Nehum 2:3, 4; 2 Timọti 3:1-5; 2 Pita 3:3,4; Jemes 5:7, 8; Matiu 24:3-28

Lesson 362 - Senior

Memory Verse
“Ma mara nka na oge di oké egwu gābia na mgbe ikpe-azu. N’ihi na madu gābu ndi nāhu nání onwe-ha n’anya, ndi nāhu ego n’anya, ndi nānya isi, ndi npako, ndi nkwulu, ndi nēkwenyeghi ndi muru ha, ndi nēnwegh-ekele, ndi nādigh ọcha n’obi, ndi ihe madu-ibe-ha nādigh-atọ utọ, ndi nādigh agba ndu, ndi nēbo ebubo ugha, ndi nādigh ejide onwe ha, ndi di ka anu-ọhia, ndi nādigh ahu ezi ihe n’anya, ndi nārara madu nye n’aka ndi-iro-ha, ndi-isi-ike, ndi afuliworo elu, ndi nāhu ihe-utọ n’anya kama ihu Chineke n’anya; ndi nēnwe udi nke nsọpuru Chineke, ma ha agọwo ike-ya; gi gbakuta kwa ndia azu” (2 Timọti 3:1-5).
Cross References

I Ihe Ịrịbaámá Enyere Nime Akwụkwọ Nke Nehum na Nime 2 Timọti

1 Egosịpụtara nkeọma ihe banyere ụgbọala, Nehum 2:3, 4.

2 Eburu amụma banyere igbutusi osisi fir, Nehum 2:3

3 Enyere nkọwa zuruòkè banyere ọnọdụ ọjọọ niile nke akparamaagwà nke oge ikpeazụ, 2 Timọti 3:1-5, 13; Jemes 5:5.

II Ihe Ịrịba-Ama dị IcheIche nke Pita na Jemes Nyere

1 Ndịọchị gaakụzi òzízí banyere nnwoghapụta (Evolution), 2 Pita 3:3, 4; Ndi Rom 1:20-22.

2 Nchịkọbata maọbụ owuweiheubi ahụ gaadị mgbe mmiriòzùzò nke ikpeazụ gasịrị, Jemes 5:7, 8; Joel 2:23-29; Ọlu Ndi-ozi 2:16-18.

III Ihe Ịrịbaámá dị Icheiche nke Matiu Nyere

1 Ọtụtụ ndịamụma ụgha gaebili, Matiu 24:3-5, 11, 23-26; I Timọti 4:1-3; I Jọn 2:18.

2 Ọgbaaghara gaadị n’ụwa niile, Matiu 24:6, 7; Mak 13:7, 8; Luk 21:9, 10.

3 Ókéụnwụ, ọria náeféefè, na alaọmajijiji gaadị kwa n’ebe dị icheiche, Matiu 24:7, 8.

4 Agaakpagbu kwa ndị Juu, Matiu 24:9, 10; Jọn 16:2; Emos 9:9, 10.

5 Ndapu n’okwukwe gaadị kwa, Matiu 24:12, 13; 2 Ndi Tesalọnaika 2:3.

6 Agaekwusa kwa Oziọma ahụ nye mba niile nke ụwa, Matiu 24:14; 28:19, 20.

7 Ekwukwara ihe banyere Mkpagbu Ukwu ahụ nke gaje ịbịa, Matiu 24:15-22; Daniel 12:1.

8 Ọbịbịa nke Onyenwe anyị gaadị ngwangwa dịka àmụmà, Matiu 24:27, 28, 42-44.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Mkpọtụ nke Ụgbọala Niile Ahụ

