Failimon 1-25.

Lesson 354 - Junior

Memory Verse
“Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma Ọ ghọrọ ogbenye n’ihi unu” (II Ndi Kọrint 8:9).
Notes

Pọl Onye-mkpọrọ

Atụbawo Pọl nime ulo-mkpọrọ dị na Rom na Itali n’ihi na o kwusra banyere Jisọs. Ọ bụghị kwa okorọbịa ugbu a, ma ọ bụkwarị ọchịchọ ya ịnọnyere ndi nke Chineke nime nzukọ niile ahụ ọ malitere. Lee ka ọ ga-abụworị ọchịchọ ya ịbụ onye ga-enyere onwe-ya ọzọ.

Otú ọ dị, ọ daghị mbà n’ihi na o kweere na ite n’ekpere ndi nke Kraist na-aga akpọpụta ya site n’ulo-mkpọrọ. N’oge ahụ ọ nọ n’ụlọ-mkpọro o dre akwụkwọ nkasi-obi dị icheiche nye ndi nke Chineke, akwụkwọ odide niile ahụ sitere na Chineke n’Onwe-ya bụ akụkụ nke Okwu Chineke dị nsọ, bụ Baịbụl.

Ihe ntụchi igwè niile nke ụlọ-mkpọrọ, mkpọrọ niile na ndi nche apụghị iké mụọ nke ezi nwa Chineke agbụ. “Nna ayị ha ndi atụrụ mkpọrọ nọgidere n’obi dị ocha.” otù onye nke Chineke etinyere nime ulo mkpọrọ sịrị na ejiri ọla-edo kpuchie agbụ ejiri ka ya. Onye mkpọrọ ọzọ n’ihi Onye-new-ayị we si kwa na nkume niile nke ụlọ nkpọrọ dị ka ruby.

Onye Emere Ka O Chegharịa

Obi Pọl jupụtara n’ịhụ-n’anya dị uku nye ndi ọzọ, ka ọ nọdụrụ ala na-ejide mkpịsi eji ede akwụkwọ n’aka ya. Ayị amaghị mmadụ ole azọpụtara site n’ije ozi nke Pọl, ma otù nime ndi Pọl kpọtara Jisọs bụ otù nwa-okorọbịa ana-akpọ Onisimọs. Nwa okorọbịa a bụ onye na-ejere Failimon ozi na Kọlọsi, ewewo iwe we gbapụ n’aka nna-ya-uku wee gbaga na Rom, Dịka oru gbapụrụ n’ebe onye-nwe-ya nọ, ọ ga abụ na ejiwo ike kpọbata ya ịbụ onye agha ndi Rom, wee bụrụ kwa onye edebere iche Pọl nche. Otú ọ dị, ọ nụwo ka Pọl na-ekwu ihe banyere Jisọs, wee chegharịa bụrụ onye nke Kraist.

Ọbụná n’ụbọchị taa ndi nche nke ụlọ mkpọrọ ma ndi mkpọrọ na anụ ihe banyere Jisọs mgbe ndi na-ezisa Oziọma na-eje n’ụlọmkpọrọ ịgwa ha banyere ihe Chineke meere ha, kee kwa ha akwụkwọ nke edere ihe banyere Oziọma. Site n’ụlọ dị otú a, emewo ka ọtụtụ mata na ha bụ ndi mmehie, wee nweta kwa nzọpụta.

Ugbu a azọpụtara Onisimọs, ọ pụrụ ịbụ onye inye aka nye Pọl. Lee ọñụ ha ga-enwe n’oge ahụ niile ha nọkọrọ n’otù dịka ndi Kraist! Lee otú ha ga-ekpeworị ekpere, bụa kwa abụ otutu nye Chineke

Ịlaghachịkute Onye-nwe-ya

Pọl abụghị onye na-achọ nke nanị ya, we debe Onisimọs ka ọ nọgide ya n’ebe ahụ. Ọ ghaghị iziga ya ka ọ laghachịkuru nna-ya-uku bụ Failimon. Ma ò nwere ike ịnabata Onisimọs? Ọ ga enyeghachi kwa ya ọnọdụ ya dịka onye na-ejere ya ozi? maọbụ ọ ga emeso ya omume ọjọ n’ihi otú o si we gbapụ? Ọ bụghị nanị na Ọnisimọs mere omume megidere aha ya nke bụ “iba-uru” kama o mejowo kwa onye-nwe-ya. Pọl aghaghị ide akwụkwọ ọ ga-enye failimon site n’aka Onisimọs; mgbe ahụ ihe nile ga adị mma.

