Failimọn 1-25.

Lesson 354 - Senior

Memory Verse
“Nweritanu obi-ọma n’arụ ibe-unu, nwenu obi ọmiko, were-kwa-nu amara gbaghara onwe-unu, dịka Chineke were-kwa-ra amara gbaghara unu nime Kraist Jisus” (Ndi Efesọs 4:32).
Cross References

I Nlata nke Ọnisimọs

1 Nchègharị nke Ọnisimọs, orù Failimọn nke jehiereejehie bụ ihe mere Pọl jiri dee Akwụkwọozi a nye Failimọn, Failimọn 1-12.

2 Ọ bụ ọchịchọ Pọl ka ya na Ọnisimọs nọdụ, ma ọ ghọtara nkeọma na ọ bụ ihe ruuru Failimọn ka o jeere ya ozi, Failimọn 13, 14.

3 Pọl dụrụ Failimọn ọdụ na ọ bụ ezie na ekewapụrụ Ọnisimọs n’ebe ọ nọ nwaoge ntà dịka orù, ma ọ naalaghachikwute ya dịka nwanne nime Onyenwe anyị, nke o ga-abụ kwa rue ebighebi, Failimọn 15, 16; Taitọs 2: 9, 10; Ndi-Efesọs 6:5-9.

4 Agwara Failimọn ka ọ nabata Ọnisimọs dịka ọ gaesiworị nabata Pọl, Failimọn 17; Matiu 10: 40-42; 12:48-50; 25:40

5 Pọl rịọrọ Failimọn ka ọ gụa ụgwọ niile nke Ọnisimọs ji dịka ọ bụ ya ji ya, ma site na nke a náegosi onweya iheatụ nke ụkpụrụ nke Oziọma nke ọ bụ nime ya ka Kraist buuru ajọomume anyị n’OnweYa, Failimọn 18, 19; Aiasia 53: 5, 12; Ndi Rom 3: 24; 4:25; 5:1-21; II Ndi Kọrini 5: 18,19; Ndi Efesọs 3:13; Ndi Kọlọsi 1:14; I Jọn 4;10.

6 Pọl nwere ntụkwasịobi na Filimọn gaanabata Ọnisimọs nkeọma, Failimọn 19-25

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Nchègharị nke Ọnisimọs

Apụrụ iji Akwụkwọ-ozi nke Pọl degara Failimọn tụnyere akụkọ banyere nwammefu n’ihi na nime ozi ya ka agaahụ nchịkọta nke akụkọ nke Oziọma n’òzùzùòkè. Nchégharị, nzọpụta, idoziụzọ, na àjà ahụ nke Kraist chụrụ iwere Onwe-Ya dochie n’ọnọdụ mmehie niile nke ụmụmmadụ, mgbaghara nke Chineke naagbaghara -- ihe ndịa niile ka apụrụ ịhụ n’akụkọ banyere nchègharị nke orù a.

Isiokwu nke Akwụkwọozi a nke Pọl degara Failimọn bụ ihe banyere orù ahụ nke anaakpọ Ọnisimọs. Aha ya pụtara “ihe bara urù” ma o gosipụtara nnọọ onweya dịka onye náabaghị urù n’ebe nnaya ukwu bụ Failimọn nọ. O mere ọtụtụ ihe jọgburu onwe ya, n’ikpeazụ o wee gbapụ n’iru nnaya ukwu na ijéré ya ozi. Na Rom, Ọnisimọs zutere Pọl Onyeozi. Ọ bụ ihe ekwenyere, nke nwekwara ezi mkwagide na ejidere Ọnisimọs na Rom dịka orù gbapụrụagbapụ, etinyekwara ya ịbụ otù nime ndịagha nke ndị Rom, na n’ebe ahụ dịka onyeagha nke Ndi Rom ezigara ya iso na ndị náeche Pọl nche. Ma dịka nrọpụta nke Chineke si dị, Ọnisimọs sitere n’ịgbanarị nnaya ukwu nke bụ OnyeKraist wee gbaba n’ịbụ onye náeché Pọl nché.

