1 Timọti 6:1, 2; Ndi Efesọs 6:5-9; Ndi Rom 13:1-8.

Lesson 358 - Junior

Memory Verse
“Ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlụ, ọ bugh kwa madu” (Ndi Kọlọsi 3:23).
Notes

Ịhụ Chineke n’anya

“I gēwere obi-gi dum, were kwa nkpuru-obi-gi dum, were kwa uche-gi dum, hu Onye-nwe-ayi Chineke n’anya. Nka bu ihe uku na ihe mbu enyere n’iwu” (Matiu 22:37, 38).

O nwere ọtụtụ mmadụ n’ụwa ndị náabụghị ụmụ Chineke ma ha nwere mmetụta na o kwesịrị ka ha hụ Chineke n’anya. Ha naekwu na ha hụrụ Ya n’anya. Onye ọ bụla amụrụ naenwe mmasị nime ya ifè ihe ọ bụla òfùfè, ịhụ onye dị elu karịa ya onwe ya n’anya. Ndị ahụ náamaghị banyere ezi Chineke ahụ na efè arụsị.

Ma ọtụtụ mgbe, ndị ahụ bụ ndị naeji ụzọ dị icheiche naeji kwa ememe dị icheiche naefe Chieneke, adịghịeme ka òfùfè ha pụta ihe na ndụ ha naebi kwa ụbọchị n’etiti ndịọzọ. Jisọs sịrị na anyị aghaghị iwere mkpụrụobi anyị niile hụ Chineke n’anya, na nke ahụ bụ ihe mbụ na ihe ukwu enyere n’iwu. Ma nke ahụ abụghị náánị ihe enyere n’iwu.

Ịhụ Onye agbataobi gị n’anya

Jisọs tụkwasịkwara n’iwu nke mbụ ahụ: “Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, “I gāhu onye-agbata-obi-gi n’anya dika onwe-gi” (Matiu 22:39). Ụmụmmadụ pụrụ ikwu na ha hụrụ Onyenwe anyị n’anya, ma anyị apụghị inwapụta ma ọ dịghị otú ahụ. Ma anyị pụrụ ikwu ọsọsọ ma mmadụ hụrụ onye agbataobi ya n’anya ma ọ hụghị ya. Onye agbataobi pụrụ ịbụ onye ọ bụla nke anyị na ya naenwe mmekọrịta n’oge ọ bụla. Otù onye ọka iwu jụrụ Jisọs n’ogù oge sị “Onye bu kwa onye-agbata-obim?” Jisọs we kọrọ ya akụkọ banyere ezigbo onye Sameria ahụ. Otù nwoke dabara n’etiti ndi na-apụnara madụ ihe ndi tikwa-ra ya ihe otiti n’ụzọ jọgburu onwe-ya. Dịka ọ tọgbọrọ n’akụkụ ụzọ otù onye-nchụ-àjà we si n’akụkụ ụzọ ọzọ gabiga. O kwesịrị ịbụworị onye nanọchi anya Chineke n’elu ụwa. O kwesịrị igosị ịhụn’anya n’ebe nwoke a emerụrụ arụ nọ dịka Jisọs gaemeworị. Ma onye nchụàjà a lere onweya anya dịka onye dị elu karị onye pụrụ inyere nwoke a nọ na mkpà aka. Onye Livai ahụ nke naesochite ya si kwa n’akụkụ ụzọ ọzọ gabiga bụ kwa onye mara ihe banyere òfùfè nke ụlọ ukwu Chineke. Ụfọdụ ọlụ dịrị ya ịlụ gabụworị ilekọta ndị ọrịa na ndị náahụjuanya. Ya mere o kwesịrị inyereworị nwoke a aka, ma asikwarị na ọ hụghị ya n’anya. Ma ọ gabigara “nākuku uzọ ọzọ.”

Emesịa otù onye Sameria we bịa, onye naamaghị ihe banyere okpukpe dịka onye nchụàjà ahụ na onye Livai ahụ matara, ma o nwere ịhụn’anya n’ime obi ya nye onye a nọ ná nsogbu, o nyekwara ya aka.

