Jemes 1:26; 3:1-18

Lesson 359 - Junior

Memory Verse
“Onye nēdebe ọnu-ya na ire-ya Na-edebe nkpuru-obi-ya ka ọ pua n’ahuhu ni3le” (Ilu 21:23).
Notes

Òkìkè nke Chineke

Chineke kerè mmadụ n’oyiyi Ya. O nyere Adam na Iv, nwoke na nwanyị mbụ ahụ, ubi agbara ogige nke maramma ka ọ burụ ebe obibi ha. Ha na Chineke kparitara ụka ka o jigharịrị n’ubi ahụ agbara ogige mgbe ifufé naefe n’ụbochị. Ha gaabụworị ndị jupụtara nnọ n’obiụtọ n’ebe ahụ tutu ha ekwenye n’ụgha nke Ekwensu wee mehie. Ha nụpurụ Chineke isi gbalịsiike izonarị onweha n’ebe Ọ nọ. Mmehie naekewapụ mmadụ n’ebe Chineke nọ. Adam na Iv apụghị kwa ibi n’ubi ọma ahụ agbara ogige, n’ihi na ha emewo iheọjọ a. Otù n’ime ụmụ ha ndikom mekwara iheọjọ, atakwara ya ahụhụ maka mmehie ya. Ken gburu nwanne ya nwoke, Ebel, n’ihi na ken nwee obiekworo n’arụ ya. O wee ghara Chineke okwu ụgha ma gbalisike ikpuchi mmehie ya, ma Chineke matara ihe mere. N’ihi mmehie ya, Ken si n’ebe Chineke na ebe obibi ya wezuga onweya. O rue otù mgbe o wee wute Chineke na O kère mmadụ. Kama iso ụzọ Chineke, mmadụ wee jupụta nnọ n’ajọ omume.

N’ihi Ọchịchị Ya

Jisọs nwa Chineke nọrị Ya na Nna Ya n’oge òkìkè nke ụwa. Anyị naagụ, “Esitewo n’aka Ya kè ihe nile, ekewo-ra-ra ihe nile” (Ndi Kọlọsi 1:16). Emere ihe niile ka enye Onyenwe anyị nsọpurụ na otuto. Na Mkpughe anyị naagụ banyere otú abụotuto: “Gi Onye-nwe-ayi na Chineke ayi, I kwesiri inara otuto nile na nsọpuru nile na ike nile: n’ihi na Gi Onwe-gi kère ihe nile, ọ bu kwa n’ihi ọchichọ-Gi ka ha diri, ka ekèkwa-ra ha èkè” (Nkpughe 4:11). Ekwuwo ya sị naewezuga mmadụ, niile ekèrèekè naeto Chineke. “Eluigwe nākọ nsọpuru Chineke; ọ bụ kwa ọju aka Ya ka mbara elu-igwe nēgosi (Abù ọma 19:1).

Arụ mmadụ kwesịrị ịbu ụlọ nsọ nke Chineke dị ndụ, ma Chineke apụghị ibi n’ime ụfọdụ mmadụ n’ihi mmehie nke dị n’ime ha. Ụfọdụ mmadụ naekwe ka ụkwụ ha duba ha n’ihe ọjọọ Ụfọdụ naeji aka ha naezu ori na ime ndịọzọ iheọjọọ. Ọnụ na ire ndị ụfọdụ naekwu iheọjọọ dị icheiche.

Ọ bụ ihe naatọ Chineke ụtọ na anyị naeme ka ire anyị neto Chineke otuto. N’Àbù Ọma nke ikpe azụ, anyị naagụ: “Ka ihe ọ bula nke nēku ume to Ja, Tonu Ja” (Abù Ọma 150:6). Ebe ọzọ n’Àbù Ọma anyị naagụ: Tonu Ja, n’ihi na ọ di nma ibùku Chineke ayi abù ọma” (Abù Ọma 147:1). Ndị nke Chineke naeji kwa ire naekpe ekpere, ịgba ndịọzọ ume, ịgba ama na ịgwa ndịọzọ banyere Jisọs.

Otù Ihe Ntà

Ọ bụ ezie na ire bụ náánị ihe ntà dị n’arụ mmadụ, ọ bụ ihe ọjọọ nke náadịghị eguzo n’otù ebe na nke sikwara ike ime ya ka ọ nọrọ juu. Anụ ufe nke eluigwe, anụmanụ dị icheiche ihe niile ọ bụla naakpụ akpụ na ihe niile ekerèekè nke óké osimiri, ka mmadụ mejuworo anya. Mgbe ndị mmadụ chọrọ ịgba ịnyịnya, ha naetinye bridle n’ọnụ ya ka ha nweike ime ka ọ nọrọ jụụ. Site n’eriri nke dị na bridle ahụ onye naagba ịnyịnya ahụ naeme ka o rubere ya isi ịga n’aka nri, maọbụ n’aka ekpe, maọbụ kwụsị. “Ma ọ digh onye ọ bụla n’etiti madụ pụrụ imeju ire anya; ọ bụ iheọjọọ nke naadịghị eguzo n’otù ebe, ọbu ihe jupụtara n’ire agwọ nēweta ọnwu.” Ma Chineke pụrụ imeju irue anya.

