I Timọti 6:1, 2; Ndi Efesọs 6:5-9; Ndi Rom 13:1-8.

Lesson 358 - Senior

Memory Verse
“Ihe ọ bula unu nēme nālunu ọlu site ná nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bugh kwa madu” (Ndi Kọlọsi 3:23).
Cross References

I. Ọlụ nke dịrị ndị náewe Mmadụ n’ọlụ

1 Ha gaasọpụrụ ndị were ha n’ọlụ, I Timọti 6:1, 2; Ndi Kọlọsi 3:22; Titus 2:9, 10; I Pita 2:18.

2 Ha gaalụ ọlụ ha dịka ha naalụrụ Onyenwe anyị, Ndi Efesọs 6:5-8; Ndi Kọlọsi 3:23.

II. Ndụmọdụ nke dịrị ndị náewe Mmadụ n’ọlụ

1 Ha gaeji nsọpụrụ meso ndị ọlụ ha, Ndi Efesọs 6:9.

2 Ha aghaghị ịkwụ ha ụgwọọlụ kwesịrịekwesị, Ndi Kọlọsi 4:1; James 5:4.

III. Omume nke Onye Kraist n’ebe Iwu ahụ dị

1 “Ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo” Ndi Rom 13:1, 2; Ilu 8:15; Daniel 4:32.

2 NdI naeme nkeọma adịghị atụ egwu iwu, Ndi Rom 13:3, 4.

3 Ndị Kraist aghaghị ịsọpụrụ Iwu, Ndi Rom 13:5-7; I Pita 2:13, 14; Mak 12:17.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Mnwapụta nke Okpukpé nke Ndị Kraist

Mgbe ụfọdụ anaekewa Iwu Chineke ụzọ abụọ -- nke náemetụta ọlụ anyị n’ebe Chineke nọ, na nke naemetụta ọlụ ayị n’ebe mmadụ ibe anyị nọ. Anyị apụghị ifè Chineke ma ọ bụrụ na anyị adịghị emeso ndịọzọ nkeọma -- ndị agbataobi anyị, ndị naejere anyị ozi, ndịisi anyị.

Anaasọpụrụ aha Chineke na òzízí Ya site n’omume nke ezi ndị naeso ụzọ Ya. Ụwa nnahụ ihaatụ ọsọsọ karịa ịnụ ihe enyere n’iwu. “Uunu onwe-unu bụ akwụwkọozi anyị, nke edeworo nime obi anyị, nke madu nile mara nāgu kwa” (2 Ndi Kọrint 3:2). Anaebuli òzízí Chineke elu site ná ndụ nke ndị ahụ naasọpụrụ Chineke naebi, ma anaekwulu kwa Ya n’ihi ndị ahụ nke naakpọ náánị aha Ya ma ha adịghị ebindụ ha dịka Okwu Ya si dị. Mgbe ụfọdụ anaekwu ihe banyere otù onye sị, “Onye ahụ naaga bụ ezi Onye nke Kraist.” Ebe anaanụ banyere onye nkeọzọ sị, “Ọ bụrụ na nke ahụ bụ Okpukpe ndị Kraist, Achọghị m ka m nwee mmekọ ọ bụla na ya.”

Eleghịanya ọ dịghị ebe ọzọ anaeleanya ná ndụ nke ndị naekpere Chineke karịa otú anaele ya n’ebe ọ naalụọlụ. Ndịọlụ emewo ọtụtụ ihe ha nwere ike iji mee ka ọnọdụ ọlụ ha dị mma karịa, ma ọtụtụ mgbe ha naewezuga ụkpụrụ nke Okpukpé ndị Kraist ka ha wee nweta ihe ha naachọ. Onye Kraist nke naalụ ọlụ gaelezi anya ka o ghara ịgbaso omume ọjọọ niile nke ndị mmehie naemeso onye were ha n’ọlụ.

