Ndi Rom 12:1-21; 2 Pita 1:5-11.

Lesson 357 - Senior

Memory Verse
“Ya mere, umu-nnam, ejim obi-ebere niile nke Chineke nārịọ unu, ka unu che aru-unu n’iru Chineke, dịka àjà di ndu, di nsọ nke di Chineke ezi utọ, nke bu ikpe-ekpere-unu dika uche si di” (Ndi Rom 12:1).
Cross References

I Ijéijè nke OnyeKraist

1 Ndụ nke naalụọlu, nke bakwaara Chineke úrú , bụ ihe anaatụ anya ya n’ebe ndị nke Chineke nọ, Ndi Rom 12:1, 11-13; Luk 19:12-27; James 1:27.

2 Onye Kraist aghaghị ime ka ndụ ya yie nke Kraist, ọ bụghị dịka omenaala; omume, maọbụ mmụọ nke ụwa si dị, Ndi Rom 12:2; Jọn 17:14; 2 Ndi Kọrint 6:17, 18; 7:1; Nkpughe 18:4.

3 Mmadụ iji obiumeala mata erughieru ya, ya na mmadụ ịlụsịọlụ ike n’ọkpụkpọòkù nke akpọrọ onye ahụ bụ ihe kachasị mkpà nke achọrọ ná ndụ nke OnyeKraist, Ndi Rom 12:3-8; Ilu 25: 27; I Ndi Kọrint 12: 11-27; Ndi Efesọs 4:1-13.

4 Ịhụn’anya nke ụmụnna, omume ịhụnaya, bụ ihe jikọtara ọnụ na ihe kachasị mkpà ná ndụ nke Onye Kraist, Ndi Rọm 12:9, 10, 14-16; 13:9, 10; Matiu 22:37-40; I Ndi Kọrint 13:1-13; 2 Pita 1:5-11.

5 Onye Kraist aghaghị ibi ndụ ma tinyekwa iwu ukwu ahụ nke dị n’Oziọma n’ọlụ sị dị bụ nke Jisọs Kraist gosipụtara iheatụ ya “Ekwela ihe ọjọ meri gi kama were ezi ihe meri ihe ọjọ”, Ndi Rom 12:17-21; Abù Ọma 64:1-10; 94:1, 23; Matiu 5:38-48.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ijéijè nke OnyeKraist

Gịnị bụ ibi ndụ nke Onye Kraist? Ná mkpirimkpi, ọ bụ mmadụ ibi ndụ ya niile n’otuto nke Chineke, inyebiga onwe ayị n’ọlụ nke Kraist ma bụrụ kwa akwụkwọozi Ya nke dị ndụ, nke mmadụ niile maara na-agụ kwa. Ndi kraist bụ ndi na-anọchi anya Ala-eze nke Chineke,ndi ụkọ n’ọnọdụ Kraist, bụ ndị Chineke náesite n’aka ha naarịọ ndị ụwa arịrịọ ka ha na Ya dị n’udo site n’aka Kraist. (Gụọ 2 Ndi Kọrint 5:19, 20.)

NdịKraist gaabụ ìhè nime ụwa (Ndi Filipai 2:15), ihe nlereanya dị ndụ nke amara Chineke ahụ náagbanwe ndụ. Ọ bụrụ na amataghị ndị ahụ nke náekwu na ha bụ ndị náesoụzọ Kraist n’ụwa site ná ndụ ịdịnsọ nke ha naebi, na kwa nkewapụ nke ha kewapụrụ onweha site n’ụwa, ọ gaesirị ha ike ịbụ ndị nke Kraist

Mmadụ isi n’ụwa kewapụ onweya bụ ihe dị mkpà nke achọrọ n’ịbụ Onye nke Kraist na ibi ndụ nke OnyeKraist. Obi nke Onye Kraist bụ nke Onyenwe anyị. Ọ bụ kwa onye nwere ihe nketa n’Alaeze Chineke. OnyeKraist nọ n’ụwa ma ọ bụghị nke ụwa; ọ bụ onyeọbịa na onyeijè nke náagafeagafe n’ụwa. (I Ndi Kọrint 5:9-11; Ndi Hibru 11:13.)

