Jemes 1:26; 3:1-18.

Lesson 359 - Senior

Memory Verse
“N’ọtutu okwu njehie adigh-akwusi: Ma onye nēgbochi ebughere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche: (Ilu 10:19).
Cross References

1. Isi-iyi nke Na-elu Ilu

1 Ire mmadụ nke anaapụghị ịkwa ngá bụ óké iheọjọọ, Jemes 1:26; 3:1-6; Abù Ọma 140:3; Ndi Rom 3:13.

2 Okwu Chineke amawo ụdị okwu ọjọọ ọ bụla ikpé, Jemes 3:7-12; 14:16.

(a) Ikwuokwuazụ: Abù Ọma 15:1-3; 50:19-23; 101:5; Jeremaia 9:3-5, 8; Ndi Rom 1:30; 2 Ndi Kọrint 12:20.

(b) Okwu efù: Job 11:2; 15:3; Ilu 29:11; Eklisiastis 5:3; 10:12-14; Taitọs 1:10.

(c) Ịgbasa akụkọ ọjọọ: Levitikọs 19:16; Ilu 17:9; 18:8; 20:19; 26:20; Ndi Rom 1:29.

(d) Ịnyaisi: Jemes 3:5; Ilu 27:1, 2; Matiu 6:2; Ndi Rom 1:30; 2 Timọti 3:2.

3 Chineke gaebibi ndị ahụ nke naekwu iheọjọọ, ma mee kwa ka nchepụta ọjọọ ha niile dakwasị ha onweha, 2 Pita 2:10-12; Jud 8:10, 14-16; Nkpughe 21:8; Abù Ọma 7:15, 16; 57:46; 64:1-9.

II Isiíyì nke Náatọ Ụtọ.

1 Mkparịta ụkà nke Onye Kraist bụ ihe banyere Eluigwe; okwu ya niile naeweli mmadụ niile elu dịka ụlọ, Jemes 3:13, 17, 18; Abù Ọma 15:3; Ilu 31:26; Ndi Efesọs 4:29; Ndi Kọlọsi 4:6; Taitọs 2:8; 3:2; I Pita 3:10, 11; Nkpughe 14:5.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Amara Ikwuokwu Ọjọọ Ikpé

“Umu nke aju-ala, ùnu gēsi aña pụ ikwu ezi ihe, ebe unu bu ajọ madu? N’ihi na ọnu nēsite n’ihe nke obi nwebigara ókù nēkwu okwu. Ezi madu nēsi n’ezi àkù-ya atuputa ezi ihe: ajọ madu nēsi kwa n’ajọ àkù ya atuputa ajọ ihe. Ma asim unu, na okwu ọ bula madu gēkwu nke nābagh n’ihe, ha gāza ajuju banyere ya n’ụbọchị ikpé. N’ihi na agēsite n’okwu ọnu-gi nile gu gi n’onye eziomume, agēsite kwa n’okwu-ọnụ-gi nile kpegbu gi” (Matiu 12:34-37).

Site n’okwu dị otú a ka Okwu Chineke ji ma ikwuokwu ọjọọ niile ikpé náemeghi ebere. Ire nke onye anaagbanwebeghi obi ya naawụpụ iheọjọọ mgbe niile dịka mmiri nime ụwa. Ọ bụ okwu dị óké mkpà n’ezie, na mkparịta ụka anyị niile kwa ụbọchị gaabịaghachị n’ebighiebi ikpụta anyị maọbụ ịma anyị ikpé n’iru Chineke! (Gụọ Jud, 8,10, 14-16.)

Ụdị ebe ọgụgụ dị icheiche n’Akwụkwọnsọ dịka nke a nakụziri anyị na ikwuokwu ọjọọ na omume nnupụisi niile megide Govment na Chineke Onweya naagakọ n’otù. Ọzọ kwa, agaekpé ndị náekwu okwu ọjọọ ikpé siriike dịka agaesi kpee ndị niile nupụrụisi megide Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na Chineke enyeghị ndị Mmụọozi ike ikpé onyeisi nke ndịiro nke ụmụmmadụ, bụ Setan ikpé mkwulu, ụdị nlezianya dị añaa ka ụmụmmadụ náaghaghị inwe n’ịgbalịsịike ijide inwe ha banyere ikwuokwu ọsọsọ maọbụ ikwu ihe ọjọọ megide onye ọ bụla maọbụ banyere onye ọ bụla maọbụ banyere onye ọ bụla.

