Ndi Rom 8:1-39

Lesson 353 - Senior

Memory Verse
“Ya mere ebe aguru ayi na ndi ezi omume site n’okwukwe, ayi na Chineke di n’udo site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; Onye ayi sitewokwa-ra n’aka-Ya nwe nkpọbata-ayi n’okwukwe-ayi nime amara nka ayi nēguzo nime ya; ayi nānya kwa isi, nādabere n’olile-anya nke otuto Chineke” (Ndi Rom 5:1, 2).
Cross References

I Ihe dị Iche nke Ịgụ mmadụ n’Onye Eziomume Naalụpụta.

1 Ọ dịghị amamikpe ọ bụla dị ná ndụ nke ndị nọ nime Kraist Jisọs; Ndi Rom 8:1; Jọn 3:18; I Jọn 3:20-24.

2 Kraist Jisọs emewo ka OnyeKraist ahụ amụrụ ọhụụ nwere onweya n’ebe iwu nke mmehie na ọnwụ dị, Ndi Rom 8:32; Ndi Galatia 5:1.

3 Obi ahụ nke nọ náanụarụ, ebe ya na Chineke dị n’iro, enweghị ike n’ebe ọnọdụ nke mgbapụta dị, Ndi Rom 8:5-8; Ndi Efesọs 4:17; Taitọs 1:15, 16.

4 Mmụọ nke Chineke na Jisọs Kraist nke náebi nime mkpụrụobi mmadụ naeweta ndụ ọhụụ, Ndi Rom 8:9-13; 2 Ndi Kọrint 5:17; Ndi Galatia 2:20; Ndi Efesọs 3:17-19.

II Ndụ Nke Imemmụọ

1 Ndị ahụ nke Mmụọ Chineke naedu bụ ụmụ ndịkom nke Chineke, Mmụọ Nsọ onweya naagbá kwa àmà, Ndi Rom 8:14-17; Jọn 1:12; Ndi Galatia 4:4-7; I Jọn 5:6, 10.

2 Inwe ezi okwukwe nime Jisọs Kraist ya na irubeisi n’iwu Ya niile naeweta olileanya nke ndụ ebighịebi n’obi nke onye kwereekwe, Ndi Rom 8:18-25; 5:21; Jọn 11:25, 26; I Jọn 5:11, 12.

3 Mmụọ Nsọ nke Chineke naarịọrọ ndịnsọ arịrịọ dịka uche Chineke si dị, Ndi Rom 8:26, 27.

4 “Ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n’anya ezi ihe,” Ndi Rom 8:28-30; 2 Ndi Kọrint 4:17; Ndi Hibru 12:11; I Pita 4:12, 13.

5 “Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi”, Ndi Rom 8:31-34; Ndi Hibru 13:6; I Pita 3:13; I Jọn 4:4.

III Ndị Kraist Nke Náemeriemeri

1 N’ihe niile nke ndụ a ezi OnyeKrait bụ onye náemeribiga ókè, Ndi Rom 8:35-37; Luk 10:9; I Jọn 5:4.

2 Ma ihe nke dị ugbu a maọbụ ihe nke gaje ịdị apụghị ikewepụ anyị n’ihụn’anya nke Chineke, Ndi Rom 8:38, 39; 2 Timọti 1:12; Jud 24.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Site N’okwukwe

Mgbe Jisọs gwara Nikọdimọs, “N’ezie, n’ezie, asim i, ọ buru na amugh madu ọzọ, ọ pugh ihu ala-eze Chineke anya,” onyeisi nke Ndị Juu ahụ zaghachiri sị, “Ihe ndia si aña pu ime?” (Jọn 3:3, 9). Ọ bụ ihe anapụghị ime bụ mmadụ nke nọ n’anụarụ ịghọta ọlụ niile nke Mmụọ Nsọ Chineke naalụ. Akwụkwọnsọ náagwa anyị sị; “madu nke nkpuru-obi onwe-ya nāchi adigh-anata ihe nke Mọ nke Chineke: n’ihi na ha bu ihe-nzuzu n’anya-ya; ọ pugh kwa imara ha, n’ihi na ewere Mọ Nsọ sikwuputa ha” (I Ndi Kọrint 2:14).