Ọnisimọs ebe ọ dị ka agaasi na ọ bụ onye anaapụghị ịmeta n’omumeọjọọ ya n’ebe nnaya ukwu Failimọn nọ, ma nke a emeghị ka Pọl daa mba n’ihi omume ochie nke Ọnisimọs. Pọl chere échìchè banyere onweya na mgbe garaaga, banyekwara omumeya, na ọnọdụ obi ya n’ebe Kraist nọ. Ọ bụ ezie na Pọl adịghị ọjọọ dịka Ọnisimọs n’ụzọ nke ya, ma otú ọ dị Pọl mere iheọjọọ dị ukwu megide Oziọma nke mere na o kwuru ihe banyere onweya si na ya bụ onyeisi nke ndị mmehie. Pọl gakwara n’iru náekwu sị “Otú ọ dị, ọ bụ n’ihi nka ka emerem ebere ka o we buru nime mu onwem, bú onye-isi, ka Jisus Kraist gēgosi ogologo-ntachi-obi Ya niile, ka m’buru ihe ilere anya n’etiti ndi gaje ikwere na Ya ka ha nata ndu ebigh-ebi” (I Timọti 1:16).

Ntụbà nke Atụbarà Ọnisimọs ịnọ nso Pọl mere ka o chègharịa wee bụrụ ezi onye nke Kraist na mgbe náadịghị anya, wee bụrụ kwa onye amụbatara n’Alaeze nke Chineke.

Onye Ekèrè Ọhụụ Nime Kraist Jisọs

Jeremaia Onyeamụma jụrụ ajụjụ otù mgbe sị: “Onye Etiopia, ọ gāgbanwe akpụkpọ arụ ya? Ma-ọbụ agụ ọ gāgbanwe agwa-ya? Ọ buru otú a unu onwe-unu puru kwa ime ezi ihe, bú ndi emere ka unu muta ime ihe ọjọ” (Jeremaia 13:23). Nke a bụ nnọọ ọnọdụ ọjọọ nke Ọnisimọs n’ezie, ma bụrụ kwa ọnọdụ nke onye ọ bụla nke anaamụbeghi ọhụụ na onye náéchégharịbeghị. Ọnisimọs enweghị ike ịgbanwe ọchịchọ ya n’ebe ajọomume dị, ma anyị amataghị na o nwere ọbụná ọchịchọ nke ịgbanwe ha. Otú ọ dị, Chineke site n’ebere Ya duuru ya rue n’onye pụrụ ime ka akọnauche ya nke nwụrụrịanwụ wee teta, n’otù mgbe ahụ nye ya ọchịchọ nke ịbụ ihe ọzọ dị iche. Mgbe akpaliri ọchịchọ nime obi mmadụ, mgbe ahụ Chineke gaenye ike nke ịdịndụ na eziomume n’ọnọdụ ọnwụ na ahụhụ ebighịebi. Akwụkwọnsọ náasị: “Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ ụmụ Chineke, bú ndi kwere n’aha-Ya: ndi amurụ, ọ bugh site n’ọbara, ọ bugh kwa site n’ọchichọ anu-aru, ọ bugh kwa site n’ọchichọ nwoke, kama site na Chineke” (Jọn 1: 12, 13).

Omume ndị ahụ nke kọrọụkọ ná ndụ Ọnisimọs tutu o chègharịa ka ahụrụ ná ndụ ya ngwangwa azọpụtasịrị ya. Ọ bụrị onye anaapụghị ịtụkwasịobi, onye náekwesịghị ntụkwasịobi n’ijéozi ya niile, onyeori na onye gbapụrụagbapụ n’ihi ajọomume ya niile. Mgbe azọpụtasịrị ya ọ ghọrọ onye dị iche: wee bụrụ onye kwesịrị ntụkwasịobi, onye náekwu eziokwu, onyeọlụ ji eziokwu náalụziọlụ ya nkeọma n’ijéozi nke Kraist, na OnyeKraist nke bụ iheàtụ. Mgbe ahụ Pọl bụrịị onye mkpọrọ n’okpuru ọchịchị Govment nke Ndị Rom, nke a mere na o nweghị onweya. Ọnisimọs mere onweya onye baara Pọl óké urù nke mere na o siiri Pọl ike ịrapụ ya mgbe ọ chọrọ ịlaghachikwuru onye nweya na mbụ.