Site n’ịgbaso òzízí niile nke dị n’Okwu Chineke, Pọl rịọrọ onyeisinchụàjà ahụ magbaghara bụ onye ọ naamataghị nkeọma, ọ bụ ezie na ọ dị ka agaasị na ikpé amaghị ya n’ihe o kwuworo [Gụa Ọlu Ndi-ozi 23:2-5; Ọpupu 22:28; Eklisiastis 10:20.]

Ire Agwọ

Otù nime iheagha kachasị nkọ nke ekwensu nwere bụ mmadụ ikwu ibe ya okwu azụ. Setan bụ “onye na-ebo” ụmụnna ebubo (Nkpughe 12:10); ekwenu naeduhie karị mmadụ mgbe ọ naeme ka onye ahụ náekwu ihe ọjọọ banyere onye ọzọ kwa mgbe kwa mgbe, ọ bụ ezie na ihe ọ naekwu nwere ike bụrụ eziokwu.

Ọlụ dịrị Onye Kraist ọ bụla karịrị ikwusa ndahie nke-nwa-nna ya nye ndi uwa; ọbụná mmehie ya ma ọ bụrụ na o mehieworo. Okwu Chineke sịrị “Umu-nnam, asi na ọ bụezie na anwude mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe-unu, bú ndi Mụọ Nsọ nāchi, menu ka mmadụ di otú a guzozie nime Mụọ nke idinwayọ; nēlezi onwe-gi anya, ka aghara inwa kwa gi onwe-gi. Nēburitanu ibu nānyi ibeunu, nēdebezu-kwa-nu iwu Kraist n’uzọ di otú a” (Ndi Galatia 6:1,2). Ọ bụ ihe ana-apughị ime bụ ịghọtahie okwu a wee were ya dịka ike nke enyere mmadụ, iji kwue mmadụ ibe ya okwu azụ banyere ndahie ya ma-ọbụ mmehie ya. Ọ bụ ọlụ ekwensu ibibi mkpụrụ -obi nke ụmu mmadụ; ma na-ekwu kwa ihe ọjọ banyere ndụ nke ụmụ mmadụ bụ nke na-adịghị ewuli mmadụ elu dịka ulọ, ma-ọbụ inye Chineke otuto, kama ọ bụ nanị inyere ekwensu aka.

“Onye nējeghari dika onye nāgba ama ọjọ nēkpughe izu nzuzu: ma onye mọ-ya kwesiri ntikwasi-obi nēkpuchi okwu” (Ilu 11:13) Ọzọ kwa, Onye nāgbakuta Chineke azụ nēzisa ise-okwu: ọzọ, onye nēkwu okwu azu nēkewa ezi eyi” (Ilu 16:28). Ndia bụ okwu ole-na-ole sitere n’Okwu Chineke banyere ikwu okwu azụ nke na-abaghị úrù ọ bụla na nke obi-ọjọ. Ọ bụghị ihe ngbagwoju anya na Jemes, site na mkpali Mụọ Nsọ, kwuwaputara eziokwu ahụ nkeọma mgbe o siri: “Ire bu kwa ọkụ, bú uwa ahụ nke ajọ omume: iro nēguzo n’etiti ihe niile di ayi n’arụ dịka ihe nēnye arụ dum ntupọ, nke nāfunwu ire ahu ọku” (Jemes 3:6).

