Ilu 31:10-31; Matiu 25:1-30; Nkpughe 2:1-4.

Lesson 363 - Senior

Memory Verse
“Ka ayi ñurịa ọñụ, ka obi nātọ kwa unu utọ nke uku, ka ayi were kwa otuto nile nye Ya: n’ihi na ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu abiawo, nwunye-Ya edoziwo kwa onwe-ya” (Nkpughe 19:7)
Cross References

I. Nwunye Ọhụụ Nke Kraist ahụ Dịka Nwanyị Nke Náejide Onwe Ya

1 Ọ bụ nwanyị apụrụ ịtụkwasịobi, Ilu 31:10-12; Matiu 24:45-47.

2 Ọ bụ onye ji obi ya nile alụọlụ, Ilu 31:13-19, 22-25; Jenesis 24:18-20.

3 Ọ na-enyere ndị nọ ná mkpà aka, o nwekwara obiọma, Ilu 31:20, 26; Abụ Ọma 112:9; Jemes 1:27.

4 Ọ bụghị onyeikpé umengwụ na nlefuruanya mara, Ilu 31:21, 27; Ndi Hibru 2:3.

5 Egwù nke Onyenwe anyị naeme ka ọ náamị mkpụrụ nke kwesịrị otuto dị otú a, Ilu 31:28-31; Abụ Ọma 111:10; Ilu 22:4; Aisaia 11:2.

II Ilu Nke Ụmụagbọghọ Iri Ahụ Náamaghị Nwoke

1 Ụmụagbọghọ iri náamaghị nwoke náechere ọbịbịa nke onye ahụ náalụ nwunye ọhụụ, Matiu 25:1-9.

2 Onye ahụ nke náalụ nwunye ọhụụ bịara nkewa wee dị, Matiu 25:10-13.

III Ilu Banyere Talent Ahụ dị Icheiche

1 Ekesara Talent ahụ ma were kwa ha jee ozi, Matiu 25:14-18.

2 Nnanwe Ụlọ lọghachirị nkewa wee dị, Matiu 25:19-30.

IV Ozi Ahụ Ezigaara Nzukọ nke dị N’Efesos

1 Etoro nzukọ ahụ n’ihi ọtụtụ ihe, Nkpughe 2:1-3.

2 Otú ọ dị ọ rapụwo ịhụn’anya mbụ ya, Nkpughe 2:4.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Nwanyị Ahụ Anaalụ Ọhụụ nke Náenweghị Ntụpọ

Akọwara Nwanyị ahụ anaalụọhụụ nke Kraist dịka “Nzukọ dị ebube, nēnwegh ntupọ, ma-ọbụ iru-ndọli, ma-ọbụ ihe ọ bula n’ihe dị otú a” (Ndi Efesọs 5:27). Ọ bụ “nwa-agbọghọ nāmagh nwoke nke anēmerugh emeru” (2 Ndi Kọrint 11:2), “gbokwasi onwe-ya ezi akwa-ọcha, nēnwu enwu” (Nkpughe 19:8). Odudonsọ -- ịdị ọcha nke obi -- bụ ịdịmma ahụ nke ọ natara site n’Ọbara nke Onye ahụ nyere ndụ Ya n’ihi ya. Ọ ghaghị idebe onweya náenweghị ntụpọ site n’ụwa ma náejégharị kwa n’ịdị nsọ ụbọchị nke ndụ ya. Lee otú ọ gaesi bụrụ onye náelezianya n’ijè ụkwụ ya ka o wee bụrụ otù nime ndị ahụ “akpọworo, ndi arọputa-kwa-ra, ndi kwesi-kwa-ra ntụkwasi obi” (Nkpughe 17:14). Otú ọ dị ọkpukpọòkù ahụ ghereoghe nye “onye ọ bula nāchọ” ịbu Nwanyi ahụ anaalụọhụụ nke Kraist.

