Lesson 355 - Junior
Memory Verse
“Ma ugbu a ka okwukwe, olile-anya, ịhụ-n’anya, ihe atọ ndia, nānogide; ma nke kachasi n’ihe ndia bụ ịhụ-n’anya” (I Ndi Kọrint 13:13).Notes
Ịhụ-n’anya
“Chineke bụ ịhụ-n’anya; onye nānọgide kwa n’ịhụ-n’anya, nime Chineke ka ọ nānọgide, Chineke nānogide kwa nime ya”. Ndi nke Chineke na-enwe ịhụ-n’anya Chineke nime obi-ha n’ihi na Chineke na anọnyere ha. Mgbe azọpụtara mmadụ, ana-agbaghara ha mmehie ha, Chineke na-etinye kwa ịhụ-n’anya Ya nime ha. Mgbe edoro ha nsọ ana-asacha mkpụrụ obi ha, ha na-enweta kwa ịhụ-n’anya Chineke karịa. Ọ bụ nanị ndi azọpụtara na-enwe ezi ịhụ-n’anya nke Kraist n’ihi na Chineke na-edote ya nye ndi mke Ya.
Ịhụ-n’anya ahụ nke Chineke na-etinye nime obi ndi nke Ya ka ana-akpọ ịhụ-n’anya nke ndi Kraist na ịhụ-n’anya nke Umụnna. Ana-akpọ kwa ya “obi-ọma”, ma ọ dị ihe ọpụtara nke dị omimi karịa nanị inye ndi ogbenye ihe. Obi-ọma a, maọbụ ịhụ-n’anya, bụ inwe mmasị maka ọdị-mma, arụ ike na obi-ụtọ nke ndi ọzọ. Ana-egosipụta ya site n’omume ayị na ihe ayị na-ebu n’uche maka ndi ọzọ.
Ịdị Mkpa Nke Ịhụ-n’anya
Ịhụ ụmụ-Chineke n’anya bụ otù ụzọ eji egosipụta na ayị bụ ndi Chineke. Jisos sịrị: “Mmadụ niile gēji nka mara na unu bụ ndi nēso uzọm, ọ bụrị na unu enwerịta ịhụ-n’anya n’ebe ibe-unu nọ” (Jọn 13:35). Nime akwụkwọ ozi nke Pita, ayị na-agụ “nke bu isi ihe niile menu ka ịhụ-n’anya ahụ unu nahụrịta onwe-unu di ike” (I Pita 4:8). Nke bụ isi ihe niile! Eburu ụzọ gụpụta ịhụ-n’anya n’usoro ihe ndi ahụ dị mma nke mejupụtara “nkpụrụ nke Mụọ Nsọ” (Ndi Galetia 5:22). Ịhụ-n’anya ka-akpọworo “ihe kachasị ịdị-elu nime uwa.”
Osisi-eji atụ Ihe
Pọl degara ndi Kọrint akwụkwọ ozi bamyere ịhụ-n’anya-nke-ndi Kraist bụ nke ọ kpọrọ “ịhụ-n’anya”. Akụkụ a n’akwụkwọ Nsọ bụ mpaghara jupụtara n’ịhụ-n’anya. Dịka osisi eji atụ ihe ayị pụrụ isite na ya mata ka ndụ ayị dịka onye Kraist ra. Dịka ayị na-amụ iheọmụmụ a okwesịrị ka ayị site na-ya tụle ndụ ayị ka Chineke wee gosi ayị otú ayị pụrụ iji dozie onwe ayị ma bụrụ kwa ezigbo ndi Kraist nye Onye-nwe-ayi.
Na-agbanyeghị ebe ha bi, ndi ha bụ, maọbụ ka ha toruru, ndi Kraist niile na-enwe ntozu ndia n’ihi ịhụ-n’anya Chineke nke dị nime ha.
Enwegh Ịhụ-n’anya
Pọl na-ewepụta ihe di iche n’etiti ịhụ-n’anya na ihe ndi-ọzọ apụrụ ikwu na-ha mara mma.Ọtụtụ mmadụ enwewori mmasị ịsụ asụsụ ndi ọzọ; ma mmadụ niile pụrụ ịghọta asụsụ nke ịhụ-n’anya, nke ana-egosipụta site n’iru ọchị, inwe obi-ebere na site nime ihe dị icheiche nke na-egosi obiọma.