Ịnyaisi

Ịnyaisi bụ kwa otù nime ihe ọjọọ nke dị n’ire mmadụ bụ nke apụrụ iji tụnyere okwu efù, ịgbasa akụkọ ọjọọ, na ikwuokwuazụ. Baịbụl naakọwa sị: “Onye nēkwu site na onwe-ya nāchọ otuto nke aka ya: ma onye nāchọ otuto nke onye zitere ya, onye ahụ bụ onye-ezi-okwu, ajọ omume adigh kwa nime ya” (Jọn 7:18). Mpako bụ otù nime mmehie nke náeweta ahụhụ ebighịebi. Mmadụ ịnyaisi banyere onwe ya bụ mkpụrụ nke sitere n’osisi nke mpako. Ihe náakpata ịnyaisi abụghị ihe ọzọ karịa mmadụ ime onwe ya ka amara na ọ bụ onye amaara aha ya, onye ebulikwara elu, na onye dị elu karịa mmadụ ọ bụla ọzọ. Ọtụtụ mgbe anaachọpụta na ndị ahụ nke náanyaisi bụ ndị náerughị ihe ahụ nke ha naeti n’óké olu na ha bụ, ọ bụ kwa n’ihi nke a ka ha ji ná anyaisi. Enwere ịnyaisi nke dị nke dị n’ibuagha nke ndị Kraist, nke ziriezi ma kwesịkwa ekwesị. Onye dere Abù Ọma kọwara ya sị, “JEHOVA ka nkpuru-obim gēji nya isi: ndi di ume-ala n’obi gānu ya, we ñuria ọñu” (Abù Ọma 34:2). OnyeKraist pụrụ ịnyaisi nke ukwu banyere Onyemgbapụta ya dị Ukwu, na óké ọlụ Ya niile n’ebe ụmụmmadụ nọ. Ma ịnyaisi ọ bụla nke anụarụ bụ mmehie!

Aha nke Onyenwe anyị

Onye Kraist nwere ihe mgbochi n’ebe ekwurekwu (ekwukwu) nke ire dị. Chineke ekwewo mkwà na Ya gaekpepụta ndị Ya site n’ebubo ụgha niile nke ekwensu gaeweta imegide ha. Okwu Chineke naakọwa sị: “Ulo-elu di ike ka aha JEHOVA bu: nime ya ka onye ezi-omume nāgbaba, o we nọ n’elu” (Ilu 18:10). Ndị eziomume pụrụ ịgbakwuru Chineke, ma nchebe Ya nke dị nsọ ka Ọ gaeji kpuchie ha site ná nhụju anya ọ bụla na n’ebe ire nke náekwu okwu nleli dị.

Iheọmụmụ banyere Abù Ọma nke iriisii na anọ naakụziri anyị ihe banyere ụzọ niile nke ndị ná emebiiwu si emehie na mmeri nke Chineke naenwe n’ebe ha nọ. “Ndi muworo ire-ha dika mma-agha, ha edowo àkú-ha, bu okwu di ilu: igba onye zuru okè ákú n’ebe nzuzo di iche iche: na mberede ka ha nāgba ya, ha adigh atu kwa egwù.” Ma gịnị bụ ihe nchebe nke onye eziomume n’oge dị otú ahụ? “Ma Chineke nāgba ha àkú; na mberede ka ntigbu niile ha bụ. Ewe me ka ha su ngọngọ, ebe ire nke aka ha nēmegide ha: ha nēfufe isi, bú onye ọ bụla nke nēlekwasi ha anya” (Abù Ọma 64:7, 8).

Heman bụ onye ya na eze dị ná mma, kwosoro Mọdekai ekworo ma chee kwa échìchè ime ya ihe ọjọọ. O jiri aghụghọ tụọ àtụmààtụ ibuli onweya elu na ibibi ndụ Mọdekai. Onyenwe anyị mere ka nzube ya bụrụ iheefù, ma ihe ọjọọ niile nke o zubere megide Mọdekai bịakwasịrị ya. Ma nsọpụrụ nke ọ chọrọ inye onwe ya ka enyere Mọdekai. (Lee Esta 7;10.) Otú a ka Chineke naatụgharị ire nke ndị náemebiiwu imegide onweha, Ọ naeji kwa mmebiiwu ha niile bibie ha.

