I Ndi Kọrint 13:1-13

Lesson 355 - Senior

Memory Verse
“N’elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n’anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè” (Ndi Kọlọsi 3:14).
Cross References

Ịhụn’anya -- Ịhụn’anya nke Chineke

1 Ịhụn’anya bụ nchịkọta na ihe ndabere nke ezi okpukpé niile. Asụsụ dị icheiche, ibuamụma, iheọmụma, okwukwe, obiọma na ịnụọkụn’obi n’ihi eziokwu -- ihe ndịa adịghị alụpụta nzọpụta, I Ndi Kọrint 13:13; Deuteronomi 6:5; Levitikọs 19:18; Deuteronomi 10:12, 13; Mak 12:28-31; Luk 10:25-28.

2 Akọwara ihe banyere amara niile nke ịhụn’anya maọbụ ịhụn’anya nke Chineke, I Ndi Kọrint 13:4-7; Ilu 10:12; I Pita4:8; 2 Jọn 5.

3 Ibụamụma niile, ịsụasụsụ dị icheiche na iheọmụma gaakwụsị, ma ịhụn’anya naadịgide rue mgbe ebighịebi, I Ndi Kọrint 13:8-10; Ndi Kọlọsi 3:14

4 Akọwara ihe banyere ọnọdụ ezughịòkè nke mmadụ, I Ndi Kọrint 3:11, 12; 2 Ndi Kọrint 3:18; 5:7; I Jọn 3:2.

5 Ihe kachasị bụ ịhụn’anya, I Ndi Kọrint 13:13; Matiu 5:44; Ndi Rom 13:10; Jọn 13:34; 15:9, 13, 17; Ndi Hibru 13:1; I Jọn 3:1; 4:7-12, 17-19.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Nzukọ Kraist nke dị na Kọrint

Pọl nọrọ ọnwa irinaasatọ na Kọrint, náekwusara Ndị Kọrint Oziọma ahụ. Ewukwara otù chọọchị siriike n’ebe ahụ; ma mgbe Pọl lasịrị, nkewa na òzízí ọjọọ wee gbebata n’etiti ha. Ahụrụ na ndị Gịrk bụ ndị ibuli mmadụ elu n’iru ya naamasị. Pọl dere Akwụkwọ ozi a iji dozie ihe ndịa. Isi irinaatọ nke Akwụkwọ a bụ ihe ijuanya ma bụrụ kwa nke anaeche na ọ bụ otù nime ndị kachasị ukwu nime Baịbụl. Onye ọ bụla kwesịrị ịmụ ya buru ya n’isi.

Otù onye ekwuwo sị: “Ịhụn’anya bụ nọọ ụdị Chineke nime obi; n’ihi na Chineke bụ ịhụn’anya. Site n’okwukwe ka anyị ji anata ihe n’aka Onye kwere anyị; site n’olileanya ka anyị ji naele anya ọdịn’iru na ọdịmma ebighịebi; ma site n’ịhun’anya ka anyị ji yịe Chineke; ọ bụ kwa site na nke a náánị ka anyị gaeji bụrụ ndị tozuruòkè rue mgbe ebighịebi” Ịhụn’anya bụ idebezu Iwu ahụ. Iwu ahụ enweghị ike ịgbanwe ndụ ụmụmmadụ, ma Kraist Onye bụ ịhụn’anya ahu n’ụdị mmadụ, mere nke a!

