Luk 24:46, 47; 14:21-23; Mak 16:15; Matiu 28:18-20.

Lesson 365 - Senior

Memory Verse
“Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptizim ba n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ: nēzi ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M’nyere unu n’iwu: ma le, Mu onwem nọnyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwụ oge a” (Matiu 28:19, 20).
Cross References

I. Ọkpụkpọòkù nke Masedọnia

Jisọs nyere ndị naesoụzọ Ya iwu ka ha zisaa ozi nke Oziọma ahụ n’ebe niile, Luk 24:46, 47; 10:1, 2; 14:21-23; Matiu 10:7-14, 23; 28:18-20.

Nkwusa nke Oziọma ahụ bụ ọlụ dị ọsọsọ, ndị nke Chineke gaalụsị ọlụ ike ịgbasa akụkọ nke nzọpụta ahụ nye ihe niile ekèrèèkè, Mak 16:15; Jọn 4:6-8, 31:-38; Matiu 20:6, 7; Ndi Rom 13:11, 12; I Ndi Tesalonaika 5:4-8; Matiu 25:24-30.

Ọhụ nke Masedọnia nke egosịrị Pọl, bụ ụdị ịkpọòkù nke Oziọma nye onye Kraist ọ bụla, Ọlu Ndi-ozi 16:9, 10; 26:16-20.

Agaeme ka akụkọ nke Oziọma ahụ gazuo nsọtụ niile nke ụwa, Matiu 24:14; Abù Ọma 96:3; Aisaia 42:4.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Owuweiheubi Charaacha

Mgbe Jisọs napụtasịrị nwoke Geraza ahụ mmụọ ọjọ ji pụọ n’ike nke mmụọ ahụ náadịghị ọcha, ọ chọsiri ike ka o soro Jisọs jee ebe ọ bụla Ọ naeje. Jisọs gwara ya ka ọ laghachi n’ụlọ nke aka ya wee gosi ha ihe ukwu niile nke Chineke mewooro ya. Nke a mere o ji lata naekwusa ná nsọtụ niile nke obodo ya ọlụ ukwu niile nke Chineke lụụrụ ya, wee site n’ime nke a ghọọ onye nkwusanjegharị nke obodo ya. Ọ dighị onye ọ bụla nke nwere ezi nzọpụta nke náadịghị enwe ọchịchọ ịgbasa akụkọ nke nzọpụta ahụ dị ukwu nke Chineke. Apụghị ikewapụ mmụọ nke nkwusanjegharị n’ebe Oziọma dị, n’ihi na akụkọ nke Oziọma ahụ metụtara mmadụ niile bi n’ụwa.

Akpụkpọarụ nke mmadụ nwereike naacha ụcha, maọbụ naeji oji, ụfọdụ naacha ododo, ndịọzọ naacha kwa uhieuhie, ma mkpụrụobi nke ụmụmmadụ bụ otù ụdị n’akụkụ niile nke ụwa. Mmehie bụ mmehie n’ebe ọ bụla, na n’ọgbọ ọ bụla; mkpà ọ dị iji Ọbara Jisọs Kraist sachapụ mmehie ahụ bụ otù ihe n’ebe niile.

Oziọma ahụ ka enyere mmadụ niile, ọ dịkwara mmadụ niile, ọ bụ kwa ọlụ nke obiụtọ nye ndị nke Chineke ịgbasa eziokwu n’ebe ọ bụla mmadụ nọ. Ọtụtụ mgbe Chineke naeme ka ihe gaara ndị nke Ya nkeọma; Ọ naenye ha akụnaụba ririnne, ndịenyì n’etiti NdịKraist, nnwekọ, obiụtọ, na udo. Ma ihe ndịa niile ka anaenye n’ihi otù ihe: ka ewere ha nyere ndịọzọ aka. Ebibiri Sọdọm na Gọmọra n’ihi na ha bụ ndị npako, jupụta kwa n’oriri (iheonwunwe), ha adịghị alụọlụ, ha emeghị kwa ka aka nke onye ewedara n’ala na ogbenye dị ike. [Lee Ezikiel 16:47]. Ndị Israel bụ ihe akụkọ n’ụbọchị taa, ndị anaakpagbu kwa n’ihi na ha jụrụ iji ihe Chineke nyere ha jee ozi maka ọdịmma nke otù nwanna. Ma ha naenwe ọñụ bụ ndị ahụ nke náagbasị mbọ ike ikwusa Oziọma ahụ