Idoziụzo

“Chineke nāchọ kwa ihe achụpụrụ achụpu” [ma-ọbụ] Chineke na-ajụ kwa asè ihe ahụ nke gara aga” (Eklisiastis 3:15). Mgbe náadịghịanya Ọnisimọs nwere ọchịchọ nke ịlaghachikwuru onyenwe ya Failimọn idozi ihe ọjọọ niile nke o mewororị. Chineke naagbaghara ụmụmmadụ mmehie ha niile n’efù, ma ọ dịghị achọ ka ha náebi ndụ gaa n’iru náekwupụtaghị mmehie nke ha mere n’oge garaaga na kwa idozi ụzọ n’ihe niile nke ha mebiri ma ọ bụrụ na ọ dị mfé. Ọ bụrụ na mmadụ nwere ọchịchọ nke idozi iheọjọọ niile nke o mere n’oge garaaga, nke a bụ ihe naegosi ezigbo nzọpụta. Ihe edere n’Iwu ahụ kwuru na agaemezi iheọjọọ niile emere na mgbe garaaga, ọ gaakwụghachị kwa ya na mkwuzu ya ọ bụ kwa otù ụzọn’uzọise ka ọ gaatụkwasị ya. (Lee Levitikọs 6:2-5.)

Mgbe azọpụtara Zakịọs, onyeọnaụtụ ahụ nke ná adịghị ekwu eziokwu, n’otù mgbe ahụ o wee kwee Jisọs mkwà idoziụzọ ya. Ọ sịrị: “Le, Onye-nwe-ayi, nkera ihe m’nwere ka m’gēnye ndi-ogbenye; ọ buru kwa na anaram onye ọ bula ihe site n’ebubo ugha, m’gēnyeghachi anọ anọ” (Luk 19:8).

Ebere Chineke nke sitere n’ụzọ nke Oziọma ahụ, naadọ mmadụ niile akanánti ka ha chègharịa ma bụrụ kwa ndi agbaghara mmehie niile ha site n’ọnwụ na mbiliten’ọnwụ nke Kraist. Okwu Chineke naenye ịdọakanántị sị: “Nmehie madụ ufọdu nāputa ìhè, n’ihi na ha buru ha uzọ nāga ikpé; ma nmehie madu ufọdu nēso kwa ha n’azu” (I Timọti 5: 24). Ọ bụ uche Chineke ka esite n’ike nke Ọbara Jisọs Kraist, mee ka mmehie nke mmadụ niile buru ụzọ pụtaihè tutu oge ahụ erue. Nke a pụtara, na onye ahụ gaamata ha ma kwupụtakwara ha Chineke, ka Chineke wee gbaghara ya ha niile. Ọ bụrụ na ha esoro anyị n’azụ n’oge niile nke anyị naadị ndụ, anyị aghaghị ịmata ha n’Iru Oche-ikpe nke Chineke; ma mgbe ahụ ọ dịghị mgbaghara gaadị ọzọ, maọbụ ebere nke gaegbochị ikpé eziomume nke Chineke ịdakwasị ndị mmehie ahụ ndị jụrụ Ọbara nke Kraist.