mụmụ Ọhụụ ahụ

Jọn Onyeozi kwupụtara na “Chineke bụ ịhụn’anya; na onye nke náanọgide n’ịhụn’anya naanọgide kwa nime Chineke, na Chineke naanọgide kwa nime ya.” Ọtụtụ nke ịhụn’anya Chineke ka anaetinye nime anyị site n’eziomume nke Jisọs Kraist, mgbe amụrụ anyị ọzọ. Ọ dị ihe dị iche n’ịhụn’anya nke Chineke na ịhụn’anye nke mmadụ. Anyị nwere ịhụn’anya nke amụrụ anyị nime ya n’ụwa a nke náenye ndi nne na nna ịhụn’anya n’ebe ụmụ ha nọ, na ịhụn’anya nye ndịọzọ n’ọtụtụ n’ọtụtụ. Ọbụná ụmụ anụmanụ nwere ịhun’anya n’ebe ụmụ nke aka ha nọ. Ma mmehie gwakọtara ịhụn’anya ahụ nke dị nime obi mmadụ. bụ nke akụnyere n’ebe ahụ mgbe mmadụ nupụụrụ Chineke isi wee dapụ site n’ọnọdụ nke inwe ịhụn’anya dị ọcha nke náenweghị kwa mmehie. Aghaghị ime ya ka ọ bụrụ onye ekèrè ọhụ. Jisọs kpọrọ nke a imụ ọzọ. Ụmụmmadụ agbalịwo iji ihe dị icheiche dochie ọmụmụ ọhụ ahụ. Ja anwawo ịgụ óké akwụkwọ, ịgbanwe nw imezi ihe dị icheiche, ịbanye otù chọọchị, ụkọchukwu ibikwasị mmadụ aka n’isi, igosi ebere, inyere ndị ogbenye na ndị nọ ná mkpà aka, ka ọ bụrụ ihe ndochi dị icheiche n’ọnọdụ mgbanwe nke mkpụrụobi. Jisọs sịrị na onye nke naesi “n’ebe ọzọ nārigo ibà, onye ahu bu onye ori na onye nāpunara madu ihe” (Jọn 10:1). Mgbalị niile nke mmadụ naagbalị ịba n’Eluigwe site n’ụzọ ọzọ nke náabụghị ịmụ mmadụ ọzọ bụ iheefù. “Ọ buru na amugh madu ọzọ ọ pugh ihụ ala-eze Chineke anya” (Jọn 3:3).

Odudonsọ

Ebe ọ bụ na ịhụn’abya naabaa nime obi mgbe amụrụ mmadụ ọhụ, ọ bụ kwa ihe apurụ ime bụ ime “ka ihu-n’anya zue okè n’akuku ayi” (I Jọn 4:17), site n’onyinye amara ahụ dị omimi karịa nke a nke anaakpọ odudonso, bụ onyinye amara nke abụọ doroanya, nke anaalụ nime obi mmadụ n’où ntabianya. “Onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihu-n’anya Chineke zue okè n’ezie” (I Jọn 2:5). Ihu-n’anya zuru okè” bu aha ọzọ anaakpọ “ịdịnsọ,” “Izu-okè nke Kraist,” ma-ọbu “Odudonsọ,” emere ka nke a dị mfé site n’iwepụ mkpọrọgwu nke mmehie site n’Ọbara nsacha nke Jisọs Kraist. “Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ Ya n’anya, rara kwa Onwe-ya nye n’ihi ya; ka O we do ya nsọ, mgbe O mesiri ka ọ di ọcha site n’ọsisa miri n’okwu Chineke, ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n’iru Onwe-ya dika ihe di ebube, n’enwegh jtupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n’ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kw aihe anāpugh ita uta: (Ndi Efesọs 5:25-27).

Asụsụ dị Icheiche

Enwere ọtụtụ ndị mara otú esi kwue okwu ireụtọ n’iru ọtụtụ mmadụ n’ebe ahụ dị nsọ nke anaekwu okwu Chineke. Ọtụtụ mgbe ka anyị naanụ okwu dị otú a, “Okwu bekee ọ naasụ naatọụtọ.” Ma ọ bụrụ na ọ dịghị mgbe ịhụn’anya Chineke mejupụara obi onye ahụ nke naekwuokwu, ireụtọ ya niile, okwu ya niile nke maramma, bụ náánị ọla naaraàra maọbụ ájà ọla naadaụda. Ọtụtụ mkpụrụobi agụ irinri nke Mmụọ naagụ esiwo n’ụlọ chọọchị alụrụ nkeọma pụọ náenwetaghị afọojuju n’ihi na onye ahụ nke naekwuokwu Chineke enweghị otù ihe ahụ dị mkpà -- ịhụn’anya nke Chineke.

Okwukwe

Agwara anyị n’akụkwọ Ndi Hibru isi irinaotù na “okwukwe bụ ndabere nke ihe anēle anya, buru kwa nnwapụta nke, ihe anāugh anya,” gwa kwa anyị na ọ bụ site n’okwukwe ka eji lugbe alaeze dị icheiche, kpuchita ọnu ọdụ, emekwara ka ndị nwụrụanwụ dị ndụ ọzọ. Jisịs jara okwukwe nke nwanyị Sairofinisia ahụ onye ji obiumeala nọgidesie ike maka ọgwụgwọ nke ada ya nwanyị; O wee sị “Nwanyi okwukwe gi di uku.” Ka anyị cheta kwa ihe banyere okwukwe nke ọchịagha ahụ naachị ọgụ ndịagha ise onye rịọrọ ka agwọ onye naejere ya ozi. Jisọs kwuru na ọ dịghị mgbe Ya hụrụ oké okwukwe dị otú a, ọbụná n’Israel Ị ọtụtụ ọlụ dị ebube ka alụworo site n’okwukwe. Ma Pọl naekwu na ọ bụrụ na okwukwe ahụ abụghị ihe ejikọtara ya na ịhụn’anya Chineke nime obi, ọ baghị úrù ọ bụla nye mkpụrụobi ahụ. Náánị okwukwe apụghị ịmaghepụ ọnụụzọama ọlaedo ahụ nke esi aba n’Eluigwe.

