Aisaia 55:1-13

Lesson 360 - Senior

Memory Verse
“Onye ọ bula nke gāñu miri ahu nke Mu onwem gēnye ya, akpiri agagh-akpọ ya nku ma-ọli rue mgbe ebigh-ebi; kama miri ahu nke Mu onwem gēnye ya gāghọ nime ya isi-iyi miri nāsuputa ri nne rue ndu ebigh-ebi” (Jọṅ 4:14).
Cross References

I Ọkpụkpọòkù Nye Ndị Akpịrị Naakpọnkụ

1 Agaeme ka afọ ju onye ọ bụla nke akpịrị naakpọnkụ nime mmụọ n’efu, Aisaia 55:1; Matiu 5:6; Jọn 4:14; Nkpughe 22:7.

2 Otù ndụmọdụ ka enyere ndị naachọ eziokwu site n’ụzọ náezighịezi, Aisaia 55:2; Eklisiastis 11:9; Luk 12:15, 19-21.

3 Eziri ozi, kwe kwa nkwà nye ndị niile gaaña ntị n’òkù nke Chineke, Aisaia 55:3; Ndi Rom 10:17; 2 Timọti 3:15; Ndi Hibru 6:17-19; 8:10 na 9:15; Abù Ọma 89:3, 27-35; Ọlu Ndi-ozi 2:29-5 na 2 Samuel 23:5.

3 Ekwere Kraist na nkwà dịka Onye Nzọpụta nke mmadụ niile, Aisaia 55:4, 5; Luk 19:10; Matiu 18:11-14; 1:21.

II Nzọụkwụ dị Ịcheiche Site ná Mmehie Rue Nzọpụta

1 Nzọụkwụ nke mbụ, “Chọnu JEHOVA,” naegosi ụdị ịnụọkụn’obi nke achọrọ n’aka onye ahụ nke nwere ezi nchégharị, Aisaia 55:6; Luk 11:10; Deuteronomi 4:29; Jeremaia 29:13.

2 Nzọụkwụ nke abụọ, “Kpọkuenu Ya,” naegosi mkpà nke ekpere dị, Aisaia 55:6; Hosea 14:2; Luk 18:13, 14; 2 Ihe Emere 7:14.

3 Nzọụkwụ nke atọ, “Onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya,” pụtara na ọ ghaghị ịrapụ mmehie ya, Aisaia 55:7; Ilu 28:13; Ndi Efesọs 4:21-23; Ezikiel 33:14-16.

4 Nzọụkwụ nke anọ, “Ya laghachikute kwa JEHOVA,” naegosi na nchégharị dị mkpà, Aisaia 55:7; Joel 2:13’ Abù Ọma 34:18; Luk 15:18, 19

5 Nzọụkwụ nke ise bụ ọzịzá amara nke Chineke: ebere na mgbaghara, Aisaia 55:7; Ndi Rom 2:4; Taitọs 2:11, 12; Luk 15:20.

III Owuweanya Enwere N’Okwu Chineke Maka Nzọpụta

1 Échìchè Chineke na ụzọ Ya niile dị elu karịa nke mmadụ, Aisaia 55:8, 9; Abù Ọma 8:1-9; 18:30; 40:5.

2 Okwu Chineke, dịka mmiriòzùzò aghaghị ịmịpụta mkpụrụ, Aisaia 55:10, 11; I Ndi Kọrint 3:6, 7.

3 Anaenye ndị niile chọtara nzọpụta óké ọñụ, Aisaia 55:12; 12:3; Abù Ọma 51:12; Ndi Rom 14:17; Jọn 15:11; 17:13.

4 Emere ka ihe dị iche dị n’etiti ndị náasọpụrụ Chineke na ndị náadịghị asọpụrụ Chineke, Aisaia 55:13; Abù Ọma 1:1-6.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Aisaia, Onye Amụma Nke Chineke

Aisaia, onye amụma nke Chineke, biri n’oge ndịeze anọ nke Juda. N’oge ọchịchị nke Hezekaia, mgbe eweghachiri òfùfù nke Chineke nke elefuworo anya, emere ka óké ntute dị n’alaeze ahụ, ụmụmmadụ nke mba ahụ wee laghachikute Chineke. Nke a bụ mgbe ndụ Aisaia nnabịaru ná njedebe, ma náagbaghị agụgọ, ọ bụ nlụpụta nke ijéozi nke nwoke a náasọpụrụ Chineke n’oge ọ dị ndụ Aisaia, site ná mkpalị nke Mmụọ Nsọ na odudu Ya, enyewo anyị ọtụtụ ihe nlebaanya nime atụmààtụ dị elu ma dị kwa ebube nke Chineke banyere ọbịbịa nke Kraist, mgbasasị na nlọghachi nke mba ahụ bụ Israel, na ọbịbịa nke ọgbọ nke Udo na Ókéọñụ nke Puku Arọ.