Ọ ga-amasị ọtụtụ mmadụ ikwu okwu dịka onye ọka-okwu. Moses matara na ọ bụghị onye-ọka-okwu Mgbe Chineke kpọrọ ya ka o dupụta ụmụ Israel site n’Ijipt, Moses sịrị, “Ọ bụgh onye ọka-okwu ka m’bu…n’ihi na onye ọnụ ya di arọ, nke ire ya dị kwa arọ, ka m’bu” (Ọpupu 4:10). Ma Chineke sịrị, na Ya ga-akụziri Moses ihe ọ ga ekwu. Ikwu okwu n’ụzọ mara mma bụ ihe ana-eñomi eñomi, ma ọ bụghị ya bụ ihe kachasị mkpa. Pọl jiri ikwu ọka-okwu na-enweghi ịhụ-n’anya tụnyere “ọla nāra ara, maọbụ ájà ọla nāda ụda” (I Ndi Kọrint 13:1).
Pọl sị na-ya agaghị abụ ihe ọ bụla ma ọbụrụ na-ya enweghị ịhụ-n’anya; ma asị kwarị na-ya pụrụ ibu amụma, ikwupụta ihe gaje ime n’ọdị n’iru; maọbụ asị kwa na-ya pụrụ ịmata kwa iheomimi niile mke Chineke; maọbụ mata kwa iheọmụma na iheọmụmụ nke sitere n’akwụkwọ na ndi-nkụzi; maọbụ asị kwa na-ya nwere okwukwe nke mere ọ gēnwe ike ibubiga ugwu. Ịhe kachasị ihe ndia niile bụ ịhụ-n’anya Chineke nke dị nime obi ndi Ya.
Ụfọdụ mmadụ nwere obiọma. Ha na-enye ndi ogbenye na ndi nọ na-mkpa ihe. Ndi ọzọ dị obi-ume-ala ọbụná rue iji ndụ ha chụa àjà. Ma ewezuga ịhụ-n’anya Chineke, agaghi erita uru nke-ga-adịgide n’ihe ndia. Onyinye ndia nke Pọl kwuru okwu banyere ha dị ịtụ-n’anya, ma ha ezugh oke. Mmadụ aghaghị inwe ịhụ-n’anya Chineke.
Ntachi-obi na Obi-ọma
“Ịhụ-n’anya nwere ogologo ntachi-obi.”
Ịhụ-n’anya Chineke ga-enye mmadụ ntachi-obi. Job nwere ntachi-obi n’ihi na ọ bụ onye nke Chineke. Mgbe ụmụ Job nwụrụ na mgbe ihe niile o nwere funarịrị ya, ọ sịrị: “Jehova nyere, Jehova anarawo kwa; ka aha Jehova buro ihe agọziri agọzi” (Job 1:21). Ka Job na-aga n’iru n’ịta-ahụhụ, o tinyere onwe-ya n’aka Chineke. O we sị: “N’ihi na Ọ mawo uzọ m’nāga; mgbe Ọ nwapụtasiri m, dịka ọlaedo ka m’gāpụta. Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso; Uzọ-Ya ka m’debeworo, adighm ewzuga kwa onwem” (Job 23:10, 11).
Ị na-enwe ntachi-obi mgbe ihe na-adịghị aga nkeọma? Eleghị-anya ihe ị chọrọ bụ ịhụ-n’anya Chineke n’ime obi gị inye gị ntachi-obi maọbụ itoeto na-ntachiobi na ịhụ-n’anya Chineke. “Ihụ-n’anya…nwe-kwa-ra obi-ọma.” N’akwụkwọ ozi nke Pọl nye Ndi-Efesọs ayị na-agụ “Nwerita obi-ọma n’aru ibe-unu” (Ndi-Efesọs 4:32). Apụrụ iji Josef má-atụ dịka otù-onye gosiworo obi-ọma, ọbụná nye ndi ahụ mere ya ihe ọjọ. Ụmụ nne Josef kpọrọ ya asị, ma re kwa ya nye ndi-ahịa ndi kpọrọ ya ga n’Ijipt; ma n’oge ụnwụ, Josef mere ka-ụmụ nne ya dị kwa ndụ site n’inye ha nri.O we sị ha, “Ma ugbu a unu atụla egwu; mu onwem ganazu unu, na ụmụ-ntakịrị unu.” “O we kasie ha obi, gwa ha okwu nāba ha n’obi” (Jenesis 50:21). Olee ndi ị na-egosi obiọma? Ọ bụ nanị ndi ahụ na-egosi gi obiọma?
