Nehum 2:3, 4; 2 Timọti 3:1-5; 2 Pita 3:3, 4; Jemes 5:7, 8; Matiu 24:3-28.

Lesson 362 - Junior

Memory Verse
“N’ihi na dika amuma si n’ọwuwa-anyanwu puta, gosi kwa onwe-ya rue ọdida-anyanwu; Otú a ka ọbibia Nwa nke madu gādi” (Matiu 24:27).
Notes

N’elu Ugwu Olive

Ọ bụ n’elu Ugwu Olive, maọbụ Olivet ahụ ebe Jisọs gaesiworị rigo n’Eluigwe ka Ọ nọdụrụ ala n’otù ụbọchị Ya na ndị naesoụzọ Ya. “Gwa ayi”, ha gwara Jisọs”, … gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi, na nke ọgwugwu oge a?” Mgbe ahụ Jisọs kwuru banyere agha, ụnwụ, na alaọmajijiji nke gaabịakwasị ụwa n’oge naadịghị anya tupu o rue nlọghachi Ya. Okwukwara banyere ndịamụma ụgha, maọbụ ndi nkwusa ndị gaeduhie ndị mmadụ, na óké mmehie na nsogbu nke gaaadị n’ụwa. “Ozi-Ọma nka nke Ala-eze Elu-igwe”, Ọ sịrị, “agēkwusa kwa n’elu-uwa dum madụ bi, ka o buru àmà nye mba nile: mgbe ahu ka ọgwugwu ihe nile gēru kwa.”

Mana otu ụbọchị bara mgbe Jisọs Ya na ndị naeso ụzọ Ya nọ kwa ọzọ n’Ugwu Olive, n’otù ntabianya igweoji nabatara Ya nime Eluigwe. “Jisọs nka, onye anapuru n’ebe unu nọ rịgo n’elu-igwe,gābia n’otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n’elu-igwe,” ka ndikom abụa ahụ ndi guzo ha nso n’uwe ọha sịrị (Ọlu Ndi-ozi 1:11).

Ndị Kwereekwe Na Ndị Náekweghịekwe

Ọ bụ ezie na ihe ra ka puku arọ abụọ (2,000) agafewo site n’ụbọchị ahụ dị ebube, ma enwewo n’oge niile ndị nọ na nche, wee chere, ma nwekwa agụụ maka mbịaghachi nke Jisọs. Taa ezigbo onye Kraist anaghị asị, “Gwa ayi, gini gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọbibia-Gi,” ma ọ naelebe anya nime Akwụkwọ Nsọ nke Chineke maka iheịrịbaàmà ndị ahụ, ma naahụ kwa dịka ọ naele gburugburu na ihe ịrịbaàmà ndịa emezuwo. Gịnị ka ihe ndịa naegosi? Na Jisọs pụrụ ịbịa n’oge ọ bụla!

Ka anyị ghara iso nime ndịọchị ahụ ndị náasị “Òlee ebe nkwà nke ọbịbịa-Ya di? n’ihi a site n’ubọchi nna-ayi-hà dara n’ụwa ọnwu, ihe nile nadigide dika ha diworo site na mmalite nke òkikè” (2 Pita 3:4). Nkwà ahụ dị nime Okwu Chineke, ayi kwere kwa na ayi gaanọgide hụ mgbe Jisọs gaabịa.

Náánị n’ihi na otù ihe akameghi egosighị na ọpụghị ime maọlị. Tupu enwe Ijummiri, mgbe Noa wuru ụgbọ ahụ, ụmụmmadụ ekwereghị na Ijummiri gaadị. Ha chịrụ Noa ọchị n’ụbọchị ndị ahụ dịka ha naeme-kwa ndi nkwusa nke ezi-omume n’ụbọchị taa. Ma n’otù ntabi-anya, “oké iju-miri ahu biara, kpopu ha nile” (Matiu 24:39).

“Otú a ka ọbibia Nwa nke-madu gādi” (Matiu 24:39). N’otù ntabianya! Nye ndi ahụ náadighị echere Ya. “Dika amuma”, nke naakuja madụ! (Matiu 24:27). “N’etiti abali”, mgbe ọchịchịrị gbachiri ebe nile! (Matiu 25:6).

