Ndi Rom 8:1-39.

Lesson 353 - Junior

Memory Verse
“Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?” (Ndi Rom 8:31).
Notes

Amam-Ikpe N’ihi Mmehie

Pọl pụrụ iji obi ya niile si, “Ya mere ugbu a ọ dịgh amamikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisọs.” Jisọs emewo ka o si na mmehie pụta, ma ugbu a, Ọ bụrụwo Onye-nwe-ya.

Amamikpe bụ ihe ahụ na-eme ka mmadụ ghara inwe obi ụtọ, nke na-eme kwa o nwe ihere, ma ọ bụ dị ka onye ikpe mara n’ihi ihe ọjọ o mere, ma ọ bụ okwu ọjọ o kwuru. Dịka igweoji na-ekpuchi iru anyanwụ ụbọchị ifufe na-efe, otú a ka igweoji nke amamikpe na-ekpuchi mkpụrụobi we zonari iru Chineke mgbe mmadụ mehiere. Iru ọma Chineke adịghịrị onye dị otú ahụ ebube Chineke adịghi amụkwasị nime obi ahụ. Kama amamikpe na-adigide nime mkpụrụobi ahụ dịka oke igirigi nke osimiri. Iru mmadụ na egosikwa amamikpe ahụ dị nime obi. Ma mgbe onye ahụ chọrọ Chineke wee chegharịa kwa site na mmehie ya, nata mgbaghara, riọ kwa ndi o mejọworo ka ha gbaghara ya, amamikpe niile na-esi kwa nime obi ya pụa, o wee bụrụ onye ikpe na-amaghị. Mgbe ahụ ọ pụrụ ịsi, ya mere ugbu a ọ dịghị amamikpe ọ bụla dị.

Ọ dị mgbe Pọl nwere amamikpe dị uku nime obi ya. Ekwensu bụ onye new-ya, Pọl rube-kwa-ra ya isi. Mgbe ekwensu gwara Pọl ka ọ kpagbue ndi nke Chineke, ka o kee ha agbụ, tinye kwa ha n’ụlọ mkpọrọ, Pọl me-kwa-ra otú ahu. Ma ihe niile gbanwere na ndụ Pọl n’ụbọchị ahụ mgbe o zutere Jisọs n’ụzọ Damaskọs. Lee ka ìhè ahụ mụkwasịrị ya si na-enwu enwu, ma lee kwa ka ọchịchịrị ahụ dakwasịrị ya mgbe ọ na-eje obodo Damaskọs si dị uku! Lee Kwa ka amamikpe ahụ Pọl nwere ga-esiworị dị uku mgbe ọ matara na ọ bụ Jisọs onye Nazaret na ndi na-es--ụzọ Ya ka ọ na-emekpa aru!

O wutere ya-wutebiga ya oke; o we rịọ Jisọs ka Ọ gbaghara ya. Mgbe azopụtara Pọl, ewpuru amamikpe niile site n’obi ya. Mgbe akpịrịkpa si n’anya ya dapụ, eme-kwa-ra ka ọ hụ ụzọ, ngwangwa Pọl malitere ịlụrụ nna-ya uku ọhụ bú Jisọs Kraist ọlụ.

Nna Uku Abụọ

“Ọ dighi onye ọ bụla pụrụ ibụ orù nke nna abua” (Matiu 6:24). Onye ọ bụla na-ejere Kraist maọbụ Setan ozi. Ọ bụ ihe apụrụ ime bú ịgbanwe nna-uku, nke ahụ bụ kwa ihe pọl mere.

Ị nwere ike jụa sị, “Ole otú m’gesi new Kraist dịka nna-uku?” Ọ bụ nanị isite n’ala obi gị kpeere Chineke, na-arịọ Ya ka Ọ gbaghara gị mmehie gị niile, na-agwa kwa ya na ị ga-ejere Ya ozi. Nime Okwu-Ya ayị na-agụ, “Onye nābiakutekwam M’gagh-achụpụ ya ma-ọlị” (Jọn 6:37). Mgbe Ọbara Jisọs kpuchiri obi gị, ana-agbaghara gị mmehie niile, I wee nwe ọñụ, bụrụ kwa onye nweere onwe-ya. Ana-ewepụ amamikpe site nime obi, I wee new ike imeri mmehie. Mmalite ọhụ nime ndụ! Obi ọhụ! Nna-uku ọhụ nke aga-ejere ozi! “Ya mere ebe aguru n’aka na ndi eziomume site n’okwukwe, ayi na Chineke di n’udo site n’aka Onye-new-ayi Jisọs Kraist” (Ndi Rom 5:1).

