụ, ọ dịghị kwa ihe ọ bụla gaeme ka mmadụ nwee ọñụ. “Ọñu nile agbachiwo, emewo ka obiutọ nke uwa je biri n’ala ọzọ.” Ọ dịghị mgbapụ gaadịrị ndị nọ n’ụwa. Ndị náagbapụ site n’otù iheegwù gaadaba n’ọzọ. “Onye ahu nke nāgbanari olu oké egwu ahu gādaba n’olụlụ ahu; ọzọ. onye ahu nke nārigoputa n’etiti olùlù ahu, agējide ya n’igbudu ahu” (Aisaia 24:18).

Oge Óké Mkpagbu ahụ gaabụ oge óké nsogbu -- ọ bụghị otù, kama ọtụtụ. Jọn Onye Ahụrụn’anya nwere nnyobàanya ntà nke Óké Mkpagbu a nke Aisaia dere ihe banyere ya. Jọn hụrụ nsogbu niile ahụ, ka otù naeso ibe ya, dịka ndị ịnyịnya naagba n’elu ụwa. Agha, ụnwụ, ọnwụ, ọrịa náeféefè, óké ihe ndakwasị gaañagharị n’ụwa, dịka edere ya ná Nkpughe isi isii (6). Otú a ka agaesi nye ndị ajọọmume ahụhụ. “Ewe chikọta ha, dika esi achikọta ndịnkpọrọ n’olùlù, agēmechibido kwa ha n’ulọnkpọrọ” (Aisaia 24:22).

Ahụhụ

Gịnị mere mkpagbu niile a ji bịakwasị ụwa? Aisaia kwuru ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Emeruwo kwa uwa n’okpuru ndi bi ya; n’ihi na ha agabigawo iwu nile, gbanwe ukpuru, mebie ọgbugba-ndu ebigh-ebi. N’ihi nka ka ọgbugba-iyi ripiaworo uwa, ewe ma ndi bi nime ya ikpe.” Agwara Ụmụ Israel na ha gaanata ngọzi ọ bụrụ na ha erubere Chineke isi. Ọ bụrụ na ha enupụrụ Chineke na Okwu-Ya isi, ọbụbụọnụ gaabịakwasị ha. Moses sịrị, “Tukwasi obi-unu n’okwu nile … n’ihi na nka bu ndu-unu” (Deuteronomi 32:46, 47).

Site n’okwu niile nke ndị amụma, anaagwa anyị onweanyị taa ihe gaabịakwasị anyị ọ bụrụ na anyị enupụrụ Chineke isi, ọ bụrụ na anyị agbanwee iwu Ya, ọ bụrụ na anyị emebie ọgbụgbandụ Ya. Taa, ọtụtụ mmadụ naekwulu Chineke na iwu Ya niile; ha naefè ego òfùfè; ha naebi ndụ ọjọọ ná mkwuwaokwu. Ma n’ụbọchị iwe Chineke, ha gaetufu arụsị ha niile nke ọlaọcha na ọlaedo nye anụ mole na ụsụ (Aisaia 2:20); ha gaagbalị izo n’ọgba na nime nkume; ha gaetiku nkume na ugwu ka ha dakwasị ha izopụ ha site n’ikpé nke Chineke (Nkpughe 6:15, 16).

Ọ dịghị mgbapụ gaadị mgbe agaawụsa mba niile iwe nke Onyenwe anyị (Aisaia 34:2). Ọtụtụ gaanwụ, “n’ihi na ubọchi ibọ-ọbọ di JEHOVA nwere” (Aisaia 34:8). Jehova gaata ndị bi n’ụwa ahụhụ n’ihi ajọomume na mmebiiwu ha nile (Aisaia 26:21).

Ebe Nzuzo

Ọ bụ na ọ dịghị ebe nzuzo site n’óké iheọjọọ niile a nke Aisaia kwuru na ọ gaabịakwasị ụwa? Aisaia dere okwu nke Jehova: “Bia, ndim, bata n’ime-ulo-gi nile, mechibido uzọ-gi nile n’azu-gi: zobe onwe-gi nání otù ntabi-anya ntà, rue mgbe oké iwe gāgabiga” (Aisaia 26:20). Ee, ebe mgbaba dị nye ndị nke Chineke. Tupu Óké Mkpagbu ahụ, Kriast gaabịa iwepụ ndị Ya n’ụwa a ka ha nọnyere Ya. “N’ihi na Onye-nwe-ayi onwe-ya gēwere oké ikpọ-òkù, were olu isi-mọ-ozi, were kwa opi nke Chineke, si n’elu-igwe ridata: ndi nwuru nime Kraist gēbu kwa uzọ si n’ọnwu bilie: mgbe ahu ayi onwe-ayi, bú ndi nọ ná ndu, ndi anārapu, ayi na ha ka agēwelikọ n’igwe-oji, izute Onye-nwe-ayi nime mbara-elu-igwe: otú a ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mgbe nile” (I Ndi Tesalọnaika 4:16, 17)