Ọ kaerughị otù narị arọ mgbe ndị nna anyị ochie ha nyara ọgbọala nke ehi naadọkpụgharị n’okporo-ụzọ nke ana-edozighị nkeọma ijéru ọnụmmiri nke ọdịdaanyanwụ America (U.S.A.). Ma taa nde narị ụgbọala ise naagba óké ọsọ ịgabiga n’okporoụzọ ukwu ndịa maramma iru akụkụ niile nke ala ahụ. Ihe egwù niile nke okporoụzọ agbanwewo kwa, site n’ihe anaahụ n’India, ebe anaenwe mkpọrịkọta nke ụgbọala kwa ntabianya iriabụọ na isii anọ ọ bụla, naemerụ kwa otù onye arụ kwa n’ihe ra ka ntabi-anya iri abụọ na isii ọ bụla n’okporo-ụzọ, ebe otù onye naanwụ nime nkeji iri na anọ ọ bụla. Ọ dị onye ọ bụla pụrụ inwe nlepụanya banyere mgbanwe dị otú a? Ọ bụ ihe siriike. Ma, chere; nka bụ onye-amụma nke dere ihe odide n’ihe ra ka arọ 2,700 gara aga: “Igwè nēgbupu ka ụgbọ-ala ya nwere … n’ezi nile ka ugbọ-ala nile kpọtuworo nkpọtu nke-uku, ha nāgbaghari iru na àzú n’ama nile: ha di ka ọwa nēnwu enwu n’ile ha anya, dika àmumà ka ha nāgba ọsọ” (Nehum 2:3, 4). Lee ụdị nkọwa dị otú a -- “dika ọwa nēnwu enwu” -- ọkụiru emechiziri nkeọma náewezuga ọchịchịrị n’iru ha; “kpọtuworo nkpọtu n’ezi niile” -- igbu opi nke enweghị ogologontachiobi, dịka onye chéworo ogologo oge maka ihentuziaka nke ebe ọ chọrọ ịga; “nāgbaghari iru na àzú” (maọbụ náakụkọrịta onweha) -- mkpọkọrịta 8,930,000 ka anaenwe n’otù arọ; “n’ama niile” (maọbụ n’ụzọ awaraawàrà niile) -- ahịrị ụzọ asatọ naeduba nime obodo anyị niile mepereemepe; “gadi ka ọwa nēnwu enwu” -- pụta, n’ebe apụrụ ịhụ ha nkeọma lee ha anya n’otù abalị nke óké ọchịchịrị; “dika àmụmà ka ha nāgba ọsọ” -- kilomita abụọ n’otù nkeji naadị ka ihe náaga nwayọ nwayọ n’okporoụzọ awaraàwàrà anyị niile. Nehum gaekiriworị ụgbọala anyị ndịa.

Gịnị mere eji were mkpughe dị otú a nye onyeamụma ahụ? Gịnị ka nke a naegosịpụta? Ọ naegosị “ụbọchị mkwadobe ya.” Enyere ihe ịrịbaámá ndịa ka ewee kpọtee ụmụmmadu ijikere maka ọbịbịa nke Onyenwe anyị. Ka anyị tụgharịa uche n’iheịrịbaámá ndịa ya na ihe ịrịbaámá ndị ọzọ banyere ọbịbịa Ya.

Osisi

“Emewo ka osisi fir me nkpatụ nke-uku” (Nehum 2:3). Mgbe anyị nyara ụgbọala ịgaru ọnụmmiri site n’otù nime ụzọawaraawara anyị nke dị n’Oregon, anyị gafere otù óké ọhịa maramma nke jupụtara n’ọtụtụ osisifir nke toro ogologo. N’ịkwụsị ụgbọala ka anyị zutu ike n’okpuru ndo nke ókéọhịa ahụ jupụtara n’akwụkwọndụ, anyị wee nwee mmetuta nke ịdị ntà anyị na nke náánị anyị na ihe ekérèèkè ịnọpụ ichè. Anyị wee zọọ nzọụkwụ olenaole ịbà n’óké ọhịa ahụ. Ìhè wee nwụpụta site n’osisi ndị ahụ, ọ bụ alaahịhịa ka ọ bụ ọdọmmiri? Nchọpụta naegosị ọtụtụ ugwu nke tọgbọrọ n’efù. Na mberede anyi nwere ihenwute mere anyị ka ndị si n’ụra teta ịmata na anyị nọ n’osisifir ndị ahụ kpuchiworo ugwu ahụ niile na mbụ. Emewo ka osisifir mee mkpatụ nke ukwu. Ọ bụ ụbọchị ndozi maọbụ njikere Ya. Ná mmalite ọ dị ka o nwere ihe ntà jikọrọ osisifir ndị ahụ na ụgbọala n’amụma Nehum buru. Ma ka anaanya ụgbọala ịrịda okporoụzọ awaràawarà ahụ, ka anaahụ ụgbọala nke a na nke ọzọ naagafe, náebu kwa nnukwu ogologo osisi náagbasi kwa ike iru ebe anaawa osisi. Anyị naahụ otú ụgbọala si bụrụ ihe nwere mmekọrịta n’ọlụ nke igbutu osisi n’oge a apụtawo, dịka anụmmiri ogologo nke nwere aka asatọ, nime ọhịa niile anyị nke anaasụchaghị asụcha, ime ka osisifir niile mee mkpatụ nke ukwu.

