Lesson 357 - Junior
Memory Verse
"Nākpọnu ajọ ihe asị nārapara ezi ihe n’aru” (Ndi Rom 12:9).Notes
Nsọ
Jisọs kpeere ndi ndị naeso ụzọ Ya na ndị niile gaeso Ya ekpere. O kpere ka ha bụrụ otù, bụrụ ndị jikọtara onwe ha ọnụ, na ndị ejikọtara ha na Chineke ọnụ. O kpere ka edo ha nsọ. Ibú onye edoro nsọ pụtara na onye ahụ gaadị nsọ, bụrụ onye asachara site ná mmehie. Ejiwo odudo nsọ tụnyere ịbụpụ mkpọrọgwụ osisi. Nzọpụta dịka mgbe egbuturu osisi, ma ogwe osisi ahụ pụkwara ịmalite ito ọzọ. Na odudonsọ ana ewepụ mkpọrọgwụ niile ahụ.
Jisọs kpere ka ndị naeso ụzọ Ya burụ ndi kwesịrị ntụkwasịobi, ka ha bụrụ ndị gaadịrị Chineke ezi ndụ, ọbụná nime ụwa nke a jupụtara na ọnwụnwa na ihe ike. (Gụọ Jọn 17:15-21).
Odudonsọ naeme ka onye nke Kraist dịwanye ike n’imeri mmehie. Ọ bụ “ihe Chineke nachọ, bú ka edo unu nsọ” (1 Ndi Tesalọnaika 4:3). Ndi Kraist naachọ ibindụ ha dịka uche Chineke si dị, ye mere ha na enyebiga ndụ ha n’ekpe kwa ekpere rue mgbe Chineke doro ha nsọ. Enwere ihe ndịọzọ onyeKraist pụrụ ime, iji bieere Chineke ndụ zuruòkè, mee kwa uche Ya, ma jekwere Ya ozi. OnyeKraist na ejisiike nime okpuke Ya mgbe dum, naachọ ka o yie Onyenwe ya.
Ụkpụrụ
Pọl kpọrọ ụfọdụ ihe aha nke gaa enyere ha aka ịbụ ezi ndị nke Kraist mgbe ọ na edegara nzukọ dị na Rọm akwụkwọ. Enwere ike ịkpọ ihe ndịa ọlụ nke dịrị onyeKraist. Ha bụ ụzọ onyeKraist gesi bie ndụ ya. Mgbe mmadụ nwere ịhụn’anya Chineke nime obi ya, ọ na emetụ ya na ọ bụ ohere dịrị ya ibi ndụ dị ọcha dị kwa nsọ. Ọ naachọ ibi ndụ gaatọ Chineke ụtọ, site nime nke a, ọ matara na ya aghaghị ijikere maka Eluigwe.
Ụfọdụ ụmụntịrị amụtawo na isoro nime ụfọdụ egwurị-egwu, maọbụ ije ụfọdụ ebe dị icheiche, maọbu isoro ụfọdụ ụmụntakịrị gwue-egwu, n’eduba ha nime nsogbu mgbe niile.
Ọ gaghị aka mma isi n’ebe ihe ndi ahụ, na n’ebe ndị ahụ n’enweta nsogbu nọ wezuga onweayị. Otú ahụ ka ọ dịrị onye nke Kraist: site n’isi n’ebe mmehie nọ wezuga onweya, na site n’ikpe ekpere na ibiri Chineke ndụ, ọ na enyere ya aka isi na nsogbu pụọ.
Àjà Dị Ndụ
Pọl rịọrọ ndi nke Kraist ka ha nyebiga Chineke ndụ ha, ma che kwa arụ ha dịka “àjà di ndu” nye Chineke. N’oge ochie ụmụmmadụ n’efe Chineke òfùfè site n’igbu anụmanụ dị icheiche iji chụọ àjà, ma n’ụbọchị ta Chineke chọrọ ka anyị naasọpụrụ, na eto kwa Ya site n’ịdị ndụ ya Ya. Aisaia bụ onye amụma sịrị: “N’ihi na ala-mọ adigh-ekele Gi, ọnwu adigh-eto Gi: … Onye di ndu, onye di ndu, onye ahụ gēkele Gi, dika m’si eme ta” (Aisaia 38:18, 19).
Àjà bụ ihe ahụ enyefere, nyebigakwa, we rapụrụ ya Chineke. Mmadụ inye arụ na ndụ ya dịka “àjà di ndu” nye Chineke pụtara mmadụ ikwe iwere ndụ ya nyefere n’aka na n’uche Chineke. Ọ bụghị náánị àjà dị ndụ ka Chineke chọrọ, kama Ọ chọkwara nke dị nsọ, n’enweghị kwa mmehie nime ya.
