Jemes 5:10-20

Lesson 360 - Junior

Memory Verse
“Gọzie JEHOVA nkpuru-obim; Echezọ-kwa-la nmeso ọma Ya Ọ nemeso gi: Bú ONye nāgbaghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nagwọ ọria-gi nile” (Abù Ọma 103:2, 3).
Notes

Ihe Nlere Anya Ọma

Jemes onye dere akwụkwọ ozi a, maara ihe banyere ndụ ndị amụma nke Chineke ndị biworo n’ụwa a n’oge gara aga. Ha bụ ihe nlereanya nye Jemes na anyị onweanyị kwa n’ihe banyere ntachiobi, ekpere, na okwukwe. Eleghịanya ka Jemes nụrụ ihe banyere mkpagbu nke Job na ahụhụ nke Jeremaia onye atụbara n’ime olùlù, ọ mataghị na ahụhụ dị ukwu naechere ya onweya n’iru. Anaeme ka ndị nke Kraist dịwanye ike mgbe ha hụrụ ịdịike nke ndịọzọ. Ihe ndịa niile nyereaka iji kwadobe Jemes n’ihi ogbugbu nke akụkọ omen’ala gwara anyị na egburu ya, mgbe náadịghị anya ka o desịrị akwụkwọozi a.

Ịhụ ahụhụ n’ihi Kraist

Okpueze nke ndụ naechere ndịnsọ a, nke agba oche na agba ọhụụ ndị nyere ndụ ha n’ihi Onyenwe anyị. Ọbụná ta, anaakpọ ndị Kraist mgbe ụfọdụ “ịtụfu” ndụ ha n’ihi Kraist. N’ezie, Jisọs sịrị: “Onye ọ bula nke nāchọ izọputa ndu-ya, ọ gētufu ya: ma onye ọ bula nke gētufu ndu-ya n’ihim, ọ gāhu ya” (Matiu 16:25). Gịnị ka nke a pụtara? Nke a pụtara na ndị naeso Jisọs na ahụ kwa ahụhụ n’ihi Ya, naenyekwa Ya ndụ ha, gaenwe ndụ ebighịebi mgbe ndụ nke a gasịrị. Mgbe ụfọdụ Jisọs naakpọ mmadụ ka ọ rapụ ézínaụlọ ya we bụrụ onye nagbasa oziọma. Ụmụ ntakịrị nwoke na ndị nwanyị ndị arọ ha ka dị ntà purụ inyebiga ndụ ha oke n’ekpere, ọ bụrụ na Jisọ anọọdụ, ọ bụrụ kwa na Mmụọ Nsọ emetụ ha aka n’obo mgbe ha toruru ịga, ha nwereike ijé ọbụná n’obodo ndịọzọ we gwa ha ụzọ nke nzọpụta. Nime iheọmụmụ 365 anyị gaamụ ihe banyere òkù nke náabịa site nakụkụ ụwa nile maka izitere ha ndị naagbasa oziọma.

Ijeozi N’ikwesịntụkwasịobi

Arọ olenaole garaaga, Chineke kpọrọ otù nwa okorọbịa nke Portland ijere Ya ozi. Mgbe niile. Ọ naele anya inweta ohere iji lụọ ọlụ ntakịrị ọ bụla n’ụlọ Chineke. Ọ naahụ ka ndi usher naenye akwụkwọ abù ka ụmụmmadụ naabata n’ụlọ Chọọchị. O wee chee na ya pụrụ inyeaka iwelitere ndị usher akwụkwọ abụ, ọ malitekwara ime nke a. Emesịa ọ we bụrụ nwa naejeozi na onye naenyere onye naeguzo n’ọnụ ụzọ ụlọ nzukọ aka. Mgbe ọ naetolite, o we bụrụ otù onye nime ndị abụune, mgbe naadịghị anya o we burụ onye Olụ na onyeozi nke onweya, emesịa o we bụrụ onye ozi n’ala Afrika, we jegharịkwa n’Ụwa niile. Ọ hụrụ ọtụtụ ihe ike, ma o nwere ọñụ nime ijéozi nke Onyenwe ya. “Ayi nākpọ ha ndi ngọzi diri, bú ndi tachiri obi” (Jemes 5:11). Mgbe ọ kọsịrị akụkọ Jisọs nye ọtụtụ mkpụrụobi ndị nọ n’ọchịchịrị, Onyenwe anyị onye náeme ihe niile nkeọma kpọrọ ya ka ọ lọta n’Eluigwe ibinyere Jisọs., na ifè kwa òfùfè gburugburu Ocheeze ya na ndị nke Chineke ahụ buwororị ụzọ ga. Ta, ọ nọ n’enwe ọñụ nke ndị kwesịrị ntụkwasịobi ya na Jisọs na ndikom ahụ ndị ihe odide ha kwelitere mmụọ ya ịga n’ieu naanọ mgbe ebighịebi. Ya na Jemes nọ bú onye dere sị, Aririo nke onye ezi omume di ike nke uku n’ilusi-ọlu-ike-ya” (Jemes 5:16), Nke a bụ ihe mere o ji new mmeri: ọ gụrụ Baịbụl ya mgbe dum kpee kwa ekpere ebe ọ dị ukwu. Mgbe mmadụ naagụ Baịbụl ya, Chineke naagwa ya okwu site n’Okwu Nsọ Ya; ma mgbe mmadụ na, ekpeekpere, ọ naagwa Chineke okwu.

