Ndi Efesọs 6:1-4

Lesson 356 - Senior

Memory Verse
“Ma ugbu a, umum, gēnum nti: n’ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu” (Ilu 8:32).
Cross References

I Ọlụ nke Dịrị Ụmụ na Ndị Nnenanna

1 Ọ bụ ihe ziriezi na ụmụ gaaña ntị okwu ndị mụrụ ha nime Onyenwe anyị, Ndi Efesọs 6:1; Ilu 23:22; Ndi Kọlọsi 3:20.

2 Ọ bụrụ na ha asọpụrụ nna ha na nne ha, enwere nkwà ekwere ha ha pụrụ ibi ogologo ndụ ma new kwa ọñụ, Ndi Efesọs 6:2, 3; Ọpupu 20:12; Deuteronomi 5:16; Jeremaia 35:18, 19; Matiu 15:4.

3 Ndị nnenanna kwesịrị ịdị nrò n’ebe ụmụ ha nọ, ma zụlite kwa ha n’ịtụegwu Onyenwe anyị, Ndi Efesọs 6:4; Detueronomi 4:9; 11:19; Abù Ọma 78:4-8; Ilu 22:6; 29:17.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Èzínaụlọ ahụ

Baịbụl kwuwara ya nọọ nkeọma ihe banyere ọlụ dịrị ndị nne na nna n’ebe ụmụ ha nọ na ọlụ dịrị ụmụ n’ebe ndị mụrụ ha nọ. Ọ bụ Chineke tọrọ ntọala èzínaụlọ ọ bụla. Chineke dokwara ya ka ọ bụrụ otù. Chineke hụrụ site ná mmalite na ọ dịghị mma ka nwoke ahụ nnọọ náánị ya, O wee nye ya onye inyeaka kwesịrị ya. Agwara anyị na ụmụ bụ ihe nketa nke naesi n’aka Chineke.

Ọlụ dị ukwu dịrị ndị nnenanna. “Dịka èzínaụlọ si dị, otú a ka mba dị kwa.” “Èzínaụlọ bụ ịdịike nke mba. Otù ilu mgbe ochie naadụọsụ sị: “Aka ahu nke naeku nwa bụ aka naachị ụwa.” Ọ bụrụ na èzínaụlọ anyị dị icheiche abụrụ ihe ekewaraekewa, na mgbe naadịghị anya anyị gaenwe obodo nke kewaraekewa. Ọ bụrụ na anyị ewue èzínaụlọ nke dị ike nke naatụ kwa egwu Chineke, anyị gaenwe mba nke onye iro ọ bụla naapughị ịkwada.

Mgbe Chineke, na Ụmụ Israel gbara ndụ site n’aka Moses, ha gaje ịpụta n’iru Ya -- Ndịisi ha, ndịokenye, ndịodoziokwu, na ndịkom Israel niile, ndịnyom ha, ụmụntakịrị ha, na ndịọbịa (Deuteronomi 29:9-12). Èzínaụlọ ahụ niile gaeche onweha n’iru Chineke ifè Ya òfùfè. Mgbe Joshua bara n’ala Kenean, o wuru ebe ịchụàjà n’Ugwu Ibal wee sure àjà nsureọkụ na àjà udo dị icheiche. O wee depụta ụfọdụ nime Iwu Moses n’elu mbadamba nkume ndị ahụ n’iru Ụmụ Israel niile. Mgbe ahụ o wee gụputa okwu niile nke Iwu ahụ nye mkpọkọta niile nke Ụmụ Israel, ma ndinyom, ụmụntakịrị na ndị ọbịa niile nke nọ n’etiti ha (Joshua 8:30-35). Chineke tọrọ ụkpụrụ nke òfùfè nye èzínaụlọ ahụ niile.