Ọ bụ ihe pụtara ìhè na, ka ọtụtụ nime amụma niile nke Aisaia buru naemetụta ndị Israel na mmeso ihe niile nke Chineke nye ha, ma ọ dị kwa ọtụtụ ndị matụtara Ndịmbaọzọ. Ebe Chineke nke ihe niile bụ kwa Chineke nye ndị niile, ebe Okwu Ya apụghị kwa ịgbanwe n’oge ọ bụla; ebe ọ bụ na Chineke naadị otú Ọ dị mgbe niile, Ọ dịghị agbanwe n’ụdị Ya na n’izuòkè Ya niile, ọbụná ebere Ya na ịdịmma Ya nke kachasị ntà apụghị ịgbanwe, ebe atụmààtụ Chineke wepụtara otù Mba a Arọpụtara iche, ịgọzi ha na ịkụziri ha ihe, ka ewee zọpụta ụwa niile, ọ bụghị ihe náezighịezi inwe olileanya na ozi Ya, nke O ziri site n’ọnụ Onyeamụma bụ onye o nwere ike itinye ọlụ nke Atụmààtụ ebighịebi Ya n’aka, gaagunye mmadụ nke oge niile na ebe niile.

Iwu ahụ dịka Moses nyere ya bụ ihe mgbakwasịụkwụ nke ịgan’iru na mkpughe nke atụmààtụ nke Chineke. Ndị amụma bụ ndịnkwusa, maọbụ ndị náakọwa Iwu ahụ. Agba Ọhụụ nke Akwụkwọnsọ kọwara ndị amụma dịka ndị náekwusa Okwu Chineke. Ibuamụma pụtara ikwusa Okwu Chineke. Onye ọ bụla nke náeweta ozi ọ bụla nke ya na Okwu Chineke náadakọtaghị bụ onyeamụma ụgha, ndị niile náasọpụrụ Chineke n’ezie aghaghị ịjụ ozi ya (Ndi Galetia 1:7-9; 2 Jọn 10, 11).

Òkù nke Chineke naakpọ Ụwa Niile

N’ebe a, n’ebe ọgụgụ a, anyị nwere okwu nke jikọtara ọtụtụ ihe banyere ozi nke Oziọma ahụ. N’ebe a anyị pụrụ ịgụta na Oziọma dịrị mmadụ niile -- ọgaranya na ogbaenye, ndị gụrụ akwụkwọ na ndị náagụghị akwụkwọ, ndị nwere onweha ndị anaemegbuemgbu. Ozi a naekwu na ọ dịghị onye agụpụrụagụpụ, ọ dịghị kwa onye echéfuruechéfu ná mkwà ya niile. Okwu ndịa naagbasa rue mba niile dịka “Onye ọ bula nke chọrọ” nke bụ okwu nke óké ịkpọókù nke ikpeazụ ahụ nke dị na Baịbụl.

Ka ndị niile náakụzi na nzọpụta Chineke dịrị mmadụ olenaole arọpụtara kọwara anyị eziokwu ahụ nke náasị na anaakpọ “onye ọ bula nke akpiri nākpọ kwa nku” ka ọ nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu. Ka ndị niile náatụgharị Okwu Chineke n’ụzọ dị otú a nwee afọojuju n’onweha, ma ọ bụrụ na ha rọọrọ ime otú ahụ, nime òzízí ha na ọkpụkpọòkù nke Chineke nwere ndị ọ gụpụrụ. Ndị niile náachọ ngọzi nke Chineke karịa ihe ọzọ ọ bụla gaachọta nkasiobi na olileanya nime eziokwu a nke bụ “onye ahu kwa nke nēnwegh ego” nwere ike ịbịa, zụrụ, rie kwa “nējigh ego nārugh ọnu ahia.”