Otu Ọkụ

Ire bụ ihe ntà dị n’arụ anyị, ma ọ pụrụ imebi ihe n’ụzọ naenweghị atụ. Ihe niile ekwuworo na mbụ ka anapụghị ikwugharị. Onye ọzọ pụrụ icheta ihe anyị kwuwororị mgbe anyị chezọworo ha. “Ire bu kwa ọku”. Ọkụ pụrụ ịbụ ngọzi nye mmadụ. Ọ bụ ya ka eji esi nri, eme ka ụlo new okpomọkụ, eji kwa ya eme ihe ọma ndịọzọ dị icheiche ma náánị ọ bụrụ naemere ya ka ọnọrọ jụụ. Ma ọkụ pụkwara imebi nnukwu ihe. Ọbụná nwaọkụ nta! Ọ bụrụ naemeghị ka ọ nọrọ jụụ. ọ naeresi nnọ ike rue mgbe o nwere ike imebi ọtụtụ ebe obibi na ụlọ ndịọzọ ma laa kwa ọtụtụ ndụ n’íyì. “Ire bu kwa ọkụ” Ire pụrụ iweta nnụkwu ngọzi. Site náikwutọ mmadụ, ọ pụkwara iweta mmebi nke ọnụ naapụghi ịkọ, nke ana apụghị kwa idozi. Site n’ire nke naadịghị anọ jụụ, emewo ka ndụ ụmụ mmadụ na eziomume ha bụrụ ihe emebiriemebi, ewedara n’ala, ma bụrụkwa ihe alara n’íyì.

Ikwu Ajọ Okwu

O nwere mgbe ụfọdụ mmadụ naakpachara anya kwuookwu ọjọọ, na nke naakpali iwe. Ha naagbalịsike “ịbọrọ onwe-ha ọbọ” maọbụ ịta ndịọzọ ahụhụ site n’okwu ha. N’ụzọ dị otú a ụfọdụ mmadụ naenwe mmasị ime ka ndịọzọ taa ahụhụ. Ọ bụrụ na ọ dị ikpe na ịta ahụhụ gaje ịdị, ọ bụ ihe dịrị Onyenwe anyị izite ya. “Unu enyeghachila onye ọbụla iheọjọọ n’ọnọdụ iheọjọọ … Mu nwe ọbọ; Mu onwem gēnyeghachi, Ka onyenwe ayị Kwuru” (Ndi Rom 12:17-19).

Mgbe ụfọdụ ọ naadị mkpà ka ndị naachịisi – Nne na Nna, ndị nkuzi, ndịozi nke Chineke –idozi ụmụntakịrị na ndịọzọ. N’ezie okwu ekwuru n’oge ahụ nwereike bụrụ okwu ọjọọ nye onye kwuru okwu ahụ na onye anagwa okwu ahụ, ma onyenwe anyị chọrọ ka adọ aka nántị. Site n’ịlụ anyị naagụ: “Dọ nwa-gi aka na nti, n’ihi na olile anya dị” (Ilu 19:18), na “Egbochila idọ-aka-na-nti n’aru nwanta” (Ilu 23:13).

Mgbe ụfọdụ o nwere oge mmadụ ụfọdụ naekwu okwu ụgha na okwu nduhie. N’ezie ọ ga dị ka ha naerita urù n’ikwu okwu n’ụzọ dị otú a, ma ha naeme iheọjọọ nye onweha. Site n’Ilu anyị naagụ: “Ikpa àkù site n’ire okwu ugha bu otù nku-ume anēfesa n’ifufe; ndi nāchọ àkụ ahụ nāchọ ọnwu” (Ilu 21:22). “Agagh-agụ onye okwu-ugha n’onye nēmegh ihe ọjọ Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n’iyi” (Ilu 19:9). “Ndi ugha nile” ka agụrụ nime ndị ahụ aga atụba n’ọdọ ọkụ na brimstone ahụ rue ebighịebi (Nkpughe 21:8).