Otú ọ dị, ezi Onye nke Kraist achọpụtawo na ọ dịghị mkpà ka mmadụ matazue ụzọ niile nke Chineke si emeihe tutu ọ nata onyinye niile nke Chineke kwadoro nye mmadụ niile. N’ịzáajụjụ nke onyenché ụlọmkpọrọ nke Filipai jụrụ, “Ndi-nwe-ayi, gini di nkpà ka m’me ka ewe zọputam?” Ndịkom nke Chineke ahụ zara sị “Kwere n’Onye-nwe-ayi Jisus, agāzọpụta kwa gi, gi onwe-gi na èzí-na-ulo gi” (Ọlu Ndi-ozi 16:30, 31).

Inwe ezi okwukwe n’ebe Jisọs Kraist nọ naanapụta mmadụ site naamamikpé na mmehie, náeme kwa ka onye ahụ bụrụ onye agụrụ n’onye eziomume n’iru Chineke; ma Onyeozi ahụ, naakọwa n’isi asatọ nke Akwụkwọozi nke edegara ndị Rom, na ọ bụrụ na mmadụ gaabụ onye gaanọ náenweghị kwa amamikpé, ọ gaabụ onye náagaghị ejeijè n’agụụ nke anụarụ maọbụ n’ọchịchọ dị icheiche nke ụwa, ma ọ ghaghị ijeijè n’odúdú nke Mmụọ Nsọ na Okwu nke Chineke. Àtụmààtụ nke Chineke banyere mgbapụta dabeerè n’ọnwụ nke iji Ọkpara Ya chụọ àjà, bụ nke mara mmehie ikpé n’anụarụ ma meghee kwa isiíyì nke eziomume nke Jisọs Kraist, emezukwara nke a n’ebe ndị náadịghị ejeijè dịka anụarụ si chọọ dị, kama dịka Mmụọ Nsọ si chọọ

Ịdị N’iro nke Ịtụkwasịuche Náanụarụ

Ụzọ ihe abụọ pụtaraìhè nke dị iche site n’ibe ya ka akọwara n’amaokwu ndịa niile nke dị ná Ndi Rom 8:8 -- eziokwu ahụ nke dị n’ịtụkwasịuche na Mmụọ Nsọ nke bụ iheọmụmụ ọhụụ na ịgụmmadụ n’onyeeziomume site n’okwukwe naalụpụta, na ịtụkwasịuche n’anụarụ nke bụ ihe ịnọ n’anụarụ naalụpụta. Ịtụkwasịuche n’anụarụ ya na Chineke dị n’iro. “N’ihi na edoghi ya n’okpuru iwu Chineke, n’ihi na apugh kwa ido ya n’okpuru ya.” Ịdịndụ n’anụarụ bụ ọnwụ nye mkpụrụobi. Mmadụ ahụ nke náadị ndụ dịka anụarụ si chọọ -- nke ahụ bụ mmadụ nke náalụọlụ ajọomume -- ọ naebindụ n’ọchịchọ niile nke anụarụ, ọ pụghị kwa ime ihe gaatọ Chineke ụtọ; n’ihi na mmehie bụ nnnọ mkpọrọgwụ nke nnupisi, n’ihi nke a ọ pụghị ịnọ n’okpuru Chineke.

Mgbe agụrụ mmadụ n’onye eziomume site n’okwukwe, ọ naakwụsị ime mmehie, n’ihi na Chineke naenye ya ike ibindụ karịa ihe ndị ahụ niile. Atụmààtụ nke Chineke abụghị ka anaenye ihe ngọpụ dị icheiche -- izobe, ikpuchi, maọbụ ịgọpụ -- mmehie dị icheiche nime ndụ ụmụ - Ya, kama ọ bụ inye ha ike ka ha náebindụ nke náadịghị eme mmehie ọ bụla. “I gākpọ kwa aha-ya Jisus; n’ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya ná nmehie nile ha” (Matiu 1:21). Chineke adịghị akpọ onye ọ bụla nime ndịa nke ndị ụwa naakpọ “NdiKraist nke náeme mmehie” nwa Ya.