N’oge nke Kraist, ndị nnenanna chọrọ ịkpọtara Jisọs ụmụ ha ka O wee gọzie ha. Ndị naesoụzọ Ya baara ha mba wee chọọ kwa ịchụpụ ha, ma Jisọs sịrị: “Kwenu ka ụmụ ntakiri bịakutem; unu egbochila ha: n’ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a.” (Gụọ Mak 10:13-16). Anyị naahụ na òzízí niile nke Jisọs naeso iheatụ nke Iwu ahụ n’ịkpọta ụmụntakịrị n’ụlọ Chineke ifè òfùfè. Lee otú o si bụrụ ihe kwesịrịekwesị ka ụmụntakịrị bụrụ ndị gaanọ nwayọọ ná nsọpụrụ n’ụlọ chọọchị! Ekwesịrị ime ka ha mata site n’iheatụ nke ndị mụrụ ha na kwa site n’ịdụ ha ọdụ, ka ha mara n’ezie na ha nọ n’iru Chineke.

Okpukpé nke Èzínaụlọ

Ụkpụrụ ọzọ nke Chineke naagọzi bụ òfùfè nke èzínaụlọ. N’èzínaụlọ nke ndị Kraist nke mgbe ochie, ndị nnenanna naakpọkọta ụmụ ha otù ugbò maọbụ ugbò abụọ n’ụbọchị wee gụọrọ ha Okwu ahụ ma kpee kwa ekpere. Lee otú o si bụrụ ngọzi ịzịlite mmadụ n’èzínaụlọ dị otú ahụ! Anyị apughị ikwere na ọtụtụ ndị naekweghị na Chineke naetopụta site n’èzínaụlọ ebe ịhụn’anya Chgineke naebi na n’ebe ndị nnenanna naalụsi ọlụ ike izi ụmụ ha Okwu Chineke.

N’okpụrụ iwu, èzínaụlọ ọ bụla aghaghị ịnụ ma rube kwa isi n’Okwu niile nke Chineke: “Nuru, Israel; JEHOVA, bú Chineke-ayi, JEHOVA bu otù: I gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, were kwa ike-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi n’anya, Okwu ndia, nke mu onwem nēnye gi n’iwu ta, gādikwasi kwa n’obi-gi: I gējisi kwa ike izi ha ụmụ-gi, I gēkwu kwa okwu banyere ha mgbe i nānọdu n’ulo gi, na mgbe i nēje ije n’uzọ, na mgbe i nēdina ala, na mgbe i nēbili ọtọ” (Deuteronomi 6:4-7).

Ọ bụ ọlụ dịrị ndịnnenanna izi ụmụ ha Okwu Chineke n’èzínaụlọ n’esepụghịaka. Ọtụtụ mmadụ naarapụ nke a n’aka onye nkụzi Ụlọakwụkwọ nke Ụbọchị ụkọ maọbụ onye náekwuokwu Chineke n’ụbọchị ụkọ. Chineke kwuru ihe banyere Abraham sị: “N’ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ JEHOVA, ime ezi omume na ihe ekpere n’ikpe; ka JEHOVA weta n’isi Abraham ihe O kwuru banyere ya” (Jenesis 18:19). Anyị pụrụ ịhụ n’ebe a ụdị ntụkwasịobi nke Chineke nwere n’ebe Abraham nọ. Ò nwere ụdị ntụkwasịobi ahụ n’ebe anyị nọ n’ụbọchị taa?

Otù nime iheọjọ dị icheiche nke ọgbọ a bụ na ụmụ naachị ndị mụrụ ha kama ndị murụ ụmụ ịchị ụmụ ha. Le otú ndị naeme iheọjọ si dị ọtụtụ dịka ihenlpụta nke omume ndịa! Anyị maara ihe banyere ikpé Chineke nke dakwasịrị Ilai, onye nchụàjà, mgbe ụmụ ya ndikom naewetara onweha nkọcha ma o gbochighị ha. Ọ bụrụ na Chineke etinyewo ụmụ ntakịrị n’aka onye ọ bụla ilekọta ọ bụ ihe agaewere obiumeala na ezi nleruanya mee. Ha nwere mkpụrụobi náadịghị anwụanwụ n’ihi nke a agaghị ekwe ka ha tolite naejegharị n’okporoụzọ dịka ndị náenweghị ebeobibi na ndị anaejighị Okwu Chineke zụpụta.