“Ka ha ra, bú ndi-orù nke nọ n’okpuru yoke, ha gua ndi-nwe-ha ná ndi kwesiri nsọpuru nile, ka ewe ghara ikwulu aha Chineke na ozizi ya” (I Timọti 6:1). Nke a naemetụta onye ọ bụla ewere n’ọlụ n’ụbọchị taa dịka o si metụta ndị bụ orù n’oge Pọl. Òlee otú mmadụ gaesi gụọ onye ahụ were ya n’ọlụ dịka onye kwesịrị nsọpụrụ wee ghara ijisiike ime ihe gaatọ ya ụtọ? “Nāriọ ndi-orù ka ha nēdo onwe-ha n’okpuru ndi-nwe-ha, ka ha buru ndi gēme ihe gātọ ha ezi utọ n’ihe nile; ghara ikwu okwu imegide ha” (Taitọs 2:9). Chineke chọrọ ka ndị náejeozi náasọpụrụ ndị nwe ha. “Ndi nēje ozi, nēdonu onwe-unu n’okpuru ndi-nwe-unu n’egwu nile; ọ bugh nání n’okpuru ndi bu ezi madụ ndi nwe-kwa-ra obi-ọma, kama o bu kwa n’okpuru ndi gbagọrọ agbagọ” (I Pita 2:18). Nke naeme ka anyị mara na anyị agaghị asị na onyeisi anyị bụ onye mmehie, maọbụ na ọ bụ onye ọjọọ n’ihi nke a anyị agaghị ejisiike ime ihe gaatọ ya ụtọ, kama anaarụgide anyị ka anyị doo onweanyị ọbụná n’okpuru onye gbagọrọagbagọ. Nke a naekwu ihe banyere ndị ahụ náagaghị ekwenye n’ihengọpụ maọbu ịrụụka dị icheiche, ndị ahụ nke naakpachapụanya naeme iheọjọọ ma náeme kwa isiike.

Ọ bụrụ na ihe asịrị anyị mee abụghị iheọjọọ, anyị gaenye ndị ahụ were anyị n’ọlụ nrubeisi zuruòkè. “Ghara ikwu okwu megide ha” pụtara na anyị agaghị ekwugide ha, (maọbụ iso náesi agụgọ), kama anyị gaanabata iwu niile maọbu ikike niile nke ndị anyị nọ n’okpuru ha.

Ọlụ Alụrụ nye Kraist

Onye Kraist nke náalụọlụ gaalụọlụ ya “dika unu nēmere ya Kraist; ọ bugh n’uzọ ibu-orù-n’anya, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu ụtọ; kama dika ndi-orù Kraist, nēme ihe Chineke nāchọ site ná nkpuru-obi-unu; were-kwa-nu obi-ọma nābu orù, dika ọ bụ Onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bugh kwa madu” (Ndi Efesọs 6:5-7). “Ibu-orù n’anya” bụ okwu ana-eji akọwa otú ụfọdụ mmadụ si alụọlụ. Ha naelezianya ịhu na ha naalụọlụ mgbe onye naelekọta ọlụ ahụ nọ nso, ma n’otù ntabianya ahụ mgbe onye ahụ nke naelekọta ọlụ rapụrụ ha, ha ewee malite ịrapụ ọlụ ha naalụ, naada kwa mbà, wee naala oge ha n’íyì. Ma mgbe onye ahụ náelekọta ọlụ batara nime ụlọ ọzọ, ngwangwa ha ewee malite kwa ọlụ ha naalụ n’iken’ike, ụfọdụ mmadụ ndị nke náagaghị achọ izuori ganaetufu oge ahụ nke onye were ha n’ọlụ naakwụ ha ụgwọ maka ya.

“Ịbụorù n’anya” naakọwa kwa omume nke ndị ahụ náalụọlụ ka mmadụ wee hụ ha, ndị náachọ otuto nke mmadụ ma ha adịghị alụọlụ ha dịka ha naalụrụ Onyenwe anyị.

Ịnụọkụ n’obi ka achọrọ

“Ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site ná nkpuru-obi-unu, dịka unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bugh kwa madu” (Ndi Kọlọsi 3:23). Ọ dịwo mgbe ị chọrọ ime iheọma pụrụ iche nye onye ihe ya naadị gị mma na onye ị naasọpụrụ? Nke a ọ gaghị eme gị ka ị nwee ezi nleruanya ma náalụsi kwa ọlụ ike? Ka anyị chefue ihe banyere onye ahụ nke anyị naalụrụọlụ; wepụ anya anyị n’ebe ọ nọ; ma ka anyị legide Kraist anya dịka ọ bụ Ya bụ onyeisi ọlụ ahụ nke naanọdụ n’oche. Onye ahụ nke anyị naalụrụọlụ bụ Onye ahụ nke rapụrụ Ocheeze Ya n’Eluigwe wee nye ndụ Ya n’ihi anyị. Dịka ndị Kraist, ugbu a ọ bụ Ya ka anyị naalụrụọlụ. Ma anyị naakụnye ntu n’elu osisi, ma anyị naereahịa n’ụlọ ahịa, ma anyị naalụọlụ nime ụlọọlụ, maọbụ na anyị naegwú ólùlù n’okporoụzọ, anyị naalụrụ Onyenwe anyị ọlụ. “Nālunu ọlu site ná nkpuru-obi-unu” nye Ya.

