Lesson 356 - Junior
Memory Verse
“Umu, nāñanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n’ihi na nka bu ihe ziri ezi” (Ndi Efesọs 6:1).Notes
Nrube-Isi Nye Ndi Bụ Nne Na Nna
“Umu nañanu nti okwu ndi muru unu” Lee otú ime nka ji siere ụmụ-nta ike! Ha pụrụ ichepụta ọtụtụ ihe ngọpụ nke ga-eme ka ha rapụ ime ihe ndi mụrụ ha chọrọ. Ọ na-adị ha mma iso ụzọ nke aka ha. Ọtụtụ mgbe ọ na-adị ha ka maara ihe karị ndi mụrụ ha, na omume ndi mụrụ ha bụ nke mgbe ochie.
Ma Okwu Chineke na-ekwu sị: “Umu, nāñanu nti okwu ndi muru unu nime Onye-nwe-ayi: n’ihi na nka bu ihe ziri ezi.” “Nime Onye-nwe-ayi.” Ọ bụrụ na ndi mụrụ gị ga-agwa gị ka ime ihe Jisọs na-ahaghị achọ ka ime, ọ dịghị iwu ọ bụla megidere gị ma-ọbụrụ na irubereghị ha isi. Ma aghaghị irubere ndi nne na nna na-eme ihe ziriezi isi.
“Sọpuru nna-gi na nne-gi (nke bu ihe mbu enyere n’iwu nke nkwa diri ya), ka ihe wee nāgara gi nkeọma, ka I wee di kwa ogologo ndu n’elu uwa” (Ndi Efesọs 6:2, 3).
Ụmụ-Nta Nwere Obi Ụtọ
Chineke maara ihe na-eme ka obi na-atọ mmadụ ụtọ, Ọ chọkwa-ra ka obi na-atọ ndi nke-Ya utọ. Ụmụ nta ndi na-eme ihe n’ụzọ nke aka ha enweghị obi ụtọ. Ndi ahụ abawooro mbá n’ihi njehie mgbe ha dị nta, ka ha wee mara otú ha ga-esi rubeere ndi mụrụ ha isi na otú ha ga-esi new obiọma n’ebe onye ọ bụla nọ wee rapụ ịhụ nanị onwe ha n’anya, nwere obi-ụtọ karị ndi ahụ nọgidesri ike n’ime otú osi masị ha. Ị chere na nwa-nta ahụ na-ewe iwe ọkụ ka o wee mee out o si chọọ ga-enwe obi ụtọ?
Cheè banyere otú ọ ga-abụrụ ndi ọzọ ihe nwuta ịnọ nso nwa-nta ahụ bụ onye ìsi-ike, nke na-enupụ isi, bụrụ kwa onye na-adịghị ekwe ekwe. Solomon sịrị: “Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ñuria: ma nwa di nzuzu bu iru-uju nne-ya” (Ilu 10:1). Nwa mara ihe bụ nke ahụ na-erubere Okwu Chineke isi na-asọpụkwa-ra ndi mụrụ ya. Nwa nzuzu bụ nke ahụ na-enupụrụ Chineke na mmadụ isi.
Chineke na-ele ihe niile ayị na-eme anya. Ọ na-eche ụmụ-nta nche zipụka ndi-mụọ-ozi Ya ịkpuchi ha: ma ọ bụrụ na ha anọgide na nnupu-isi, aga-eme ka ha taa ahụhụ. Ha ga-ahụju anya n’ụwa nka: O bụrụ kwa na ha echegharịghị, ha ga-ahụ ahụhụ mgbe ha ga-eguzo n’iru Onye-Ikpe nke ụwa niile.
Ndi bụ nne na nna aghaghị ikụziri ụmụ-nta otú esi erube isi. Emeghị ka ụmụ-nta bụrụ ndi amụrụ site n’eziomume.
Aisaia onye-amụma kwuru sị: “Ayi niile kpafuru akpafu dika aturu” (Aisaia 53:6); onye dere Abụ ọma kwukwa-ra sị: “Ha akpafuwo site n’afọ nne-ha” (Abù Oma 58:3). Aghaghị ikụziri ụmụ-nta n’ulo inye ndi ọzọ nsọpụrụ kwesiri ha na irube isi n’iwu ụfọdụ. Ndi ahụ na-enweghị nsọpụrụ nye iwu nke ndi mụrụ ha agaghị asọpụrụ iwu nke obodo maọbụ iwu nke Chineke.
