I Jọn 1:1-10; 2:1-17, 24, 25, 28, 29; 3:1-24; 4:7-21; 5:1-21; 2 Jọn 1-6, 12, 13; 3 Jọn1-8, 12-14

Lesson 361 - Senior

Memory Verse
“Ọ buru na onye ọ bula gāsi, anamāhu Chineke n’anya, ma ọ nākpọ nwa-nne-ya asì, ọ bu onye-ugha: n’ihi na onye nādigh-ahu nwa-nna-ya n’anya, bú onye ọ huworo ọ pugh ihu Chineke n’anya, bú Onye ọ nāhugh mgbe ọ bula” (I Jọn 4:20)
Cross References

I. Iso Chineke Nwekọ Ihe

1 Jisọs Kraist, mpụtaìhè nke ịhụn’anya nke Chineke n‘ebe anyị nọ, bụ náánị ntọala nke ọñụ ebighịebi, I Jọn 1:1-4; 2:25; 5:11-13; Jọn 3:14, 15, 36; Ọlu Ndi-ozi 4:10-12; Jon 17:2, 3

2 Chineke bụ ìhè, ndị ha na Ya naenwekọ ihe aghaghị ijégharị n’ìhè ahụ ma debe kwa iwu Ya niile, I Jọn 1:5-7; 2:3-6, 24, 28; 5:1-3.

3 Ụmụ Chineke naenwekọrịta ihe n’ebe ọ dị ukwu mgbe ha na ejégharị n’ìhè ahụ, I Jọn 1:7; 2 Jọn 1-6, 12, 13; 3 Jọn 1-4, 12-14

4 Mmadụ niile emehiewo, ma ndị náekwupụta mmehie ha niile nye Chineke náanata mgbaghara nke mmehie ha, I Jọn 1:8-10; 2:1, 2; Ilu 28:13; Aisaia 55:7; Ọlụ Ndi-ozi 3:19

5 Ndị hụrụ ụwa n’anya, ha na Chineke adịghị enwekọ ihe, I Jọn 2:15-17; Ndi Rom 12:2; Taitọs 2:12; Jemes 4:4.

II Ịbụụmụ nke Ndị Kwereekwe

1 Ịhụn’anya dị ukwu nke Nna akwụwoụgwọ ahụ ka ụmụndịkom nke mmadụ wee ghọọ ụmụndịkom nke Chineke, I Jọn 3:1-3; Jọn 3:16; Ndi Rom 5:8; Ndi Efesọs 2:4,5.

2 Ụmụ ndịkom nke Chineke -- ndị Kraist amụrụ ọhụụ -- adịghị emehie, I Jọn 3:4-10; 2:12-14, 29; 5:4, 5, 18-21; Ndi Galatia 6:7, 8; Jemes 1:27.

3 Ụmụ Chineke naahụ Ụmụnnaha náanya, I Jọn 3:11-19; 4:7-12, 20, 21; 2:7-11; 5:16, 17; Luk 10:25-37; Jọn 13:35; 15:12; I Pita 1:22; 3 Jọn 5-8