Ekpere Nille nke Elaija

Jemes nyere Elaia maọbụ Elaija dịka ihenlereanya onye azara ekpere ya niile. Ọ bụ kwa mmadụ efu, nke ihe naemetụ n’arụ na nke new kwara ọchịchọ nke aka ya, ma lee ka o si kpe ekper! Chineke nụụrụ ekpere niile dị ike nke nwoke a, wee mee ka mmiri ghara izo arọ atọ na ọnwụ isii. Óké Ụnwụ dakwasịrị Israel dịka ahụhu n’ihi mmehie niile nke ndị bi nime ya mere. Ọ bụ kwa n’elu ugwu Kamel ka Elaija kpekwara ekpere ọzọ mmiri we zoo. Ugbò asaa ka Elaija ekpereekpere tutu o wee nweta ọzízá. Ọ gaabụ na Chineke chọrọ inwapụta okwukwe Elaija, maọbụ na Chineke chọrọ ịkuziri anyị na anyị aghaghị ịnọgidesiike n’ekpere rue mgbe anyị natara ọzịzá. Elaija kpereekpere ugbò asaa, ma ọ natara ọzịzá -- ma lee ka mmiri ahụ si zoo!

Ọrịa

Oge naadị ná ndụ ndị ka n’ọnụọgụgụ mmadụ mgbe ọrịa naadawasị arụ a. Jemes isi 5, amaokwu nke 13 na 14 doro anya nkeọma na ọbụná nwantàkịrị pụrụ ịghọta ha. Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nāhuju anya? ya kpe ekpere”. Nke a bụ ihe onye nke Kraist naeme; ma onye nke naenwebeghị nzọpụta, kama ọ gaekpere ekpere, ọ nā-añụ mkpụrụ ọgwụ maọbụ ọgwụ mmiri. “Ò di onye ọ bula nwere obi-ụtọ? ya bụa abù ọma.” Nke ahụ bụ nna ihe onye nke Kraist naeme. N’ezie ọ na abụ abụ ọbụná mgbe obi naadịghị atọ ya ụtọ, na mgbe “ụzọ ya gba-kwara ọchichiri”. Obi ya naeto Chineke ọbụná mgbe ihe náadịghị agazi.

“Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nke aru-ya nādigh ike? Ya kpọ ndi okenye nke nzukọ Kraist ka ha bịakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n’isi ya, nēte ya mmanu olive n’aha Onye-nwe ayi: epere nke okwukwe ahu gazọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie”. Ndi okenye naete onye ahụ arụ náadịghị ike mmanụ n’aha Onyenwe anyị, Onyenwe anyị we mee kwa ka o bilie. Mmadụ ahụ enweghị ike ọ bụla nime ya ịgwọ onye ọrịa, okenye maọbụ onyeozi ahụ naete onye ọrịa mmadụ, enweghị kwa ike ọ bụla n’aka ya iju gwọọ onye ọrịa ahụ. Ọ bụ okwukwe nke dị n’ime obi onye ahụ arụ naadịghị ike, na okwukwe nke dị n’ime nzukọ, naewetara onye ọrịa ọgwụgwọ.

Ọ bụ ihe nwute ikwu na kama ụfọdụ mmadụ gaakpọ ndị okenye ha ka ha kpere ekpere, ha naejekwuru ndị dibịa ile ha ule, ndị ọ na abụ mgbe ha lepụtasịrị, ha na eziga karị ndị ọrịa n’ụlọ ọgwụ ebe aga egbuwa ha rụ iwepụta ihe ahụ naarịa ha. Ụfọdụ nzukọ adịghị ekwusa, kụzie maọbụ kwere na ọgwụgwọ nsọ, ya mere ndị òtù ha adịghị akpọ ndi okenye ha maka ikpere ha ekpere, kama ha naakpọ ndị dịbịa. “Otú a ka JEHOVA siri: Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru bú madu, buru ogwe-aka-ya” (Jeremaia 17:5).

“Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke JEHOVA bụ Chineke –ha” (Abù Ọma 144:15). “Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka” (Abù Ọma 146:5).

“Onye natukwasi JEHOVA obi, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu” (Ilu 16:20).

Lee ka o si bụrụ ihe ka mma bụ mmadụ itụkwasị Onyenwe anyị obi we nwe añụrị, kaị ịnọdụ n’okpuru ọbụbụọnụ nke Onyenwe anyị! Ọ gaabụ na ihe mere ọtụtụ mmadụ ji enweghị añụrị bụ na ha náatụkwasị mmadụ obi ịgwọ ha, karị ịtụkwasị Chineke obi.