Gịnị bụ ụwa ahụ nke OnyeKraist kwesịrị ikewapụ onweya site na ya? Okwu Chineke naegosị na ọ bụ usoro dị icheiche, na mmadụ niile, na mmụọ niile nke náeguzogide maọbụ náemegide iwu nke Chineke na Oziọma nke Jisọs Kraist, bụ “ụwa ahụ.” Ịbụ otù akụkụ nke ụwa ahụ, maọbụ ikwenye n’ụkpụrụ ya niile na njégharị ya niile, pụtara ịbụ onye iro nke Chineke. C.H. Spurgeon, otù ụkọchukwu nke amara nkeọma n’oge garaaga, kwuru okwu otù mgbe banyere ụwa sị: “Nime iwu dị icheiche nke náachị omume ya niile iteghete nime iri bụ okwuụgha, otù nke fọdụrụ afọdụ bụ ịma náánị onweonye; ọbụná nke ahụ bụ ịma náánị onweonye; nwere ụgha n’okpuru ya.” Okwu Chineke naekwu sị: “Unu ndi nākwa iko ùnu amatagh na ibu enyi nke ụwa bu ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bụla nke zubere ibu enyi nke ụwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke” (Jemes 4:4). Ahụrụ nke a ọ bụ eziokwu n’Iheodide ahụ dị Nsọ: “Ndi-eze uwa guzoro onwe-ha n’otù, ndi-isi zukọ-kwa-ra, imegide Onye-nwe-ayi, na imegide Kraist Ya”. (Ọlu Ndi-ozi 4:26). Iwu nke Chineke nyere ndị agaakpọkwasị aha nke Kraist bụ: “Sinu n’etiti ha puta, guzo-kwa-nu iche, ka Onye-nwe-ayị kwuru, unu emetu-kwa-la ihe nādigh ọcha aka; Mu onwem gākpọbata kwa unu, buru kwa unu Nna, unu onwe-unu gābu-kwa-ram umu-ndikom na umu-ndinyom ka Onye-nwe-ayi kwuru Nke puru ime ihe nile” (2 Ndi Kọrint 6: 17, 18). Náagbanyeghị na akụkụ Akwụkwọnsọ ndị a nwere nghọta pụtara ìhè otú a, akanwekwara ọtụtụ mmadụ nime ụwa ndị náagbalị ịnata iruọma nke Chineke. Ụdị mmadụ ndịa náenwe mmasị ịnata iruọma nke Chineke ma ha bụrụ kwa enyi nke ụwa ma ha enweghị ike ịnagide ịtaụta nke Oziọma ahụ, maọbụ iheịman’ọnya nke Obe ahụ. (Gụọ Ndi Galatia 5:11; Matiu 11:6; 13: 21.)

Àjà dị Ndụ

Òzízí ọzọ dị óké mkpà n’Oziọma na n’ịbụ Onye nke Kraist bụ na onye náesoụzọ Jisọs Kraist aghaghị inyechasị ndụ ya na ihe dum n’ijéozi na ọkpụkpọòkù nke Chineke. Ebeọgụgụ anyị n’Akwụkwọnsọ náakọwa na iché ndụ anyị ka ọ bụrụ àjà dị ndụ, dị nsọ nke dị Chineke ezi ụtọ, bụ náánị ikpé ekpere dịka uche si dị (maọbụ bụ náánị ijéozi kwesịrịekwesị)