Enwere nnukwu ọtụtụ “ihe-iriba-ama” na akuziri anyị na ọbbịa nke Jisọs adịwo nso. Ndikom nke Chineke ndị biri n’elu ụwa tupu ụbọchị nke Kraist kwuru ọtụtụ ihe nke gaeme n’oge ikpeazụ a. Ihe ịrịba-ama di icheiche nke Jisọs gwara ndị naeso ụzọ Ya, -- Agha, Alaọmajijiji, nsogbuabiawori. Ọtụtụ ụmụ okorọbịa na ụmụ agbaghọbịa ndi dị na nwanta taa pụrụ icheta mgbe ha zipụworo ozi ekele nye nwanne ha nwoke maọbụ nna onye gara agha. Anyị anụwo banyere alaọmajijiji nke mebiworo ọtụtụ ihe na ọgbọ anyị, na kwa ahụhụ na nsogbu nke ọtụtụ mmadụ n’ụwa naanagide.

Ndịijè

Ọ dịworị mgbe ị naaga njem dịka ị na abịaru obodo ahụ nso i we hụ ihe odide dị icheiche nke nagosi ebe ndịijè naezuike naarụrụụra maọbụ ebe ha na eri ihe n’obodo ahụ; iheịrịbaama ndịọzọ naenye ọzọ ụkwụ oke di rue n’obodo ahụ; tinyere nke a ihe ịrịbaama ndịọzọ na oge ọ ga ewere iru n’ebe ahụ.

Taa anyị naaga njem. Onye ọbụla naaga Ebigh-ebi, okporo ụzọ nke ndụ ka egosipụta nkeọma Onye Kraist naaga njem, otú ọ dị, o nwere ihe náegosipụta n’obodo ahụ. Ihe naegosipụta ihe dị na ya, ihe naegosipụpta ụzọ esi eru ya; O naeji ilezianya mụọ ihe ndịa niile, nke bụ Baịbụl. Mgbe ahụ dịka ọ naaga n’ụzọ nke ndụ ahụ ọ naahụ iheịrịbaàmà nke ụzọ. Ọ naeleba kwa anya nime Baịbụl ya. Eziokwu, ọ naachọpụta na egosipụra ebe ahụ na Baịbụla ya, n’ebe ahụ kwa n’akụkụ ụzọ ka enwere iheịrịbaàmà ọzọ n’iru; ma mgbe ọ bịaruru nso igụpụta ya, ọ chọpụtara na ọ naagwa kwa ya otù ihe nke ọ naagụ na Baịbụl.

N’ụzọ ịma atụ, ka anyị were onweanyị dịka anyị naakwọ ụgbọ ala n’okporo ụzọ nke dị na Oregon. N’iru, anaahụ ụgbọ ukwu nke naebu osisi na kwa ụgbọ nke dị ogologo nke bu kwa osisi fir naaga ebe igwe nke naawa ha dị. Dịka amụma, amaokwu nke akwụkwọnsọ naabata n’obi anyị, na n’ụbọchị ndozi Ya, “osisi fir nile me nkpatu nke-uku” (Nehum 2:3). Anyị naaga kwa n’iru n’ịkwọ ụgbọ, n’otù ntabianya, n’iru, anyị naahụ ọtụtụ ụgbọala kwụsịrịakwụsi n’okporo ụzọ ahụ ma dịka anyị kwụsịrị anyị naahụ na ụgbọala abụọ akụkọrịtala n’iru nye onwe ha. Ọzọ, anyị naecheta na “Baịbụl” naasị na, nke a aghaghị ịbụ ụbọchị njikere Ya.

Anyị naaghọta na ndị naakwọ ụgbọala nọrị naañụ mmanya naaba n’anya, “iheiribaàmà” ọzọ nke naegosi na nke a bụ oge naesote mgbịaghachi nke Jisọs n’ụwa. Anyị naanụ nkwulu nke ndị iheụtọ nke ụwa ahụ nọ nime ụgbọala ndị ahụ naekwu nke bụ kwa ihrịrịbaàmà nke oge ikpeazụ (2 Timọti 3:1-5).

Iheịrịbaàmà Ndịọzọ

Anyị gaele anya gburugburu ịhụ “iheịrịbaàmà” ndịọzọ anyị nwereike ịchọpụta? Anyị naagụ na 2 Timọti 3:2, na “na mgbe ikpe azu” ụmụ okorọbịa na ụmụ agbọghọbịa gaabụ ndị naekwenyeghị ndị mụrụ ha. Ọ dịwo mgbe ị tụgharịrị ya n’uche na, mgbe ị naadịghị ekwenye ndị mụrụ gị, na ị naeme nnọ náánị ihe Baịbụl kwuru na ọtụtụ ụmụntakịrị ga naeme n’oge nke naesote ọbịbịa nke Jisọs? Ka ọ dị, ọ bụ ihe dị ezi mkpà n’oge a ụmụntakịrị dị otu kwesịrị inweta nzọpụta naatụfughị oge, ma rịọ kwa ndị mụrụ ha ka ha gbaghara nnupụisi ha, ma nwe kwa ezi nkwadobe maka ọbịbịa Onyenwe anyị. Ị bụ onye náenweghị obiekele nye Chineke maka nchebe Ya ná ndụ gị? Ị bụ onye náenweghị obiekele nye ndị mụrụ gị ns ndị enyì gị maka obiọma ha n’ebe ị nọ na kwa ọtụtụ eziihe i nwere n’ụwa? Ọ bụrụ na ị bụ, ị dị n’otù n’ime ndị ahụ náemezu “iheịrịbaàmà” ọzọ nke náegosi na mgbe ikpe azụ adiwo nso.

