Matiu 25:1-30; Nkpughe 2:1-4; Ilu 31:10-31

Lesson 363 - Junior

Memory Verse
“Ya mere, nēchenu nche: n’ihi na unu amatagh ubọchi Onye-nwe-unu gābia” (Matiu 24:42).
Notes

Dịka Onyeozi N’abalị

“Ma unu mara nka, na ọ buru na nna-nwe-ulo matarari oge nche onye-ori gābia, ọ ganēche nche” (Matiu 24:43). Ọ bụ ezie na onyeori adịghị ekwu ụbọchị ọ gaabịa izuori, ma asị na mmadụ matara na agaenwe onye garaachọ ịbịa zue ya ori n’abaghị urù. Ebe onyeori pụrụ ịbịa n’oge ọ bụla, anyị aghaghị imechisị ọnụ ụzọ anyị ike mgbe niile we kpachapụrụ ihe ọ bụla ọ matara dị n’iru.

Jisọs sịrị na mgbe Ya gaabịa ịkpọrọ nwunye Ya anaalụ ọhụụ, na Ya gaabịa dịka onyeori n’abalị. Okwu ọ bụla kwuru bụ ezi okwu, ọ ghaghị kwa imezu. Ya mere asị na anyị bụ ndị mmara ihe, anyị gaejikere onweanyị maka oge ahụ Jisọs gaakpọrọ ndị nke Ya n’ụwa a.

Ọ pụrụ ịbụ n’ụtụtụ mgbe anyanwụ na awa n’akụkụ ụwa nke anyị a, anyị bụ ndị jikere izuta Jisọs gaamalite ụbọchị ọhụụ n’eluigwe. Na akụkụ ọzọ nke ụwa a ọ pụrụ ịbụ n’anya mgbe anaakwadobe ịrarụ ụra. Ọ gaabụ na ndị ahụ asịworị ọ” ma na mberede, agaakpọta ha ịhụ ebube nke ọbịbịa Jisọs, ha gaasị kwa ndị nsọ ha gaezute n’elu” ụtụtụ chi”. N’akụkụ Ụwa ọzọ, ọ gaabụ mgbe ha naanọdụ ala maka iri nri ehihie, ndị ahụ ntị ha ghere oghe n’ebe oku nke Jisọs di gaarpụ nri ha lakuru Jisọs n’Eluigwe maka inwe oriri nke nwunye anaalụ ọhụ nke Kraist. Otù ụbọchị anyị gaanụ okwu ndị ahụ: “ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu abiawo, nwunye-Ya edoziwo kwa onwe-Ya” (Nkpughe 19:7). Ụbọchị dị añaa ka nke ahụ gaabụ! Ma anyị aghaghị ijikere maka ya.

Ejikerewo

Gịnị ka ọ pụtara bú ijikere? Ụfọdụ gaasị: “Jisọs zọpụtaram site na mmehie niile. Amam na agbagharawom mmehiem niile. Echetaram mgbe Jisọs dorom nsọ wee mee kam dị nsọ. Otuto dị aña jupụtara na ndụ mgbe Jisọs jiri Mmụọ Nsọ wụọm mmiri” Ihe ndị ahụ bụ nnwapụta dị egwu, ma ọ bụrụ na anyị anọgide n’ikpeekpere na ịgụ Baịbụl, na ibindụ dịka Baịbụl si kụzi mgbe anyị natasịrị ha, anyị gaabụ ndị jikeworo mgbe Jisọs gaakpọ okù.

Ị ka nọ kwa naahụ onye ọ bụla n’anya dịka i meworo mgbe Jisọs zọpụtara gị ọhụ? Ị naecheta otú ndị ahụ ị kpoworo asị na mbụ si dị n’anya mgbe Jisọs batara nime obi gi? Ị naecheta otú isiworo chọọ ka ndịọzọ nwe ụdị ọñụnke nzọpụta ahụ ị nweworo? Ị kpesiri ekpere ike ka ndịọzọ nwe nzọpụta, ma kwa ihe niile ị pụrụ ime iji mee ka ha new mmasị banyere ihe nke náadị mgbe ebighịebi. Ị ka nwekwara ụdị ịnụọkụ ahụ?