Ụwa buruibu, ndị bi kwa nime ya baraụba, ma ime ngwangwa bụ okwu ibun’obi nke OnyeKraist. Ọ dịbeghị otù ụbọchị gāfere ewee kpụ nyahụrụ nke náadịghị ahụta ọtụtụ mkpụrụobi nke ụmụmmadụ anaapụghị ịgụta ọnu ka ha naala n’ebighịebi ha, ọ bụ kwa otù ha si bie ndụ n’ụwa a gaekpebi ihe ọnọdụ ikpeazụ ha gaabụ n’ebighịebi. Ọ bụ ka ewee lụọ ọlụ nke Chineke ọsọsọ ka Onyenwe anyị ji naakpọ NdịKraist niile: “Gini mere unu guzoro n’ebe a ubọchi dum nālugh-ọlu? … Unu onwe-unu ga kwa n’ubi-vine nkem, (ihe ọ bula zikwara ezi, nke ahu ka m’ga-enye unu)” (Matiu 20:6, 7). Ọ bụ ọlụ dịrị Mmụọ Nsọ ime ka ndị mmehie mara mmehie ha na ịtụ ha mmehie ha n’anya na ịkpọrọ mmadụ dum bịa n’ikpé, ya na ikwupụta ihe niile nke gaje ịbịa. Nwa Chineke, ma karịsịsịa onye ahụ edoro nsọ nke nwekwara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ -- onye Mụọ Nsọ ahụ naedu ma naachị kwa -- aghaghị ịpụta ịlụrụ Chineke ọlụ, ya na Mmụọ Nsọ ga naalụkọ ọlụ n’otù.

Mgbe ndị naesoụzọ Jisọs bịakutere Jisọs bụ Onye nọ náakpanyere nwanyị Sameria ahụ ụka n’akụkụ ólùlùmmiri Jekob, ha wee rịọ Ya ka O rie ihe. O wee gwa ha na Ya nwere iheoriri nke ha náamagaghị ihe banyere ya. Ebe ha naaghọtaghị ihe okwu Ya pụtara, ha wee chee na ọ dịworị onye nyere Ya nri. Ma O mere ka Okwu Ya doo ha anya site n’ịgwa ha na nri O nwere nke naagba kwa Ya ume bụ ka Ọ naeme ihe Nna Ya nke zitere Ya naachọ, ka Ọ lụzue kwa ọlụ ahụ. N’ụzọ dị otú a ka esi agba ezi nwa Chineke ọ bụla umu n’ụzọ ya mgbe ọ naamata na ya naeme uche Nna ya. Amamihe dị otú a mgbe niile naeme ka ike ghara ịgwụ ndị nke Kraist naeme kwa ka ha ghara ịdamba n’ịgbasa Oziọma ahụ. Ọlụ nke Nna Ya bụ ihe mere ka Kraist hụ ahụhụ niile nke Ọ hụrụ, ewee kwue ihe banyere Ya sị, “N’ihi na ekworo ulo-Gi eripiawom,” (Abù Ọma 69:9). Eripịara ndụ nke Kraist site ná mgbalịsiike Ya ime uche nke Nna Ya; n’otù aka ahụ kwa, dịka ike na amara nke Chineke naenye ra, OnyeKraist kwesịrị inwe ịhụn’anya na ọmiko maka mkpụrụobi nke ụmụmmadụ nke karịrị ịhụn’anya na ọchịchọ ọzọ niile dị icheiche.

Anyị nwere ọlụ nke anyị naaghaghị ịlụrụ Chineke. Ka anyị ghara ịtụfu ọhụ nke ihe anyị kwesịrị ime. Anyị kwesịrị ikpesi ekpere ike ka Chineke kpọbata ndịa niile ike gwụrụ, ndị nwere ọrịa nke mmehie n’obi na ka Chineke nye kwa anyị otù iko mmiri oyi inye ha -- ike nke ngụgụobi, na nke akụkọ ọma na ụzọ dị nke agaesi pụọ ná mmehie na ụzọ ịgbanarị ọnwụ ebighịebi site n’ọnwụ na nbiliten’ọnwụ nke Jisọs Kraist.

Anyị niile n’otù n’otù apụghị ijezu mba niile. Ma, ekele dịrị Chineke, na O nyewo anyị ohere nke ịba nime ụwa niile site n’ekpere na site n’okwukwe na site kwa ná agụụ nke naagụ obi anyị nke naakpọdata ike nke Chineke ịzọputa, na ido nsọ, na imeju na ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ na ọkụ -- ịkpọpụta site n’ọchịchịrị baa n’ìhè. Ndị ahụ náenweghị ike ije nwere ike nye àkụ ha; ha pụrụ iji obi ha naalụ ihe ahụ nke aka ha chọtara ịlụ -- idozi ụlọ Chineke, maọbụ ijere ndị ọrịa ozi, maọbụ akụkọ ahụ n’akụkụ ụzọ, maọbụ ịga n’ụlọọgwụ, ịgbasa Oziọma site n’inye mpempe akwụkwọ ọgụgụ, maọbu ihe ọ bụla nke Chineke gaenye ha ka ha mee. Ma ihe ọ bụla nke emere, ka ọ ghara ịbụ ná nsọpụrụ na otuto nke onweonye, kama ná nsọpụrụ na otuto nke Chineke náánị