N’ọgbọ garaaga ọ bụrụworị ihe ịnyaisi nke ndị ọchịchị akaike na ọ bụrụ na anọgide n’ikwu okwuụgha rue ọtụtụ ugbò na ụwa ga emesịa kwere ya dịka eziokwu. Ụwa naekwu kwa eziokwu mgbe ha naasị na ụgha pụrụ ịgaru ọkàrà ụwa mgbe eziokwu ka “na-ejikere.” Ndị nọ n’anụarụ pụrụ ịnabata ụdị okwu a, ma ụgha apụghị ịkwada eziokwu. Ọ dịghị kwa ụdị iheọjọọ ọ bụla nke pụrụ ibibi eziokwu. Jisọs kwuru sị, “Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu” (Jọn 14:6). Ọ dịghị okwuụgha ọ bụla nke ekwensu kwuwororị, maọbụ nke ọ gaje ikwu nwere ike ịgbanwe Ọkpara Chineke maọbụ Eziokwu nke Chineke ọbụná n’ụzọ dịkarịsịrị ntà. Eziokwu sitere na Chineke; ma eziokwu, náagbanyeghị ihe isiokwu ya bụ, apụghị ikewapụ ya site n’ebe Chineke nọ, n’ihi na Ya onweya bụ isiiyi nke ihe niile bụ eziokwu na ihe niile dị mma.

Iheọjọọ na okwuọjọọ niile si n’ebe ekwensu nọ pụta. Jisọs gwara ndị náeguzogide okwu Ya sị: “Unu onwe-unu sitere na nna-unu, bú ekwensu, ọ bu kwa ihe nāgu nna-unu ka unu nāchọ ime. Onye ahụ bu ogbu mmadụ site na mbu, o guzogh kwa n’ezi-okwu, n’ihi na ezi-okwu adịghị nime ya. Mgbe ọ bụla ọ nēkwu okwuụgha, ọ nēkwu ihe si n’ihe nke aka ya pụta: n’ihi na ọ bụ onye ugha buru kwa nna-ya” (Jọn 8:44). Ya mere ikwu okwuụgha maọbụ ihe ná abụghị eziokwu n’ụdị ọ bụla naegosi na onye ahụ naeso ụzọ ekwensu. Chineke agaghị ele okwuụgha anya ọma, ndị niile náekwu okwuụgha agaghị abata kwa n’Alaeze Chineke. “ Ọ dịgh kwa ihe ọ bụla emeruru emeru, ma-ọbụ onye nēme ihe-árú na ụgha, gaba nime ya ma-ọlị, kama ọ bu nani ndi edeworo aha-ha n’akwụkwọ nke ndụ Nwa-aturu ahu.” “N’azu obodo ka ha di, bu nkita niile, na ndi niile nāgwọ nsi, ma ndi niile nākwa iko, na ndi ogbu mmadu niile, na ndi niile nēkpere arusi, na onye ọ bụla nke nāhu ụgha n’anya nēme kwa ya” (Nkpughe 21:27; 22:15).

Obi nke OnyeKraist jupụtara n’ezi àkụ nke Onyenwe-anyị, ọ ghaghị ikwu otú ọ gaadị Onyenwe ya mma. “ Ma amamihe ahu nke si n’elu bia buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obiọma, nēkwenye okwu nkeọma, juputa n’ebere na ezi nkpuru, nēnwegh obi-abụọ, nēnwegh iru-abụọ. Ma ọ bu mkpuru nke ezi-omume ka ndi nēme udo nāgha n’udo” (Jemes 3:17, 18).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị mere ire ji bụrụ ihe nke náadịghị anọ n’okpuru iwu?

  2. 2 Gịnị mere Baịbụl ji sị na ọkụalammụọ bụ ihe náafụnwụ ire ahụ ọkụ?

  3. 3 Onye bụ nna nke ụgha na okwu ọjọọ niile?

  4. 4 Gịnị gaeme ndị niile náekwu okwu ọjọọ?

  5. 5 Òlee otú kwesịrị ndị nke Kraist iji náekwuokwu?

  6. 6 Gịnị mere na ndị Kraist agaghị eso n’ikwuokwu náabaghị n’ihe?

  7. 7 Ònye bụ onye ahụ nke náebo ụmụnna ebubo

  8. 8 Gịnị bụ ihe nchébe nke OnyeKraist nwere megide okwuazụ na nkwutọ?