Jisọs kpeere ndị naesoụzọ Ya ekpere, “Were ezi-okwu do ha nsọ” okwu-Gi bu ezi-okwu;” Ọ gakwara n’iru we sị, “ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi Nna” (Jọn 17:17, 21). Ị na echeta otàu ị si bụrụ onye ime udo na agụagụ mgbe Jisọs doro gị nsọ” Ị chọghị ịrụụka. I we new iheụtọ nime ịdị n’otù nke okwukwe ahụ odudonsọ webatara. Ị ka nwekwara ya rue ugbu a?

Mgbe ejiri Mmụọ Nsọ na ọkụ wụọ gị mmiri, ị nwere mmetụta nke ịdịnsọ nke onyenwe anyị nke mere na ọ dị gị ka ị pụrị isi n’ụwa a zọpụ ụkwụ ba nime Eluigwe. O wee dị gị ka ọ gaabụ náánị nwa nzọ ụkwụ ntà. Ọ ka naadị gị ka ọ dị nso? Jisọs sịrị na Onye nkasiobi ahụ bú Mmụọ Nsọ, gaabịa gwa anyị ihe banyere Ya karị. Ọ gaagwa anyị banyere ọñụ niile náechere anyị n’Eluigwe. Mmụọ Nsọ naabịa ịgwa anyị ihe banyere Ụlọ Ya.

Ma òle otú mmasị ị nwere ta ra n’ịnụ ihe banyere ebe ahụ Jisọs gara idoziri gị? Ị naekwu banyere ya dịka ị si náekwu banyere ụlọ ibi n’ebe a?

Ànyị naebi kwa ụbọchị, náenwe échìchè ahụ nime obi anyị na anyị bụ nwunye anaalụ ọhụ nke Kraist, na anyị kwesịkwara ịbụ ndị kwesịrị ntụkwasịobi? Ànyị na akpachapụ kwa anya ịhụ na ọ dịghị ihe ọ bụla dị nime ndụ anyị gaewute Jisọs, ma ọ bụrụ na ọ gaakpọ anyị taa ịbịa na ọlụlụ nwunye ahụ? Mmadụ pụrụ ibindụ dị mma, náenwe kwa ịnụọkụ n’obi dị ike ịhụ na ndịọzọ naemeso ibe ha dịka ha chọrọ ka emeso ha, (Iwu Ọlaedo) ma náagbanyeghị nke a, naenweghị ịhụn’anya Jisọs nime obi dịka o nwere ya mgbe eburu ụzọ zọpụta ya.

Ịtụfu Ịhụn’anya Mbụ Ahụ

Mgbe Jọn Onyeozi nọ n’agwaetiti Patmọs, egosiri ya n’ọhụ ihe bụ ezi ọnọdụ nke nzukọ niile ahụ dị nime Esia. Nke a bụ ihe Jisọs gwara ya banyere nzukọ ahụ dị n’Efesọs: “Amataram ọlu-gi nile, na ndọgbu i nadọgbu onwe-gi n’ọlu, na ntachi-obi-gi, mata kwa na i pugh inagide ndi ọjọ, i nwa-kwara ndi nākpọ onwe-ha ndi-ozi, i bu-kwa-ra ibu n’ihi aham, ike akāgwugh kwa gi. Ma enwerem nka imegide gi, na i gapuru ihu-n’anya ahu i nwere na mbu. Ya mere cheta ebe i siworo dapu, gi chègharia kwa, lu kwa olu mbu” (Nkpughe 2:2-5).