Mnwoghapụta

“Dika ha juru inọgide n’imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n’aka uche ajuru aju” (Ndi Rom 1:28). N’ọgbọ ndị garaaga, ụlọakwụkwọ nke ntà na nke ukwu ndị kwesịrị ịbụ ebe ịkwadobe ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa abụrụwo ndị emere ka ha kwere n’òzízí nke nnwoghapụta nke náekwu na Chineke abụghị Onyeòkìkè nke ihe niile, na kwa na Baịbụl adịghị n’usoro nke óké iheọmụmá (science) na ọ bụ kwa ihe oge nke ya gafeworo, na ụmụmmadụ bụ chi, na ụmụmmadụ anọghị n’okpuru iwu nke Chineke maọbụ nke mmadụ, na kwa ikwu na Eluigwe na ọkụalammụọ adịghị. Nke a ka ha naekwu, “Gịnị gēeme ka madu ghara ịbanye taa n’ihe ọ bula na ihe nile nke ya na anu-aru ya nāchọ?”

Òzízí nke iheọmụmụ nke nwoghapụta agbasawo n’ụwa niile. “Ọ dibegh nchepụta ọhu ọ bula ọzọ,” ka otù onye odeakwụkwọ sịrị, “Ka mgbe ọbịbịa nke Kraist na odide nke Testament Ọhụ nke nweworo ike ịgbanwe akụkụ niile nke échìchè mmadụ, dịka òzízí nke nnwoghapụta meworo, nke ka nke site na mgbe ebipụtara akwụkwọ nke Darwin anaakpọ Mmalite nke ihe niile dị N’ụwa n’arọ 1859.” Ma eleghịanya, anyị pụkwara ịtụkwasị na nke a na ọ dịbeghị kwa nchepụta ọzọ nke nweworo mmetụta ọjọọ gafere ókè a.

Pita buru ụzọ kwuo na iheámá nke ọgwụgwụ oge gaabụ “Ndi-ọchị, nāga dịka agu ihe ọjọ nke aka ha si di, nāsi kwa, òle ebe nkwà nke obịbịa Ya di? n’ihi na site n’ubọchi nna-ayi ha dara n’ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site ná nmalite nke òkíkè” (2 Pita 3:3, 4). Ọtụtụ mmadụ taa naegosi na ha kwere na Chineke, na ha bụ kwa ndị náanabata iheọmụmụ nke mnwoghapụta náagọnarị kwa ihe edere na Baịbụl banyere òkìkè. Ha naagọnarị Chineke Onye keworo ha wee guzobe chi nke ha onwe ha mere. Ịchịọchị ha naabịa dịka ihe ịdọakanántị nye ezi ndị ahụ kwereekwe na oge ndịa bụ ụbọchị ikpeazụ.

Agụụ Iheọjọọ na Agha

“Nāga dika agụ ihe ọjọ nke aka ha si di” emewo ka ọgbọ a náanọgide n’ọnọdụ ibuagha mgbe niile. “Òlee ebe ibua-agha si bia, ole ebe kwa ilụ-ọgù si bia, bu nke di n’etiti unu? Ọ bụgh n’ebe ahu, bu ihe utọ nile unu nke nēbu agha n’ihe nile di unu n’arụ, ka ha si bia? Agụ nāagụ unu, ma unu enwegh: unu nēgbu madu, nēkwo kwa ekworo, unu apugh kwa ihu ihe unu chọrọ: unu nālu ọgu, nēbu kwa agha” (Jemes 4:1, 2). “Mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ” (Matiu 24:7). Ịlụọgụ a nke Jisọs kwuru na ọ bụ iheàmà nke ọbịbịa Ya naepupụta site n’agụụ nke ọchịchọ obi nke wezugara Chineke n’ocheeze ma were kwa mmadụ dochie n’ocheeze ahụ.