IKwesị Ntụkwasịobi

Ka anyi were ndị niile bụ Nwanyị anaalụ ọhụụ dịka nwanyị náejide onweya nke akọwara n’akwụkwọ Ilu 31:10-31. Ọnụahia ya karịrị ruby nke ukwu (nkume nke dị óké ọnụahịa). Gịnị mere ya otú ahụ? “Obi di-ya atụkwasiwo ya obi.” Ọ bụrụ na Ọ nọọ ọdụ rue otù arọ, ọ bụrụ na Ọ nọrue arọ iri, ike agaghị agwụ ya, ọ gaghị adámbà nke gaeme ka o merụa onweya n’ụwa maọbụ mee ihe ụfọdụ dị nime ụwa nke náekwesịghị. É-è! Ewerewo obi ya kegide na Kraist, Ọ pụkwara ịtụkwasị Nwunye ọhụụ Ya obi. Ya na iheịchọmma efù nke ụwa enweghị mmekọ rue ebe agahụ ya ka ọ naeteji ọnụya, agịrịisi adara ígwè ọkụ (isi bọbọ) maọbụ iyi uwe náekwesịghịekwesị. Ka ha kpọọ ya Meri-amaka maọbụ onye nọ n’omume ngwaochie; obi ya dị n’ebe Ọ nọ.

Ịkwaiko nke Omumeụwa

Jemes hụrụ ọtụtụ ndị kweworo ka ihe ụwa wezuga ịhụn’anya ha o wee tie mkpu sị: “Unu ndi nākwa iko, unu amatagh na ibu eyi nke ụwa bụ ibu onye-iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bụla nke zubere ibu eyi nke ụwa nēdo onwe-ya onye-iro nke Chineke” (Jemes 4:4). Nzukọ ọbịaraọhụụ nke oge a esowo ụwa kwaa iko. Ma ha abụghị Nwanyị ahụ anaalụ ọhụụ nke Kraist.

Ihe mwute mere n’oge agha mgbe ọtụtụ ndịkom rapụrụ nwunye ha nke ha hụrụ n’anya wee gaa ibuagha n’ihi obodo ha; mgbe ha pụrụ, ndị ọzọ batara wee nara ịhụn’anya nke nwunye ha, ewee rapụ di ha n’iruuju. Ọtụtụ mmadụ si otú a náemeso Ọkpara Chineke. Ndị kwesịrị ịbụ ndị eziokwu nye Kraist ekwewo ka ụwa gbebata wee wezuga ịhụn’anya ha. Ha naabànye n’otù ihe ahụ nke náeme obi ụtọ dịka ndị ụwa naeme. Ha naaga n’ebe anaegosị sinima maọbụ ihe yiri ya n’oge abalị, n’ebe anaatụ òkwè (maọbụ ịgba chacha), na n’ebe ihe ụwa ndị ọzọ dị. Ndị ọzọ ka ewereworo ibu nke nchèkasị maka ọlụaka ha bogbue, ha wee bụrụ ndị nchègbu nke ndụ a náegbu dịka mmanya, ha wee kwe ka ịhụn’anya nke Kraist pụọ n’obi ha. Jisọs mara obi nke Ọ pụrụ ịtụkwasịobi, Ọ naatụkwasị kwa Nwunye ọhụụ Ya obi

Ịnọgidesiike

Nwunyeọhụụ nke Kraist karịrị ịbụ náánị nwaagbọghọ náamaghị nwoke, onye asachara ma were kwa uwe naenwu ọcha yibe ya, onye kụkọtara akaya abụọ n’ụdị pụrụ ichè n’elu ihe eji ehinyeisi (pillow) wee náechere ọbịbịa nke Onyenwe ya. Dịka ụmụagboghọ ahụ náamaghị nwoke bụ ndị nwere uche ọ ghaghị inwe mmanụ n’arịa ya nke bụ ihe atụ nke Mmụọ Nsọ. Mgbe mmadụ natara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ, Mmụọ nke Chineke naabata nime ndụ ahụ ibiri ka o wee náedu ndụ ahụ, wee nye onye ahụ ike na nkwuwaokwu ịlụ ọlụ nke Onyenwe anyị. Otú a ka Nwunye ọhụụ nke Kraist “nālụ ọlụ nātọ aka ya abụa utọ” (Ilu 31:13). Ọ naalụsịọlụ ike n’ọlụ nke Chineke kpọrọ ya ịlụ.