Mgbe Jisọs kọchara akụkụ a, O we jụọ onye ọka iwu ahụ, “Ọ bu onye nime madu atọ a, ka i chee, gosiri onwe ya ka onye agbata-obi nke onye ahu dabara n’etiti ndi ahu nāpunara madụ ihe?”(Luk 10:36). Onye ọ bụla pụrụ ịza ajụjụ ahụ. Otù aka ahụ, onye ọ bụla nke chọrọ inyeaka ka anyị bụ onye agbataobi anyị.

Anyị pụrụ ịkpọ kwa ndị èzínaụlọ anyi ndị agbataobi anyị. Ndi nne na anụkarị na ụmụ ha naakpa ezigbo agwa n’ụlọ ndị enyì ha karị n’ụlọ nke aka ha. Ụmụ ntakịrị ga náeche na ha ekwesịghị ịgosipụta obiọma na agwa ọma nye ndị ha na ha si n’otù nne. Ma ọ bụrụ ná anyị nwere ịhụn’anya Jisọs n’obi anyị, anyị gaahụ mmadụ niile n’anya.

Mụọ nke Chineke gwara Jọn Onyeozi ka o dee: “Ọ buru na onye ọ bula gāsi, Anamahu Chineke n’anya, ma ọ nākpọ nwa-nne-ya asi, ọ bu onye ugha: n’ihi na onye nādigh ahu nwa-nna ya n’anya, bu onye ọ buworo, ọ pugh ịhụ Chineke n’anya, bu Onye ọ nāhugh mgbe ọ bula?” (I Jọn 4:20). Ọ bụrụ na anyị amụta n’ụlọ otú esi asọpụrụ onwe anyị na èzínaụlọ anyị, ọ ghaghị esiri anyị ike ịsọpụrụ ndịọzọ, anyị gerubekwara iwu nke obodo isi. Agwara anyị: “Nākwụghachinu madu nile ihe nile unu ji ha n’ugwọ: tunu ụtụ nye onye unu ji ụgwọ ụtụ, tunu ụtụ-ahia nye onye unu ji ugwọ ụtụ-ahia, tuanu egwu onye unu ji ugwọ egwu, sọpurunu onye unu ji ụgwọ nsọpuru” (Rom 13:7). N’obodo anyị, akụkụ nile, na kwa mba nile, enwere iwu dị icheiche, nke emere maka ọdịmma nke ụmụmmadụ; ma ime ka ọtụtụ mmadụ biri n’otù náenweghị esemokwu, aghaghị ịsọpụrụ iwu ndị ahụ. “Ka mkpuru-obi ọ bula do onwe-ya n’okpuru ndi nāchi isi n’elu ya: n’ihi na ọ digh onye ọ bula nachi isi ma ọ buru na Chineke edogh ya; ndi nāchi isi bu kwa ndi Chineke doworo” (Rom 13:1).

Ọlụ dị icheiche nke Ndị ewere N’ọlụ

Ndị anyị na ha naalụkọ n’otù ebe bụ kwa ndị agbataobi anyị. Ayị aghaghị ịdị naemeso ha n’ụzọ ha gaeji mara na anyị bụ ụmụ Chineke. Pọl Onyeozi degaara Timọti sị: “Ka ha ra, bú ndi-orù nke nọ n’okpuru yoke, ha gua ndi-nwe-ha na ndi kwesiri nsọpuru nile, ka ewe ghara ikwulu aha Chineke na ozizí-ayi. Ma ka nwere ndi kwere ekwe dika ndi-nwe-ha, ka ha ghara ileli ha anya, n’ihi na ha bu umu-nna-ha; kama ka ha buru orù-ha kari” (I Timọti 6:1, 2).