Ọ dịghị nkọwa ọzọ okwu ndịa chọrọ. Ndị náachọ ịkọwa ha pụọ n’eziokwu nwere ike were ọtụtụ ịrụụka mee ka nchepụta ha guzo, ma ọkpụkpọòkù dị mfé nke Chineke naakpọ ụwa niile naeguzo rue mgbe ebighịebi náenweghị mgbanwe. Akọwapụtara ọkpụkpọòkù ahụ n’okwu olenaole nke pụtara ìhè, nke náadịghị emegide onwe ya. “Onye ọ bula nke nāga n’uzọ ọbuná ndi gbagọrọ agbagọ n’uche-ha, ha agagh akpafu akpafu” (Aisaia 35:8).

Oziọma niile nke Jisọs Kraist, n’òzùzùòkè niile nke ịmamma ya, pụtara nnọọ ìhè. Ọ bụ nnọọ ihe dị mfé, nke anaapụghị ịjụajụjụ banyere ya nke náenweghị ihe ọbiabụọ, nke náadịghị agbanwe kwa agbanwe. Ọ dịbeghị anụarụ ọ bụla bụ mmadụ nke ruworo ịdịelu niile nke ozi nke Oziọma ahụ, apụghị kwa ịchọpụta omimi ya niile n’ụwa nke a; ogologo na obosara nke ozi ahụ na nrọpụta ya niile bụ ihe anaenweghị ike inyochapụta -- maọbụ ichepụta ya n’obi. Ma náagbanweghị nke a ozi ahụ dị nnọọ mfé nke ukwu nke mere na ihe niile anyị kwesịrị ịmata banyere ya, ka anyị na Chineke wee mee udo, bụ nnọọ ihe anaaghọta nkeọma.

N’ebe a, n’ebe ọgụgụ anyị, edepụtara na ọ dị oge mgbe anyị nwere ike ịchọ Chineke, nke náegosi na oge ahụ nwere ọgwụgwụ. Òzízí a na òzízí nke Onyenwe anyị na nke Ndịozi nke náadakọta kwa. Ụbọchị ebere nke Chineke gaabịaru n’ọgwụgwụ, ụbọchị ikpé Ya ewee malite, dịka chiọbụbọ na ọgwụgwụ niile nke dịworo n’ezie siterị ná mmalite akụkọ nke òkìkè ụwa nke a.

Chineke nke Ebighịebi na Ọgbụgbandụ Ya n’ebe Anyị nọ

Chineke naadị rue mgbe ebighịebi n’ụdị Ya na ihe niile eji mara Ya, n’ihi nke a ụzọ Ya niile na échìchè Ya niile dị elu karịa nke anyị. Anyị bụ ndị ejiri ájá kpụọ; ma Ọ naadị rue mgbe ebighịebi. Chineke naahụzu obi mmadụ, ma anyị naele ihe anya naahụ. Chineke naahụ ihe niile ebu n’obi mee omume maọbu kwuookwu, ma anyị naahụ omume ahụ maọbu nụ okwu ahụ náánị. Chineke dịrịị site ná mmalite, dị kwa mgbe niile, zue òkè n’ịdịnsọ, ma anyị onweanyị siterị ná mmalite bu “anụarụ, erekwara anyị inọ n’okpuru mmehie.” Chineke enweghị njedebe n’ụzọ ọ bụla, ma ọ bụghị n’ihe mgbochi ahụ nke O debeworo nye OnweYa n’inye mmadụ ohere ịrọrọ ihe dị ya mma ime. Anyị naenwe njedebe, ebe anyị “ji enyo hu ihe, nime ilu,” anyị “makwara (náánị) na mkpirikpi.” Anyị matara na nzọpụta Chineke zuruòkè nye mmadụ niile, ịzọpụtachasị ndị niile nēsite n’aka Ya (Jisọs) abịakwute Chineke” Na, n’ihi ịdịukwu nke Chineke na enweghịike ịdaada Ya n’ihe niile, anyị pụrụ ịhụ na nzọpụta Ya dị obosara karịa náerubiga kwa ókè ná mkwadobe ya niile karịa ka anyị pụrụ ịghọta maọbụ ịmata.

