I Jọn 1:1-10; 2:1-17, 24, 25, 28, 29; 3:1-24; 4:7-21; 5:1-21; 2 Jọn 1-6, 12, 13; 3 Jọn1-8, 12-14

Lesson 361 - Junior

Memory Verse
“Ma ọ buru na ayi ejeghari n’ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n’ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n’etiti onwe-ayi, ọbara Jisọs, bu Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile” (I Jọn 1:7).
Notes

Onye Ahụ Naezo Ụzọ Jisọs Nke Ọ bụrụ N’anya

Mgbe Jisọs nọ n’ụwa amatara Jọn Onyeozi dịka “Onye naeso ụzọ onye Jisọs hurụ n’anya” Ya na Jisọs na Pita na Jemes nọkọrọ ọtụtụ oge, ya na Onye nzọpụta nwere ezi mmekọrịta karịa Onyeozi ọ bụla ọzọ.

Mgbe Jọn desịrị Oziọma ya, ọ sịrị “Ma edewo ihe ndịa n’akwụkwọ, ka unu we kwere na Jisọ bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke, ka unu wee, new ndu n’aha-Ya n’ihi na unu kwere” (Jọṅ 20:31). Jọn kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke dị nsọ, onye nke Abụọ nime Atọ Nime Otù. O dere sị. “Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke di-kwa-ra, Okwu ahu buru kwa Chineke. … Okwu ahu ahu we ghọ anu-aru, bu mmadụ, ọ we biri n’etiti ayu” (Jọn 1:1, 14). Nke ahụ bụ Jisọs.

Mgbe ya na Jisọs bisịrị arọ atọ na ọkàrà, nke o jiri gee ntị n’ije ozi Ya, hụ ọlụ ebube ndi Ọ lụrụ, ọ hụkwara ka akpọgidere Ya n’obe, we hu kwa ka Ọ bịaghachịrị na ndụ ọzọ náanụarụ, emere ka Jọn niile iji mee ka ndịọzọ mata eziokwu ahụ.

Mgbe Jọn ghọrọ agadị nwoke, mgbe o jisịrị ọtụtụ arọ jee ozi n’ịkwesị ntụkwasị obi nye Chineke na mmadụ, Chineke mere ka o dee akwụkwọ ụfọdụ ndị edebeworo anyị nime Baịbụl. O meghere nke mbụ n’otù ụzọ ahụ ọ kọwakwre n’ihe-ndepụta ya nke mbụ: na Jisọs na Chineke anọworị site ná mmalite, na Ọ bịawo kwa n’ụwa ibinyere mmadụ.

Ịmata

Jọn kwuruokwu banyere ihe ndị ọ nwaputaworo. Ihe karịrị ugbò iriatọ ka o jiri okwu a bụ “amawo” kwuookwu nime akwụkwọozi ys niile. Ihe niile o kwuru doro ya anya. Ọ nwapụtara na Jisọs naazọputa site ná mmehie naedebe kwa site na mmehie, ọ chọkwara ka ụwa mata eziokwu ahụ.

Jọn kwupụtara ihe anọ mere o ji dee akwụkwọ ndịa: iji tụkwasị ọñụ n’ọñụ ndị kwereekwe; iji dụọ ha ọdụ ka ha lezie anya ghara imehie; iji dọọ ha akanántị banyere ndịozízí ụgha; na iji gbaa okwukwe ha nime Kraist ume na ime ka o doo ha anya na ndụ egbighịebi gaabụ nke ha, ma ọ burụ na ha anọgide n’iso Chineke jee ijè n’ìhè nke okwu Ya, bụ Baịbụl.

Ọñụ Zuruòkè

“Ka ọñụ unu we zue” Ọ dịghị ezi obi ụtọ dị n’ụwa ọ burụ mmadụ amaghị nzọpụta nke Onyenwe anyị Jisọs Kraist. Jisọs naenye ndị nke Ya ike ibi ndụ nke mmehie náadịghị n’ihi na ọ bụ Ọkpara Chineke. Ọ bụ Ìhè nke ụwa, ọ bụrụ ka na anyị eso Ya náeje ije anyị aghaghị ijeije nime ìhè anyụ.