Ọbuná Jisọs, Ọkpara Chineke, mgbe amụrụ ya dịka mmadụ n’ụwa nka, O rubeere ndi mụrụ Ya isi. O nyere ayị ihe nlere anya otú ayị ga-esi bie ndụ. Ụmụntakịrị ụfọdụ na-eche na mgbe ha gbara arọ iri-na-abụọ (12), na ha agafewo urubeere ndi mụrụ ha isi maọbụ isite n’aka ha nāta ahụhụ. Mgbe Jisọs gbara arọ iri-na-abụọ (12) ahụrụ Ya nime Ulo-Uku Chineke ka Ya na ndi ozizi Ndi-Ju ne-ekwurita okwu banyere ihe di nime Baịbụl. O wee gwa nne Ya na Ya aghaghị ịdị n’ihe nke Nna Ya bi n’Eluigwe, nke dị oké mkpa. Out ọ di, O soro Meri na Josef la n’ulo ha di na Nazaret, wee “nọdu n’okpuru ha” (Luk 2:51).
Iwu Nye Ndi Bụ Nne Na Nna
Ndi bụ nne na nna ga-aza ajụjụ n’ebe Chineke nọ banyere otú ha ji zụlite ụmụ ha. Ha nwekwa-ra iwu sitere n’ebe Chineke nọ bịa: “Ndi bụ nna akpasu-kwa-la umu-unu iwe: kama nāzùpụta ha n’ozùzù na idu-ọdu nke Onye-nwe-ayi” (Ndi Efesọs 6:4). Ọ bụ ọlụ ndi bụ nne na nna ime ka ụmụ ha rube isi; ma ha aghaghị inwe obiọma, nye kwa ha ahụhụ n’ịhụ-n’anya nke sitere n’obi.
Mgbe Chineke rọpụtara Abraham ịbụ nna nke obodo Ndi-Ju, ọ hụrụ otù omume dị mkpa nime ya nke ga-enye n’iwu obodo ahụ. O sịrị: “N’ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọcho ya, iwu ka ha wee debe uzọ Jehova, ime eziomume na ihe ekpere n’ikpe; ka Jehova wee weta n’isi Abraham ihe O kwuru banyere ya” (Jenesis 18:19).
Ụmụ nke ndi-Kraist pụrụ inyere ndi mụrụ ha aka nke uku site n’iso ha na-amụ Baịbụl na iji otù obi rubeere okwu ahụ isi. Ụmụ Abraham na ụmụ-ụmụ ya nyeere ya aka imezu uche Chineke site n’irube isi nye ihe o kwuru, nye kwa iwu Chineke.
Ime Dịka Ụwa Si Eme
Ọtụtụ mgbe ụmụ-ntakịrị na-eche na ihe dịkarịsịrị mkpa nime ndụ ha nke na-amalite bụ imụ akkwụkwọ nkeọma, iyi ụmụ-nta ndi ọzọ ha na ha na-aga ulo akwụkwọ. Ike ekike n’ụzọ ịchọ mma na-adị kwa ha mkpa nke uku. Òtù dị icheiche nke ụwa nka, igwuri egwu, ebe ana-eme ihe nlere-anya, na ebe ana-eri oriri na-añụ kwa ihe-ọñụñụ, na-adọpụta ụmụ-nta site n’Okwu Chineke. Ha na-enwe ọchịchọ ịbụ ndi ama-ama n’etiti ọra mmadụ ndi na-amaghị Chineke, ndi mụrụ ha na-agbalị kwa ike hụ na ụmụ ha ndi bu ụmụ agbọghọ na ejike nkeọma. Ndi bụ nne na nna na-agọnarị onwe ha ọtụtụ ihe, ka ha wee nye ụmụ ha ihe ndi kachasị mma na ndụ
Ma gịnị bụ ihe bara urù karịsịa na ndụ? Ọ bu ezie na ndi mụrụ ayị agaghị arapụrụ ayi ihe ọma nile nke ụwa nka, ọ bụrụ na ha arapụrụ ayị ihe-nlere-anya nke ibi ndụ Onye-Kraist na nke ezi ntụkwasị-obi. n’okwu Chineke, ọ dịghi ihe-nketa karịrị nka ayi pụrụ ịrịọ. Ndụ a na nsọpụrụ ya na nganga ya niile ga-agabiga mgbe na-adịghị anya. Ihe ga-anọgide bụ ịhụ-n’anya Chineke ayị nwere nime obi ayị.
Ebe Ịchụ Àjà Nke Ezi-na-ulo
“Ezi-na-ulo na-ekpekọ ekpere n’otù, na-adị n’otù,” abụrụwo ihe ana-ekwu ọtụtụ mgbe. Ana-enwe mmekọrịta site n’ekpere ana-ekpe n’ezi-na-ulo na site n’ọmụmụ Baịbụl ana-amụ n’otù n’otù, nke na-enwghị ụzọ ọzọ apụrụ isi malite ya. Chineke na-agọzi ekpere ana-ekpe n’ezi-na-ulọ n’ihi na ọ bụ irubere uche Chineke isi. Iwu Chineke site n’aka Moses bụ: “Unu gēzi umu-unu (okwu nile nke Chineke) ha, n’ikwu okwu banyere ha mgbe I nānọdụ n’ulo-gi, na mgbe I nēje ije n’uzọ, na mgbe I nēdina ala, na mgbe I nēbili ọtọ” (Deuterọnọmi 11:19). Ma ịmụ Okwu Chineke na ezi-na-ulo agaghị ezu. Aghaghị kwa ịkpọrọ umụ-nta-amụta ihe riri nne mgbe ana-akpọ ha na-eje nzukọ ndi okenye, ọ bụ ezie na ha dị nta, ngọzi Chineke na adịkwasị kwa n’isi ha.