Ume
Òle otú ị gaesi nọrọ n’enweghị mmehie? “Site n’ime ka uche gi buru ihe ọhu.” Pọl kwukwara ụdị okwu a mgbe ọ na ekpere nzukọ dị na Efesọs ekpere: “ka ewere ike me ka unu di ike site n’aka Mọ-Ya nābata nime madu ime unu; … ka ewe me ka unu zue ezù rue ozuzù nile nke Chineke” (Ndi Efesọs 3:16-19). Site n’ikpe ekpere ụtụtụ ọbụná tupu eje ụlọ akwụkwọ, igwuegwu maọbụ je ọlụ, na kwa site n’ịgụ Baịbụl maọbụ igentị mgbe anaagụ ya ụmụ ntà n’enwe Onye-nwe ibinyere ha, ka O wee zi ha ime ezi ihe na ibindụ nye ya.
Ịmụ ihe ibun’isi niile anyị na enyere anyi aka ịbụ ndị enwoghara ime ka uche ha dị ọhụ na ime kwa ka anyị dị ike nime onyenwe anyị.
Imeso Ndịọzọ Omume
Onye ọ bụla nke naeso Onyenwe anyị naadị umeala, ọ na ebu ụzọ che ihe banyere ndịọzọ tupu o che banyere onweya. Aga egosipụta nke a site ná ndụ mmadụ naebi kwa ụbọchị. Apụrụ iwepụta mkpụrụ osisi abụa nke otù nime ha buru ibu karị nke ọzọ, ewe sị gị were otù. Setan pụrụ iji olu nwayọ kwuo okwu ná ntị gị sị na ịkwesịrị iwere nke ahụ buru ibu n’ihi na agụ naagụ gị.
Ma ị gacheta na Jisọs achọghị ka ayị bụrụ ndị naahụ náánị onweha n’anya, kama ka anyị naebu ụzọ eche ihe banyere ndịọzọ, ya mere ị ghaghị ịrapụrụ nweta ibe gị nke ahụ buru ibu. Nka a ahụ bụ otù ụzọ esi egosị ihụn’anya, “nācharanu ibe-unu uzọ,” ọ bụghị iche banyere onweayị ebe ọ dị uku karị ka anyị kwesịrị.
Iheọjọ Ka Ọ Bụ Iheọma
Nākpọnụ ajọ ihe asị, nārapara ezi ihe n’aru.” Onye nke Kraist naeze, na akpọ kwa ihe nille naadịghị mma asị. Ọ naahụ ihe dị mma n’anya, na arapara kwa ihe dị mma n’arụ. Ọbụná n’igwuriegwu, nwata hụrụ Onyenwe anyị n’anya naeze ihe niile ahụ bụ mmehie. Ọ gaghị eji egbe ahụ eji egwuriegwu, naegwu egwu ndị ahụ naegosiputa otú esi ezu ori na kwa otú esi egbu mmadụ.
Ọ gaghị agbaso ndị ahu naānụ sigaret we tinye sigaret ọ tụtara atụta n’ọnụ ya, maọbụ were ihe ndi ahụ eji eteji ọnụ emere maka igwuriegwu na eteji ọnụ ya. Nwa Krasit adịghị enwe mmasị nime ihe ọjọ dị nime ndụ ndị ahụ naezu ori na aghọgbu kwa ibe ha. Setan nwere ụzọ o si arafu ụmụmmadụ ikwere na mmehie “adịghị okè njọ,” ma were nwanyọ naagbalị ị nwa ha ka ha ji aghụghọ naeme ihe ahụ náadịghị mma. Pọl sịrị. “Burunu uzọ nēchè ihe ọma n’iru madu nile.” N’ihi na ụfọdụ mmadụ adịghị ebi ndụ naatọ chneke ụtọ, enyeghị anyị ike ime ihe ọ bụla nke gaewe Chineke iwe.
Eziihe N’ọnọdụ Iheọjọ
Kama ịkwụghachị iheọjọ n’ọnọdụ iheọjọ, onye nke Kraist na ewere eziihe merie iheọjọ. Ọ na enwe obiọma n’ebe ndị ahụ naakpọ ya asị nọ. Ọ dịghị enwe mmụọ nke “esemokwu.” Ọ na eji ohere ọ bụla o nwere emere ndị ahụ kpagbuworo ya ihe ọma. N’akwụkwọ ilụ anyị gụrụ banyere nkwà dịrị ndị ahụ naekesa ihe ha nwere nye ndịọzọ, naegosi kwa ndịọzọ bụ ndị mejọworo ha obi ebere. “Ọ buru na agu nāgu onye nākpọ gi asi, gi me ka o rie nrọ; ọ buru kwa na akpiri nākpọ ya nku, gi me ka ọ ñua miri: n’ihi na icheku nēre ọku ka I nāgukwasi n’iei-ya, Jehova gākwughachi kwa gi” (Ilu 25:21, 22).