Mgbe azọpụtara mmadụ, mkpọrọgwụ ochie nke mmehie maọbụ ụdị nke mmehie nke amụrụ mmadụ nime ya naenwe ntigbu dị ukwu nke mere na ọ dịghị egosi onweya na nwa oge; ma mgbe náadịghịanya ọ gaakpali nsogbu, ma ọ bụrụ na egwupụghị ya site na mkpọrọgwụ. Akpọgidere “madụ ochie” ahụ ya na Kraist n’obe. Ma ọ gaanwa ike ya isi n’obe ahụ pụta. Nwa Chineke ahụ amụrụ ọhụụ kwesịrị ijekwuru Chineke ka ewee doo ya nsọ; nke bụ, ịrịọ ka egwupụ mkpọrọgwụ ochie nke mmehie ahụ, ụdị Adam, site ná mwụsa Ọbara nke Kraist nke ugbo abụọ n’obi ahụ. Mgbe ahụ ka nwa Chineke ahụ gaenwe obi dị ọcha. Ọ bụ n’odudonsọ ka “madụ ochie” ahụ naanwụ, nwa Chineke ahụ ewee nweeike ịdị ndụ nke onye náemeribiga òkè.

Ịtụkwasịuche N’ihe Nke Mmụọ

“Ọ buru na Kraist bi nime unu.” Kraist ibi nime unu bụ onyinyeamara nke ịgụmmadụ n’onyeeziomume site okwukwe, nke anaenweta site n’ọmụmụ ọhụụ. N’ebe ọzọ Baịbụl naekwu sị: “Ọ buru na onye ọ bụla di nime Kraist, ọ bụ onye ekerè ọhu: ihe ochie agasiwo; lee, ha aghọwo ihe ọhu” (2 Ndi Kọrint 5:17). Nke a bụ ihe mmadụ ọ bụla gaeji lee onweya ule ịmara ụdị amara nke ọ naeguzo n’elu ya. Mgbe agbapụtara mmadụ site ná mmehie ya niile, site n’ọmụmụ ọhụụ ahụ, Mmụọ nke Kraist naabata nime obi onye ahụ wee biri nime ya. Onye ahụ adịghị eche kwa uche maọbụ ime omume niile nke anụarụ nke jupụtara ná mmehie, dịka onye nwụrụanwụ náapụghị ime omume nke onye dị ndụ nke anaahụanya; kama onye nke Kraist naelezianya ma naerubekwara ihe niile nke sitere na Mmụọ nke Chineke isi. Ịtụkwasịuche na Mmụọ Nsọ bụ ndụ na udo, ndụ ọhụụ a nwere óké nnyeghachị nke ụgwọ ọlụ. “Ọ buru na Mọ nke Onye ahu Nke mere ka Jisus si ná ndi nwuru anwu bilie nēbi nime unu, Onye ahu Nke mere ka Kraist Jisus si na ndi nwuru anwu bilie gēsite kwa n’aka Mọ-Ya Nke nēbi nime unu me ka aru-unu nke puru inwu anwu di ndu” (Ndi Rom 8:11).