4 Irubeisi n’iwu Chineke náalụpụta okwukwe na ntụkwasịobi, I Jọn 3:20-23; 4:17-19; 5:14, 15; Jọn 15:7

5 Chineke naagbara ụmụ Ya àmà n’ikwesị ntụkwasịobi, I Jọn 3:24; 4:13-16; 5:6-10; Ndi Rom 8:16; Ndi Galetia 4:6.

Notes
NKỌWA DI ICHEICHE

Ịhụn’anya nke Chineke

Jọn, onye ahụ nke náeso ụzọ Jisọs nke náadabere kwa n’obi Ya ka anaakpọ mgbe niile Onyeozi nke ịhụn’anya, ọ bụghị náánị na ọ kpara nso Onyenwe anyị nime arọ atọ ahụ O jere ozi Ya nime ụwa, kama n’ihi òzízí ya nke náemetu n’obi n’ihe odide ya nile banyere ịhụn’anya Chineke. N’ihi na Jọn hụrụ n’onwe-ya ihe niile nke mere n’ijéozi nke Jisọs Kraist site ná mmalite wee rue n’onwụ Ya n’elu obe, wee hụ kwa ịdịirè nke ịhụn’anya Chineke n’ebe ya onweya na ndịozi ọzọ nọ, isiokwu nke ịhụn’anya Chineke bamiri nime obi ya. Mgbe ọtụtụ arọ gasịrị, site ná mkpali nke Mmụọ Nsọ, o dere ọtụtụ ihe banyere isiokwu dị mkpà.

“Chineke bụ ịhụ-n’anya,” ka Onyeozi ahụ dere; ịhụn’anya ahụ pụtakwara ìhè nkeọma site n’inye Ọkpara Ya nke O mụrụ náánị Ya ịgbapụta ụwa. “Ọ biakutere ihe nke aka-Ya, ma ndi nke aka-Ya akpọbatagh Ya. Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka O nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n’aha-Ya” (Jọn 1: 11, 12).

Jọn bụ otù onye nime ndị ahụ nke kwere ma nabata kwa Jisọs, Ọkpara Chineke. Mgbe Jisọs laghachirị n’Eluigwe Jọn ghọtara n’ọtụtụ dị ukwu ohere ahụ dị ebube nke o nwererị n’ihi na ya na Jisọs anọworị. Jọn pụrụ ikwu dịka onye hụrụ ihe n’onwe-ya, site n’obi jupụtara m’amamihe banyere ndị mkwutọ ahụ ndị náasị na Jisọs bụ náánị ezi onye na onye òzịzí: “Ihe nke diri site na mbu, ihe ayị nuworo, ihe ayị jiworo anya ayi hu, ihe ayi kiriri, nke aka ayi detu-kwa-ra, banyere Okwu nke ndu ahu” (I Jọn 1:1). Anụarụ na ọbara ekpugheghị eziokwu a dị ịtụn’anya, nke náadị kwa ebighiebi nye Onyeozi ahụ ahụrụn’anya, kama Chineke Nna kpughere eziokwu a site n’Eluigwe. (Lee Matiu 16:15-17).

Mnwapụta nke Ọmụmụ Ọhụụ

Jọn nwere amamihe nke sitere ná mnwapụta banyere Jisos, ma ụdị amamihe a dịkwara mmadụ niile. Jisọs gwara Tọmas sị: “N’ihi na ihuwom, Ì kwerewo? ngọzi nādiri ndi akāhugh, ma ha kwere” (Jọn 20:29). N’ihe odide niile nke Onyeozi a, ekwusirị otù eziokwu ike bụ nke Jisọs kuziri n’oge ijéozi Ya; nke bụ, na ịmara Jisọs na ikwere na Ya karịrị ịmara Ya maọbụ ikwere na Ya n’okpokoroisi. Nke a bụ eziokwu dị mkpà, n’ihi na ọtụtụ ndị náekwupụta taa na ha bụ ndị nke Kraist erubeghị ebe ọ bụla ma ọ bụghị náánị ịmara Jisọs n’okpokoroisi, ha naakpọ kwa nke a “Okpukpé nke NdiKraist.”

Apụrụ ịmara Jisọs site nánnwapụta náánị mgbe ụmụmmadụ kwupụtara mmehie ha niile ma rapụ kwa ha aka wee náejégharị n’ìhè niile nke Okwu Chineke. Ihe Baịbụl naakpọ ikwere na kraist bụ irubeisi n’iwu Ya niile. Mgbe mmadụ bịakwutere Chineke n’ụzọ dị otú a, kwupụta mmehie ya niile ma rapụ kwa ha aka, náekwere na Jisọs Kraist na mgbapụta ahụ nke Ọ zụtara ụmụmmadụ site n’ọnwụ Ya n’elu obe, Chineke kwesịrị ntụkwasịobi ma bụrụ kwa Onyeeziomume ịgbaghara mmadụ ahụ mmehie ya niile. Ụdị mnwapụta dị otú a n’ebe Chineke nọ ka anaakpọ ịbụ onye amụrụ ọhụụ. Ọ bụ onyinye amara dị mkpà nke onye náeweghị ya agaghị ahụ Alaeze Chineke anya. (Lee Jọn 3: 1-8.)