Kraist bụ mmasị na mmetụta kachasị mkpà nke náachị ndụ Onye nke Kraist. Ọ bụ ezie na ekwenyere na ọ dị ọnọdụ dị icheiche na ụmụmmadụ ndị mmetuta nke dị ná ndụ ha naachị ndịọzọ, ọbụná n’ebe Ndi Kraist nọ, otú ọ dị ọ bụrụ na Kraist na Alaeze nke Chineke abụghị ike nke náachịzi ndụ onye ọ bụla, onye ahụ abụghị Onye nke Kraist. Dịka anyanwụ bụ nnọọ ebe ụwa nagba gburugburu na njèm ya, náenweta okpomọkụ na ìhè nke náenyere ndụ aka site “n’óké ọkụ ya nke nēnwu ajọ onwunwu” n’otù aka ahụ kwa ka ndụ nke OnyeKraist naagba Kraist gburugburu, naenweta ike nke mmụọ na ihe site na ya.

Chineke naatụ anya na ndị Ya gaanọgidesi ike n’ọlụ Ya. Ndị ụwa naalụsiọlụ ike ịchọ náánị úrù nke aka ha, naewu kwa ikpeazụ ha dịka ụlọ, naebi kwa ndụ ha otú o si masị ha nye onweha. Onye Kraist naadịrị Kraist ndụ. Ọ naachọ ụzọ nke ọ gaesi mee ka ihe banyere Kraist náaga n’iru kama ihe nke onwe ya, ọ bụkwa onye ya na Chineke naalụkọọlụ, náewu ọ bụghị náánị nye oge a, kama rue kwa ebighịebi! (Lee I Ndi Kọrint 3:9.) Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla ebighị ndụ ya nye Onyenwe anyị, ọ gahụ ahụhụ nke amamikpé ebighịebi na ịlan’íyì. Mmadụ ílì talent ya n’ala bụ ime dịka ndị ụwa ndị, ọ bụghị náánị na ha adịghị achọ ihe nke Eluigwe, ha naelì kwa ndụ ha niile n’ihe nke ụwa. (Gụa Matiu 25: 14-30.)

Enwogharịrị

“Unu ekwe-kwa-la ka eme ka unu yie ajọ oge a: Kama ka enwogha unu site n’ime ka uche-unu buru ihe ọhụ” Uche bụ ọnụụzọ nke esi abà nime mkpụrụobi; apụghị ikwubiga okwu ókè banyere mkpà ọ dị ndị Kraist idebe uche ha n’ebe Kraist na Alaeze Ya dị, ọ bụghị kwa n’ebe ụwa na ihe niile nke dị n’ụwa dị. Ụwa akpafuwo ebe dị anya site n’ebe Chineke nọ nke mere na mmehie na nrafu ya niile ka anaekwusa náenweghị ihere site n’ụzọ ọ bụla nke mmadụ pụrụ imepụta. Ọtụtụ ihe naenye mmadụ obiụtọ nke ndị ụwa mepụtara bụ náánị ihe akpụrụakpụ, nke náadịghị dịka okikè si dị bụrụ kwa náánị ihe jupụtara n’ihe-uré. Ọ bụ ihe náebibi mkpụrụobi n’ihi na ọ naakpali ụmụmmadụ ime mmehie.

OnyeKraist enweghị ọchịchọ maọbụ oge nye ihe ndịa niile nke anaakpọ ihe na-eme mmadụ obiụtọ. Onyonyo nke bụ otù nime ihe mmepụta ọhụ nke mmadụ meputara, abụrụwo ihe ụmụmmadụ ndị náeme otú dị ha mma mebiworo nke mere na ọ bụ otù nime ihe ná egbochi ụmụmmadụ ibindu nke OnyeKraist bụ nke ndị ntorọbịa chere iru n’ụbọchị taa. Ụlọọlụ ebe anaemepụta mmanya náaba n’anya na siga bụ ebe abụọ nke náakwagide ihe nkiri onyonyo karịa ebe ndịọzọ, kwa arọ ka ha naemefu ego riri nne iji gosi ihe ha naere, Ò kwesịrị ka onye ọ bụla jụọ sị, “OnyeKraist o kwesịrị ísè sigaret maọbụ ịñụ mmanya náabà n’anya?”