Mgbe ụfọdụ anyị aghaghị agụ onweanyị ná ndị orù, ma ọ bụrụ na anyị naalụrụ onyeọzọ ọlụ, anyị aghaghị iji irube isi lụọ ọlụ zuruòkè bụ nke ọ naakwụ anyị ụgwụ ya. Mgbe ụfọdụ onye na ewe mmadụ n’ọlụ pụrụ ịbụ onye uche ya gbagọrọagbagọ na onye siriike n’ịlụrụ ọlụ. Ma nke ahụ abụghị ihe ngọpụ ime ka anyị ghara ịlụọlụ n’ụzọ ziriezi maka ụgwọọlụ anyị kwa ụbọchị. Pita dere: “Ndi nēje ozi, nēdonu onwe-unu n’okpuru ndi-nwe-unu n’egwu nile; ọ bugh nání n’okpuru ndi bụ ezi madụ ndi nwe-kwa-ra obi-ọma, kama ọ bu kwa n’okpuru ndi gbagọrọ-agbagọ. N’ihi na nka bụ ihe-ekele, ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nātachi obi n’ihe-nwuta di iche iche n’ihi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ, na-ahụ ahụhụ nke nēzigh-ezi” (I Pita 2:18, 19). Anyị gaanata ụgwọ-ọlụ dị ukwu karị n’Eluigwe maka ihe niile anyị hụrụ ahụhụ banyere ha n’ụwa a, naenwetaghi ụgwọ-ọlụ ọ bụla -- naenwetaghị maọbụ náánị. “I mere nke ọma” – kari ka anyị gaenweta n’ihe wetara anyị ụgwọọlụ n’ụwa a.

Jisọs sịrị: “Lezienu anya ka umu ghara ime ezi-omume umu n’iru madu, ka ha we kiri unu: ma unu emegh otú a unu enwegh ugwọ-ọlu n’ebe Nna-unu nke bi n’elu-igwe nọ” Matiu 6:1). Ihe ọ bụla anyị naeme ọ bụrụ na anyị naeme ya maka otuto nke mmadụ, anyị naenwetazu ụgwọọlọ anyi n’ụwa a. Ka anyị naalụrụ Jisọs ọlụ, naemeghị mkpọtụ ọ bụla, eleghịanya naekweghị ka mmadụ hụ anyị anya, ka anyị we nwe akụ n’Eluigwe.

Dịka Anaalụrụ ya Onyenwe anyị

Ọtụtụ mgbe ọ naabu ihe siriike na mmadụ onye naalụrụ onyeọzọ ọlụ pụrụ inwe mmetụta na ya dịka ọ naalụrụ ya Onyenwe anyị. Mgbe Pọl degara akwụkwọ nye ndi Efesọs, o we sị: “Ndi-orù, werenu egwu na ima-jijiji nāña nti okwu ndi bu ndi nwe-unu n’uzọ anu aru, nime afọ-ofufo nke obi dika unu nēmere Kraist; … were-kwa-nu obi-ọma nabu orù, dika ọ bu onye-nwe-ayi ka unu bu orù-Ya, ọ bugh kwa madụ” (Ndi Efesọs 6:5-7). Chineke naamazu ihe niile anyị naeme. Ọ nahụzu nsogbu niile anyị naagafe nime ha, ma kwekwa nkwà na Ya agaghị esi n’ebe anyọ nọ wezuga onwe Ya maọbụ rapụ anyị na Ya ga enye anyị ụgwọọlụ anyị maka ezi ọlụ niile anyị ma ọ bụrụ na anyị gaeme dịka anyị naemere ya Onyenwe anyị.

Mgbe Pọl degara ndi Galetia akwụkwọ, o we sị: “Ma ike agwula ayi n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na ayi gēweta ihe-ubi mgbe oge-ya ruru, ma ayi adagh mba.” O tinye kwara: Ka ay nālu ezi ihe n’ebe madu nile nọ, ma ka ayi nālu ezi ihe karisia n’ebe ndi ezi-na-ulọ nke okwukwe ayi nọ” (Ndi Galetia 6:9, 10).