Ọ bụrụ na anyị egee ntị wee bịakwute Chineke, nụrụ okwu amara Ya, ma nata kwa mkwà Ya niile dị ebube, anyị pụrụ ijidesi mkwà Ya ndịa ike banyere anyị: “Mu na unu gāgba kwa ndu, bú ọgbugba-ndu ebigh-ebi, bu ebere nile kwesiri ntukwasi obi nke emere Devid.” Nke a bụ kwa okwu ọzọ dị ịtụn’anya nke anyị náapụghị -- ime ụwa nke a -- ịghọta ya n’òzùzùòkè ya niile.

“Mu na unu gāgba kwa ndu, bú ọgbugba-ndu ebigh-ebi.” Ọ bụ náánị Chineke ebighiebi pụrụ ime ọgbụgba-ndụ ebighi-ebi. Mkwekọrịta niile nke ụmụmmadụ na ibeha maọbụ n’etiti mba na mba abaghị urù ọ bụla ma ọ bụrụ na ewezuga ike ahụ eji akwagide maọbụ emezu ya. Ọchịchọ niile nke mmadụ naadịgide náànị mgbe niile onye ahụ naadị ndụ naeme ka ha guzosieike, maọbụ dịka oge ahụ ra mgbe ndị náanọchi anya ya matara na ọ bụ ọlụ dịrị ha imezu ihe ndị ahụ. Ma mkwà niile nke Chineke enweghị ike ịdaada, n’ihi na Chineke apụghị ikwu okwuụgha, Ọ dịghị agabiga kwa agabiga. Ọ naasọpụrụ okwu Ya karịa ahaYa. Rue mgbe ebighiebi ka emeworo ka Okwu Ya guzosieike n’Eluigwe. Ma, iji gosi na échìchè-obi na ọchịchọ Ya n’ebe anyị nọ bụ ndị akpọkwasịrị aha Ya ma tinye kwa onwe anyị n’ijéozi Ya agaghị agbanwe, O nyeghị náánị Okwu banyere nke a kama O jiri ịñụiyi kwagide ya. Ma, “ebe Ọ nēnwegh onye ọ bula ka Ya uku iji ñu iyi, O ji Onwe-ya ñu iyi, … N’ihi na madu ji onye ka ha uku añu iyi: iñu-iyi bu-kwa-ra ha nkwubi-okwu nke okwu ọ bula, ime ka o guzosie ike. N’otù uzọ ahụ Chineke, ebe Ọ nēzube igosibiga ndi-nketa nke nkwa-Ya ókè kari na ìzi-Ya bu ihe nādigh-agha agha, Ọ were iñu-iyi gbo okwu: ka ayi we were ihe abua nādigh-agha agha, nke Chineke nāpugh ikwu okwu-ugha nime ha, nwe nkasi-obi siri ike, ayi bú ndi gbabára ijidesi olile-anya ahu ike, bú nke edebere n’iru ayi” (Ndi Hibru 6:13-18).

Òlee ndị bụ ndịa ha na Chineke gbara ndụ, nke OkwuYa n’onweya naakọwa na ọ pụghị ịgbanwe, nke O jiri ịñụiyi nke Ya OnweYa ñụrụ n’OnweYa mee ka O guzosieike? Ònye nime anyị tozuru ókè inwe ụdị ntụpụta ọma dị otú a na Onye-okike nke kachasị Ihe niile elu ga-enye ayị ezi ọdị-mma dị otú a maka oge a na kwa ebighiebi ayị, nke ayị na-apughị ịkwụ Ya ụgwọ ọ bụla ma-ọbụ gosi na ayị kwesịrị? Ònye bụ onye ahụ nke pụrụ iguzo n’iru Chineke n’ihi iziezi nke onwe ya ka ya na Chineke wee rụrịta ụka maọbụ lụọọgụ banyere ihe ruru ya maọbụ ihe o chere na o kwesịrị ka emere ya?

Ebe ọgụgụ nke iheòmụmụ anyị naegosi na ndịa nwere ohere ọma dị otú a, ndịnketa nke mkwà nke Ọgbụgbandụ ahụ, bụ ndị ahụ ndị agụụ naagụ na ndị akpịrị naakpọ kwa nkụ maka mmiri nke ndụ ahụ ndị náachọ kwa inwe afọojuju n’ihi agụụ na akpịrịịkpọnkụ ahụ n’ụzọ ziriezi. Ha “ahugh uwa, ma-ọbụ ihe nke di n’uwa n’anya” (I Jọn 2:15). N’akụku nke ọzọ, mmadụ ndịa bụ ndị “buru uzọ chọ ala-eze Chineke na eziomume-Ya” n’ihi nke a, wee hụ “ihe ndia niile” ka atụkwasị-kwa-ra ha” (Matiu 6:33).