Chineke chọrọ ka anyị dozie ụzọ anyị n’ụwa nke dị ugbu a n’ihe ọjọọ niile nke anyị meworo ma ọ bụrụ na anyị naenwe olileanya nke izute Ya n’udo mgbe ndụ a gasịrị. Ịjụ maọbu ịrapụ idozi ụzọ anyị mgbe anyị nwere ike ime ya gaekewapụ ayi n’Alaeze nke Chineke wee mee ka o doo anyị anya na anyị aghaghị ịbà n’ikpé. Mgbe mmadụ ọ bụla natara nzọpụta nke Chineke nime obi ya, n’oge náadịghị anya ọ naenwe ọchịchọ na mkwagide site na Chineke idozi ụzọ ya. Ọnisimọs naegosipụta ụdị nzọpụta nke o nwere ọchịchọ nke ịlakwuru nnaya ukwu ochie iguzo n’iru ya n’ihi ndụ ochie ahụ nke o biworo na mbụ. Ọ gaghị agbapụ kwa ọzọ n’ihi mmehie ya niile, n’ihi na ha agasịwo ma bụrụ kwa ihe anaagaghị echeta kwa ọzọ megide ya.

Náagbanyeghị agụụ nke Pọl nwere ka ya na Ọnisimọs nọdụ na inyeaka dị mkpà nke ọ naenyere ya n’ọlụ nke Onyenwe anyị, o jiri ọtụtụ ekpere kwagide Ọnisimọs wee zighachiri ya Failimọn. Akwụkwọ nke o degaara Failimọn bụ nnọọ arịrịọ maramma nke ná emetu kwa n’obi ka Failimọn nabata kwa orù ya bú Ọnisimọs, onye náabaghị urù na mbụ ma ugbu a ọ bara urù nke ukwu. Ọ gbapụrụ dịka orù, ma ọ naalaghachị dịka onye náejéozi na nwanna nime Kraist. Pọl naekwu na o nwere ike ịbụ na Ọnisimọs rapụrụ Failimọn na nwaoge ka o wee nábata ya ebighịebi. Dịka ihe enyere n’Iwu n’Agba Ochie si dị, ọ bụrụ na orù ejeéozi nwaoge, anaarapụ ya ka ọ laa. Ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka ọ nọgide n’aka nna ya ukwu, onye nwe ya ga-agbapu ya ntị. Ịgbapụ ntị a maọbụ ịrapụ nti ya naeme ka mmadụ niile mara na o kpebiwo ijéré onyenwe ya ozi ụbọchị ndụ ya niile. (Gụọ Ọpụpụ 21: 1-6; Abù Ọma 40:6.) N’ezie Ọnisimọs rọrọ ịlaghachikwuru nnaukwu ochie ya ka o wee were obi ya na uche ya niile jeéré ya ozi dịka ọ na ejéré Onyenwe anyị. Ọ bụghị ijéozi dịka orù kama ọ bụ ijéozi na ịlụọlụ nke ịhụn’anya.

N’Ụgwọ M’Ji

Akwụkwọozi, nke Pọl degaara Failimọn naarịọ ka ọ nabata Ọnisimọs n’ịhụn’anya karịrị arịrịọ efù maka ebere na mgbaghara. Náahịrị okwu olenaole Pọl kwupụtara nnọọ omimi nke Oziọma Jisọs Kraist nkeọma. Failimọn chègharịrị site ná mkwusa nke Pọl ma Pọl arịọghị Failimọn ka ọ gbaghara Ọnisimọs n’ihi na ha bụ enyi. Otú Pọl si kwueokwu n’ozi ahụ dị ike bụrụ kwa ihe náechetara Failimọn ihe banyere Onye ahụ nke kwụrụ ụgwọ ya niile ka Failimọn wee gbaghara Ọnisimọs n’efù dịka Kraist gbaghawokwara ya (Matiu 18:23-35).

