Aisaia 40:1-31; 52:7-10; Matiu 3:1-3; 11:2-15.

Lesson 352 - Junior

Memory Verse
“Chègharianu; n’ihi na ala-eze elu-igwe di nso” (Matiu 3:2).
Notes

Obodo Jọn

N’ala tọgbọrọ n’efu, obodo Judia nke jupụtara n’ugwu na nkume n’akụkụ ọdịdaanyanwụ nke Mmiri Ọnwụ, ka amụrụ Jọn Onyeọwụmmiri nye nnenanna dị ala. Eleghịanya site n’ụlọ ha ọ pụrụ ịhụ Ugwu Nebo na Osimiri Jọdan, agabiga ha ọ hụ obodo Jeriko. N’akụkụ ebe ahụ ka mmiriiyi Kerit dị ebe ugoloọma zụrụ Elaija n’oge ụnwụ. O nwereike bụrụ na Jọn ejeruwo ụfọdụ ebe ndịa ndị amụma nke Chineke meworo ka ha dị nsọ. Otù ụdị ike, mkwuwaokwu na ịnụọkụn’obi nke Elaija gosipụtara ka ahụtara n’obi Jọn. Omume nke ndụ ya na otú o si eyi uwe kwa, yiri nke Elaija. Nri ya bụ igurube na mmanụañụ (Matiu 3:4), nke eleghịanya, anyanwụ meworo ka ọ kpọọnkụ o wee náatọ kwa ka oporo.

Ozi Ya

Jọn bụ otù onye nwere ohere ịkpọsa ọbịbịa Jisọs. Dịka ihe náebu okwu nke náadasị ụda ike, olu ya aghaghị ịnaada n’ugwu ahụ niile; ndị niile bi na Jerusalem, Judia, na ndị niile bi n’akụkụ ótú nke Osimiri Jọdan wee nupụta n’obodo ịnụ mkwusa nke Jọn. Ndịeze nke ọwụwaanyanwụ naezipụ ndịọgbaọsọ iwepụ ihemgbochi ọ bụla dị n’ụzọ wee dozie ụzọ n’iru ha. Ya mere ọlụ Jọn bụ idozi ụzọ maka ọbịbịa nke Jisọs n’ụwa. “Menu ka uzọ atuliri atuli guzoziere Chineke-ayi n’ala ihe nādigh. Agēme ndagwurugwu ọ bula ka ọ di elu, agēme kwa ka ugwu ọ bula na ugwu ntà ọ bula di ala: ebe di nkputankpu gāghọ kwa ebe guzoziri eguzozi, nkume nile di elu gāghọ kwa ebe di lari” (Aisaia 40:3, 4). Ọlụ ya abụghị ịwapụta okporoụzọ dị obosara maọbụ ime ka ugwu di larị, kama ọ náakpọghachị ha ka ha rubeisi, náakuziri ha ịwepụ mpako na iruabụọ site ná ndụ ha na ịchègharị pụọ ná mmehie niile ha.

Okwu asaa bụ ihe mejupụtara okwu-Chukwu nke mere ka ụmụmmadụ nwee mwute nime obi ya wee kwupụta mmehie niile ha, Jọn wee wụọ ha mmiri na Jọdan. Gịnị bụ ozi ahụ dị mkpà nke Jọn kwusara? “Chègharianu; n’ihi na ala-eze elu-igwe di nso” (Matiu 3:2).

Ihe Apụrụ Iji Anya Hụ

Gịnị ka “ala-eze eluigwe” pụtara? Ọtụtụ ihe ka ekwuru nime Baịbụl banyere nke a, ọ dị kwa mkpà ka anyị ghọta ya. Jisọs ji iheàtụ ndịa ịgbalị ịkọwa ya: (1) mkpụrụ mustard; (2) ihe náeko achịcha ezobere na mgbé ụtụ ọka atọ; (3) onyeahịa; (4) ụgbọ awụnyere nime óké osimiri; (5) mkpụrụ ọma; (6) àkù ezoworo n’ubi (Matiu 13:31-47); (7) nna-nwe-ulo (Matiu 20:1); (8) eze nke siri oriri ọlụlụ nwunye nye nwa ya nwoke (Matiu 22:2); (9) ụmụagbọghọ iri jere izute onye náalụ nwunye ọhụụ (Matiu 25:1). Daniel kọwara ya dịka óké nkume (Daniel 2:31-45); ndịọzọ dekwara ihe na Testament Ochie kwuruokwu banyere ya.