Ọlụ Dịrị Ndịnnenanna N’ebe Ụmụ ha nọ

“Ndi bu nna akpasu-kwa-la umu-unu iwe.” Akụziri ya nkeọma nime Baịbụl ihe banyere iduzi na inye ụmụ ntakịrị ahụhu. Mmehie ahụ eburu pụta ụwa nke amụrụ ụmụntakịrị nime ya gaeduba ha nime mmehie na ndụ ọjọ dị icheiche ma ọ bụrụ na ndịnnenanna akpọghị ya ọlụ dịrị ha ilekọta na igbochi ha nime ha. Iduzi ụmụ ntakịrị chọrọ amamihe dị ukwu na ịhụn’anya nke Chineke. Ụfọdụ ndị nnenanna naabara ụmụ ha mba ike ike naeti kwa ha aka mgbe niile nke fọdụrụ ihe ntà ka ọ dị njọ karịa enyeghị ha ahụhu maọlị. Ọ bụrụ na ndịnnenanna gaakpọbata ụmụ ntakịrị ha n’ebe nzuzo ha ma were ịhun’anya na obiọma kọwaara ha ihe dị iche n’etiti iheọma na iheọjọ, ha gaeme ka nwa ntakịrị ahụ ghọta nkeọma ihe mere eji enye ya ahụhụ. Ndịnnenanna ụfọdụ na ụmụ ha naekpekọ ekpere n’otù tutu ha enye ụmụ ha ahụhụ, nke a kachasị mma mgbe nwa ntakịrị ahụ toruworo ịghọta ihe nkeọma. N’otù èzínaụlọ, ọ dị otù nwa ntakịrị nwoke dị arọ irinaabụọ nke kpọrọ otù nwanyị bi n’ụlọ ahụ asị, ma naagwa kwa ya okwu ọjọ. Nne ya naakpọbata ya nime ụlọ naagwa ya na ya agaghị ekwe ka ọ naekwu ụdị okwu ahụ. Mgbe ahụ ha ekpee ekpere. Otù ụbọchị ọ kpọbatara ya nime ụlọ, nwa ntà nwoke ahụ wee tie sị, “nne, ekwubeghịm ihe ọbụla site na mgbe ahụ mu na gi kpesịrị ekpere.”

Ụlọakwụkwọ nke Ọrà Mmadụ

Ụlọakwụkwọ anyị nile naeme dịka agaasị na ha enwetawo ụmụ anyị dịka ihe nketa, ma naachọ kwa ka arapụrụ ha ihe niile banyere ha kpamkpam n’ụzọ agaesi naakụziri ha ihe. Ha edepụtasiwo ụdị iheọmụmụ nke ha gaenwe nke ndịnnenanna bụ ndị Kraist naapụghị ikwenye n’ụzọ ụfọdụ. Iteegwu, otù nime iheọjọ nke ụbọchị taa ka anaakụzi n’ọtụtụ ụlọakwụkwọ anyị niile. Ụdị uwe eji egwuegwuregwu (gymnastic) naemegide ụmàọma nke ụmụ ntakịrị anyị. Ụfọdụ nime akwụkwọ nke naesi n’ọba akwụkwọ anyị dị icheiche abụghị nri kwesịrịekwesị nye uche nke ụmụntakịrị anyị ndị naetolite etolite. Naemegide ụmàọma nke ụmụ ntakịrị anyị. Ụfọdụ nime akwụkwọ nke naesi n’ọba akwụkwọ anyị dị icheiche abụghị nri kwesịrịekwesị nye uche nke ụmụ ntakịrị anyị ndị naetoliteetolite. Ụfọdụ ndị webata n’ụlọ ha; ma ọ bụrụ na ha abụghị nke kwesịrị ụmụ ntakịrị ahụ ịgụ, ha gaenweghachi ha azụ. Nnenanna ọ bụla kwesịrị ime nke a. Uche ụmụ ntakịrị anyị naadị dịka ihe eji zụọ ha si dị.