Akwụkwọ-ozi Nke Pọl

Akwụkwọ-ozi nke Pọl nye Failimon, maọbụ akwụkwọ nke Failimom, bụ akwụkwọ Pọl degara Failimon, na-arịọ ya ka ọ nabata kwa Onisimọs ọzọ dịka onye na ejere ya ozi. Pọl matara na obi Failimon jupụtara n’ịhụ-n’anya dị uku ga-agbaghara orù ahụ na-ekwesighi ntụkwasị-obi na mbụ. Na ọ ga-agbasa kwa aka-ya nabata Onisimọs, ọ bụghị nanị dịka orù ịga n’iru n’ịlụ ọlụ-ya niile, kama dịka nwa nna nime Kraist ugbu a, bụrụ kwa onye inye-aka na onye olụ kwesịrị ntụkwasi-obi nye Onye-nwe-ayị.

Idozi Ụzọ

Onisimọs jikeere idozi ihe ọjọ niile o mereri megide Onye-nwe-ya. Onye mmehie ọ bụla chegharịworo site na mmehie ya wee nata mgbaghara na ejikere idozi ihe ojọ niile o meworo na mbụ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị abụ ihe dị nfe ime mgbe ọ bụla, ma otù ọ dị, ọ na-ejekuru ndi o mejọrọ wee rịọ ha mgbaghara; ọ na akwUghachi kwa ego o zuru n’ori maọbụ nke o nwetara n’ụzọ na ezighi-ezi; ọ na ekwupụta okwuụgha niile o kwuru, wee dozie ihe niile dịka o kwesịrị. “Asi na onye nēmebi iwu enyeghachi ihe-ibe, kwughachi ihe ọ punara mmadụ n’ike, jegharia n’ukpuru niile nke ndụ, ghara ime ajọ omume; ọ ghagh idi ndu, ọgagh-anwụ” (Ezikiel 33:15).

Onisimọs edozighi ụzọ ya na-enweghi onye nyeere ya aka, otù aka ahụ kwa mụ na gị apụghị kwa idozi ụzọ ayị na-enweghị enyemaka. Pọl rịọrọ Onisimọs arịrịọ, Kraist ga-anọ kwa dịka onye ndụmọdụ nye onye ọ bụla nwere ihe ọ ga-edozi n’ụbọchị taa (Aisaia 9:6). O bụrụ na ayị arịọ ya ka O due ayị tụzikwara ayị aka, Ọ ga-enyekwara onye ahụ ayị mejọrọ aka ịghọta ihe ayị na-ekwu nkeọma wee gbaghara kwa.

Akwụghachịrị Ụgwọ N’ihi Mmeso Ọma

Mgbe ụfọdụ ana-emeso mmadụ omume ọma, maọbụ gosi ya obi ebere n’ihi onye ọzọ. Ayị na-agụ nime banyere nwatakịrị nwoke nke dara ngwụrọ mgbe o dị arọ ise. Jonatan bụ nna nwatakịrị nwoke a, abụwori ezi eyi Devid. N’ezie, Jonatan na Devid hụrụ onwe-ha n’anya nke uku. Mgbe Devid malitere ịbụ eze, ọ kpọrọ nwatakịrị a dara ngwụrọ wee gwa ya ka ọ ghara ịtụ egwu. Ọ gwara ya na ọ ga-egosi ya obi ebere n’ihi nna ya bụ Jonatan, na ya ga-enye kwa ya aku dị uku, na ọ ga-eri nri na tebụl eze ogologo ụbọchị ndụ-ya niile. Devid aka-echezọghi mmeso ọma nke Jonatan mesoro ya, ma ugbu a o nwewo oghere imeso Mefiboshet bụ onye ngwurọ mmeso ọma. (Gụa II Samuel 4: 4; 9:5-7).

N’ihi Onye-ọzọ

Pọl tukwasịkwara ihe n’akwụkwọ nke o degaara eyi ya, na-arịọ ya ka ọ nabata Onisimọs n’obi ghere oghe dịka agasị na ọ bụ ya onwe-ya bụ Pọl ka Failimon na-anabata: Onisimọs ò ji nna-ya-uku ụgwọ ihe ọ bụla? Ò mejọwa Failimọn? Ọ bụrụ na ọ dị otú a “Rapụrụm ihe niile,” ka Pọl kwuru. “Mu onwem ga-akwughachi ya.”