Ọtụtụ mmadụ adịghị erulata isi ha n’ekpere na tebụl nri ikele Chineke maka nri nke O nyere ha. “Ma mara nka, na mgbe ikpe-azu. …madu gābu … ndi nēnwegh ekele” (2 Timọti 3:2). Ọbụná ụfọdụ ndịKraist na ewere ihe ọ bụla na otú ahụ ka o kwesịrị ịdị, ma naechefu na “Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n’elu bia, ebe o si n’aka Nna nke ihè ridata” (Jemes 1:17).

Ị bụ okorọbịa maọbụ agbọghọbịa onyeKraist nke naaga akwụkwọ n’ụlọ akwụkwọ nke ọra mmadụ? Eleghịanya ị naahụ oge niile ka ụmụntakịrị ndị anaazọpụtabeghị naemeso gị omume ọjọ, naachị kwa gị ọchị n’ihi na ị dịghị eso ha jee ụlọ egwuriegwu, iteegwu, ịgba bọl na kwa ihe ụtọ nke ụwa ndịọzọ Ị dịghị eyi uwe n’ụdị nke ndị mmehie na eyi, ị dịghị kwa eji ọla na iheodide mejupụta onwe gị. Ha nweike ịjụ gị n’ihi na ị mere ka ị dị iche ma were kwa iheịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe gị mma. Nke a bụ “iheịrịbaàmà ọzọ, n’ihi Okwu Chineke naasị na mgbe ikpe azụ mmadụ gaabụ “ndi nādigh ahu ezi ihe n’anya.” Ma otù ụbọchị naabịa mgbe Onyenwe anyị gaachị ndị mmehie ọchị maka ihe ọjọ nke gaadakwasị ha bụ ndị naechegharịghị site ná mmehie ha.

Ije a nweike ịbịa na njedebe n’oge náadịghị anya; dịka onyeije naahụ ọtụtụ ihe ịrịbaàmà nke naegosi ya na obodo ahụ dị nso, out a ka ndịKraist naahụ ọtụtụ ihe ịrịbaàmà nke naegosi ha na Obodo nke Chineke di n’iru.

Ihe Ahụ Dịkasịrị mkpà

Ọ bụrụ na ị dịbeghị na njikere maka mbịaghachị ọsịsọ nke Jisọs, ewezugakwala ị nọ ná njikere karị. Were obi gị niile chọ Onyenwe anyị; chọ ọñụ ahụ nke náesi na náánị Ya bịa. Mgbe ahụ agaesi na ị nọ n’ụzọ ahụ nke n’aga Eluigwe. Mgbe azọpụtara gị, ị ghaghị ịchọ ma nwetakwa odudonsọ na baptizim ukwu nke Mmụọ Nsọ na ọkụ ahụ.

“Iheịrịbaàmà” dị icheiche nke mbịaghachi nso nke Jisọs naamụba ụbọchị niile -- ụsọtụ nke ụzọ ahụ aghaghị ịdị nso! O nwereike ịdị n’iru karị ka Ị naeche. Ị dịwo na njikere?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị bụ ajụjụ ndị naesoụzọ jụrụ Jisọs n’Ugwu Olive?

  2. 2 Gịnị bụ ọzịzá nke O nyere ha?

  3. 3 Kpọọ aha otù onye ode akwụkwọ na Testament ochie onye kwukwara banyere iheịrịbaàmà nke mgbe ikpeazụ.

  4. 4 Gịnị ka o buru n’amụma?

  5. 5 Òlee ụzọ anyị si mara na ihe ndịa niile emezuwo?

  6. 6 Gịnị bụ ihe dị mkpà o kwesịrị ka anyị mee iji new njikere izute Jisọs mgbe O gaabịa?

  7. 7 Òlee ihe mere o jiri dị mkpà ịdị ná njikere, na ịnọgide na njikere?

  8. 8 Gịnị ka ndị ọchaị naasị?

  9. 9 Gịnị gaeme ndị ahụ agaarapụ n’ụwa?

  10. 10 Gịnị gaabụ Ụgwọọlụ nke ndị ahụ nọ ná njikere?