Nke a ahụ ọ pụtara na anyị gaemeso ndị ahụ pụrụ iji anyị me ihe ọchị nkeọma? E, ọ bụ ihe ọ pụtara. “Nāgọzinu ndi nēsogbu unu.”
Itoeto
Náánị ijeozi nke bara úrù nke Chineke naachọ bụ ibindụ anyị nye Ya. Chineke adịghị achọ ihe ọ bụla naaka ndị ya karịrị nke ha pụrụ ime. Ọ bụghị náánị na Chineke naachọ ihe naaka ndị Ya kama Ọ na enyekwara ha aka. Nime inye aka Ọ naenye ndị nke Ya, anaenwe ịhụn’anya nke Chineke, amara, okwukwe, olile-anya, ike, na ndidi. Ha dịrị anyị, anaenweta kwa ha site n’ekpere na Okwu Chineke bụ Baịbụl. Mmadụ apughị uru ogo Chineke chọrọ ma ọ bụghị site na enyem aka Chineke.
Mgbe azọpụtara mmadụ, ọ na enwe amara niile nke ndị Kraist n’ebe ọ dị ntà. Chineke chọrọ ka anyị n’etoeto nime ihe ndịa. Nime 2 Pita 1:5-11 agbara anyị ume ka anyi naaba ụbu naetinye kwa ihe na nke anyi nwere, ka anyị we ghara imejọ Chineke. Pita dekwara sị “nābunu uba n’anmara na ọmụma nke Onye-nwe-ayi, bú Onye nzọpụ-ayi, Jisus Kraist” ma ọ bụghị otú a, anyị gaadapụ site n’iguzosi ike na ikwesị ntụkwasị obi (2 Pita 3:18).
Mgbe nwata na adịghị eto ogologo, ọ dịghị ebu kwa ibu anyị na amata na ihe adịghị agazi nkeọma: arụ adịghị ya ike, o zughi kwa òkè; ọ gaanwụ ma enyeghịrị ya aka. Otú a ka ọ dịrị onye nke Kraist, ọ bụrụ na ọ dịghị etoeto, ọ pụtara na ihe adịghị agazi nkeọma. Ọ bụ onye naarịa ọrịa nime mmụọ, o zughị kwa òkè. Ọnọdụ a gaedube ya ọnwụ ma ọ bụrụ na ọ kpọghị Chineke maka inyere ya aka.
Onye nke Kraist naebiri Onyenwe anyị ndụ ya kwa ụbọchị. O zughị ezu ị dị na eso Onyenwe anyị náánị n’ụbọchị ụkọ maọbụ ime eziihe náánị mgbe ụfọdụ. Nime iheọmụmụ a, site na ihe Pọl na Pita dere, anyị amụwo ọtụtụ eziihe onye nke Kraist naeme. Mmadụ adịghị eme ihe ndịa iji bụrụ onye nke Kraist. Ọ naeme ha n’ihi na ọ bụ onye nke Kraist. Ihe naadị ya n’iru mgbe dum, bụ ọchịchọ nke ime uche na ihe naatọ chineke ụtọ. mgbe ahụ ka Onyenwe anyị na ụwa niile gaamata site ná ndụ ọ naebi, na ọ bụrụwo inye nke Kraist.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE1 Ònye dere akwụkwọ ndi Rom?
2 Ọ bụ onye ka edegaara ya?
3 Òle otú mmadụ gaesi bụrụ àjà dị ndụ nye Chineke?
4 Gịnị naeme ka mmadụ bụrụ onye naebi ndụ ziriezi na nke kwesịrịntụkwasịobi nye Chineke?
5 Gịnị ka mmadụ gaeme kwa ụbochị iji we náadị ike nime mụọ?
6 Òle otú agaesi chọpụta na mmadụ bụ onye nke Kraist?
7 Òle ụdị mmetụ onye nke Kraist naenwe banyere iheọjọ?
8 Òle otú onye nke Kraist si emeso ndị ahụ naadịghị emere ya ebere?
9 Gịnị ka odudonsọ naemere mmadụ?
10 Gịnị ka itoeto n’amara pụtara?