Nke a pụrụ ịgbagwoju ụfọdụ ụmụntà ndịkom na ndịnyom anya, ma anyị chọrọ imeghe anya anyị, ntị anyị, na ọnụụzọ nke obi anyị wee mụta ihe ọ pụtara. Anyị achọghị ịdị ka ndịkom ahụ kpuru ìsì, n’akụkọiro ahụ, ndị gbalịrị ịchọpụta ihe ényí yiri. Otù metụrụ mpi ya aka wee sị na ya purụ ịghọta ugbu a na ényí yiri ube; ọzọ metụrụ ụkwụ ya wee sị na ọ ghaghị ịdị ka osisi; ma onye nke ọzọ mtụrụ obosara arụ ya wee sị na ényí aghaghị ịdị ka mgbidi. Ma anyị ekpughị ìsì; ọhụhụụzọ anyị adịghị kwa warara na anyị pụrụ ịgụ náánị akụkụ ụfọdụ nke Baịbụl -- anyị nwere Okwu niile nke Chineke anyị pụkwara ịchọta nime ya ọzịzá nye ajụjụ a: Gịnị ka Alaeze Eluigwe pụtara?

Ọtụtụ mgbe Jisọs naeji “ihe apụrụ ịhụ anya” ikụziri ụmụmmadụ ihe okwu Ya pụtara. O kwuru banyere mkpụrụ mustard nke Ọ sịrị na ọ dị ntà karịa mkpụrụ nile, ma ọ naebukarị ihe niile anaakụ n’ubi wee ghọọ osisi, anụufe nke Eluigwe bịa kwa náanọ n’alaka ya. Jisọs sịrị na nke a dị ka Alaeze Eluigwe.

Ndịijé jeruworo Obodo Nsọ gwara anyị na ụdị mkpụrụ mustard a, nke Jisọs kwuruokwu banyere ya ka nọ kwa n’ala Palestain, ụfọdụ naebu kwa ibu nke ukwu. O sighị ike ịghọta na mgbe agaewepụ “ọbubu-ọnu” ahụ n’ụwa na mgbe ihe niile akụrụ n’ubi na osisi gaenwe ohere itó otú ha chọrọ maa kwa mma, na ọbụná osisi mustard gaeto kwa ogologo nke ukwuu.

Eze ahụ na Alaeze ahụ

Alaeze bụ obodo nke nwere eze, obíeze, ocheeze, èzínaụlọ eze, ndịọlụ, na ụmụmmadụ maọbụ ndị náerubeisi n’okpuru eze. Mgbe Kraist bụ Eze gaabịaghachị ịchị n’ụwa, isi Alaeze Ya gaadị na Jerusalem “agēkpughe kwa ebube JEHOVA, anu-aru nile, bú madu, gāhukọ kwa ya n’otù: n’ihi na ọnu JEHOVA ekwuwo” (Aisaia 40:5). Ndịnsọ gaeso Kraist bịaghachị gaeso kwa Ya chịa (Nkpughe 2:26, 27; 5:10), dịka anyị mụworo n’iheọmụmụ 342. Ọchịchị eziomume a nke Kraist gaabụ Eze ya gaekpuchi ụwa niile. Nke ahụ ọ dịghị ka osisi náeto naeto rue mgbe ọ nọchiri ụwa niile? maọbụ dịka nkume ahụ, nke Daniel kwuru banyere ya, na o jupụtara ụwa niile?