Ụfọdụ mmadụ naeche na o kwesịghị ka ha rubere onye ọbịa sis n’ọlụ o goro ha dịka ha naerubere onye ha na ya nọ n’otù chọchị isi n’ọlụ. Ma o kwesịrị ka anyị naedebe onweanyị n’ụzọ kwesịrị ntụkwasịobi na irubeisi n’ọlụ. Pọl onyeozi dọrọ ndị Kraist akanántị ka anyị “nāgharanu idi ọbọ” (Ndi Rom 12:11). Ọ bụrụ na anyị naerubere ndi enyì anyị isi n’ọnọdụ ha, anyị na ha gaadị n’udo rue ogologo mgbe, ngọzi nke Chineke ga adịkwasị kwa n’arụ anyị.

Chineke nwekwara okwu nye ndi na ewe mmadụ n’ọlụ. “Ndi-nwe-madu, nēnye-kwa-nu ndi-orù unu ihe ziri ezi na nke ra nrata, ebe unu matara na unu onwe-unu nwe-kwara otù onye nke bu Onye-nwe-unu n’elu-igwe” (Ndi Kọlọsi 4:1). Ndi na ewe mmadụ n’ọlụ ma ha adịghị eme ihe ziri eze gaata ahụhụ maka ajọomume ha n’oge ikpe nke Chineke. (Jemes 5:1-6).

Iwu Ọlaedo Ahụ

Mgbe Jisọs nyere anyị ihe anyị kpọrọ Iwu ọlaedo, Ọ sịrị: “Ya mere ihe nile, ka ha ra, bù nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a, unu onwe-unu” (Matiu 7:12). Ọ sịrị: “madu” nke mejupụtara onye ọ bụla ndi nwoke, ndị nwanyị na ụmụ ntakịrị ndị si n’obodo dị icheiche, ndi nsọ na ndịmmehie.

Ekwuwo ya na ọ bụrụ na mmadụ niile enwe mkpebi n’iso iwu Ọlaedo a nsogbu niile nke dị n’ụwa a kwasụsiworị n’otù ụbọchị. Agụụ ichi isi agaghị adị kwa ọzọ, mmasị imejọ ndịọzọ ka ewe nweta uru nke onweonye agaghị adịkwa ọzọ. Ndị baraụba agaghị emegide ndị ogbenye; onye na ewe mmadụ n’ọlụ agaghị eme ka onye ewere ọlụ lụọ ọlụ karị ka o kwesịrị ịlị; onye ewere ọlụ gaenye onye were ya ọlụ ihe niile kwesịrị ya, na karị kwa ma ọ bụrụ na o new ike. Ụmụnne ndị nwoke, na ndị nwanyị agaghị enwe esemokwu; ndị bụ di na nwunye gaeji ịhun’anya na nsọpụrụ náemeso onweha. Nkewa na mgbasa nke di na nwunye agaghị adị kwa ọzọ, agaghị enwe kwa ụmụ ana ahụghị n’anya. Ọ gaghị abụ ụwa jupụtara n’obiụtọ? Nke ahụ bụ ụdị ụwa nke Jisọs gaachọ ka anyị biri nime ya. Nke a bụ ihe mere O jiri nye anyị iwu ndịa maka ibindụ anyị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị bụ ihe mbụ na ihe ukwu enyere n’iwu?

  2. 2 Gịnị bụ ihe nke abụọ nke yiri ya?

  3. 3 Kọ akụkọ banyere ezigbo onye Sameria ahụ.

  4. 4 Gịnị mere onye Sameria ahụ jiri bụrụ ezi onye agbataobi?

  5. 5 Gịnị ka Chineke kpọrọ onye ahụ sịrị na ya hụrụ Chinee n’anya ma ọ hụghị onye agbataobi ya ma ọbụ nwanna ya n’anya?

  6. 6 Òle otú o kwesịrị ka anyị naemeso ndị were anyị n’ọlụ?

  7. 7 Kwupụta kwa Iwu Ọlaedo ahụ ọzọ.

  8. 8 Gosị ọnọdụ gaadị n’ụwa ma asị na mmadụ niile naebi ndụ n’usoro Iwu Ọlaedo ahụ si dị.