Obiumeala

Mkpako -- ịchọ náánị ihe nke onweonye, ibuli onweonye elu -- bụ isi ihe kpatara ọdịda nke Setan, na ọtụtụ mmadụ nke anaapụghị ịgụtaọnụ site na mgbe ahụ. Ihe náemegide ụdị omume anụarụ di otú a bụ obiumeala. Obiumeala bụ ihe anapụghị ikewapụ n’Oziọma Jisọs Kraist. Ebe ọgụgụ anyị n’akwụkwọnsọ naakọwa: “N’ihi na esiterem n’amara nke enyerem si onye ọ bula nọ n’etiti unu, ka ọ ghara itukwasi uche n’onwe ya kari nke o kwesiri itukwasi uche: kama itukwasi uche n’inwe uche zuru ókè, dika Chineke kere ọtụtụ nke okwukwe nye madu nile n’otù n’otù.” Ọzọ kwa, “N’akụku nsọpuru-unu, nācharanu ibe-unu uzọ.”

OnyeKraist naachọsiike ịdị ka Onyenwe ya. Ọ naachọsiike ka ndụ ya nwee ike bụrụ ihe ezoro n’azụ Obe nke Kraist ka ịmamma niile nke Jisọs wee náenwupụta. Okwu Chineke naasị: “Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisọs: Onye, ọ bụ ezie na Ọ diri n’udi nke Chineke na mbu, ma Ọ gugh ya n’ihi Ọ gējidesi ike, bú ira ka Chineke, kama O mere Onwe-ya ihe efù, n’inara udi nke orù, ewe me Ya n’oyiyi nke madu; ebe ahuru Ya ka Ọ di ka madu n’oyiyi-Ya, O weda-kwa-ra Onwe-ya we buru Onye nāña nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe” (Ndi Filipai 2:5-8). Ọtụtụ mmadụ naasị na ọ bụ ihe anaapụghị ime bụ mmadụ ibindụ agaeji tụnyere nke Kraist. Ndị obiabụọ na ndị náagọnarị eziokwu nwereike ikwu ihe dị ha mma, ma Jisọs debere ihenlereanya nke mmadụ niile gaagbaso. Ọ ghọrọ anụarụ wee biri n’etiti anyị, ụmụmmadụ pụkwara, site n’amara nke Chineke, ibindụ dị ọcha dị kwa nsọ, nke mmehie náadịghị ya, nke dị kwa Chineke eziụtọ.

Ịmị Mkpụrụ

Ịgụmmadụ n’onyeeziomume naakpọgide “madụ ochie” nke mmehie n’elu obe nke Kraist. (Lee Ndi Rom 6:1-7) Odudonsọ naeme ka “madu ochie” ahụ nwụọ kpamkpam; anaefopụ mkpọrọọgwụ nke mmehie; ịdịnsọ ewee jupụta obi nke onye ahụ kwereekwe. (Lee Luk 1:74, 75; Ndi Efesọs 5:27). Mgbe onye ahụ natara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ na ọkụ, Onye Atọ nke Atọnimeotù nke Chineke, ọ naeduba “n’ezi-okwu nile;” odudu na ntụziaka a naetinye ike naenyekwara OnyeKraist aka ịmị ọtụtụ mkpụrụ. (Lee Jọn 16:13; 15:8.)

Kraist bụ Ezi Osisivine ahụ; Ndị Kraist bụ alaka ya dị icheiche. Alaka ndị ahụ naamị otù ụdị mkpụrụ dịka osisivine ahụ náamị kwa. Ya mere, Ndị Kraist naamị otù ụdị mkpụrụ ahụ na ezi ọlụ n’iru ụmụmmadụ dịka Jisọs Kraist mịrị. (Gụọ Jọn 14:12; 15:1-8.)