Ịdịmfé nke Okwukwe

Mmụọ nke nwa ntakịrị dị nọọ nrò. Ọ bụrụ na ọ dịbeghị mgbe ndịnnenanna duhiere nwa ntakịrị, ọ gaenwe ezi ntụkwasịobi n’ebe ha nọ. Apụrụ izi ụmụ ntakịrị ihe banyee Jisọs ngwangwa ha nwereike ịkpọ Aha ahụ. Okwukwe ha nke dị mfé gaeme ka ihere mee ndị mụrụ ha mgbe niile. Mgbe ụfọdụ anaesite n’ekpere nke ụmụ ntakịrị gwọ nnenanna ha nke arụ naadịghị ike. Ọ naadị mfé imebi mmụọ nwa ntakịrị, n’ihi nke a ndịnnenanna gaenwe ezi nleruanya otú ha gaesi náekwuokwu maọbụ naeme omume n’iru ha. Lee otú o si bụrụ ọlụ dị ukwu bụ ịzụpụta nwa ntakịrị, n’ụzọ o kwesịrị ịga!

Ịnupụrụ Ndị Nnenanna Isi

Pọl n’akwụkwọ o degaara Timọti, kwụrụ na n’oge ikpeazụ ụmụ ntakịrị gaabụ ndị naenupụrụ ndị mụrụ ha isi. Nime èzíe-na ụlọ òle taa ka ana-ahu ụmụ-ntakịrị ndi na-erube isi? Narọ ole-na-ole gara aga, ekwensu tụpụtara aghụghọ kachasị njọ iji bibie ụmụ-ayị nke na abatabeghi n’echiche na mbụ. O ji nwayọ bata n’obi ndi na-akụzi ihe ịkụzi na o kwesiri ka ụmụ-ntakịrị nwere onwe-ha n’ime omume, iche echiche na ime otú ọ dị ha mma, na o kwesịghị ka egbochie ha, kama na ha kwesịrị itolite ná nrọnrọ nke onwe-ha. Obodo ayị na-aghọ mkpụrụ nke ihe ahu akụworo lụputara. Ọ dịghị mgbe mmebi-iwu bara ụba dịka ọ dị n’ụbọchị taa. Ọtụtụ ndi na-emebiga ihe-ọjọ okè n’ụbọchị taa bụ ụmụ-ntakịrị ndị na-erubeghi iri arọ abụọ na atọ.

Anyị apụghị ilelị Okwu Chineke wee náenwe olileanya inwe ụmụ dị mma. Baịbul sịrị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụ ihe ekekọtaworo n’obi nwata; ma mkpa-n’aka nke idọ aka-na-nti gēme ka ọ di anya n’ebe ọ nọ” (Ilu 22:15) Ndu-ọdụ nke dị n’ihe ọmụmụ ayị bụ: “Umu nañanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayị: n’ihi na nka bu ihe ziri ezi.” Lee otú o si bụrụ ihe náenye ọñụ ịga n’èzínaulo ebe anaakụziri ụmụntakịrị irubeisi!

“Sọpụrụ nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n’iwu nke nkwa diri ya”). Mkwà ahụ bụ, “Ka ihe we nāgara gi nke-ọma, ka i we di kwa ogologo ndu n’elu uwa.” Ọ bụ ndị nnenanna òle nọdụworo ala ha na ụmụ ha wee tụgharịa uche, wee náagwa kwa ha ihe banyere iwu ahụ na mkwà a dị ebube nke Onyenwe anyị kwere? Ọ naadịrị ụmụntakịrị nfé irubere Onyenwe anyị isi ma ọ bụrụ na akụziiri ha ihe banyere irubere nnenanna isi n’ụlọ. Enwere ọtụtụ ihe atụ dị icheiche na Baịbụl banyere ụmụntakịrị ndị ndụ ha bụ ihe nlereanya: Aisak, Josef, Samuel, Timọti, na ndị ọzọ.

