Aisaia 7:14; 9:1-7; 11:1-5; 42:1-4; 53:1-12

Lesson 364 - Senior

Memory Verse
“N’ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n’ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndumodu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mgbe nile ebigh-ebi, Onye-isi Udo,” (Aisaia 9:6).
Cross References

I Ọmụmụ dị Ebube nke Kraist

1 Chineke kwere eze Ehaz mkwà nnapụta, ebukwara amụma ịkwagide iheịrịbaámá nke mgbapụta ahụ nke gaadịrị ụwa niile, Aisaia 7:1-14; 52:10.

2 Nwaagbọghọ náamaghị nwoke mụrụ Jisọs imezu ihe ịrịbaámá ahụ, Matiu 1:18-25.

II Mkwà nke Ìhè Ukwu ahụ

1 Ndị zebulun na ndị Naftali gaahụ ìhè ukwu, Aisaia 9:1-5; Matiu 4:12-16; Luk 2:32.

2 Jisọs bụ Ìhè nke ụwa, Jọn 1:4-10; 8:12.

III Ijéozi na Ahụhụ Niile nke Kraist

1 O nwere obi umeala na obiọma nime ijéozi Ya, Aisaia 42:1-4; Matiu 12:15-21; Jọn 12:37-41.

2 Aisaia nyere iheodide pụtara ìhè banyere ahụhụ niile nke Kraist, Aisaia 53:1-12; Ọlu Ndi-ozi 8:32-35; I Pita 2:23, 24.

IV Eze Ahụ Nke Náabịa

1 Ịbụ Onyeisi gáadịkwasị kwa n’ubu Ya, Aisaia 9:6, 7; 11:1-5; Nkpughe 19:11-21; 20:1-5.

Notes
NKỌWA DI ICHEICHE

Ihe Ịrịbáámá

Amụma nke Aisaia buru banyere Kraist dị ọtụtụ; ha metụtara ọmụmụ Ya, Ijéozi Ya, ahụhụ Ya, ọnwụ Ya na Ọchịchị nke otù puku Arọ Ya. Ọ dị otù oge, mgbe Ehaz, eze Juda jupụtara n’ụjọ n’ihi na ndị Siria na ndị Israel jikọtara onweha ọnụ megide ụlọ Devid, Chineke zipụrụ Onyeamụma bụ Aisia imesi ya obi ike na Juda aghaghị inwe onye mgbapụta (maọbụ onye nnapụta). Chineke gwara Ehaz ka ọ riọ maka “ihe iriba-ama n’aka Onye-nwe gi bú Chineke gi, riọ ya n’ebe nke di n’elu,” ma Ehaz site n’igosị óké nsọpụrụ nke o nwere n’ebe Chineke nọ, o rịọghị arịrịọ. Mgbe ahụ Jehova wee kwupụtara ụlọ Devid sị “N’ihi nka Onye-nwe-ayi Onwe Ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le nwa-agbọghọ ahu nāmagh nwoke di ime, ọ gāje kwa imu nwa-nwoke, Ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel” (Aisaia 7:14). Nke a bụ iheebube nke gaemezu nke gaabụ kwa iheịrịbáámá iji mesie nnapụta nke ụlọ Juda ike.

Ịmụ Nwa Na-amaghị Nwoke ọ bụla

Ihe karịrị narị arọ asaa gāfere tutu Ihe-ịrịba-ama nka emezue, ma otù ụbọchị achọpụtara na otù nwa-agbọghọ ma-amaghị nwoke “di ime site na Mụọ Nsọ” (Matiu 1:18). Josef, onye ekwererị na ọ ga-alụ nwa-agbọghọ nka, zubererị ịrapụ atụmatụ nke ọlụlụ-di-na-wunye nke ya na Meri, ma mụọ-ozi bịakutere ya sị ya: “Josef nwa Devid, atụla egwu ikuru nwunye-gi Meri: n’ihi na Ihe nke ọ di ime Ya sitere n’aka Mụọ Nsọ. Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke, I gākpọ kwa aha-Ya Jisọs: n’ihi na Ya onwe-ya gāzọpụta ndi nke Ya ná nmehie nile ha” Matiu 1:20 ,21).