Ọ bụ ndịa hụtara iruọma bụ ndị kwesịrị inwe ohere ọma dị otú a? Ọ bụ n’ihi iziezi ha, É-è! Hà kwesịrị inwe ihe ndịa? Site n’ihe ha pụrụ ịlụpụta maọbụ n’ihi ihe ha nwetaworo, ihenketa maọbụ dịka ọnọdụ diọkpara ha, n’ezie ọ bụghị n’ihi ihe ndịa! Hà bụ ndị zuruòkè, n’ụzọ niile ọ bụla, iguzo n’iru Chineke nke Pụrụimeihe-niile dịka mmadụ náeguzo n’ụlọikpé nke ụwa nke a, ikpé ọnụ na n’iru Chineke Nkepụrụ ime ihe niile? Onweghi ụzọ ọ bụla ha gaesi pụ ime nke a! Gịnị bụ kwa ihe mgbakwasịụkwụ nke esitere na ya mezuere mmadụ ndịa ahụrụ iruọma ihe ndịa ma nye kwa ha ohere ọma ndịa? Ọ bụ nàànị otù ihe: ebere na ịhụn’anya nke Chineke, Onye nyere Ọkpara nke Ọ mụrụ nàànị Ya ịkwụ ụgwọ nke mmehie anyị niile, erughịeru anyị niile, nlefuruanya anyị niile, ná adịghịike niile nke mmadụ, na ime ka ịkpáókè ghara kwa ịdị n’etiti Onyeòkìkè nke Pụrụimeihe niile na ihe O kèrèèkè.

Ebere Náenweghi Ọgwụgwụ Na Ịhụn’anya Nke Chineke Ebighiebi

N’ebe a, ka anyị naahụ ebere náenweghị ọgwụgwụ na ịhụn’anya nke náenweghị nsọtụ nke emere ka ọ pụta ìhè. Chineke achọghị ihe ọ bụla bụ nke anyị, ihe anyị bụ, maọbụ ihe anyị pụrụ ime. Anyị onweanyị, site n’ike nke ajọ nrọrọ anyị, agawo n’ụzọ nke aka anyị, wee lefuru Ya anya, leda kwa Ya anya, ma náajụ kwa Ya. Náagbanyeghị nke a Chineke ebere a edoziwo àtụmààtụ maka nnapụta anyị, nzọpụta anyị, na ime ka anyị nwe ebube. O nyewo anyị mpkụrụobi nke site n’ike nke okike Ya, náagaghị anwụanwụ. Ebe Chineke náadịghị agbanwe, ebe Ọ bụ kwa Onye zuruòkè n’ụzọ Ya niile, ọ bụghị nàànị na mkpụrụobi ahụ nke Ọ kụnyeworo nime mmadụ agaghị anwụanwụ, kama ọ pụghị ịnwụanwụ maọlị. Mkpụrụobi ahụ nke náanagide n’ilefuru Chineke anya maọbụ ịjụ Chineke gaanọ n’óké nhụjuanya rue mgbe ebighiebi.

Ọ bụghị uche Chineke ka onye ọ bụla laa n’iyi; ebe Ọ matara site ná mmalite ụgwọ dị óké egwù nke Ọ gaekwu ka wee gbapụta ọbụná otù mmadụ, O ji obi Ya niile kwụọ ụgwọ nke mgbapụta ahụ Ọ dịghị ihe ọzọ maọbụghị ebere náenweghi ọgwụgwụ na ịhụn’anya nke náenweghị nsọtụ bụ nke pụrụ ichepụta ụdị àtụmààtụ dị otú a, ntúa, nke etinyere n’ọlụ ka ndi niile ahụ ledaworo ebere na ịhụ-n’anya ahụ anya, ma asị na ha ga-echegharị ná mmehie na nnupụ-isi ha, pụrụ inwe nnapụta pụa n’ọnọdụ ọjọ ha ma mee kawa ka ha nọdụ-ala n’ebe niile dị n’eluigwe -- iruọma nke ha na-apụghị inweta n’onwe-ha maọbụ ịkwụghachị ụgwọ ya.