Ndị Nkwusanjegharị, Ụlọ na Obodo Ọzọ niile

Ọtụtụ ọgbakọ nke NdịKraist na òtù nzukọ dị icheiche naekewa ọlụ nke nkwusanjegharị ha ụzọ abụọ; nke dị ka ndịa: ndị nágbalị n’ọlụ nkwusanjegharị nke ụlụ na ndị nkwusanjegharị n’obodo ọzọ. Ọlụ nkwusanjegharị nke ụlọ jikọtara mgbalị niile anaetinye n’ọlụ iji kwusaa ma ritakwa mkpụrụobi nke ọtụtụ mmadụ n’úrù bụ ndị bi n’obodo na ndị bi n’obodo ahụ gburugburu. Iwu ụlọ nzukọ nke ime obodo na ịchịkọta maọbụ iguzobe ọgbakọ nke ndị kwereekwe n’obodo nke onye ahụ bi nime ya ka akọwara dịka “nkwusanjegharị nke ụlọ.” O kwesịghị ka anaeche na nkwusanjegharị nke ụlọ bụ ihe náadịghị oké mkpà dịka nke anaalụ n’obodo dị anya. N’ihe ịmaàtụ ụfọdụ, nkwusanjegharị nke obodo dị anya gaaga n’iru náánị site ná nkwagide nke ndị òtù Kraist nke nọ n’ụlọ naenye ha.

N’ebe ụmụmmadụ naalụsị ọlụ ike ná nkwusanjegharị nke ụlọ ọ naeme ka agalaba nke nzukọ ahụ bawanye ụba karịa. Ọ bụ eziokwu na mgbe òtù NdịKraist ọ bụla zipụrụ ụfọdụ ndị nke ha ịga n’obodo ọzọ maka nkwusa nke Oziọma, Chineke naeme ka ihe gaara nzukọ ahụ ha zipụrụ n’obodo ọzọ nke ọma

Otù ihe nlereanya pụrụ ichè banyere òtù nkwusanjegharị bụ ọmụmụ Baịbụl, nke ndị òtù Kraist naanya ụgbọmmiri anaakpọ “U.S.S. Enterprise” n’Agha ụwa nke abụọ hụrụ ihe banyere ya. Ndikom ndịa wepụtara òtù naagbasa oziọma dịka ihe ntinye n’òfùfènrò ndịọzọ anaenwe mgbe dum n’ụgbọ ahụ, ime ka ndị ụgbọmmiri ibe ha wee chigharịkute Kraist. Náagbanye ọtụtụ ihembgu nke ibi ndụ nime ụgbọ mmiri n’oge agha emere ka ọtụtụ mmadụ chịgharịta ukwu n’ọlụ nkwusanjegharị nke alaọzọ. Ndịkọm ndịa bụ ndị nkwusanjegharị n’ezie, ha lụrụ ọlụ ike ha ewee zọpụta mmadụ ndị nọ ha nso, ma nyekwara ndị naalụọlụ n’obodo ọzọ dị icheiche aka.

Nye Ihe niile Ekèrèèkè

Ọ bụ nọọ uche Chineke ka mkpụrụobi niile dị ndụ mata ihe banyere amara nke nzọpụta nke Kraist. Chineke agọziwo mgbalị niile nke mmadụ olenaole maọbụ nke ọtụtụ mmadụ, iji mezue iwu ikwu ahụ nke Jisọs nyere bụ “Kwusara ihe niile ekèrèèkè ozi-ọma nkem.”

N’Asụsụ Niile

Charles Wesley dere sị, “O! ka puku ire abụa otuto Onye Ngbapụta ukum.” Ebe ọ bụ ihe anaapụghị ime na otù mmadụ gaabụ abụọtuto na puku asụsụ dị icheiche, ma otú ọ dị, emewo ka nke a dị irè site n’Okwu ahụ ederè ede n’akwụkwọ. Òtù nke anaakpọ, The American Bible Society, n’akwụkwọ nchịkọta akụkọ ha nke arọ 1952, kọwara na Baịbụl, maọbụ akụkụ ụfọdụ ya, ka ebipụtaworo n’asụsụ dị icheiche, nke dị 1059. Baịbụl niile ebipụtaworo asụsụ dị icheiche dị 197, otù Testament zuru ezu ka ebipụtaworo n’asụsụ dị icheiche nke dị 257, ma n’ebe ọ dịkarịrị ntà otù Akwụkwọ Oziọma maọbụ akwụkwọozi zuruòkè nke Baịbụl ka ebipụtaworo n’asụsụ dị 605. Enwekwara ihe dị ka asụsụ 90 ọzọ dị icheiche nke ebipụtara akụkụ ụfọdụ nke naerughaghị otù akwụkwọ nime Baịbụl.