“Nka bu ikpe ahu, na ìhè ahu abiawo n’uwa, ma maadu huru ọchichiri n’anya kama ìhè ahu; n’ihi na ọlu-ya jọrọ njọ” (Jọn 3:19). Mgbe ụmụmmadụ mere ihe ọjọọ, ọ naadị ha mma ikpuchi ya. Ọbụná nwantakịrị naamata mgbe o mere ihe náadịghị mma, ọtụtụ mgbe ka ọ naagbalị izo ihe ọjọọ ahụ ka nne ya we ghara ịmata maọbụ kwuookwu ụgha banyere ya.

Anyị onweanyị bụ ndị Kraist aghaghị ibindụ nke ọ gaabụ na agaenwe ike gosi ihe niile anyị naeme nime ìhè. Ọ bụrụ na anyị chọrọ iso Jisọs jekọ ije, anyị aghaghị ibindụ dịka O biri. “Onye nāsi na ọ nanọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri” (Jọn 2:6).

Enweghi Mmehie

Ihe nke abụọ mere Jọn ji dee akwụkwọozi ya niile bụ nke a: “Umu-ntakirim, ihe ndia ka m’nēdegara unu n’akwukwọ, ka unu we ghara imehie” (1 Jọn 2:1).

Ọ bụ ihe siriike nye onye mmehie ịghọta na mmadụ pụrụ ibindụ nime ụwa a náenweghị mmehie. Ọtụtụ ndị naakpọ onweha ndị Kraist agụwo ihe Jọn dere, we sị na Jọn eguzosịghị ike n’ihe o kwuru. Ha sị na ọ bụ ihe anaapụghị imeeme bụ ibindụ dịka Jọna si kwuo. Ma Jọn birindụ otú ahụ; ọ bụrụ kwa na otù mmadụ pụrụ ibindụ otú ahụ, mmadụ ọzọ niile pụkwara site n’inye aka Chineke.

Jọn kwuru sị: “Ma ọ buru na ayi ejeghari n’ìhè ahu, dika Ya onweya nọ n’ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n’etiti onwe-ayi, ọbara Jisọs, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile” (1 Jọn 1:7). Agaazọpụta anyị site na mmehie ka anyị we nweike ijeije nime ìhè ahụ. Mgbe anyị naejeije nime ìhè ahụ ka Ọbara Jisọs nasachapụ anyị mmehie nile – nke pụtara odudonsọ. Ọbụná mmehie ochie, échìchè nke ime mmehie, bụ nke amụrụ anyị nime ya, ka anasachapụ site na ndụ anyị.

Ụfọdụ gaagụ amaokwu a: “Ọ buru na ayi asi na ayi enwgh nmehie, ayi nēduhie onwe-ayị, ezi-okwu ahu adigh kwa nime ayi” (I Jọn 1:8), we kwere na nke ahụ naenye ha ike iwu na onye ọ bụla naeme mmehie. Ma edere amaokwu ahụ nye ndị anaamụbeghị ọhụụ ma ha naeche na ha abụghị ndị mmehie. Ha naeche na ha dị mma otú okwesịrị ọbụná ma asị na ha enweghị nzọpụta. Ha naeche na ha gaeje Eluigwe náenweghị nchegharị. Ụdị mmadụ dị otú a náeduhie onweha.

Amaokwu nke náesote naagwa anyị sị: “Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa onye ezi omume, ka Ọ we gbaghara ayi nmehie ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile” (1 Jọn 1:9). Anyị niile emehiewo: anyị aghaghị kwa ikwenye na anyị bụ ndị mmehie. Nzọụkwụ ọzọ bụ ichegharị site ná mmehie anyị. Mgbe ahụ Jisọs gaagbaghara anyị, anyị gaebi kwa ndụ nke mmehie náadịghị ya ka anyị n’erubeere Onyenwe anyị isi.

Imeri Ajọ Onye Ahụ

Jọn sịrị na ya naadegara ụmụokorọbịa akwụkwọ n’ihi na ha “emeriwo ajọ onye ahu” (1 Jọn 2:13). I bụ onye náemeriemeri pụtara inwe mmeri. Ajọ onye ahụ bụ Ekwensu, mgbe anyị ghọrọ ndị Kraist, anyị adịghị adaba n’ọnwụnwa nke ọ naeweta n’iru anyị. “Umu okorọbia, edegaram unu kwukwọ, n’ihi na uni di ike, okwu Chineke nānọgide kwa nime unu unu emeriwo kwa ajọ onye ahu” (1 Jọn 2:14). Ndị náemeriemeri naebi ndụ nke mmehie náadịghị.