Ejikereworo

Ebe nzuzo a nime Kraist dịrị náánị ndị Ya. Anyị kwesịrị ileruanya ịhụ na anyị bụ nke Jisọs na anyị jikerekwara izute Ya. Baịbụl naakụzi na anyị aghaghị ijéijè nime ìhè niile Chineke nyeworo anyị ka anyị wee bụrụ ndịmmeri zuruòkè, ejikereworo izute Jisọs. Anyị onweanyị ndị enyeworo ìhè ahụ amụtawo site na Baịbụl na aghaghị ịgbaghara mmehie anyị, anyị ewee bie ndụ edoro nsọ, ewee mejụọ kwa anyị na Mmụọ Nsọ, ka anyị wee bụrụ ndị jikeere maka ọbịbịa nke Jisọs.

Apụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie ya mgbe onye ahụ kpereekpere rịọ kwa Chineke maka mgbaghara. (Gụọ Ilu 28:13 na I Jọn 1:9). Mgbe azọpụtasịrị mmadụ, o kwesịrị ka edoo ya nsọ. Site n’ekpere na iji ndụ ya chụọ àjà nye Chineke, mmadụ ahụ gaanata odudonsọ, otù nwapụta nke náewepụ mkpọrọgwụ nke mmehie nye kwa onye ahụ ike ibindụ dị nsọ. “N’ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ” (I Ndi Tesalọnaika 4:3). Na mmadụ gaebi ndụ dị nsọ abụghị náánị uche Chineke kama ọ bụ ihe anaachọ n’aka anyị, n’ihi na Baịbụl naasị, “Nāgbasonu udo n’ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agagh-ahu Onye-nwe-ayi anya ma ọ nwegh ya” (Ndi Hibru 12:14).

Ọ dị mnwapụta ọzọ nke anyị kwesịrị inwe ka anyị wee jègharịa n’ìhè ahụ enyeworo anyị, jikere kwa maka ọbịbịa Jisọs. Nke ahụ bụ ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ nke Jisọs kwere ndị náesoụzọ Ya ná mkwà (Ọlu Ndi-ozi 1:5), na nke ekwewo kwara ná mkwà nye “ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke-ayi gākpọtara Onwe-ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39). Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ naenye mmadụ ike ijéozi na ike ịgbaàmà banyere Onyenwe anyị. Ị nwewo onyinyeamara ndịa? Ì jikerewo maka ọbịbịa Jisọs? Ọ bụrụ na opi nke Chineke daa ugbu a ị gaezute Ya na mbaraigwe?.

Aisaia kwuruokwu ọ bụghị náánị banyere Óké Mkpagbu kama o kwukwara banyere ebe mgbaba nye ndị náesoụzọ Onyenwe anyị. Onye dere Abù Ọma kwukwara banyere ebe mgbaba. Ọ sịrị, “Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu” (Abù Ọma 46:11). Devid sịrị: “Otù ihe ka m’riọworo n’aka JEHOVA, nke ahu ka m’nāchọ; ọ bu ka m’biri n’ulo JEHOVA ubọchi nile nke ndum, ihu idi-utọ JEHOVA, na ijuta ihe n’ulo Ya. N’ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n’ulo-ntu-Ya n’ubọchi ihe ọjọ: O gēzobem n’ebe-nzuzo nke ulo-ikwu-Ya” (Abù Ọma 27:4, 5).

Ọ dịghị mkpà ka egwù merie anyị, Anyị pụrụ ịbụ ndịmmeri site n’okwukwe. Ka ihe niile Aisaia kwuru ghara ime ka ụjọ jide anyị, kama ka anyị jikere, náalụọlụ, náechenche, náechéré kwa ọbịbịa nke Onyenwe anyị, wee si otú a gbanarị Óké Mkpagbu nke náabịa ịdakwasị ụwa.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ọlụ nke onyeamụma?
  2. Òlee amụma Aisaia ndị mezuworo?
  3. Gịnị bụ mkpagbu?
  4. Gịnị mere Óké Mkpagbu ahụ ji náabịa?
  5. Òlee ebe ọ gaemezu?
  6. Òlee otú ọ gaesi metụta ụmụmmadụ?
  7. Gịnị gaeme anyanwụ, ọnwa na kpakpando?
  8. Òlee otú ndị eziomume gaesi gbanarị Mkpagbu ahụ?
  9. Gịnị ka mmadụ náaghaghị ime ka o wee jikere maka ọbịbịa nke Onyenwe anyị?
  10. Òlee otú anyị si mata na Mkpagbu gaadị?