Okwu niile nke Pọl, “Ọ bụrụ na i gurum n’onye nnwekọ, nara ya nkeọma dịka mu onwem. Ma ọ bụrụ na o mejọrọ gi n’ụzọ ọ bula, ma-ọbụ na o ji gi ụgwọ ọ bula, gua ya n’ụgwọ m’ji gi” bụ ihe Mmụọ Nsọ kpaliri ma were kwa okwu olenaole kọwaa ihe ọ pụtara bụ àjà mkpuchi mmehie ahụ nke Jisọs Kraist chụrụ, nke zuru ikpuchi mmehie nke ụmụmmadụ. Onye mmehie ahụ nke agbaghaworo mmehie ya niile pụrụ ịlaghachị n’ụlọ Onyenwe ya náeji ozi nke ime ka adị n’otù ahụ, nke o natara n’aka Kraist. Ọ bụ na Jisọs Kraist adịghị agwa Nna Ya n’ọnọdụ onye mmehie ọ bụla maọbụ ndị niile ndị naraworo Ọbara Kraist maka ịgụ ha ná ndị eziomume sị, “Nara ya nkeọma dịka Mu Onwem.” “Ya mere ọ bụrụ na i gurum dịka onye nnwekọ, nara ya nkeọma dika mu onwem. Ma o buru na o mejọrọ gi n’ụzọ ọ bụla, ma-ọbu na o ji gi ugwọ ọ bula gua ya n’ụgwo m’ji gi.” Site n’ike nke Ọbara Jisọs Kraist, Chineke naanara onye mmehie ọ bụla nke náechègharị dịka Ọ naara Ọkpara Ya bụ Jisọs Kraist! Anaagụrụ onyemmehie ahụ ịdịmma niile nke Kraist, wee were ajọomume nke onyemmehie ahụ n’ihe Kraist kwụworo ụgwọ ya ma kpuchi kwa.

Ọ bụrụ na “o ji gi ụgwọ ọ bụla -- .” Òlee onyemmehie nke ná ejighị Chineke ụgwọ ukwu karịa ka o nwee ike ịkwụ? Òlee onye nke náemehiebeghị wee ghara iru ọtụtụ nke Chineke? Otú ọ dị Jisọs ekwuwo sị, n’ihe Ọ gaje ime, náagbanyeghị iheọjọọ emere megide Govment nke Chineke na aha nke Chineke, na Ya ga-eché onweYa n’iru NnaYa n’ọnọdụ ha ịrịọrọ ha arịrịọ. Jisọs pụrụ ịrịọarịrịọ nkeọma n’ihi onye mmehie nke náechègharị n’ihi na Ya onweYa eburuwo mmehie niile nke ụmụmmadụ n’onweYa. “Ma ya onwe-ya bupuru mmehie ọtutu madu, ọ bu kwa ndi-njehie ka ọ nārịọrọ aririọ” (Aisaia 53:12). Ya onweYa bụ Nwaatụrụ Chineke -- otù Nwatụrụ nke náenweghị ntụpọ -- nke egburu site n’oge ịtọntọala nke ụwa; ma n’ihi àjà a zuruòkè nke achụrụ, Chineke naagụ onye ọ bụla nke kwere n’ike nke Ọbara Kraist awụsịrị n’ihi mgbaghara nke mmehie niile n’onye eziomume.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka aha Ọnisimọs pụtara?
  2. Gịnị mere Ọnisimọs ji rapụ ọlụ nke onyenwe ya?
  3. Kọwaa otù Ọnisimọs si chègharịa.
  4. Gịnị mere Ọnisimọs ji chọọ ịlaghachịkwuru nnaukwu ochie ya
  5. N’ọnọdụ dị añaa ka Ọnisimọs lakwuuru Failimọn?
  6. Gịnị mere Pọl jiri gwa Failimọn ka ọ nara Ọnisimọs dịka ya onweya?
  7. N’ihi ndị òle ka Jisọs gaasị Nna Ya, “Nara ya nke-ọma dịka mụ onwem”?
  8. Òlee otú esi atụkwasị Jisọs Kraist mmehie nke ụmụmmadụ?
  9. Gịnị ka ike nke dị n’Ọbara Jisọs pụtara?
  10. Gịnị mere Chineke agaghị anabata onye mmehie ọ bụla ma ọ bụghị ma o sitere n’Ọbara nke Jisọs Kraist bịakwute Chineke?
  11. Gịnị mere idoziụzọ ji dị mkpà?