Ụmụndịkom nke Chineke

Mnwapụta nke onyinyeamara ahụ bụ ọmụmụ ọhụụ naagbanwe mmadụ nke ụwa (náagbanyeghị maọbụ onyenwere omume ọma maọbụ onye nwere omume ọjọọ, náagbanyeghị otú o si dị elu n’ihi mnweta nke ụwa maọbụ otú o si bamie nime mmehie) wee mee ka ọ bụrụ nwa Chineke. Anaewzuga ịhụn’anya n’ebe ihe nke ụwa dị, ewee mee ka ịhụn’anya nke Chineke were ọnọdụ ya. Amamikpé naesi n’obi ahụ pụọ, ịtụkwasị Chineke obi amalite nke náeto, náeto dịka nwa Chineke ahụ naejéijè n’ìhè nke Okwu Chineke. Mmụọ nke Chineke naagbara mmụọ nke ụmụ Ya àmà mgbe niile na ha bụ ụmụ Ya.

Ngọzi niile ndịa nke dị ebube, na ọtụtụ ndị ọzọ náabịakwasị ụmụ Chineke n’ihi ịhụn’anya pụrụ iche nke Nna ha. Ọlụ ukwu ọzọ nke anaalụ nime obi mmadụ site na mgbapụta na ịmụbata nime èzínaụlọ nke Chineke bụ olileanya nke náegosị na otù ụbọchị ụmụ Chineke gaahụ Chineke otú Ọ dị. “Onye ọ bụla nke nwere olileanya nka n’ebe Ọ nọ, ọ nēme kwa onwe-ya ka ọ dị ọcha, dika Ya onwe-ya dị ọcha” (I Jọn 3:3). Chineke naazọpụta otù mkpụrụobi site ná mmehie ya nile, ọ bụrụ kwa na onye ahụ anọgide nime nzọpụta ahụ ọ gaabụ onye ganaétóétó n’amara site n’oge ahụ rue mgbe ọ gaaba n’Otuto.

Ọ dịghị mmehie ọ bụla nke dị ná ndụ nke ụmụChineke. Mmehie bụ imebi iwu nke Chineke, emekwara ka Jisọs Kraist pụta ìhè ka O wee hichapụ mmehie. Ọ dịghị mmehie dị nime Kraist, “Onye ọ bụla nke nānọgide nime Ya adigh emehie: onye ọ bụla nke nēmehie ahụgh Ya anya mgbe ọ bụla, ọ magh kwa Ya” (I Jọn 3:6). Onyeozi ahụ, nke ji anya ya hụ ike nke ihe ịrịbaama nke Jisọs ma bụrụ kwa onye ñara ntị nkeọma ná mkparịta ụka na ndụmọdụ Ya niile, nwere ezi nkọwa banyere ndịa naakpọ onweha ndị Kraist ma ha náeme mmehie. Site na Mmụọ Nsọ Onyeozi a kwuru na ọ bụ ihe anaapụghị ime ịbụ nwa Chineke ma náeme kwa mmehie. “Onye ọ bụla nke amụworo site na Chineke adịgh-eme nmehie, n’ihi na mkpuru-Ya nādigide nime ya: ọ pụgh kwa imehie, n’ihi na amuwo ya site na Chineke” (I Jọn 3:9). Chineke naagbanwe mmadụ náewepu kwa agụụ nke mmehie site n’obi mgbe amụrụ onye ahụ ọzọ site na Chineke.