Ihe mere ọtụtụ mmadụ ji náekwu na anyị apughị ibindụ nke náenweghị mmehie bụ n’ihi na ha bụrụ mmehie ụfọdụ n’anya, chọkwa ịnọgide nime ha. Ọ bụrụ na mmadụ chọọ ibindụ nke mmehie naadịghị n’ezie, Chineke gaenye ya ike ahụ.

Ịhụ Ụwa N’anya

“Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n’uwa n’anya. Ọ buru na onye ọ bula ahụ uwa n’anya, ihu’nanya nke Nna-ayi adigh nime ya” (1 Jọn 2:15). O nwere ike bụrụ na ihe mmadụ hụrụ n’anya abụghị ihe ọjọọ, ma ọ bụrụ na ọhụrụ ihe ahụ n’anya karị ka ọ hụrụ Chineke, ọ naeme ihe nádịghị mma. Chineke chọrọ ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị; ma ọ bụrụ na anyị naeche échìchè karị banyere ụlọ, ala, ego, ike maọbụ nsọpụrụ karịa ka anyị naeche banyere Jisọs, ịhụn’anya nke Nna adịghị nime ayi. Ihe nke ụwa a nagafe, ọ bụrụ kwa na anyị enweghị Ihụ-n’anya Chineke n’obi anyị, ọ dịghị ihe gaafọdụrụ anyị. Ma ọ bụrụ na anyị eme ihe Nna naachọ, anyị gaanọde” rue mgbe ebigh-ebi.

Ndịozízí Ụgha

Ihe nke atọ mere Jọn ji dee akwụkwọ ya bụ iji dọọ ụmụ mmadụ akanántị banyere ndịozízí ụgha. Atọrọ ntọala nke nzukọ nke Kraist a mgbe náadịghị anya garaaga, Ekwensu naabịa kwa n’otù ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ ịnapụ ụmụmmadụ okwukwe ha, dịka ọ naeme n’ụbọchị ta.

Otù ụzọ Ekwensu si abịa bụ site n’ime ka ụmụmmadụ new obi abụọ na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, na Ya na Chineke nọ site mmalite, na esitere na Ya kee ụwa niile. Ma Jọn kwere ya, ọ sịkwara na onye ọ bụla náekweghị nke a bụ onye ụgha na onye náemegide Kraist. Cheè échìchè banyere ndị niile naeje chọọchị, bụ kwa ndị kwere na Jisọs bụ onye ozízí dị ukwu bụrụ kwa onyeamụma, ma kwere kwa na ọ bụ náánị mmadụ dịka anyị bụ. Ndị ahụ bụ ndị náemegide Kraist. Ọ bụrụ na ị naamụ ihe banyere mmadụ isi n’Enwe nwogharị (evolution) pụta n’ụlọ akwụkwọ, cheta na ọ bụ chepụta nke mmadụ, ọ bụghị kwa eziokwu. Ndị nchọpụta náagbanwe échìchè ha banyere mmalite nke ụwa na ndị bi nime ya, ma Okwu Chineke adịghị agbanwe. Cheta, Baịbụl naekwu banyere Jisọs sị: “Ekère ihe niile site n’aka-Ya, ekèghi kwa otù ihe ọ bula nke ekèworo ma Ọ nọgh ya” (Jọn 1:3).

Mmụọ Nke Eziokwu

Jisọs sịrị na mgbe Ya laghachisịrị n’eluigwe, na Ya gaezite Onye nkasiobi, bụ Mmụọ nke eziokwu. “Mgbe ọ bula Onye ahu gābia, bu Mọ nke ezi-okwu, Ọ gēduba unu n’ezi-okwu nile” (Jọn 16:13). Jọn naekwu banyere Mmụọ nke eziokwu ahụ dịka “otiti-madu site n’Onye Nsọ ahu” dika-kwa “otite-manu ahu nke unu natara n’aka-Ya” nke “nādigede nime unu, … dika ọ bu kwa ezie, nābugh kwa okwu ugha, dika O zi-kwa-ra unu, nānọgidenu nime Ya” (1 Jọn 2:20, 27).