Ì naechè na adịghị akwụ gị ụgwọ ruru gi, maọbụ na ọ dịghị onye ihe ị naalụ naamasị? Cheta kwa na “ezi ihe ọ bụla onye ọ bụla nēme, nke a ka ọ gānaghachi n’aka Onye-nwe-ayi” (Ndi Efesọs 6:8). Eleghịanya ị naelegide onye náabụghị onye kwesịrị ịkwụ gị ụgwọọlụ anya, ọ bụrụ na ọ bụ Okorie ka ị naalụrụ ọlụ, ị gaghị eleanya ka Okroafọ kwụọ gị ụgwọọlụ. Ọ bụrụ na ọ bụ Onyenwe anyị ka ị naalụrụ ọlụ legide Ya anya maka ụgwụ ọlụ.

“Ma ndi nwere ndi kwere ekwe dika ndi-nwe-ha, ka ha ghara ileli ha anya, n’ihi na ha bụ umu-nna-ha; kama ka ha buru orù-ha kari” (I Timọti 6:2). Onye Kraist agaghị eme otú o si dị ya mma n’ihi na ọ naalụrụ onye kwereekwe ọlụ. Nwanna ahụ agaghị enwe obi ọjọ maọbu ọchịchị dịka onye naekweghịekwe si enwe ma otú ọ dị, onye ọlụ ahụ aghaghị ịbu onye jikeere ịlụọlụ nke ụbọchị ya nkeọma nye Onye Kraist ibe ya dịka ọ naaghaghị ịlụrụ onye mmehie ahụ siri ike onye naachọ kwa ka ọ lụọlara ya ọlụ dị ukwu.

Ịraotù nke Chineke Naachọ

Baịbụl gwara ndị nwere orù sị: “Onye nwe ma ha ma unu nọ n’elu igwe” (Ndi Efesọs 6:9). Okwu ndịa naeme ka onye naewe mmadụ n’ọlụ mara na ya na ndị o were n’ọlụ bụ orù n’anya Chineke. Ile mmadụ anya n’iru adịghị n’ebe Ọ nọ. Ọ chọrọ ikpé ziriezi n’aka onyeisi dịka Ọ chọrọ ya n’aka orù. “Ndi nwe madu, nēnye-kwa-nu ndi orù unu ihe ziri ezi na nke ra nrata; ebe unu matara na unu onwe-unu-nwe-kwa-ra otù Onye nke bu Onye-nwe-unu n’elu-igwe” (Ndi Kọlọsi 4:1). Chineke ahụ Onye nụrụ ákwá nke onye Hibru ahụ bụ orù, wee napụta kwa ya site n’ịbu orù n’Ijipt, ka naanụ kwa ákwá ndị anaakpagbu akpagbu. “Le, ụgwọ-ọlu nke ndi-ọlu ndi biri ọka n’ubi-unu nke unu jidere na nmegbu, nēti nkpu; iti-nkpu nke ndi ahụ ndi were ihe-ubi-unu abàwo na nti Onye-nwe usu nile nke ndi-agha” (Jemes 5:4). Chineke naahcọ ka ndị naewe mmadụ n’ọlụ kwụọ ha ụgwọọlụ ziriezi, ma meso kwa ha n’ụzọ ziriezi, “nārapu iba-nba-unu;” nke a pụtara na ha agaghị eji ụtarị náachị ha n’ihi na ndịọlụ ahụ nọ n’okpuru ọchịchị nke ndị were ha n’ọlụ.