Mgbe nwata ọ bụla bịakutere Chineke, chegharịa site na mmehie ya nile, rịọ kwa ka agbaghara ya mmehie yanile, Jisọs na-abata we sị, “Nna, nabata ya dika ọ bu Mu onwem. Awusirim Ọbaram we nwua ka ewe gbaghara ya.” Onye mmehie emehiwo Chineke, ma mgbe o chegharịrị, Chineke na-agbaghara ya n’ihi Jisọs.

Ịlaghachi N’ulo

Ogologo ụzọ ahụ nke na-agwụ kwa ike ịlaghachị Kọlọsi bịaruru ọgwụgwụ mgbe Onisimọs laghachirị Failimon. Lee ka o si yie nwa mmefu onye laghachiri na-enwe ọbu-ụkwụ mgbu na n’ike ọgwụgwụ, n’eyi kwa uwe dọkara adọka, n’enweghị kwa ego ọ bụla, ma nna-ya nwere obi ebere onye hụrụ ya site n’ebe dị anya gbaghara ya ihe niile.

Onisimọs ji n’aka ya akwụkwọ ahụ nke Pọl dere, na-arịọ maka ebere na mgbaghara. Ayị bụ ndi azọpụtaraworo, nwere ike ile anya n’azụ n’ụbọchị ahụ ayị laghachikutere Chineke, na-ejide n’aka ayị mgbaghara ahụ ejiri Ọbara nke Jisọs dị oke-ọnụ-ahịa ka akàra. “Ya onwe-ya bupuru nmehie ọtụtụ mmadụ, ọ bụ kwa ndi njehie ka ọ narịọrọ aririọ” (Aisaia 53:12).

Agbaghara Ya

Lee otú Onisimọs ga-esiworị new añụrị ugbu a! Lee otú ọ ga-esikwa new obi ekele n’ebe Pọl nọ, bụ onye rịọrọ ya arịọ n’ebe nna-ya-uku bụ Failimon nọ! Ụgwọ ekele ịhụ-n’anya dị aña ka ọ na-aghaghị ikwughachị Pọl na Failimon! Ma lee ka o si bụrụ Jisọs ka o ji ụgwọ kachasị n’ihi obi dị ọcha ịbụ kwa onye ana-enweghị ihe ọjọ edere banyere ya, na mmalite ọhụ nime ndụ! Ụgwọ dị aña ka ayị ji Chineke na Kraist onye kwụrụ ụgwọ ayị ji, buru mmehie ayị niile, wee kghachi ayị n’èzi-n’ụlọ nke Chineke! “Ya mere otú a unu abugh ndi ọbia na ndi nanọ dịka ọbịa ọzọ site b’ugbu a, kama unu soro ndi nsọ buru ndi amụrụ n’ala, unu bụ kwa ndi èzi-na-ụlọ Chineke” (Ndi Efesọs 2:19).

“Jisọs kwuru,

Ụgwọ nile m’ji;

Unyi mmehie dị n’obim,

Ọ sachapuru ha.”

Questions
AJỤJỤ DI ICHEICHE
  1. Òlee ebe Pọl nọ mgbe edere akwụkwọ a?
  2. Ọ bụ onye ka ezigaara ya, ọ bụ kwa onye jiri ya ga?
  3. Gịnị bụ ọkwa Onisimọs ji n’ụlọ Failimon na mbụ?
  4. Gịnị ga-abụ ọnọdụ ya?
  5. Gịnị ka Baịbịl kụziri banyere idozi ụzọ?
  6. Gịnị ka Pọl kwuru nime akwụkwọ ahụ mere ayị ji mara na o nwere olile anya na aga-akpọpụta ya site n’ulo mkpọrọ?
  7. Gịnị ka Pọl kwuru banyere ụgwọ Onisimọs ji?
  8. Ọ bụ onye ka Onisimọs ji ụgwọ ekele dị uku?
  9. Ọ bụ onye ka ayị ji ụgwọ ịhụ-n’anya na ije ozi nke ana-amanyeghị amanye?
  10. Òlee otú ayị ga-esi gozi ịhụ-n’anya ayị n’ebe Jisọs nọ?