Ikwu Okwu Náamaghị Ama

Mgbe ụfọdụ mmadụ naekwu okwu ọjọọ ha naachọ ịgọpụ onwe ha site n’ikwu na ire ha kwuru ya námaghị ama. Ha nereike kwuo okwu nke ha na achọghị ikwu, ma n’ihi na okwu ọjọọ ndị ahụ di n’ime obi ha, ha aghaghị ịpụta. Iwe na ịkpọasị nke dị n’ime obi naeme ka ire kwue okwu ọjọọ. Mgbe mmehie dị n’ime obi, arụ niile abụrụwo ihe emerụrụ emerụ. Mmehie dịka ihe naeko achịcha, naemerụ arụ mmadụ dum “Ihe-iko-achicha di nta nēko ogbe utu ịka agwọrọ agwọ dum” (Ndi Galetia 5:9). Okwu mmadụ kwuru maọbụ omume o mere naegosipụta ka obi ya dị. “Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi gi, n’ihi na site na ya ka nputa nile nke ndụ di” (Ilu 4:23). Jisọs sịrị: “Ma ihe nke si n’ọnu puta nezi nime obi aputa; ihe ndia nēmeru kwa madu” (Matiu 15:18).

N’Ime Obi

Apụghị ịhụ mmehie nke dị n’ime obi anya ma ọ naemetụta okwu nke si n’ọnụ apụta. Ọ naeme ka mmadụ ñụọ iyi, kwuo okwu kwa okwu ọjọọ dị icheiche. Mgbe mmadụ nwetara nzọpụta, anaewepụ mmehie niile dị n’ime obi ya. Ịhụ n’anya Chineke nke naadị n’ime obi gaeme ka mmadụ kwuookwu maramma. Isiiyi anaghịesi n’otù ọnụ ahụ sụpụta mmiri n’atọụtọ na mmiri nnu. Ha ga agwakọta n’otù. Mmiri ahụ dị ụtọ gaaghọ nke naatọ nnunu. N’otù aka ahụ, ọbụná ọnụ na ngọzi agaghị esi n’otù ọnụ ahụ apụta. Okwu ọjọ naemerụ eziokwu. Anaemerụ ezi ndụ ọbụná site n’otù okwu ọjọọ.

Mgbe azọpụtasịrị mmadụ, Ekwensu naagbalisiike n’ụzọ dị icheiche ime ka onye ahụ kwuokwu n’ụzọ naezighịezi. Ịhụn’anya Chineke nke naadị nime obi onyeKraist gaenyere ya aka ịkwa ire ya nga. Ọ ganaekpe nnukwu ekpere, naanọkwa nime mmụọ kama ịdị náekwu okwu n’ụzọ nabaghị urù. Ọ ganaeze ikwu ọtụtụ okwu na ikwu okwu náechèghị échìchè. Oge dị mgbe ikwuokwu na mgbe Ịgba nkịtị (Eklisiastis 3:7).

Otù Nzube

Ka anyị naeche ire anyị nche, ilezi anya n’okwu nke onye ahụ dere Abù Ọma: “Chezi ire-gi ka O ghara ikwu ihe ọjọ, chezi kwa egbugbere-ọnu gi ka ha ghara ikwu okwu aghughọ” (Abù Ọma 34:13). Devid sịrị, “ka m’lezie uzọm nile anya, ka m’we ghara iwere irem mehie” (Abù Ọma 39:1). Ezubewom na ọnum agagh-agabiga oke” (Abù Ọma 17:3); na “Irem gānekwu okwu, dika onye natughari uche, banyere ezi omume-Gi, baye-kwa-ra otuto Gi ogologo ubọchi nile” (Abù Ọma 35:28). Site n’ime otú a ọ bughị náánị n’anyị naedebe onweanyị ka anyị pụọ n’ahụhụ, (Ilu 21:23), ma anyị pụrụ ịbụ kwa ngọzi nye ndịọzọ.

Site n’Ilu, anyị naagụ; “Ọla ọcha arọputara arọputa ka ire onye ezi omume bu. … egbugbere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzu ọtutu madu” (Ilu 10:20, 21). Ndị ahụ nọ ná njikere maka ọbịbịa nke Onyenwe anyị ka ejiri tụnyere ezigbo nwunye, onye ekwuru banyere ya sị, “Iwu nke ebere dikwasi kwa n’ire ya” (Ilu 31:26).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Èkere anyị n’ihi ọchịchọ onye?

  2. 2 Ụlọ nsọ onye ka arụ anyị bụ?

  3. 3 N’ụzọ dị añaa ka ire ji dị ka ọkụ?

  4. 4 N’ihi gịni ka isiiyi apụghị isụpụta mmiri naelu ilu na mmiri naatọ ụtọ?

  5. 5 Òlee otú ngọzi na ọbụbụọnụ pụrụ isi n’otù ọnụ ahụ pụta?

  6. 6 Gịnị naeme ka mmadụ kwuookwu ọjọọ dị icheiche?

  7. 7 Gịnị pụrụ ime ka ire mmadụ dere duu ka ọ ghara ikwuhie?

  8. 8 Òlee ụzọ ire ji bụrụ ihe náadịghị eguzo n’out ebe, ma jupụtakwa na nsí?

  9. 9 Òlee otú mmadụ pụrụ iji chebe okwu ya niile ka ọ ghara ịdị náekwu okwu ọjọọ?

  10. 10 Ụdị okwu dị añaa ka Devid zubere ikwu?