Obi ọ bụla nke arapụrụ ka ọ nọgide n’agụụ iheọjọọ nke aka ya naadapụ ngwangwa site n’ọnọdụ ọma mbụ ya nke ọ nọrịị nime ya, otú ọ dị ọ bụ n’ụbọchị taa ka anyị nọ n’etiti oge ahụ nke Pọl kọwara dịka ụbọchị dị óké egwù nke oge ikpeazụ. Mmadụ nke nwere mpako nime ya naanyaisi naamamihe ya na ihe ọ pụrụ imepụta, ma, lee ihe ịsọoyi nke ọ meworo n’ihe banyere ihe nke ụwa. Ọ naede ọtụtụ akwụkwọ maka ndụ na omume niile nke ụmụntakịrị, ma ọ pụghị ime ihe ọ bụla banyere isiike na ajọomume niile nke ụmụokoro na ụmụagbọghọ. “Ndi ihe madu-ibe ha nādigh atọ utọ” na “ndi nēkwenyeghị ndi muru ha” náakọwa nkeọma ọnọdụ nke ọtụtụ èzínaulo nke ndị Nigeria, ebe otù nime agbamakwụkwọ (maọbụ ọlụlụ dinanwunye) atọ naakwụsị ná nkewa, ụmụntàkịrị kwa ewee bụrụ ndị ụlọikpé na elekọta. Ụmụntakịrị ndị etiti (teen-agers) ndị náadịghị ekwe nchịkọta bụ ndị ọnụọgụgụ ha ruru ọtụtụ puku n’ọnụọgụgụ naabanye “n’ihe ọñụñụ náagbakaisi” náánị ka enwee ọñụ náegbu ka mmanya, ma ngwangwa ha ewee bụrụ ndị náeme ka anụọhịa, ndị náemebi iwu, na ndị abalịdịegwù náánị ka ha wee gaa n’iru n’omume ahụ. Oge ahụ dị óké egwù abịwo n’ụwa taa.

Ndịamụma Ụgha

“Ndi nēbo ebubo ụgha,” “ndi nādigh agba ndụ,” na “ndi nārara madụ nye n’aka ndi iro ha” -- okwu ndịa adịghị akọwa náánị ihe banyere mgbasaozi ụgha na omume niile nke Kọmunsist Russia, kama kwa ọ naakọwa ihe banyere omume ọjọọ nke anaahụ mgbe niile n’ụlọ ọlụ nke Govment anyị niile. “Ndi nduhie” na-egbeba n’ebe anaefè Chineke, anaahụ kwa ndị mkwusa ndị náadị ndụ n’ịkwaiko ma náekwu kwa na ọ bụ ihe anaapụghị ime bụ mmadụ ibi ndụ karị mmehie. Ndị isiike, ndị afụliworo elu, Ndịọkachamara n’ihe ọmụmụ banyere Baịbụl nke oge ahụ ndị náekwugide ndị náakụzi maka okporo ụzọ ọma mgbe ochie ahụ nke nchègharị, náachị kwa Ọbara Mgbapụta nke Kalvarị ahụ ọchị, náakwa kwa ụdị Chineke nime Kraist emò: “Ndi nēnwe udi nke nsọpuru Chineke, ma ha agọwo ike-Ya: gi gbakuta-kwa ndia azụ” (2 Timọti 3:5).

Ọ bụghị náánị na anyị nwere ọtụtụ “ndi ọgwọ-ọrịa” bụ ndị náagagharị ebe dum náewere Oziọma nke Kraist náazụ ahịa, kama enwekwara ọtụtụ mmadụ bụ ndị naegosi na ha bụ chi n’onweha, wee nwee ìgwè mmadụ ndị náeso ha. Jisọs dọrọ akanántị sị: “Kraist ụgha dị iche iche na ndi amụma ụgha gēbili, gosi kwa ihe iriba-ama uku di iche iche na ọlu-ebube uku di iche iche; iduhie ọbuná ndi arọputara, ma ọ buru na ọ gēkwe me” (Matiu 24:24). Adọrọ anyị akanántị ka anyị ghara ịbụ ndị eduhiere ọbụná ma asị na alụrụ ọlụebube dị ukwu, kama ka enyochaa ndụ na òzízí nke ndị ahụ náekwupụta na ha naekwusa Kraist. “Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe àmà! Ọ buru na ha adigh-ekwu dika okwu a si di, n’ezie ọ digh chi ọbubọ diri ha” (Aisaia 8:20).

Ókéụnwụ, Ọrịanáeféefè na Alaọmajijiji

Lụso ọrịa náakpọnwụ arụ ọgụ, lụsọ ọrịa ụkwarantà ọgụ, lụso ọrịa iheofifi ọgụ -- ọtụtụ ịkpọ òkù ndịa nke nwere akara, na àtụmààtụ dị icheiche eji enweta ego naakpọta akọnauche anyị na ọrịa náeféèfè dị icheiche nke bụ otù nime iheàmà nke ọgwụgwụ oge náaba kwa ụba “n’ebe di iche iche” náagbanyeghị ọkachaamara niile nke enwere n’ihe banyere ọgwụgwọ ọrịa nke oge ugbu a. Óké ụnwụ kwa, n’otùaka ahụ naachụ ụwa dum ntá, akụkọ nke òtù Nationalist Chinese Govment dere naekwu na enwere ihe ra ka nde mmadụ 76 nke agụụ naagụgbu. Alaọmajijiji bụ ihe ọzọ nke náechetara anyị na ọbịbịa nke Onyenwe anyị dị nso. Enwewo alaọmajijiji dị ọtụtụ n’ọnụọgụgụ n’ọgbọ nke 19 karị ka ọ dịworo n’ọgbọ niile ọzọ site na mgbe amụrụ Kraist; ma rue kwa ugbu a enwewo alaọmajijiji n’ọgbọ, nke 20 nke a karịa ka ha diworo n’ọgbọ nke 19.