Ịhụn’anya N’ebe Ụmụnna nọ

“Nime nka ka ihụ-n’anya dị, ọ bụgh na ayi onwe-ayi huru Chineke n’anya, kama ọ bu na Ya onwe-ya huru ayi n’anya, we zite Ọkpara-Ya ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi banyere nmehie-ayi. Ndi m’huru n’anya, ọ buru na Chineke huru ayi n’anya. otú a ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ ihurita onwe-ayi n’anya” (I Jọn 4:10, 11). N’ebe a ka emere ka odooanya na ọ bụghị ihe enyere ụmụ Chineke ịrọrọ ma ha gaahụ nwanna ha n’anya maọbụ na ha agaghị ahụ ya n’anya, n’ihi na nke a bụ iwu pụtara ìhè nkeọma. Nime akwụkwọ nke Agba Ọhụ niile anyị naahụ na ọtụtụ nke ịhụn’anya nke mmadụ nye Chineke naapụta ìhè n’ịhụn’anya ya maọbụ enweghị ịhụn’anya n’ebemmadụ ibe ya nọ. “Ọ buru na ayi ahurita onwe-ayi n’anya, Chineke nānọgide nime ayi, emewo kwa ka ihu-n’anya-Ya zue okè nime ayi” (I Jọn 4;12).

N’obi nke onye-Kraist ahụ ịhụ-n’anya ya n’ebe mmadụ ibeya nọ adịghị ebute ihụn’anya ya n’ebe Chineke nọ ụzọ, kama ha abụọ bụ ihe ekekọtara n’otù. Obi nkume na ihụn’anya nke Chineke enweghị ike ibi n’otù ebe. Ụfọdụ mmadụ nwere ojujuafọ ịhụ ndị enyi ha na ndị ikwu ha n’anya, ma kpọọ ndịiro ha asị. “Ma Mu-onwem si unu, nāhunu ndi-iro unu n’anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsogbu unu; ka unu we buru umu nke Nna-unu nke bi n’elu-igwe” (Matiu 5:44, 45).

Ịhụn’anya a nke anaenwe n’ebe ụmụnna nọ abụghị nke mmadụ meere, n’ihi na ọ bụ Chineke naetinye ya nime obi mmadụ. Mnwekọrịta nke Chineke nke ndị nke Chineke naagakọrita (maọbụ naaga aka na aka) -- mmadụ agaghị enwe otù nime ha wee ghara inwe nke ọzọ. Apụghị inwe akpụrụakpụ ná mnwekọrịta; n’ihi náasụgharị n’etiti mmụọ nke ụmụ Chineke. Mgbe egbubiri nnwekọrịta nke dị n’etiti mmadụ na Chineke, mgbe ahụ egbubiwo kwa nnwekọrịta nke dị n’etiti onye ahụ na ụmụ Chineke.

Òlee ebe ịhụn’anya nke ụmụnna kwesịrị iru? Ọ ghaghị iru nnọọ n’ebe o zuruókè nke gaeme ka nwa Chineke mee ka nwanna nke nọ na mkpà soro ya keta ókè n’iheoriri maọbụ n’ihe onwunwe ya. Náagbanyeghị otú ọ bụla mmadụ si ekwupụta na ya bụ onye Chineke, ọ bụrụ na o nweghị ọmiko n’ebe mmadụ ibe ya nọ ná mkpà nọ, ọ pụtara na eziokwu adịghị ná mkwụpụta ya. Mmụọ Chineke kwupụtara na dịka Kraist tọgbọrọ ndụ anyị, n’otù aka ahụ kwa na “ayi onwe-ayi ji kwa ugwọ itọgbọ ndụ ayị n’ihi umu-nna-ayi” (I Jọn 3:16). N’oge nke Ndịozi igbummadụ n’ihi okwukwe ya bụ ihe naeme mgbe niile, náagbaghịagụgọ ọ bụ ihe dị mfé otù onye nime ụmụ Chineke inye ndụ ya iji nápụta ndụ nke ọtụtụ mmadụ maọbụ kwa nke otù mmadụ. Ịhụn’anya n’ebe ụmụnna nọ ekwesịghị ịdị ala n’ụbọchị taa. Onye nke náenweghị ike iwere ihe oriri ya nye onye agụụ naagụụ agaghị enwe kwa ike ịtọgbọ ndụ ya n’ihi ụmụnna.