Ùdé

Ọtụtụ ndị nwere àkụ ewerewo ego ha nye ka ewee lụọọlụ ọma dị icheiche, ha enyewo kwa ego maka iwu ụlọakwụkwọ kọleji dị icheiche, ụoọọgwụ na ụlọakwụkwọ dị icheiche dị elu. Ụfọdụ emewo kwa ihe karịrị nke a site n’inye arụ ha maka ịkwagide ihe ahụ nke dị ha mma. Ma isi irinaatọ nke I Ndi Kọrint naagwa anyị nkeọma na ọ bụrụ na anyị enweghị ịhụn’anya Chineke nime obi, ihe ndịa niile agaghị abara anyị úrù ọ bụla. Aha anyị Ùdé anyị, ihe niile anyị nere gaala n’íyì n’ọlụ eji ya lụọ. Ịgụakwụkwọ dịkarịsịrị elu, inwe onyinye nke nkà na mmụta, ime nkeọma karịsịa n’ihe banyere iheọmụmá (science) na nchọpụta dị icheiche nke oge a apụghị inweta ịhụn’anya dịkarịsịrị ntà nye onye ọ bụla. Ọ bụ onyinye Chineke nyere n’efù nke eji Ọbara Ọkpara Ya bụ Jisọs zụta, bụrụ kwa ihe apụrụ inweta site n’ikwere n’Onyenwe anyị Jisọs Kraist.

Omume dị Icheiche nke Eji Mara Ịhụn’anya

Pọl nyọchara ịhụn’anya nkeọma ịma ihe ọ bụ, kewasịa ya n’akụkụ ya dị icheiche, wee gwa anyị ihe ọ pụrata n’ezie. Ịhụn’anya nwere obiọma, new kwa ogologo ntachiobi. Ịhụn’anya Chineke nime obi mmadụ naeme ka onye ahụ naanọgide n’iwu nke obiọma. Ọ pụtara na ọ bụghị náánị na onye ahụ bụ onye dị nwayọ, bụrụ kwa onye nwere ogologontachiobi, kama ọ naegosi ikwesịntụkwasịobi nye ndị ahụ nke naadịghị agwa onweha eziokwu. Ọtụtụ mmadụ adịghị agwa onweha eziokwu, ha naagbalị ikpuchi enweghị eziokwu nke dị n’obi ha. Ha chọrọ onye nwere obiọma nke makwaara ihe, onye gaenyere ha aka ikpughe ihe ahụ nke gaemesi mee ka ha tufue mkpụrụobi ha ma ọ bụrụ na ha esighị na ya chegharịa. Obiọma bụ ịdịmma, nke alụpụtara nime obi, nke naesi kwa n’ọnụ naapụta dịka ihe anaahụ anya si dị.

Onye naahụ n’anya adịghị ekwujọ nwanna ya. O nwereike ịbamba maọbụ tụ mmadụ mmehie ya n’anya, na n’okpuru ya ọ bụ iwu nke obiọma dị nime ya ịwụkwasị mmanụ n’elu ya. Ịhụn’anya dị nrò naenwe kwa obi ebere n’onweya, o nwekwara obiọma naeme kwa iheọma nye ndịọzọ. Ọ dịghị akpali nsogbu. Ịhụn’anya naeme mmadụ ka o jikere mgbe ọ bụla ikwe ka ebulie ndịọzọ elu karịa ya onweya. Ịhụn’anya adịghị ekwoekworo n’ebe ọñụ maọbụ ịdịbigamma òkè nke onye ọzọ dị. Ọ dịghị ewepụta onweya n’iru, Ọ dịghị kwa achọ ka amara ya maọbụ inye ya otuto ọ bụla. Ịhụn’anya adịghị eme ngwa ikwuokwu banyere onye ọzọ maọbụ ịgwa onye ọzọ ihe ọjọ nke o mere. Ọ dịghị ebule onweya elu site n’ikwuokwu ọma banyere onweya. Ezi ịdịumealan’obi naesite na mmadụ ịmata ozùzùòke nke Chineke nime obi.