Ụmụ Dịka Ihe Nlereanya

Anaadọ ụmụntakịrị akanántị ka ha cheta onye keworo ha mgbe ha dị n’okorọbịa. “Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n’omume ya nile, ma ọlu-ya di ọcha ma o zi-kwara-ra ezi” (Ilu 20:11)

Ụmụntakịrị nwekwara ọlụ nke ha gaalu n’Oziọma, anyị nwekwara iheatụ nke náemetu n’obi banyere ụfọdụ ndị Onyenwe anyị jiri kwue ihe banyere Chineke ma wetakwara ndị ọzọ ọñụ na obiụtọ. Anyị naeheta ihe banyere nwatakịrị nwanyị ahụ adọtara n’agha onye gwara onye ọchịagha ukwu ahụ nke ụsụndịagha Siria otú ọ gaesi chọta ọgwụgwọ n’ala Israel. Ọ bịara chọta bụghị náánị ọgwụgwọ nke arụ ya kama ọ chọtakwara nzọpụta nye mkpụrụobi ya.

Mgbe ahụ enwere nwatakịrị nwoke bụ Samuel onye nne ya ji chụọ àjà inye oge ya niile maka ijéozi n’ulo Chineke. Ọ naejere onyenchụàjà ozi n’Ụlọukwu Chineke, wee tolite bụrụ ezi onyeamụma nke Chineke, onye náekpé ekpere mmeri nke ukwu, na onye náeritara Chineke mkpụrụobi n’úrù.

Enwekwara otù nwatakịrị nwoke onye nyere Jisọs nriehihie ya, ka O were ya zụọ ìgwè mmadụ. Ihe ndịa kwesịrị ịgbà ụmụntakịrị ume irubere Onyenwe anyị na ndị mụrụ ha isi.

Chee échìchè banyere ụmụntakịrị ahụ ndị so n’etiti ìgwè mmadụ ahụ ndị náatụsa igùnkwụ n’ụzọ mgbe Jisọs naanọkwasị n’elu ịnyịnya náabanye nime Jerusalem ná mmeri. Nụ ka ha naeti n’olu ụmụntakịrị náasi: “Hosanna diri Nwa Devid: Onye agọziri agọzi ka Onye ahụ bụ Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayị” (Matiu 21:9).

N’ụbọchị taa anyị naele anya Jisọs ka Ọ bịa ọzọ. Lee ụdị ọñụ ụmụntakịrị ahụ gaenwe ndị n’ihi na ha nwere obi dịọcha, gaanụ ụda opiike ahụ, wee tie sị, “Hosanna diri Nwa Devid: Onye agọziri agọzi ka ọnye ahụ bu Nke nābia!”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Kwue ebe dị icheiche nime Akwụkwọnsọ igosị na ụmụntakịrị kwesịrị ige ntị n’okwu ndị mụrụ ha

  2. 2 Òlee ihe ụfọdụ ụmụntakịrị inupụrụ ndị mụrụ ha isi naalụputa?

  3. 3 Gụọ kwa ihe mbụ ahụ enyere n’iwu nke mkwà dịrị ya?

  4. 4 Kwue ya n’okwu nke gị ndụmọdụ niile nke Moses nye ndị nnenanna banyere mgbe na ebe ha gaezi Okwu ahụ.

  5. 5 Kwue ya n’isi bụ okwu niile nke Jisọs kwuru banyere ụmụntakịrị ịbịakwute Ya.

  6. 6 Kpọọ aha ụfọdụ mmadụ na Baịbụl ndị leziri èzínaulo ha anya nkeọma?