Irubere Iwu Isi

“N’ihi na Chineke abugh Chineke nke aghara, kama ọ bụ Chineke nke udo” (I Ndi Kọrint 14:33). Anyị aghaghị ilegharị anya gburugburu wee hụ ka ihe niile ekereèkè si ejégharị n’enweghị mkwụsị -- anyanwụ, ọnwa, na kpakpando niile bụ ihe nlereanya -- ịhụ usoro ha niile nke Chineke bụ Onye tọtọ ntọala ya. Ịhụ na mmadụ bikọtara n’otù obodo n’udo, ọ dị mkpà inwe iwu dị icheiche na ụkpụrụ dị icheiche nke gaanachị omume ha. Chineke bụ onye mere ya ka ọ dị otú a, wee nye Moses Iwu Ya ka ụmụ Israel wee mara otú ha gaesi naeme omume n’Ala ahụ nke Ekwere ná nkwà. Ọbụná taa anaasọpụrụ Iwu a dịka ntọala nke iwu niile nke naachọ obodo dị icheiche.

“Ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo” (Ndi Rom 13:1). Iwu niile dị icheiche nke mmadụ naenye iji mee ka ihe niile dị n’usoro ma dị kwa mma bụ uche Chineke. Ọ bụrụ na anyị anọgide nime ya, anyị agaghị atụ egwù n’ebe iwu ahụ dị. Ọ bụrụ na anyị erubereghị iwu ahụ isi, ọ bụghị náánị ndị naachịisi ka anyị gaatụ egwù, kama anyị ganaatụ egwù akọnauche anyị na kwa egwù Chineke. Ọ bụghị ihe dị mma n’ebe Onye Kraist nọ ilelị iwu, maọbu iwu nke ịga n’okporoụzọ iji hụ na anyị adabaghị ná nsogbu, maọbụ iwu banyere usoro nke ịchụnta ego anyị. “N’ihi ya ọ di nkpa ido onwe-unu n’okpuru ya, ọ bugh nání n’ihi iwu ahụ, kama ọ bụ n’ihi akọ-na-uche” (Ndi Rom 13:5).

Mgbe ụfọdụ ha naeji aghụghọ webata nime akwụkwọ iwu anyị iwu dị icheiche nke náemegide Iwu Chineke. Ndịa abụghị ezigbo iwu; onye Kraist aghaghị kwa ime ihe ọ bụla ọ pụrụ ime ịhụ na iwu ndịa adịghị irè. Enyere iwu nke gaegbochi Daniel ikpé ekpere, ma otú ọ dị o kpereekpere. Pita gwara ndị naachiisi sị “Ayi aghagh ikwenyere Chineke kari madu” (Ọlu Ndi-ozi 5:19). NdịKraist aghaghị ime ihe ruru ha n’oge ntụliaka maka ọchịchị na itimkpu megide iwu niile náezighịezi, na ndị naeme iwu nke náakwagide omume ọjọọ niile dịka ịñụmmanya na ịgba chacha. Site n’idebe iwu anyị niile ka ha dị ọcha, ndị niile nke naachọ ihe dị mma gaasọpụrụ iwu anyị, ma “Nākwughachinu madu nile ihe nile unu ji ha n’ugwọ: tunu ùtú nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia nye onye unu ji ugwọ ùtú-ahia; tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu; sọpurunu onye unu ji ugwọ nsọpuru” (Ndi Rom 13:7).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kwuo ụzọ ụfọdụ esi naekwulu òzízí niile nke Chineke.
  2. Gịnị bụ ihe ụfọdụ nke onye ewere n’ọlụ gaecheta banyere omume ya n’ebe ọlụ ya dị?
  3. Ọ bụrụ na ị naewere ọlụ gị dịka ihe ị naalụrụ Chineke, òlee otú ị gaesi lụọ ya?
  4. Gịnị bụ ndụmọdụ nke enyere ndị nwere nnaukwu kwereekwe?
  5. Kwuo ihe abụọ nke Chineke naachọ n’aka ndị naewe mmadụ n’ọlụ.
  6. Gịnị bụ omume Chineke n’ebe ndị naachọ obodo na iwu dị icheiche dị?
  7. 7 Kwuo ihe abụọ Onye nke Kraist gaeji sọpụrụ iwu obodo.

  8. 8 Kwuo otù ihe nlereanya banyere otù onye eziomume nke nupụrụisi n’iwu naezighịezi, ma kwuo ihe bụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.