“Ma ihe a dum emewo ka okwu Onye-new-ayi kwuru site m’ọnụ onye-amuma-Ya we mezue” (Matiu 1:22). Na-agbanyeghị akukọ ahụ nke pụtara ìhè banyere ọmụmụ dị ebube nke Jisos, ozi nke mụọ-ozi ihe-ịrịba-ama ahụ nke onye-amuma kwere ná nkwa, naihe-ngụpụta nke na-akwagide Onye-ozi ahụ, ọtụtụndi kpọrọ onwe ha ndi-isi nke ndi-otù-Kraist taa na-agọnarị ịbụ-Chi nke Kraist na ọmụmụ Ya site na nwa-agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha weere ya dịka mmadụ efu. Ndi nkụzi ọbiara-ọhụ ndia a agawo n’iru idegharị okwu ụfọdụ nke edere na Baịbụl site n’ide Baịbụl Ọhụ nke ha kpọrọ “Revised Standara Version” nke o bụ kwa nime ya ka ha ji “otù nwata nwanyi” dochie anya “nwa-agbọghọ na-amaghị nwoke” nke ekwuru okwu ya n’amuma Aisaia. N’ibe akwụkwo nka na nime ebe-ọgụgụ ndi ọzọ dị icheiche ka ha nwaworo ime nka site n’aghụghọ na-agbanyeghi ịbụ-Chineke nke Kraist. Ma ezi okwu kwa na-eweghi mgbanwe: Jisọs bụ Ọkpara Chineke; ihe ịrịba-ama ahụ nke enyere site n’ọnye-amụma Aisaia mezuru -- Amụrụ Onye Nzọpụta Uku ahụ site na Nwa-agbọghọ Na-amaghị nwoke.

Ìhè Uku Ahụ

Obodo nke Zebulun na obodo nke Naftali nwere ókè ala nke eji agha bibie nke enyere ọtụtụ Ndi Mba-ọzọ ohere ịbata; ndi obodo a adịghị mma n’omume dịka ndị bi na ndịda nke Paleastain kama ha bụ ndi ana-elelị anya dịka ndị omume na okwu-ọnụ ha yiri nke anụ-ọhịa na-eme kwa mmehie ri nne. Akọwara obodo ahụ dịka obodo “nānọdu n’ọchịchịrị” na obodo nke “nānọdu kwa ala n’ala na onyinyo ọnwụ.” Ọ bụ na “Galili nke Ndi Mba-ọzọ a” ka o si pụta bụ Onye ahụ amụrụ ịbụ Eze nke Ndi-Ju, Onye Aisaia kpọrọ Aha Ya “onye-ebube, Onye-ndumọdu, Chineke nke bu Dike, Nna nke bu Nna mgbe nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo” (Aisaia 9:6).

Nye ndi ahụ nke nanị ihe ha maara bu inupụ-isi n’iwu na isi-ike na iji agha bibie ihe ka ezi nkwa nka bịaara: “Ọ digh ọgwụgwu ọ bụla iba-uba nke ibu-onye isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n’elu oche-eze Devid, na n’elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n’ikpe ziriezi na n’eziomume, site n’ugbu a we rue mgbe ebigh-ebi” (Aisaia 9:7). Lee ụdị ìhè nka bụ! Lee olile-anya dị ebube nke enyere ndịa ndi ode-akwụkwọ na Ndi-Farisi bụ ndi mara Ya ikpe na Ya na ndi mmehie na-enwe mmekọ, Jisọs zara sị, “Abiaghm ikpọ ndi-eziomume kama ọ bụ ndi nmehie ka ha chegharia” (Luk 5:32). Simeon kwuru banyere Isọs dịka “Ìhè agēkpughere mba nile ọzọ; na ebube ndi-Gi, bú Irael (Luk 2:32).

Ọchịchịrị

“Nime Ya ka ndu diri; ndu ahu buru kwa ìhè nke mmadụ. Ìhè ahụ we nānu n’ọchịchịrị; ọchịchịrị ahụ ejidegh kwa Ya: (Jọn 1:4, 5). Oké Ìhè ahụ nke chawara nime ọchịchịrị nke Naftali bụ “Ìhè nke ụwa.” Ma ụwa enweghi njikere ịnabata Ya; ha aghọtaghị kwa ụdị nke Ala-eze Ya. “Ayi onwe-ayi nuru site n’iwu-ayi na Kraist-ayi nānọgide rue mgbe ebighi-ebi: Gi onwe-gi si kwa aña si, Aghagh iweli nwa nke mmadụ elu?” (Jọn 12:34). “Ya mere ụfọdụ nime ìgwè mmadụ ahụ, mgbe ha nuru okwu ndia, ha si, N’ezie Onye a bụ Onye-amụma ahụ. Ndi ọzọ nāsi, Onye a bụ Kraist-ayị. Ma ụfọdụ nāsi, Gịnị, ọ gābụ na Galili ka Kraist-ayị si bia? Àkwụkwọ Nsọ ekwugh na Kraist-ayị nēsi na nkpụrụ Devid bia, site kwa na Betlehem, bú obodo ntà ebe Devid nọri?” (Jọn 7:40-42).