Ịdị Ume-ala
Ịhụ-n’anya Chineke na-eme ka mmadụ nwe afọojuju n’ihe o nwere karịa ikwoekworo. Agwara ayị sị “Ka afọ ju” ayị n’ihe ayị nwere (Ndi Hibru 13:5). Ayị na-agụ “ma nsọpụrụ Chineke, ya na inwezu ihe niile dị nkpa, bu uzọ irita urù nke-uku” (I Timọti 6:6). Ndi ahụ nwere ekworo n’obi na-ekwutọ ihe ọma ndi ọzọ nwere. Ọ dịghị ihe ọ bụla bara uru apụrụ ikwu banyere ekworo. O nwere ọtụtụ ebe edepụtara na Baịbụl banyere ndi jupụtaworo na ekworo, ma ihe niile edere banyere ha bụ ihe nwụta. Ken gburu nwannne ya n’ihi ekworo. Ụmụ nwoke ahụ kpatara ihe mere ejiri tụba Daniel n’òlùlù-ọdụm, mere nke a n’ihi ekworo. Ndi boro kraist ebubo nyere ya ka ewe kpọgide Ya n’obe n’ihi ekworo.
Ịhụ-n’anya na-eme ka mmadụ nwe obi dị ume-ala karịa ifuli onwe-ya elu. N’ime Okwu Chineke ana-akụziri ayị idi ume-ala-n’obi. Gụa banyere ịdị-ume-ala n’obi n’Ilu 22:4; Jemes 4:10; I Pita 5:5, 6. Otù nime ihe Chineke na-achọ n’aka ayị bụ “iji obi-ume ala soro” Ya (maika 6:8).
Achọghị-ihe nke Onwe-onye
“Ịhụ-anya … ọ digh-eme ihe nādigh nma n’anya.” A ga-asị na ayị kpara ezigbo agwa ma-ọbụrụ na ayị na-egosi obi iwe, ma-ọbụ nwe iru-mgbarụ mgbe ana-ekweneghị n’arịrịọ ayị? Ọ bụrụ na ihe agaghị dịka ha tụrụ anya, ụfọdụ ụmụntakịrị na-egosipụta obi-ọjọ, ma na-eme ka ndi ọzọ nọ n’ọnọdụ ọjọ rue mgbe ha nwetazuru ihe ha chọrọ. Ma ụmụntakịrị ndi ahụ enweghị ịhụ-n’anya-Chineke n’obi ha.
“Ọ dịghị-achọ ihe nke aka ya.” Ịhụ-n’anya adịghị eche nanị ihe banyere onwe-ya n’ihi nke a ọ dịghị-achọ ọbụná ihe nke o nwere. Lee otú o ji bụrụ ihe dị iche bụ mụọ nke na-achị ụwa, nke na-eme ka mmadụ gbalisie ike inwetazu ihe niile ha chọrọ, na-agbanyeghị ma o kwesịrị ndi ọzọ! Ezigbo ọñụ adịghị esite n’inweta ihe, kama ọ na-esite n’inye ihe. “Cheta okwu Onye-nwe-ayị Jisọs, otú Ya Onwe-Ya siri, ọ dị ngọzi inye ihe kari inara ihe” (Ọlu Ndi-ozi 20:35).
Obi-Ọhụ
“Ịhụ-n’anya … oké iwe adịgh-ewe ya”. Lee otú ọtụtụ mmadụ gbaliworo n’efu ime ka iwe ha dajụa! Mgbe akpasuru ha iwe ha we kwue-okwu ma mekwa ihe nke mgbe ihe niile gasịrị o wutere ha na ha mere ihe dị otú ahụ. Iwe ọsọsọ na-eduba n’oke iwe, ịkpọ asị na ịbọ-ọbọ. Ihe niile ekwuru maọbụ ndi emere mgbe iwe were mmadụ adịghị aba urù. Ọ dịghị nnukwu ihe apụrụ ime ka oke-iwe ghara ịdị, kama apụrụ ime ka ebe ahụ iwe si apụta -- nke bụ mkpụrụ obi -- nwere-ike bụrụ ebe dị ọcha.
Ịhụ-n’anya Chineke na-etinye udị mkpụrụ-obi ahụ nke na-adịghị ewe iwe ọsọsọ.
“Ihụ-n’anya … ọ digh-agụ ihe ọjọ emere ya.” Onye-nke-Kraist adịghi atụpụta ihe ọjọ, o digh atụgharịkwa uche n’ihe ọjọ. Ọ bụghi onye na-adịghị atụkwasị ndi ọzọ obi, na-echere nanị maka ihe ọjọ dị na-ndụ ha.