Utó Ya

Ọgbọ nke Oziọma, nke ụbọchị niile a anyị naebi nime ya ugbu a dị nime ya, bụ akụkụ mbụ nke Alaeze Ya. Na mbụ, olu otù onye mkwusa, nke náeyikwsị akpụkpọanụ (Matiu 3:4), ka anụrụ n’ọzara. EMESỊA JISỌS WEE BỊA! Ọtụtụ mmadụ ka anapụtara site ná mmehie, ewee rọpụta Ndịozi iri na abụọ ikwusa Oziọma. Ha wee pụọ, ozi ahụ wee malite ịgbasa ngwangwa site n’okwu ọnụ. Site na mgbe ahụ rue ugbu a anaahụ mgbe niile ndị náejeozi, ndịọlụ, na ndị náeburu Oziọma jee n’obodo ọzọ, bụ ndị kwesịrị ntụkwasịobi ndị gwaworo mkpụrụobi nọ n’ọchịchịrị oziọma nke nzọpụta pụọ na mmehie. “Aghagh kwa ibu uzọ kwusa ozi ọma nkem n’iru mba nile” (Mak 13:10), tupu Jisọs abịa, nke a ka anaemezu kwa n’ụbọchị ikpeazụ ndịa. OnyeKraist ọ bụla amụrụ ọhụụ n’ezie naenwe ọchịchọ ịgwa ndịọzọ banyere Jisọs; n’ụbọchị ndịa kwa, eji ihe ọhụụ dị icheiche eji ekwuokwu, Oziọma náagbasa n’iken’ike.

Ụgbọala, ụgbọmmiri n’elu mmiri, na ụgbọelu n’iru igweoji ka eji náenyeaka iburu oziọma nke nzọpụta. Ọ bụ ezie na ọ dịwo anya olu Jọn adịghịada kwa n’ugwu Judia, ma anaanụ kwa olu nke ezi ndịmkwusa nke eziomume. Nzukọ Apostolic Faith nwere òkè n’ịgbasa Oziọma site na nzukọ anaenwe n’akụkụ ụzọ nime obodo anyị. Ụlọmkpọrọ, ụlọọgwụ, na ụlọ ebe ndị arụ ha náezughịòkè na ndị agadi; ndị ewezugara iche n’agweetiti ka anaeji ụgbọmmiri ebugara Oziọma; anaejekwuru ndịkom náanya ụgbọmmiri ma ha bịarue n’ótú wee kpọta ha n’ụlọ nzukọ; anaakpọta ụmụntakịrị n’Ụlọakwụkwọ Ụbọchịụkọ ebe anaakuzi Okwu Chineke. Akwụkwọ Oziọma ka eziga ya n’akụkụ niile nke obodo anyị. Ọtụtụ puku mmadụ náanata akwụkwọ niile ahụ náenweta nnapụta site ná mmehie na ọgwụgwọ nye ndị arụ náadịghịike. Ọtụtụ ụzọ ọzọ dị icheiche ka anaetinyesiike n’ọlụ ka ewee mezue iwu nke Jisọs nyere: “Ganu n’uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè ozi ọma nkem” (Mak 16:15).

Oziọma

“Le, ka ha si ma nma nke-uku n’elu ugwu, bú ukwu nke onye nēzisa ozi ọma, bú onye nēme ka anuru okwu udo, onye nēzisa ozi ọma nke ezi ihe, onye nēme ka anuru okwu nzọputa” (Aisaia 52:7). Ndị náezisa Oziọma náebu ozi maramma, n’ihi na “ozi ọma” pụtara “akụkọ dị mma.” Ị naebu akụkọ dị mma? Ma ọbụghị otú a, gịnị mere ị maliteghị taa náagha mkpụrụ nke obiọma, ịhụn’anya, na nzọpụta, wee hụ otú mkpụrụ ntà ahụ gaesi topụta ngwangwa. Ị nwereike inyere “osisi mustard” ahụ aka itó rue mgbe Jisọs gaabịa iwepụ ndị jikere izute Ya. “Agēkwusa kwa ozi ọma nka nke ala-eze elu-igwe n’elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mgbe ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa” (Matiu 24:14). Anyị kweere na ọgwụgwụ ihe niile dị ezi nso!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye ka anụrụ olu ya n’ọzara Judia?
  2. Gịnị mere eji zite ya? Gịnị bụ kwa ozi ya?
  3. Gịnị bụ nri ya? Gịnị ka ọ naenyi dịka uwe?
  4. Òlee onye nọ na Testament Ochie o yiri?
  5. Kwuo ihe atọ Jisọs ji kọwaa Alaeze Eluigwe?
  6. Òlee ndị agaagwa Oziọma?
  7. Òlee otú anyị nwereike si nyeaka ịgbasa Oziọma? Ị naeme Bya?
  8. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere Jọn Onyeọwụmmiri?
  9. Òlee otú anyị si mata na ọgwụgwụ ihe niile dị ezi nso?