N’ilu banyere Talent ahụ Jisọs gosịrị mkpà ọ dị ịlụsịọlụike na ikwesị ntụkwasịobi. Chineke náenye ohere nke ijéozi dịka ike anyị ra. Ngwangwa site na mgbe Nna nke ịhụn’anya nke bi n’Eluigwe nyesịrị talent ndịa, ka Nwanyị ahụ anaalụ ọhụụ, site ná mkpali nke ịhụn’anya, naamalite iji ha jee ozi. “Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma, ọ bugh kwa nri ume-ngwu ka ọ nēri” (Ilu 31:27). Na mbụ eleghịanya ọlụ ya dị ka agaasị na ọ bụ náánị nye ndị èzínaụlọ ya, ma ngwangwa “aka ya abụa ka o setworo rue ogbenye aru” (Ilu 31:20). Ọ naachọpụta èzínaụlọ nọ ná mkpà wee mee ngwangwa “setipu aka-ya abụọ n’osisi ikúkú ogho” náeme ọtụtụ uwe nye ụmụntakịrị, náenyeju ndị agụụ naagụ afọ, ma náeleta kwa nne nọ n’ọrịa.

Dịka anaanabata ihe banyere ọlụ ịhụn’anya na nke obiọma ya niile otú a ka ọ naachọpụta na ijéozi ya niile bụ ihe anaachịsiike. Eleghịanya agaakpọ ya ịga leta ndị nọ n’ụlọọgwụ, maọbụ ịkọ akụkọ nke nzọpụta nye ndị nọ n’ụlọmkpọrọ, maọbụ ndị fuworo ụzọ n’okporoụzọ ụfọdụ nke obodo anyị dị icheiche.

Egwù Nke Onyenwe anyị

O nwere ezimmasị dị omimi maka omumeọma niile nke eji mara Onyenwe ya nke náanọghị n’ụlọ, ọlụ eziomume ndịa nke kwesịrị otuto náasụpụta site n’egwù nke nsọpụrụ nke dị n’obiya. Ọ naachọkarị ka aha ukwu Ya bụrụ ihe agaasọpụrụ n’akụkụ niile nke ndụ ya.

Mmanụ

“Ọ dị ka ugbọ onye-ahia: site n’ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya”. Lee ka o si maamma na Nwanyị ahụ anaalụọhụụ matara na apụghị iji mgbụgbọ nke ụwa nyejue ya afọ, kama nime ụlọ ntà ya kaya na Chineke naenwe mkparịtaụka ma site n’ebe ahụ ka ọ naenweta ike na amara ịlụọlụ ya dị ọtụtụ, náeweta “nri” ya site n’ebe dị anya. Ndụ nke ekpere ya naeme ka mmanụ ahụ náeruba nime arịa ya nke mere na “oriọna-ya adigh anyu n’abali.”

Mmanụ Adịghị

Mkpà ọ dị idebe Mmanụ nke Mmụọ Nsọ ka akọwara mgbe anaegosị ihe dị iche n’etiti ụmụagbọghọ náamaghị nwoke ndị mara ihe na ndị nzuzu. Ndị mara ihe bara nime ọñụ nke oriri ọlụlụnwunye, ma òlee maka ndị nzuzu? Otù onyeozi nke mgbe ochie kọwara ha otú a: “N’ezie oké ọchịchịrị nke dị oké egwù nke ọjujuajụrụ ha náenweghi olileanya dakwasịrị mmadụ ise ndịa náeruuju, náeguzo ọtọ, gbakọta otù ebe n’ọnụụzọ, náejide oriọna nyụrụanyụ nke akwụbara n’aka ha náenweghị olileanya. Atañ nke ọlụlụnwunye aghọwo atañ nke ịkwàozù. Ha abụghịrị ndịiro nke onye ahụ náalụ nwunyeọhụụ, ha chererị na ha bụ ndịenyi ya. Ha kwere ka oge ganarị ha náebughị ụzọ nweta otù ihe ahụ dị mkpà, nlefuruanya ahụ wee bụrụ ihe náenweghị ngwọta.”

Gịnị bụ ihe ahụ nke mere ka ókè ihe dị iche dị otú a dị n’etiti ụzọ mmadụ abụọ ndịa? Ha niile nọ náechere onye ahụ náalụ nwunye ọhụụ; ha niile n’itimkpu ahụ wee dozie ọwa ha ịga izute ya. Mgbe ahụ ise chọpụtara na ha lefuru inweta mmanụ gaezuru ha anya. Mmanụ bụ ụdị nke Mmụọ Chineke. Ha lefuruanya inọgide nime ịkpánso Chineke nke náeme ka Mmụọ Nsọ bigide nime obi.