Ya mere, anyị hụrụ na ka Jọn naede akwụkwọozi ya niile, ọ naekwusa banyere onyinyeamara atọ nke ime mmụọ: mgbaghara mmehie, ịgụmmadụn’onye eziomume; ime ka obi dị ọcha, odudo-nsọ; na baptizim nke Mmụọ Nsọ -- otitemmadu ahu nke unu natara n’aka-Ya nāgidide nime unu.”

Nkọwa Jọn Bnayere OnyeKraist

“Ndi m’huru n’anya, ugbu a ka ayi bu Chineke, akēmegh kwa ka ọ pụta ìhè ihe anyị gābu: anyị matara na, ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhe, anyị gābu ndi yiri Ya; n’ihi na ayi gāhu Ya otú Ọ di” (1 Jọn 3:2). Ọ bụrụ na anyị bụ “umu” Chineke anyị gaenwe ụdị omume nke Nna anyị nwere. “Onye ọ bula nke amuworo site na Chineke asigh-eme nmehie” (1 Jọn 3:9).

O nwere ihe dị iche n’ebe ụmụ Chineke na ụmụ Ekwensu nọ. Anyị naele náahụ ndị sị na ha bụ ndị Kraist, mgbe ụfọdụ ọ naeju anyị ịhu na ọ dịghị ihe dị iche n’etiti ha na ndị ụwa. “Nime nka ka umu Chineke bu ndi emeworo ka ha puta ìhè, ha na umu ekwensu; onye ọ bula nke nādigh-eme ezi omume esigh na Chineke puta, onye nke nādigh-ahu nwa-nna-ya n’anya esigh kwa na Ya puta” (1 Jọn 3: 10).

Ọ bụ ihe dị ezi mkpà nye gị na I gaahụ nwanne gị n’anya? Okwu ahụ naagwa anyị na: “onye ọ bula nke nākpọ nwanna ya asi bu ogbu-madu” (1 Jọn 3:15). Ọ dịghị kwa ogbummadụ ọ bụla náenweghị nchègharị gaeje Eluigwe. Anyị naegosi nwanna anyị ịhụn’anya site n’omume anyị. “Unu-ntakirim, ka ayi ghara ihu n’anya n’okwu, ma-ọbu n’ire; kama ka ayi nāhu n’anya n’ọlu na ezi-okwu” (I Jọn 3:18).

Ọ bụrụ na anyị naebi ndụ dịka Chineke chọrọ ka anyị naebi, Ọ gaanụ ma zakwa ekpere anyị niile. “Ndi m’huru n’anya, ọ buru na obi-ayi amagh ayi ikpè, ayi nwere nkwuwa okwu n’ebe Chineke nọ; ihe ọ bụla o nyere n’iwu, ayi nēme kwa ihe nile nāto utọ n’iru Ya” (1 Jọn 3:21, 22). Mgbe anyị naedebe kwa iwu Ya, Mmụọ Ya naesoro mmụọ anyị gbakọ ama na anyị bụ ụmụ Ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee aha eji mara Onyeozi bụ Jọn?

  2. 2 Gịnị mere o ji dee Akwụkwọozi Jọn?

  3. 3 Gịnị bụ isiokwu nke Akwụkwọozi niile nke Jọn?

  4. 4 Kwuo ihe atọ mere Jọn jiri dee Akwụkwọozi ndịa.

  5. 5 Gịnị mere ụmụmmadụ ji hụ ọchịchịrị n’anya kama ìhè ahụ?

  6. 6 Òlee otú anyị bụ ndịKraist gaesi jeije nime ụwa a?

  7. 7 Gịnị ka Jisọs gaemere anyị ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị?

  8. 8 Gịnị ka Jọn kwuru banyere ndị hụrụ ụwa n’anya?

  9. 9 Gịnị ka Jọn kpọrọ ndị ahụ náekweghị na Jisọs bụ Ọkpara Chineke?

  10. 10 Gịnị ka Jọn kwuru banyere ịhụ nwanne anyị n’anya?