Onyeozi ahụ gosịrị na ọnọdụ amara a dị elu nke OnyeKraist abụghị ihe mmadụ pụrụ inweta site n’ike nke onweya. Mmụọ nke Chineke bụ onye ndụ nke ezi ndị Kraist, Jisọs n’Onweya bụ onye naedu ma náegosịkwa ụzọ. “Ka ha ra bụ ndi Mọ Chineke nēdu, ndia ahu bu umu-ndikom Chineke.” “Unu guzoro iche n’ebe Kraist nọ n’oge ahu, ndi emererị ka unu buru ndi ala ọzọ n’ebe ọnọdu ndi amuru ndi Israel di, unu bu kwa ndi-ọbìa n’ebe ọgbugba-ndu nile nke mkwà ahu di, ndi nēnwegh olile-anya, ndi nāmagh kwa Chineke n’uwa. Ma ugbua a nime Kraist Jisus unu onwe-unu, bú ndi nọ n’ebe di anya n’oge garaaga, unu ka emere ka unu nọ nso nime ọbara Kraist” (Ndi Efesọs 2:12, 13). Amụbatara ndị niile kwereekwe n’èzínaụlọ nke Chineke ha wee bụrụ kwa ndị nketa nke Chineke na ndị ha na Kraist naekekọ ihe. Mmụọ nke Chineke naeso mmụọ nke ezi nwa Chineke ọ bụla náagbàmà ịkwagide óké mgbanwe a dị ebube.

Ndị Anwapụtaworo

OnyeKraist gaabụ onye ya na Kraist naekekọ ihe, “Ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto.” N’akụkụ akwụkwọnsọ niile akọwaarà anyị na Ya otuto.” N’akụkụ Baịbụl niile akọwarà anyị eziokwu ahụ na ndị nke Chineke gaabụ ndị nke ejiri ahụhụ, mkpà na mkpagbu nwapụta. Nke a bụ kwa eziokwu n’oge Ndịozi mbụ ahụ, nke a bụ kwa ezi okwu n’ụbọchị taa, ọ gaadị kwa otú ahụ rue mgbe Jisọs gaakpọrọ Nzukọ Ya laa n’Eluigwe. Ekwuwo ya sị na Eluigwe bụ ebe edoziriedozi nye ndị edoziworo, Chineke naejikarị usoro nke ule dị icheiche na nnwapụta dị icheiche ejikere ndị nke Ya maka ụgwọọlụ na ụlọ ebighịebi ha. Ịkpọasị nke ụwa kpọrọ amara Chineke na ahụhụ nke ihe mgbu dị icheiche naeme ka agụụ nke ịla n’ụlọ ebighịebi ahụ náagụ nwa Chineke mgbe niile. “N’ihi nka ike agwugh ayi n’obi; kama asi na ọ bu ezie na madu elu aru ayi nēre uré, ma anēme ka madu ime ayi buru ihe ọhu kwa-ụbochi. N’ihi na nkpagbu ayi nke di nfé, nke di na nwa oge a, nāluputara ayi ebube nke-uku ri nne kachasi ihe nile, bú ebube nke di arọ di kwa ebigh-ebi” (2 Ndi Kọrint 4:16, 17).

“Ayi matara na ihe niile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n’anya ezi ihe bú ndi akpọrọ dika ihe Ọ nēzube si di.” Chineke maara obi nwa Ya ọ bụla. Ọ makwara ọnwụnwa nke onye ọ bụla nwere ike ịnagide. Ọ gaghị ekwe ka ihe ọ bụla bịakwasị ụmụ Ya nke Ọ náagaghị enye ha ike ịnagide ya. Ibu nke OnyeKraist mgbe ụfọdụ nwereike dịka ọ dị arọ n’obubu; mgbe ụfọdụ ọnwụnwa ahụ gaadị ka ọ dịkarịrị ike ịnagide; ọ gaadị ka igweojii na ọchịchịrị ekpuchiwo iru anyanwụ nke ukwu nke mere na ọ pụghị ịmụwa ọzọ; ma Chineke naanọgide n’ikwesịntụkwaobi, Okwu Ya apụghị kwa ịda. N’oge dị otú a ọ naadị onye nke Kraist dịka agaasị na ọ pụghị kwa ikpeekpere: ma ọ bụrụ na ọ gaechere ma kpọkue kwa Chineke n’anya mmiri, nsogbu ahụ gaebi ná mmeri. “Otú ahu Mọ Nsọ nēnye-kwa-ra adigh-ike ayi aka: n’ihi na ayi amatagh ihe ayi gēkpe n’ekpere dika ayi nāghagh ikpe: kama ọ bu Mọ Nsọ onwe-ya were isù ude anāpugh ikwu nāriọrọ ayi aririọ” (Ndi Rom 8:26).