Mgbe Joshua nyere ụmụ Irsael iwu, ụmụ ntakịrị ha nọ kwa n’ebe ahụ. “Ọ digh okwu ọ bụla n’ihe niile nke Moses nyere n’iwu nke Joshua nāgugh n’iru nkpọkọta niile nke Israel, na ndinyom, na umu ntakiri, na ndi-ọbia ndi nēje ije n’etiti ha” (Joshua 8:35). Lee kwa otú ndi ahụ si ñuria ọñụ mgbe Chineke wukwasịrị ngọzi Ya n’elu ajá ha niile! “N’ihi na Chineke mere ka ha ñuria uku ọzọ kwa, ndinyom-ha na umu-ntakiri-ha ñuriri: ewe na ọñu Jerusalem rue ebe di anya” (Nehemaia 12:43).
Jisọs chọrọ ụmụ-nta n’ije ozi-Ya. Ọ siri: “Kwenu ka umu-ntakịrị biakutem, unu egbochila ha: n’ihi na ala-eze Chineke bu nke ndi di otú a” (Mak 10:14).
Ọ bụrụ na ụmụ-nta dị mkpa otú a nye Jisọs, chee otú ha aghaghị isi lezie anya n’ime omume nime ulọ Chineke. Ọ hụrụ ha n’anya, chọọ kwa ha n’ebe ahụ: ma ha aghaghị ịnye nzukọ Ya nsọpụrụ na ugwù. Ha aghaghị ịnọdụ nwayọ wee rapụ ijeghara site n’otú na-edu nzukọ n’ekpere. Ya na Chineke n’ekwurịta okwu, ha aghaghị kwa ikpe ekpere.
Otù oge mgbe ụmụ mmadụ rapụsirị Ulo Uku Chineke, ndi-nchụ aja ọjọọ chọrọ ijide Jisọs. Ma ọtụtụ ụmụ-nta nọ n’Ulo Uku Chineke ndi hụrụ Jisọs n’anya, ha na-abụ kwa abụ si: “Hossanna diri Nwa Devid.” Nka mere ka iwe wee ndi-nchụ-aja ahụ, ma Jisọs sịrị: “Ò digh mgbe ọ bụla unu guru, I si n’ọnụ ụmụ ọhụ na ụmụ nañu ara me ka ojija zue oke? (Matiu 21:15, 16). Ụmụntakịrị na-teo Jisọs karịa ndi-okenye nke okpukpe ahụ.
Ọtụtụ mgbe ụmụntakịrị bụ ndi-Kraist kwesịri nụkwasiobi eduruwo ndi mụrụ ha bịakute Jisọs. O nwere ike bụrụ na azọpụtawo nwatakiri n’Ulo Akwụkwọ nke Ụbọchị Ukọ, ọ laa kwa n’ulo kọrọ ndi mụrụ ya banyere ọñụ o nwere n’obi ya. O kpekwaara ndi mụrụ ya ekpere. Chineke na-anụ ekpere dị nfe nke nwa-ata na-ekpe n’okwukwe, Ọ na-aza kwa. Ọtụtụ mgbe, ndi mmehie ga-ege nwa-nta ntị ka ọ na-akọ Akụkọ Jisọs karịa otú ha nwere ike ige onye toro eto.
Lee otú omume nwatakịrị si dị mkpa, lee kwa oke ihe ọ pụrụ ime mgbe ọ na-ebi ndụ ya nye Jisọs!
Questions
AJỤJỤ DI ICHEICHE1. Gịnị bụ iwu Chineke nye ndi bụ ụmụ?
2. Gịnị bụ nkwa O kwere banyere nrube-isi?
3. Òlee ụmụ-nta ndi nwere obi-ụtọ?
4. Òlee ebe o kwesịrị ka eburu uzọ kụziere ụmụ-nta ka ha sọpụrụ?
5. Òlee otú ayị si mara na Jisọs rubeere ndi mụrụ Ya isi?
6. Gịnị bụ iwu Chineke nye ndi bụ nne ne nna?
7. Gịnị bụ ihe-ndi ahụ dị n’ulo Akwụkwọ nwere ike ịdọrọ nwa nta site n’ebe Chineke nọ ma lezighị anya?
8. Gịnị bụ ihe-nketa ayị nke kachasị na ndụ nka?
9. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ịnabata ụmụ-ntakịrị?
10. Gịnị bụ ihe ụfọdụ ụmụ-nta Kraist pụrụ imere ndi mụrụ ha?