Ndi Filipaị 4:8 na-enye n’otù n’otù ihe ndi ahụ dị mma nke agana-eche ihe banyere ha: ihe bụ eziokwu, ihe kwesịrị nsọpụrụ, ihe ziri ezi, ihe dị ọcha, ihe kwesịrị ịhụ-n’anya, n’ihe ekwuru nke ọma; “ọ bụrụ na idi-nma ọ bụla di, ọ bụrụ kwa na otuto ọ bụla di, nagukọnu ihe ndia.”
Ịdigide
“Ịhụ-n’anya adịgh-ada mgbe ọ bụla.” Ọ na-adịgide. Ihe ndi ọzọ ga-ada, gabiga, maọbụ nye ohere maka ihe ọhụ. Okwukwe, olileanya, na ịhị-n’anya na-anọgide ugbu a -- ma n’Eluigwe mkpa okwukwe na olile-anya agaghị-adị kwa. Nanị ịhụ-n’anya ga-adịgide. Banyere ihe atọ ndia, Pọl sịrị, “ma nke kachasị n’ihe ndia bụ ịhụ-n’anya.” Okwukwe na olile-anya dị mkpa ma ba kwa uru na-ndụ nke onye-Kraist.
Asị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe anapụghị ime, bụ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ (Ndi-Hibru 11:6). Okwukwe bụ mmeri ahụ nke meriworo ụwa (I Jọn 5:4). Agwara ayị K’ayị “nāgbasị mgba ike n’ihi okwukwe ahụ nke enyere ndi nsọ n’aka nani otu mgbe idebe” (Jud 3). Olile-anya bụ otù akụkụ nke ihe-agha nke onye-Kraist –“ya na okpu-agha, bú olile-anya nke nzọputa” (I Ndi Tesalọnaịka 5:8). Olile-anya bụ “arilika nke mkpụrụ-obi, nke nu ihe-ntụkwasi-obi na ihe nēguzosi ike” (Ndi Hibru 5:8). Okwukwe bụ agwa ọ bụla ayị kpara nye Chineke. Olile-anya dịrị ayị onwe-ayi.. Ma nke kachasị n’ihe ndia bụ ịhụ-n’anya. Ịhụ-n’anya Chineke na-akpali ayị ịhụ onye agbata-obi ayị n’anya.
Dịka ị mụrụ ihe ọmụmụ a ma were kwa ndụ-onye-Kraist nke I na-ebi tụnyere osisi ahụ eji atụputa ka ihe ra, ị chọtara ohere inwe nwuli-elu? Cheta na onye-Kraist na-eto –ge-niile, ime ka amara ọ bula nke-onye-Kraist na-amụba. Pita sịrị ka ayị tụkwasị ịnụ-ọkụ-n’obi niile, ma nyezu kwa iheọma ndia; okwukwe, idị-nma, ihe-ọmụma, ijisi-onwe-ayị-ike, ntachi-obi, nsọpụrụ-Chineke, ịhụ-n’anya ụmụ nna na ịhụ-n’anya. Site na-ito-nke-onye-Kraist ayị pụrụ ịmị mkpụrụ nke Mụọ Nsọ, ime ka “ọkpụkpọ-ayi na nrọputa-ayi buru ihe nēguzosi ike,” na-ime ka ayị na Jisọs nọ n’Ala-eze-ebigh-ebi Ya Ma ọ bụrụ na ihe ndia kọnarịrị ayị, ndụ ebighebi agagh eru ayị aka (Gụa II Pita 1:5-11).
Questions
AJỤJỤ DI ICHEICHE- Gịnị bụ aha ọzọ ana-akpọ ịhụ-n’anya?
- Òlee ụzọ mmadụ ga-esi nweta ịhụ-n’anya?
- Òlee otú ịhụ-n’anya Chineke si dị mkpa?
- Òlee otú mmadụ pụrụ ikwu onye nwere ịhụ-n’anya Chineke?
- Gụa nime I Jọn 4:19 ihe mere ayi jiri hụ Onye-nwe-ayị n’anya.
- Òlee otú ụmụ mmadụ pụrụ ịmata na ayi bụ ndi na-eso-ụzọ Jisọs?
- Tinyere ịhụ ndi agbata-obi ayị n’anya ole ndi ọzọ Jisọs kụziri ayi ka ayị hụ n’anya?
- Òlee ihe ga-eme ma ọbụrụ na onye-Kraist adịghị eto eto?
- N’ama-okwu nke ikpe azụ n’ihe ọmụmụ ayị òle ụzọ-ihe abụọ ọzọ agwara ayị na-anọgide nke ịhụ-n’anya ka ịdị elu?