Ihe Egwu Dị Nime Mmehie

Setan bụ nna-uku siri ike mmadụ ijere ozi Ọ na ekwe nkwa inye ọñụ, arụ-ike, akụ-na-ụba, na ndu; kama ime nka, ọ na-enye èchìchè, ọrịa, ịda-ogbenye na ọnwụ. Emetụla mmehie aka; echela na ị pụrụ iji ihe ọjọ egwuegwu. Echela na ị pụrụ inwe ihe ụtọ nime ụfọdụ mmehie niile ahụ dị nta, “ya na ihe ụtọ ndi ahụ nke ihe na-adịghị emeru mmadụ arụ di nime ha, “n’ihi na n’oge na-adịghị anya, ị ga-amalite ịdaba nime mmehie niile ahụ dị uku, na nime ihe ụtọ ndi ahụ na-emerụ arụ nke pụrụ iduba nkpụrụ obi gi nime ahụhụ ebighiebi. Si na mmehie pụta ta. Ọ bụrụ na ị gbughị mmehie, ọ ga egbu gị.

Mgbe ufọdụ aja dị na-akụkụ miri nke Britain na Scotland, na-adị ka ụrọ, nke mere na onye na ejegharị n’ebe ahụ na-achọpụta na-mberede na aja ahụ na arapara n’okpuru akpụkpọ-ụkwụ ya. Ọ bụ ezie na akụkụ miri ahụ na-adị ka ihe kpọrọ-nkụ n’ile ya anya, ma ebe ọ bụla azọnyere ụkwụ, na-ejupụta na miri. Mmadụ pụrụ ịdị na-eje na-amataghị na ihe egwu dị. Na mberede, aja ahụ we kpughie ụkwụ ya. O we chigharịa ịlaghachi azụ, ma nzọ-ukwụ ọ bụla ọ zọrọ na emikpu nime aja ahụ karịa.

Nime ịtụ egwu, ọna achọpụta na ya na-emikpu nime aja. O we tụpụ ibu ya n’ala, ma ọ bụ mgbe ihe mebisiworo. Ngwangwa, aja ahụ ruru ya n’ikpere, emesịa o rue ya n’ukwu, rue ya n’obi, rue kwa ya n’olu. O we tie mkpu, ma ngwangwa ọnụ ya we jupụta n’aja, nke mere na o nweghi kwa ike ikwu okwu ọzọ. Emesịa anya ya we mechie o we ba nime ọnọdụ nke inwụ ọnwụ ọjọ! Lee ka osi yie ihe egwu nke mmehie!

Ọ pụrụ ibụ na ọ gaghị alụ ọlụ ọsọsọ dịka aja a ne eri mmadụ, ma ọ dị ike dịka aja ahụ. Nke mbụ, na-abụ “otù ihe-oriri di ụtọ,” emesịa enwekwa mmasị ime ọjọ n’ebe ọ dị uku, n’oge na-adịghị anya mmadụ na achọpụta na ya amawo n’ọnya nke ihe egwu niile ahụ na eduba nime mbibi dị otú ogwe aka nke pụrụ inye aka n’oge ihe mberede dị otú a; ọ bụ nanị otù onye pụrụ ịzọpụta site n’ọnwụ. “Kpọkukwam n’ụbọchi nkpagbu; M’gadọputa gi” (Abù Ọma 50:15).

Akwụghachirị Ụgwọ Ahụhụ Atara

Ọ bụ nnukwu ibu arọ ebupụrụ n’ebe Pọl nọ ime ka o new Nna-uku ọhụ a bụ Jisọs Kraist – e, nna ọhụ, ọbụná Chineke n’Onwe-Ya. Nka mere ka Pọl bụrụ onye nketa nke otù Ala-eze, ọ bụ ezie na ihe onwunwe ya n’ụwa dị ole na ole. Pọl maara na ọ bụrụ na ya esoro Jisọs hụkọ ahụhụ n’ebea, otù ụbọchị na ya ga-esoro Ya nwekọ kwa otuto.

Ọ matara na “opku eze nke eziomume” (II Timọti 4:8) na-echere ya.

Ọ bụrụ na ayị ahụ ahụhụ ntakịrị n’ihi Kraist, gịnị ka o pụtara? Pọl sịrị na agaghị eji nka tụnyere otuto nke gaje ịbịa. Mgbe ọ bụla ị na eche na ihe ndụ onye Kraist pụtara bụ ịgọnarị onwe-gị ihe ụtọ niile nke ụwa nka ebe ọ dị uku, nanị cheata ihe Pọl kwuru: “N’ihi na itukwasi uche n’anụ-arụ bụ ọnwụ” (Ndi Rom 8:6). Mgbe ọ bụla ị na eche na eleghị-anya ndị ụwa na enweta ihe ụtọ nke ndụ a ebe ọ dị uku karịa gị onwe-gị bụ onye nke Kraist, cheta Pọl onye kwuru sị, “Asi na unu nadị ndụ dịka anụ-arụ si chọ, unu gaje inwụ.”