Osisi ntà ọ bụla nke náamị mkpụrụ naamalite ịmịmkpụrụ ya ntakịrị ntakịrị. Náagbanyeghị otú ọbụla mkpụrụ ahụ si dị, mkpụrụ ọ naamịpụta naadị mma dịka o kwesịrị ịdị. Dịka arọ naagabiga mgbe osisi ahụ tozuruòkè, ọ naamị mkpụrụ ririnne karịa, ma mkpụrụ ya naabu kwa otù ihe ahụ nke ọ bụ site ná mmalite. Náánị ịdị ọtụtụ nke mkpụrụ ya gbanwere -- ọ bụghị ụdị mkpụrụ nke ọ naamị maọbụ ịdịmaa ya. Otú ahụ kwa ka ndụ nke OnyeKraist si amalite. Ọ naamalite ịmịpụta mkpụrụ olenaole nke mkpụrụ nke

Mmụọ Nsọ, ma ọ naga n’iru náamịpụta mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ. Dịka OnyeKraist naeto n’amara ná mmazu nke Onyenwe anyị Jisọs Kraist, ha naamị mkpụrụ niile nke Mmụọ Chineke rinne ma ụdị mkpụrụ ahụ ka bụ kwa otù; náánị na ọ naabawanye ụba. Itóétó n’amara a ka egosịrị n’ebe ọgụgụ nke iheọmụmụ anyị n’ụzọ maramma: “Ma n’ihi otù ihe a n’akuku-unu tukwasinu inụ-ọku-n’obi nile, nye-zukwa-nu idi-mma n’okwukwe-unu; nyezu-kwa nu ihe-omuma n’idi-nma-unu; nyezu kwa ijisi-onwe-unu-ike n’ihe-ọmuma-unu; nyezu kwa ntachi-obi n’ijisi-onwe-unu-ike; nyezu kwa nsọpuru Chineke nime ntachi-obi-unu; nyezu kwa ihu-n’anya umu-nna nime nsọpuru-Chineke unu; nyezu kwa ihu-nanya nime ihu-n’anya-umu-nna-unu. N’ihi na asi na unu nwere ihe ndia, asi kwa na unu nwere ha ri nne, ha nēdo unu ndi nābugh ndi nādighi-alu ọlu ma-ọbu ndi nādigh-ami nkpuru rue imazu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.”

Apụrụ ikwu na OnyeKraist naaga n’iru n’ịtụkwasị ná ndụ ya ịdịmma niile na ihe niile dị mma nke náebi nime Onyenwe anyị Jisọs Kraist. OnyeKraist ebe ọ bụ alaka nke Ezi Osisivine ahụ, ọ naamịta mmiri ya nke bụ ịdịnsọ, na ihe nke naenye ndụ nke mkpụrụobi ike, ma náatụkwasị ná ndụ ya amara niile nke Kraist.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ isi ọlụ kachasị mkpà nke OnyeKraist? Gịnị mere OnyeKraist ekwesịghị isoro ndị ụwa náenwekọ ihe?
  2. Kọwaa ihe Baịbụl kpọrọ “ụwa”
  3. Òlee otú mmadụ gaesi mata ihe dị iche n’ebe Ndị Kraist nọ na n’ebe ndị ụwa nọ?
  4. Gịnị mere o ji bụrụ ihe náekwesịghịekwesị ka Ndị Kraist soro n’ọtụtụ egwuriegwu nke ndị ụwa?
  5. Kpọọ ihe ụfọdụ nke eji mara ndịKraist?
  6. Gịnị ka ihe ahụ edere n’Akwụkwọnsọ pụtara na Kraist bụ Osisivine ma Ndị kwereekwe bụ alaka ya niile?
  7. Kọwaa otú Ndị Kraist gaesi mịa ọtụtụ mkpụrụ karịa nime ndụ ha?