Anyị gụrụ “JEHOVA, Nna-ayi ka I bu: anyị onwe-ayi bu urọ, Gi onwe-gi bu onye nākpu anyị; ọlu aka-Gi ka ayi nile bu” (Aisaia 64:8). “Ma ọbu ọkpu-ite, Ò nwegh ike n’ebe urọ di”? (Ndi Rom 9:21). Lee nọọ ka o si bụrụ ihe náekwesịghị ka eche ya na onye mere anu-arụ apughị idozi ya! Jisọs nwereike ịgwọ ndị niile náabịakute Ya taa n’okwukwe náekwere kwa, dịka O mere mgba ahụ Ọ nọ n’ụwa.

Ekpere Ahụ Niile Anaazaghị

Ụfọdụ nwereike ịjụ sị, “Ebe ọ di otú a gịnị mere na ọ bụghị mmadụ niile ka anaagwọ taa”? Ọ pụrụ ịbụ na okwukwe adịghị maọbụ o nwere ihe ndịọzọ kpatara ya. Chineke gwra ụmụ Israel sị: “Ọ buru na I ge nti nke-ọma n’olu JEHOVA, bu Chineke-gi, ọ buru kwa na i mee ihe nke ziri ezi n’anya-Ya, ọ buru kwa na i ña nti n’ihe Ọ nyere n’iwu, ọ buru kwa na I debe ukpuru-Ya nile, ọ digh ọrịa ọ bula nke M’tinyere n’aru ndi Ijipt M’gētiye n’aru gi” n’ihi na Mu Onwem bu JEHOVA nke nēme ka aru di gi nma” (Ọpupu 15:26). Anyị pụrụ ịhụ n’ebe a ihe ndị ahụ naeweta ọrịa: Ọ gaabụ na mmadụ emebeghị “ihe nke ziri eze.” Ma Devid sịrị: “Gọzie JEHOVA nnkpuru-obim … bú Onye nagbaghara gi ajọ omume-gi nile; Onye nāgwọ ọria-gi nile” (Abù Ọma 103:1-3). Ya mere ọ bụrụ na mmadụ emehiewo, mgbaghara dịkwara mmehie, ọgwụgwọ ọrịa dịkwara anụarụ site n’ekpere nke okwukwe. Ma otú ọ dị, ọ bụghị ọrịa niile mmadụ naarịa ka mmehie butere.

Nkwupụta bụ kwa ihe ọzọ nke Onyenwe anyị naachọ -- ọ bụghị ikwupụtara onye isi nchụàjà, kama “gwarita ibe-unu.” Ọ bụrụ na akọ na uche mmadụ naama ya ikpe n’ihe ihe onye ahụ mere, ọ dị mkpà na onye ahụ gaejekuru onye o mejọrọ wee kwere na ya emehiewo. Náekperịtaranụ ibu unu ekpere, mgbe naadịghị anya, ihe niile aghaghị ịdị mma.

Ekpere ekpesiri Ike

Ịbụ onye Kraist nke náachọ ihe n’aka – obi dị ọcha nke edokwara nsọ, ike nke Mmụọ Nsọ? ọgwụgwọ nke anụarụ gị? Ọ dị ihe ndịọzọ ị naachọ ohere iji lụara Onyenwe anyị ọlụ? ohere iji wulie talent nile O nyere gị n’ihi ọlụ-Ya? Ọ bụ ọchịchọ gị ịhụ na enyì gị maọbụ onye ị hụrụ n’anya nwetara nzọpụta?

Ị pụrụ inweta ihe ndịa niile ma ọ bụrụ na ikpe ekpere! Kpee ekpere! Kpee ekpere!

Ma, i nasị, azaghị ekpere niile. Ị na ekpesi ekpere ike? Ị na eji ịnụọkụn’obi na eziokwu na ekpesi ekpere ike” Èkpere gị niile ọ naadị ọkụ? maọbụ ha naajụ oyi? Chineke nke Elaija naaza kwa ekpere dị ike onye eziomume, maọbụ nwoke, maọbụ nwanyị, nwantakịrị nwoke maọbụ nwantakịrị nwanyị.

“Elaija kper’ekpere na Kamel El’igwe we nuru akwa ya, Amaram na Ọ bu ihe ebube N’ihi na ọkụ si n’elu da”.

“CHUKWU KWE KA MMADỤ DUM N’EKPE!”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Kpọọ ihe ra ka aha mmadụ ise nime agba Ochie ndị azara ekpere ha.

  2. 2 Gịnị ka mmadụ gaeme mgbe ọ naahụju anya?

  3. 3 Gịnị ka onye ọrịa kwesịrị ime?

  4. 4 Gịnị bụ ihe ekpere nke okwukwe naalụpụta?

  5. 5 Kwuọ ihe “idi ike” na “ịlụpụta ihe achọrọ” pụtara.

  6. 6 Òlee ekpere atọ nke Chineke zara Elaija?

  7. 7 Gịnị mere o ji dị mkpà na mmadụ gaatụkwasị Chineke obi maka ịgwọ ya ọrịa?

  8. 8 Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ndị naejekuru ndị dibịa maka ịgwọ ha ọrịa?