Ayị, dịka mmadụ, na-atụ atụmatụ dị iche iche iji mezue ọchịchọ ayị maọbụ ihe ọ bụla masịrị ayị. Tutu ayị amalite itinye atụmatụ ndia n’ọlụ ayị na-anọdụ ala wee gụkọọ ihe ọ gaefu nkeọma. Àyị gaenwe ike ịlụsị ọlụ ahụ? Àyị gaenwe ike ịlụsị ya na-etinyeghi ọlụ nke ọzọ ayị bu n’obi n’ihe-egwu? Ọlụ a n’onwe ya ọ ga-adịrị ayị mma maọbụ ọ gaabara ayị úrù dịka ayị si tụpụta ya? Ajụjụ ndia na ọtụtụ ndi ọzọ ka ayị gaedozi nkeọma tutu ayị amalite itinye aka n’ọlụ ahụ nke dị ayị n’iru. Ọtụtụ mgbe ana-arugide ayị, site n’ihe ndapụta, ịrapụ otù atụmatụ ka nke ọzọ wee nwee ọga-n’iru.

Ma n’ebe Chineke nọ ọlụ nke mgbapụta abụghị ihe echepụtara n’ikpeazụ maọbụ nke eji dochie ibe ya n’ihi ọdịda nke atụmatụ maọbụ usoro nke mbụ. Chineke matara siterị ná mmalite otú ihe niile nke dị n’iru na-aghagh ịdị. Ọ matara ihe niile ga-adị mkpa iji mezue ọchịchọ Ya banyere ayị. Ọ matara ụgwọ ahụ nke Ọkpara Ya ga-akwụ. Ma Ọ laghị azụ, ọ bụ ezie na ụgwọ ahụ bụ nke na-enweghị ọtụtụ.

Chineke tụrụ atụmatụ ahụ. Akwụ-kwara ụgwọ ahụ. Ọ bụ Ya-onwe ya kpọrọ òkù ahụ. O wee zipu Mmụọ Ya ka O duzie ụmụ mmadụ ịnabata Atụmatụ ahụ ma nata kwa nzọpụta Ya. Ọ na-etinye kwa akụkụ niile nke Atụmatụ ahụ n’ọlụ maka ebube nke ayị ga-eyikwasị n’oge dị n’iru…

Ọ gwawo ayị si: “Chọnu Jehova … kpọkuenu Ya … onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ ya onye nēme ajọ ihe, ya rapu echiche-ya niile: ya laghachi-kute kwa Jehova, Ọ gēnew kwa obi-ebere n’aru ya: ya laghachikute kwa Chineke-ayi, n’ihi na Ọ gāgbaghara ya nmehie-ya n’ụba”.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ndi enyere ịkpọ-òkù nke achọtara n’ama-okwu mbụ nke ihe-ọmụmụ ayị?
  2. Mụa I Jọn 2:15-17 n’isi.
  3. Òlee otú o si doo ayị anya na aga-agụnye ayị nime atụmatụ nke nzọpụta Chineke?
  4. Gịnị ọzọ ka Chineke mere, tinyere Okwu-Ya nke O nyere ayị iji mee ka nzọpụta Ya ruta ayị aka?
  5. Gịnị mere ụmụ mmadụ ji añụ iyi? Gịnị mere Chineke ji mee otú a n’ihe banyere nzọpụta ayị?
  6. Gụkọọ nzọ-ụkwụ niile nke eji erutr nzọpụta?
  7. Akwụkwọ nsọ na-ekwụpụta si: “Ọ bụ amara ka ejiworo zọpụta unu, site n’okwukwe,” Gịnị bụ amara? Gịnị bụ okwukwe? Òlee otú ayị si enweta okwukwe?
  8. Echiche Chineke na ụzọ-Ya niile dị elu karịa nke mmadụ. Gụkọọ ihe ụfọdụ na-egosi na nka bụ eziokwu. Òlee otú nka si metụta atụmatụ Ya banyer nzọpụta?
  9. Kpọọ aha ngọzi ụfọdụ ayị na-enweta site ná nzọpụta nke Chineke?
  10. N’iji Abù ọma 1 mee ebe-ọgụgụ, kọwaa ihe dị iche n’etiti onye na-aspụrụ Chineke na onye na-adịghị asọpụrụ Ya?