Che echìchè banyere ọgwụgwụ. Che echìchè banyere ụbọchị ahụ mgbe onye dị elu, onye di ala, ọgaranya na ogbenye ha niile ga eguzo n’iru Onye-ikpe nke eziomume. Mgbe ahụ gịnị ga-abụ ọnọdụ nke ndi ahụ na ebi ndụ nanị maka ihe dị ugbu a?

“Ma,” ị na asị, “Mgbe m, kpebiri ịga-n’iru na-ikpe ekpere karị ka m, na-eme na mbụ, anam enwe ọnwụnwa karị mgbe m, na-adịghị ekpe ekpere dịka o kwesịrị.” Nke ahụ nwere ike ịbụ eziokwu, ma ị na-enwe kwa amara karị iji gabiga ọnwụnwa niile ahụ. Pọl amụtawo ma otú ọ bụla ọnwụnwa na ule si dị, na “ihe niile nālụkọ ọlụ iwetara ndi hụrụ Chineke n’anya ezi ihe” (Ndi Rom 8:28). Ya mere ọ bụrụ na ekwensu achọ ịnwa gọ ọnwụnwa site n’iweta ihe mgbachi n’ụzọ gị, nanị kwue sị: “Enwerem ike ghara ịghọta ihe kpatara ihe niile a jị na-adakwasim, ma amataram na ahụrụm Onye-nwe-ayị n’anya site n’obim niile, na Ya onwe-Ya hụkwaram n’anya, na Ọ gaghị ekweworị ka ọ dakwasim, ọ bụrụ na ọ gaghị ewetaram ezi ihe.”

Ịhụ-N’anya Nke Kraist

Pọl mechirị isi ebe ọgụgụ a site n’ijụ ajụjụ na inye ọziza ya. “Onye gēkewapu ayi n’ihu-n’anya nke Kraist?” Nsogbu, enweghi ihe oriri maọbụ uwe-oyiyi, izendụ, agha, ọnwụ, ndụ, ndi mụọ-ozi, ike di icheiche, ebe dị anya ka ọ bụ ụmụ mmadụ -- ọ dịghị nke ọ bụla nime ihe ndịa pụrụ ikewapụ ayị n’ihu-n’anya nke Kraist. Ihụ-n’anya Ya adịghị agwụagwụ.

Nka ọ pụtara na mgbe azọpụtasịrị mmadụ, na onye ahụ apụghị ịdapụ n’amara we bụrụ onye furu-efu? È-è, nka abụghị ihe ọ pụtara. Ọ bụ eziokwu na ịhụ-n’anya Kraist adịghị agbanwe ma ọ bụrụ na mmadụ anọgideghi Ya nsọ nke uku site n’iche-nche, n’ịgụ Okwu Chineke mgbe niile na n’ikpe ekpere nke uku, ịhu-n’anya onye ahụ pụrụ ijụ oyi. Ọ bụrụ na nka eme, onye ahụ nọ n’ọnọdụ dị egwu, n’ihi na ka ọ na ala azụazụ site n’ebe Onye-nwe-ayị nọ, otú a ka ọ na-agaru ụwa nso karị, n’oge na-adịghị anya, ọ gaghi abụ kwa nwa nke Nna.

Otù ugbò amam-ikpe ewee kpuchie ndụ Ya

Ị sitewo na amam-ikpe nwere onwe-gị?

Questions
AJỤJỤ DI ICHEICHE
  1. Ònye ka edpụtara ama ya nime Ndi Rom 8?
  2. Gịnị ka ọ pụtara bú ijé ijè dịka anụ-arụ si chọ? Dịka Mụọ si chọ?
  3. Òlee otú ayị ga-esi mara na ayị bụ ụmụ ndikom Chineke?
  4. Gịnị ka ikewapụ n’ịhụ-n’anya nke Kraist pụtara?
  5. “Ọ bụrụ na Chineke dịrị ayị, ònye nēmigde ayị?”
  6. Òlee ndi ka ihe niile na-alụkọ ọlụ iwetara ezi ihe?
  7. Òlee otú aga-esi were ahụhụ niile nke onye Kraist n’oge dị ugbu a, tunyere ọdị-n’iru?
  8. Gịnị ka ọ pụtara bụ ịtụkwasị uche n’anu-arụ? ịtụkwasị uche na Mụọ Nṣọ?