Ihe Ịmaọsụ na Iheakụkọ na Ijuanya

Ịbaụba nke ịkpọasị nye ndị Juu, nke bụ ihe zuru ụwa dum, bụ ihe ịrịbaámá ọzọ nke náatụaka ọbịbịa nke Onyenwe anyị ma bụrụ kwa ihe anapụghị ilefuruanya. “Mba nile gākpọ kwa unu asi n’ihi aham” (Matiu 24:9). N’oge anyị a ọtụtụ mba ekewapụtawo ndị Juu iche wee rịba ha àmà maka mbibi; ebe ndịọzọ, dịka na mba nke anyị, anaeme ka ha bụrụ ihe ọchị na ihe ịkpọasị ọtụtụ mgbe.

Ihe Ịrịbaàmà Ikpeazụ Ahụ

“Agēkwusa kwa ozi-ọma nka nke ala-eze elu-igwe n’elu ụwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ogwugwu ihe nile ga-eru kwa.” Ọ naadị ka ihe ịrịbaàmà ikpeazụ tutu ọbịbịa Ya bụ ikwusa Oziọma ahụ nye mba niile nke ụwa; ma dịka anyị matara ihe ịrịbàmà a emezuwo. Ì jikerewo maka ọbịbịa Ya?

“Le, onye-ọlụ ubi nēche mkpụrụ di okè ọnụ-ahia nke ala, nātachi ogologo-ntachi-obi n’ebe ọ di, rue mgbe ọ gānata miri-òzuzo mbu na miri-òzuzo ikpe-azụ. Unu onwe-unu, nātachi-kwa-nu ogologo-ntachi-obi; menu ka obi-unu guzosie ike: n’ihi na ọbịbịa nke Onye-new-ayị dị nso” (Jemes 5:7, 8). Na Palestine mmiriòzùzò mbụ naezò n’oge ịkụ mkpụrụ ma mmiriòzùzò nke ikpeazụ naabịa tutu oge iweiheubi eruo, ime ka ọkà chaa. Mmiriòzùzù mbụ nke ihe mmụọ zoro n’ụbọchị Pentikọst, ka mkpụrụ nke Oziọma aghara n’akụkụ ụwa dum, wee gbaa mkpọrọọgwụ. Mmiriòzùzò ikpeazụ malitere izo n’arọ 1906 (Lee Iheọmụmụ 281.) Nke a bịara ka mkpụrụ ahụ wee chaa maka owuweiheubi. “Ọbịbịa nke Onyenwe anyị dị nso.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gosị ihe Nehum kọwara banyere ụgbọala.
  2. Òlee otú ịbaụba nke nkewa ọlụlụdịnanwunye nke obodo anyị si bụrụ ihe ịrịbaàmà nke ọgwụgwụ oge?
  3. Nye iheàtù nke ụmụmmadụ ịbụ “ndi náahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya”
  4. Òlee ụzọ òzízí nke nnwoghapụta si bata nime iheịrịbaàmà nke ọbịbịa Kraist?
  5. Gịnị ka anaeleanya bụ iheịrịbaàmà nke ikpeazụ gaemezu tupu ọbịbịa nke Onyenwe anyị?
  6. N’ihe nke mmụọ, gịnị ka mmiriòzùzò mbụ na nke ikpeazụ pụtara?
  7. Nye iheàtụ nke ndị náarara mmadụ ibe ha nye n’aka ndịiro ha nke ụbọchị anyị. Ndị náadịghị agba ndụ.
  8. Kpọọ aha ụfọdụ nke óké alaọmajijiji nke meworo n’arọ olenaole garaaga?
  9. Kpọọ aha ụfọdụ ọrịa náefeèfè nke ụbọchị ikpeazụ.
  10. Nye iheàtụ dị icheiche nke ụnwụ n’oge nke anyị.
  11. Òlee mgbe Onyenwe anyị gaabịa?
  12. Òlee iheịrịbaàmà ndị fọdụrụ imezu?