Onyeọkàiwu ahụ jụrụ ajụjụ sị: “Onyeozizi ọ bu gini ka m’gēme ka m’we keta ndụ ebigh-ebi?” Jisọs wee jụọ onyeọkàiwu ahụ ihe edere n’iwu banyere ajụjụ a, ma onyeọkàiwu ahụ kwupụtara ya. Jisọs wee sị: “I zara nkeọma: me nka i gādi kwa ndụ: (Luk 10:25, 28). Gịnị ka onyeọkàiwu ahụ zara? “Hu Onye-nwe-ayi Chineke-gi n’anya site n’obi-gi dum were kwa nkpuru-obi gi dum, na ike-gi dum, na uche-gi dum; hu kwa onye-agbata-obi-gi n’anya dika onwe-gi” (Luk 10:27). Nke a pụtara na ịhụn’anya a gaewetara onye ahụ nke nwere ya ndụ ebughịebi. Dịka ọtụtụ mmadụ n’ụbọchị taa, onyeọkàiwu ahụ chọrọ ịgụ onweya n’onye eziomume, n’ihi nke a ọ jụrụ Jisọs ka ọ kọwara ya onye bụ onyeagbataobiya. Jisọs kọọrọ ya akụkọ banyere Onye Sameria Ọma ahụ wee jụọ onyeọkàiwu ahụ onye o chere na ọ bụ onyeagbataobi nke onye Juu ahụ nke dabara n’aka ndị náapụnara mmadụihe. Eleghịanya onyeọkàiwu ahụ kpọrọ Ndị Sameria asị, dịka ọtụtụ nime Ndị Juu mere, n’ihi na ọ kpọghị ya aha, kama ọ nabatara eziokwu ahụ: “Onye ahụ nke mere ya ebere.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ya “Ga, gi onwe-gi me kwa otú ahụ” (Luk 10:37).

Cheta, na akụkọ banyere Onye Sameria Ọma ahụ naekwu ihe banyere ndụ ebighiebi. “Ònye bu onye-agbata-obim?” Ajụjụ ahụ metutara ndị niile gaachọ ịbà n’Eluigwe. Onyeagbataobi anyị bụ onye ọ bụla nke anyị nwere ike imere iheọma, maọbụ onye nke anyi, nwere ike ịkpọtara Chineke.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú o si dị mfé mmadụ na ụmụ Chineke inwe mnwekọrịta?
  2. Òlee ndị mehieworo n’etiti ụmụ mmadụ?
  3. Òlee otú o si bụrụ ihe dị mfé ịgbaghara mmehie anyị?
  4. Gịnị naeme mgbe mmadụ naachọ ịhụ ụwa na Chineke n’anya n’otù mgbe ahụ?
  5. Òlee ndị bụ ụmụ ndịkom nke Chineke?
  6. Gịnị mere mmehie apụghị ịdị ná ndụ nke nwa Chineke?
  7. Gịnị mere o ji dị mkpà ka ụmụ Chineke nwe ịhụn’anya n’ebe ụmụnna ha nọ?
  8. Ọ bụ rue otú ra añaa ka nwa Chineke gaegosipụta ịhụn’anya n’ebe nwannaya nọ?
  9. Òlee otú o kwesịrị ụmụ ndịkom nke Chineke iji mesoo ndị náezi òzízí ụgha?