Onye dere Abù ọma sịrị, “Onye-nwe-ayi okwu: Ndinyom ndi nēsiza ozi ahụ bu usu bara uba” (ma-ọbụ ndị nēzisa ozi ahụ bu usu ndi bara uba”) Abù ọma 68:11). Ọlu nke ịgbasa Oziọma, na ime ka ndị mmehie chegharịa bụ nọọ ihe ndị ụwa náadịghị amata. Ma otú ọ dị, ọ naaga n’iru kwa ụbọchị, site n’aka mmadụ olenaole ndị jiri obi ha chụọàjà, ọ bụ kwa mmezu anaahụ anya nke ilu ahụ banyere ihe náeko achịcha na achịcha ahụ. Ihe náeko achịcha nke ezobere na mgbè ụtụ ọka ato, naeko ụtụ ọka ahụ dum. (Lee Matiu 13:33). Ọ dịghị ebe ekwuru nime Akwụkwọnsọ na agaeme ka ụwa niile chigharịkute Kraist, kama ekwuru na “Agēkwusa kwa OziOma nke a nke alaeze eluigwe n’elu-uwa dum madu bi, ka ọ buru àmà nye mba nile; mgbe ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa” (Matiu 24:13).

Nime ọgbọ niile garaaga agbasawo Oziọma a n’inwe nguzogide dị ilu. Ndikom ahụ ndị tụgharịrị Baịbụl n’asụsụ ọzọ dị icheiche naeji ndụ ha mgbe ụfọdụ kwụọụgwọ ọlu ha. Chineke arapụbeghi Onwe-Ya na-enweghi iheàmà, ọ dịghị kwa akwụkwọ ọ bụla ebipụtaworo mgbe bụla nke bịaruworo nso Baịbụl na ụdị nnabata anaanabata ya mgbe nile. Site n’arọ rue n’atọ, ọ na-abụ “Ahia na-ere onwe-ya” n’etiti akwụkwọ ndịọzọ. N’arọ 1952 ndi òtù American Bible Society kwesasịrị ihe karịrị ndè Baịbụl iri na atọ ya na Testament dị icheiche.

Náagbanyeghị atụmàtụ niile nke nke mmegide, ọ dibeghị ihe ọzọ nke mmadụ nwere mmasị nime ya dịa ha nweworo n’ebe Baịbụl dị, n’ihi na ọ dị ndụ, bụrụ kwa ihe naadị ebighịebi. Ọ naekwu ihe banyere ịhụn’anya nke Chineke nye mmadụ niile n’otù n’otù, ma bụrụ kwa ihe naegosi ụzọ iru Eluigwe. Ịdịụtọ ya ka apụrụ ịhụ n’ihe nlereanya nke ndị obodo Agwaeiti Hebrides nke dị na Ndida Pacific gosịrị n’arọ olenaole garaaga. Mba ahụ niile arọ ise lụsie ọlụ ike inweta ego agaeji bipụtara ha Baịbụl n’asụsụ nke aka ha, ka ha wee nwee ike ịgụ n’onwe ha ihe banyere Onye ahụ nke hụrụ mkpụrụobi ha n’anya ma were kwa Onwe-Ya nye n’ihi ha.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ebe Jisọs nyere ndị naesoụzọ Ya iwu ka ha kwusaa Oziọma ahụ?
  2. Gịnị mere ọlụ ikwusa Oziọma ji bụrụ ọlụ dị ọsọsọ?
  3. Gịnị ka okwu a pụtara “Ikpọ-òkù nke Masedonia”?
  4. Kọwaa ihe okwu a pụtara “ndi nkwusa-njegharị-ulọ” na “ndi nkwusanjegharị nke obodo ọzọ”?
  5. Nime asụsụ òle ka ebipụtaoworo akụkụ ụfọdụ nke Baịbụl?
  6. Òlee Akwụkwọ amaara nkeọma karịa ndịọzọ n’oge niile?
  7. Kọwaa ihe Jisọs bu n’obi mgbe Ọ gwara ndị naesoụzọ Ya na Ya nwere “ihe oriri” nke ha naamataghi?