Nlefuruanya

Ikpé nke nlefuruanya nke ihemmụọ mara ụmụagbọghọ ndị nzuzu ahụ ewe si otú a wezuga ha pụọ n’oriri ọlụlụnwunye ahụ. Nzukọ ahụ dị n’Efesọs arapuworị ịhụn’anya mbụ ya wee nọọ kwa ná mkpà nke nchègharị. Ọlụ ya niile, ndọgbu n’ọlụ, na ntachịobi ya abaghị úrù ọ bụla ebe elefuru ịhụn’anya mbụ ahụ anya. Nwoke ahụ nke nwere otù talent ka anápụrụ ya n’aka ya wee tụba kwa ya nime ọchịchịrị nke èzí n’ihi na ọ rapụrụ iji ya jee ozi. “Ayi onwe-ayị gēsi aña gbanari ma ọ buru na ayi lefuru oké nzọpụta di otú a anya” (Ndi Hibru 2:3).

Ọhụ (Inwe Nlepugaanya N’ọdịn’iru)

Ụfọdụ mmadụ gaeme ihe agwara ha mee, ma rapụ ịhụ óké ihe niile dị mkpà nke dị ha gburugburu. “Unu onwe-unu asigh, Ọnwa anọ fọdụrụ, owuwe-ihe-ubi ewe bịa? le, asim unu, Welienu anya unu elu, kiri ubi, na ha chara acha ugbua ka ewere ihe di nime ya” (Jọn 4:35). Nwanyị ahụ anaalụ ọhụụ nke Kraist naahụ, n’etiti ìgwè mmadụ bara ụba, alaubi nke iweiheubi dị ukwu nke Chineke; mmehie na ihe mgbu, ọrịa na ogbenye, itinye n’ụlọmkpọrọ na mmadụ, ịnọ náánị ya, bụ ihe chéré ya aka mgbá. Omume ya niile bụ omume obiebere, ọlụ ya niile naabụ kwa ọlụ ịhụn’anya, “Iwu nke ebere dikwasi kwa n’ire ya”.

Ụgwọọlụ

“Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwanyi ihe nāgara nkeọma: Di-ya kwa, ọ nēto ya.” Ụgwọọlụ dị ebube dị añaa ka ọ gaabụ mgbe Eze ahụ gaasị ya, “Bianu, ndi agọziri agọzi nke Nnam, ketanu ala-eze edoziworo unu site na ntọ-ala nke uwa” (Matiu 25:34). N’oge ahụ, ọnwụnwa ahụ niile nke sitere ná ndọgbun’ọlụ dị icheiche gaapụ n’anya ya, nzaghachị ya gaabụ kwa, “Onye-nwe-ayi, òle mgbe ayị huru Gi ka agu nāgu Gi, ayi wee zua Gi? ma-ọbụ ka akpiri nākpọ Gi nku, ayi we kuru miri nye Gi?” Ọ gaazaghachị: “ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye” (Matiu 25:40).

Questions
AJỤJỤ DI ICHEICHE
  1. Òlee ndị gaemejupụta Nwanyị ahụ anaalụọhụụ nke Kraist?
  2. Kpọọ aha omumeọma ụfọdụ nke Nwanyị ahụ?
  3. Gịnị ka ịbụ nwaagbọghọ náamaghị nwoke naegosị n’ihe nke mmụọ?
  4. Gịnị mere ka ihe dị iche dị n’etiti ụmụagbọghọ ahụ náamaghị nwoke mara ihe na ndị nzuzu?
  5. Gịnị ka mmanụ naegosịpụta n’Akwụkwọnsọ?
  6. Gịnị bụ ọkpụrụkpụ ihe agaamụta site n’ilu nke ụmụagbọghọ ahụ náamaghị nwoke?
  7. Gịnị bụ talent?
  8. Gịnị bụ ihe ebu n’uche kesaa talent ahụ?
  9. Gịnị ka nnanweụlọ ahụ lere anya site náaka ndịorùya n’ọbịbịa ya?