Ọmụmaihe Chineke Buruụzọ Mara

Ndi Rom 8:29, 30 bụ amaokwu nke akwụkwọnsọ jupụtara n’irụụka, ma nime ha ka Onyeozi ahụ gosịrị n’ụzọ dị mfé otú Chineke si alụọlụ, usoro nke anaeji enwe óké nzọpụta ahụ -- site n’ọmụmụ ọhụụ rue mgbe agaaba n’otuto -- nke náesochite ibe ya. Onyeozi ahụ degaara Ndi Rom akwụkwọ -- nye Ndimbaọzọ. Ndi Juu chere na ha bụ ndị Chineke rọpụtara, na ọ dịghị kwa mba maọbụ ndịọzọ nke nwereike ịchọta iruọma n’aka Chineke maọbụ ndị Ọ kpọrọ ifè Ya òfùfè. Mmụọ Nsọ kpaliri Onyeozi ahụ ide na Chineke site n’ọmụmáihe nke O buru ụzọ mara matara na Ndi Juu gaajụ ka Jisọs bụrụ Mesaia ha, na ọkpụkpọòkù Ya gaetute Ndịmbaọzọ n’ọtụtụ dị ukwu karị otú ọ dị na mbụ, ka ha bịa fee Ya òfùfè n’Oziọma nke Jisọs Kraist. (Ihe niile nke gara aga, nke dị ugbu a, nke gajeịbịa -- Chineke ebighịebi maara ha niile; n’ihi nke a okwu ahụ nke bụ “Ọmụmá ihe Chineke buru ụzọ mara” bụ nnọọ eziokwu bụrụ kwa ihe náakọwapụta na Chineke mazuru ihe niile, nke bụ ihe dị iche na amamihe nke mmadụ nke dị mkpirimkpi.)

“Pita, onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi arọputaworo ndi bi dika ọbia n’etiti mgbasa ahu nime Pọntọs, Galetia, Kapadọsia, Esia, na Bitinia, ndị arọputaworo dika ọmụmáihe Chineke buru ụzọ mara si di” (I Pita 1:1, 2). Chineke eburuworị ụzọ mara ihe banyere Ndịmbaọzọ (bụ ndị nwere onweha ma nwee kwa ike nke nrọrọ ịzá òkù Ya maọbụ ịjụ ịzá ya) ndị zara òkù nke Chineke, wee rapụ mmehie na ụzọ ọjọọ ha niile ka azọpụtara. “Ndi akpọworo dị ọtutu, ma ndi arọputaworo di ole-na-ole” (Matiu 22:14). Aga eyikwasị ndị nke Chineke azọpụtara otuto n’oge náadịghị anya ma ọbụrụ na ha anọgide ná nzọpụta ha ma náeto kwa etó na amamihe nke Onyenwe anyị Jisọs.

Ọ bụ nguzosike nke àtụmààtụ nke nzọpụta ka Onyeozi ahụ náekwusiike banyere ya n’amaokwu ndịa, ka onye ọ bụla were oghere nke Chineke nyeworo mee ihe. Chineke arọpụtawo ụzọ nke nzọpụta na inyeaka niile dị mkpà maka ịgụ onye ọ bụla n’onye eziomume, ma mmadụ ọ bụla nwereike nke nrọrọ ime ihe ọ bụla n’onweya. Ịbà n’ebube maọbụ ịnata ahụhụ ebighịebi nke onye ọ bụla dabeere n’omume onye ahụ mere n’ịnara àtụmààtụ ahụ dị ebube nke nzọpụta Chineke.