Ụmụmmadụ maọbụ ọnọdụ dị icheiche adịghị akpasu ịhụn’anya ime omume nke náekwesịghị ọnọdụ ya nime ndụ. Ezi ịhụn’anya naakpli onye nwere ya ime ihe dịmma na ihe kwesịrịekwesị n’ọnọdụ ọ bụla. Ịhụn’anya adịghị achọ ọdịmma nke aka ya, ọ dịghị enwe ajujuafọ maọbụghị n’ọdịmma, nkasiobi na nzọpụta nke ndịọzọ. Ọ naañụrịọñụ náánị n’eziokwu. Ọ naanagide adịghịike na njehie nke ndịọzọ, naekwere ihe kachasị mma nke onye ọzọ pụrụ ime, naenweolileanya banyere ịdịmma na nzọpụta nke ụmụmmadụ n’ebe niile, ọ naeji ntụkwasịobi naanagide nnwapụta na mkpagbu dị icheiche. Ọ dịghị onye ọ bụla nke pụrụ ịbụ onye nwere njikere n’ezie ịba n’ebube ebighịebi ahụ ma ọ bụghị onye obi ya na mkpụrụobi ya jupụtara n’ịhụn’anya nke Chineke a n’ụzọ dị omimi.

Ịhụn’anya

Ịhụn’anya adịghị ada mgbe ọ bụla. Ibuamụma niile gaada; asụsụ dị icheiche gakwasị; iheọmụmá gaagabiga; ma ịhụn’anya Chineke gaadịgide rue mgbe ebighịebi. N’obodo gbara ọchịchịrị nke Afrịka, ebe David Livingstone bụ onye ọcha mbụ nke bamiri nime ime obodo ya, ekwuru na mgbe ọ bụla akpurụ aha ya, iru ha ahụ nke naeji oji naenwupụ mgbe ha naekwu ihe banyere dibịa obiọma ahụ onye gabigara n’ebe ahụ ọtụtụ arọ garaaga. Ha apụghị ịghọta asụsụ ya, ma ha naenwe mmetụta nke ịhụn’anya ahụ nke dị nime obi ya. Ọ bụrụ na anyị ewebata amara ahụ dị mfé nke ịhụn’anya nke Kraist ahụ nime obi anyị, ọlụ anyị gaaga nkeọma. Anyị agaghị enweta ihe karịrị nke a ukwu.

Nke Kachasị Nime ha Niile

Ma ugbu a ka okwukwe, olileanya, ịhun’anya naanọgide ma nke kachasị n’ihe ndịa bụ ịhụn’anya. “Ịhụbiga n’anya òkè bụ ịdịbiga ndụ òkè, ịhụn’anya rue ebighịebi bụ kwa ịdị ndụ rue ebighịebi,” ka otù ụkọchukwu kwuru. Ya mere ekekọtara ndụ ebighịebi n’ịhụn’anya.

Asị n’okwukwe adịghị ọ bụ ihe anaapụghị ime bụ ime ihe gaatọ Chineke ezi ụtọ. Okwukwe naadọrute anyị nso Chineke, site kwa n’okwukwe ka nyị naeso Chineke naeje ije. Ọ bụ otù nime ihe atọ ahụ nke dị ukwu. Olileanya naewuli mkpụrụobi anyị elu ma naeme kwa ka ọ naaga n’irun’iru. Olileanya bụ iji ntụkwasiobi naeleanya nke ihe ahụ nke gaji ịbịa. Okpuagha anyị bụ olileanya nke nzọpụta. Anyị naeyi ya mgbe niile. Ma olileanya adịghị, mkpụrụobi gaarịa ọrịa wee nwụọ. Ọ ụná n’oge gbakarịsịrị ọchịchịrị, olileanya naejegharị nime ndụ a, ma naeji ịhụn’anya naejegharị rue mgbe niile ebighịebi. Nke kachasị n’ihe ndịa niile bụ ịhụn’anya!

“Hu-n’anya Chuku d’ebube!

Dịke, nēnwegh àtụ

Gādịgide ebighi ebi --

Abụ ndi-nsọ, mu’ozi.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ihe atọ dị ukwu nke eji tụnyere ibe ya n’iheọmụmụ a?
  2. Kọwaa Okwukwe.
  3. Kọwaa Olileanya.
  4. Kọwaa ịhụn’anya.
  5. Kwue ihe dị iche n’ịhụn’anya nke mmadụ na ịhụn’anya nke Chineke.
  6. Òlee otú okwu Chineke maọbụ ịgbaàmà si ada ụda mgbe ịhụn’anya Chineke n’adịghị nimeobi?
  7. Gịnị naeme ka mmadụ bụrụ OnyeKraist nyechasịrị onweya?
  8. Kpọọ aha ụfọdụ nime mkpụrụ nke ịhụn’anya Chineke.