“Atụrụ nke Anākpụrụ Ije N’ogbugbu Ya”

N’ezie okwu, Jisọs bụ onye bụ ahụ Aisaia kwuru ihe banyere Ya mgbe ọ sịrị “N’ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi, ibu-onye-isi gādikwasi kwa n’ubu Ya.” Ma ndị ahụ aghọtaghị na ịdịndụ dịka mmadụ nke Ya bụ náánị otù ụzọ nke ọbịbịa Ya. Ha amataghị na ọbịbịa Ya nke mbụ gaabụ “dika aturu nke anākpuru ije n’ogbugbu ya,” “dika àjà-ikpe-ọmuma” (Aisaia 53:7, 10). Ma otú ọ dị Aisaia agwawo ha rị banyere ahụhụ nke Kraist na ihe mgbu Ya, banyere mmapúatụ nke agaamapu Ya na ubiri ụtarị Ya niile.

Otù nime ọtụtụ amụma ndị ahụ nke enyere site n’aka Aisaia bụ: “Ewe me ka ili-Ya di n’etiti ndi nēmebi iwu, Ya na ọgaranya nọ kwa n’ọnwụ-Ya” (Aisaia 53:9). Nke a mezuru mgbe akpọgburu Jisọs n’etiti ndị ori abụọ -- “na ndi njehie ka aguru Ya” (Aisaia 53:12). --na mgbe Josef, otù ọgaranya nke Arimatia, tọgbọrọ arụ Jisọs n’ílì, ọhụ nke aka ya.

Onyeisi Udo

Amụma nke Aisaia buru banyere Kraist akwụsịghị nime ílì, ma ọ naaga kwa n’iru tutu rue ụbọchị ahụ mgbe “Ọ gēji ezi-omue kpe ndi n’ēnwegh ike ikpe, Ọ gēji kwa izi-ezi ba nba banyere ndi di ume-ala n’uwa: Ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tigbue uwa, Ọ gēji kwa iku-ume egbugbere-ọnu Ya abua me ka ndi nēmebi iwi nwua” (Aisaia 11:4). Emere ka o doo anyị anya nkeọma n’Akwụkwọ Nkpughe na nke a gaemezu n’ọdịn’iru. “N’ezi omume ka Ọ nēkpe ikpe, n’ēbu kwa agha … Mma-agha di nkọ nēsi kwa n’ọnu-Ya puta, ka O we were ya tigbue mba nile; Ya Onwe-Ya gēwe kwa nkpa n’aka nke igwè zua ha dika aturu” (Nkpughe 19:11-15). N’elu ocheeze Devid ka otù Onye ahụ gaanọkwasị nke “gēme ka o guzosie-ike na ikwagide ya n’ikpe ziri-ezi na n’ezi omume, site n’ugbu a we rue mgbe ebigh-ebi” (Aisaia 9:7). Mgbe O jisịrị mmagha dị nkọ nke naesi kwa n’ọnụ Ya apụta tigbue ndị ahụ niile naemebi iwu (Nkpughe 19:15, 21), Onyeisi udo ahụ, gaewere ịbu onyeisi tụkwasị kwa n’ubu Ya O we malite ọchịchị ngọzi nke otù puku arọ ahụ nke gaejupụta n’udo. (Nkpughe 20:1-6), Ya na ndị ahụ jikeere ijeije nime ìhè ahụ. “N’ọñu ka unu geji puta, udo ka agēji kwa duru unu: ugwu nile na ugwu nta nile gētiwa nkpu ọñụ n’iru unu, osisi nile nke ọhia gāku kwa aka-ha (Aisaia 55:12).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ihe ịrịbaàmà nke Onyenwe anyị dịka ihe nchekwube nke nnapụta Ya nye ndị Ya?
  2. Gịnị bụ ufọdụ nime aha ndị ahụ nke enyere Kraist?
  3. Òlee ebe ala Zebulun na Naftali dị?
  4. Òlee mgbe ìhè ukwu ahụ mụwaara ha?
  5. Òlee mgbe Jisọs gaeji ikuume nke si n’ọnụ Ya tigbue ndị naemebi iwu?
  6. Òlee mgbe gaanọkwasị n’ocheeze Devid?
  7. Gịnị bụ ụfọdụ nime ahịrịokwu dị ntà nke dị n’Aisaia 53 nke naatụaka banyere Nkpuchi mmehie?
  8. Gụpụta ụfọdụ nime amụma ndị ahụ akọwara n’otù n’otù banyere nhujuanya nke Kraist na mmezu ha.