Ịhụn’anya ahụ nke Náejikọta

Dịka Onyeozi ahụ naatule ihe ndịa, ọ dị ka iko nke ọñụ ya jubigara ókè, otuto nke dị n’obi ya enweghị kwa ọtụtụ. Site n’okwu nkọwa dị eziụtọ nke Mmụọ Nsọ kpaliri, o mechiri okwu ndụmọdụ a banyere onyinye amara nke Chineke nyere mmadụ niile n’efu. “Ònye gēkewapu ayi n’ihu-n’anya nke Kraist?” Pọl gụpụtara ọtụtụ ihe dị n’ụwa nke pụrụ ime ka ụfọdụ mmadụ daghachịazụ site n’ụzọ nke ndị Kraist, ma ọ pụrụ ịsị na n’ihe ndịa niile “ayi nēmeribiga okè site n’aka Onye ahu Nke huru ayi n’anya.” Pọl matara, n’ihi na ọ gabigawo ọtụtụ nime ihe ndịa niile ma bụrụ kwa onye mmeri. Chineke abụghị onye náele mmadụ anya n’iru. Ọ bụrụ O dubigara otù onye ná mmeri rue Eluigwe, Ọ pụkwara idubiga mmadụ niile bú ndị naabịakwute Ya.

Ejiri okwu ndịa nke anaapụghị ichefu mechie ebe ọgụgụ nke ihe ọmụmụ anyị: “N’ihi na emewo ka m’kwenye, na ọnwu, maọbụ ndụ maọbụ ndi mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi dị iche iche, ma-ọbu ihe di ugbu a, ma-ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche, ma-ọbụ ihe di elu, ma-ọbụ ihe di omimi, ma-ọbụ ihe ọ bula ọzọ ekèrè èkè, agagh apu ikewapu ayi n’ihu-n’anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.” Ọbụná onyeiro nke mkpụrụobi na iheegwù dị icheiche nke anaadịghị ahụanya nke náabịa n’ụzọ nke OnyeKraist apụghị ikewapụ OnyeKraist nke náeguzosiike n’ebe Kraist nọ, n’ihi na mmeri dịrị onye ọ bụla nke náatụkwasị Chineke obi n’òzùzùòkè. Mgbe azọpụtara mmadụ, mgbe ahụ, ọ pụtara na ọ bụrụwo onye azọpụtara rue mgbe ebighịebi? Ọ dịghị otù nime ihe ahụ niile nke Onyeozi ahụ kwuru nke pụrụ ikewapụ anyị n’ebe Kraist nọ! Onye azọpụtara gaabụ onye azọpụtara ebighịebi ma ọ bụrụ na ọ rọrọ ịnọgide n’aka Kraist -- ka oge ra ọ naarọrọ ime uche Chineke. Ma mmadụ ọ bụla n’onweya, pụrụ iwepụ onweya n’aka Kraist.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee ndị ahụ bú ndị nwere onweha site n’amamikpé nke mmehie?

  2. 2 Gịnị ka ọ pụtara bụ ijéijè “dịka Mọ Nsọ si chọ”? maọbụ ijégharị “N’anụarụ”?

  3. 3 Gịnị gaeme ndị náejégharị n’anụarụ?

  4. 4 Gịnị bụ ụgwọọlụ nke ndị náejégharị na Mmụọ Nsọ?

  5. 5 Òlee ndị bụ ụmụ ndịkom nke Chineke?

  6. 6 Òlee otú ọ gaesi dịrị onye ọ bụla mfé ịbụ otù onye nime ụmụ Chineke?

  7. 7 Ònye naenyere ndị nsọ nke Chineke aka mgbe ha naekpeekpere? N’ụzọ dị añaa?

  8. 8 Mejue okwu a; “Ọ buru na Chineke diri ayi,…”

  9. 9 Ònye maọbụ gịnị pụrụ ikewapụ Onye nke Kraist site n’ịhụn’anya nke Kraist?