Azọpụtaworị ndịa n’ezie. Jisọs sịrị, “Cheta … ebe i siworo dapu.” Ha enweworị ịhụn’anya Chineke nime obi ha na mbụ, ma ha adaghachiwo azụ. Ha alụsịworị ọlụ ike nye Jisọs, ma ha ka nọ kwa naalụ. Ha enwewo ntachiobi, nke karịrị nke ọtụtụ mmadụ ndị naasị na ha bụ ndị nke Kraist. Ha kwugidesịrị ya ike n’ebe ọ dị ukwu megide mmebi iwu nke ndịọzọ. Ha chererị na ọ bụ Jisọs ka ha naemere ihe ndị ahụ ha naeme. Ma ha atụfuwo ịhụn’anya mbụ ahụ, ha ekwesịghị kwa ịbụ nwunye anaalụ ọhụ nke Kraist.

Okwu ahụ n’agwa anyị na ọ bụrụ na anyị enwe okwukwe nke mere na anyị gaenwe ike ibubiga ugwu, ma anyị enweghị ịhụn’anya Chineke nime obi anyị, anyị abụghị ihe ọ bụla. Anyị nwereike inye arụ anyị dịka àjà, new kwa ike inye ego niile anyị nwere iji nyere ndị ogbenye aka, ma nke ahụ agaghị eme anyị ịbụ nwunye anaalụ ọhụ nke Kraist. Anyị aghaghị inwe ịhụn’anya Chineke nime obi anyị, mee kwa ka ọ nọdụ n’ebe ahụ.” “Nke bu isi ihe nile menu ka ihu-n’anya unu nāhurita onwe-unu di ike; n’ihi na ihu-n’anya nēkpuchi otutu nmehie” (I Pita 4:8).

Ụmụ agbọghọ nzuzu ahụ n’amaghị nwoke

Nime ilu atụrụ banyere ụmụagbọghọ ise ndị nwere uche na ise ndị nzuzu, agwara anyị banyere otú ndị okpukpe, ndị naechere ọbịbịa Onyenwe anyị. Ha niile chere na ha ejikerewo, ma ise nime ha dịka ndị ahụ nọ nime chọchị dị n’Efesọs. Ha arapụwo “ihu-n’anya ahu ha nwere na mbu” Ha mere omume dịka ise ndịọzọ. Ha lụrụ otù ụdị ọlụ ahụ, ma ọbi ha abụghị otù. Ha enweworị ịhụn’anya Chineke na mbụ, ma ha rapụrụ ya ka o ohipụsia rue mgbe ọ naadịghị kwa mmanụ fọdụrụ nime arịa ha. Ọ bụghị ndị niile malitere dịka ndị nke Kraist gaanọ na njikere mgbe Jisọs gaabịa. “Onye were ntachi-obi nọgide rue ọgwugwu ihe nile, onye ahu ka agazọputa” (Matiu 10:22).

Nwanyị Anaalụ Ọhụ Nke Kraist

Òle otú anyị gaesi bie ndụ ka mmanụ anyị we ghara ihipụsi site n’arịa -- anyị ewe nọrọ náenweghị mmanụ nime arịa anyị? Nime Ilu 31 akọwara ihe banyere nwanyị na-ejide onwe-ya nke-ọma, nke bụ ụdị nwanyị anaalụ ọhụ nke Kraist.

“Obi di-ya aukwasiwo ya obi” (Ilu 31:11). Jisọs bụ Di ahụ. Ọ pụrụ itukwasị gị obi? Ọ nọghị ya ugbú a. Ò kwesịrị ịdị náenwe nsogbu banyere otú isi náebi ndụ gị ugbú a, Ọ naanọghị ya? Anyị aghaghị ibu nke a n’obi mgbe anyị naeme ihe niile; Jisọs Ọ gaachọ kam mee ihe dị otú a? Asị na enwere onye ọ bụla nime ụwa naele ihe m’naeme, ọ gaahụm dịka nwanyị analụ ọhụ nke Kraist? Mụ na Ya anyị dị n’otù n’omume na n’inwe aha ọma dịka di na nwunye kwesịrị ịdị? “Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe ọ bugh kwa ihe ọjọ, ubọchi nile nke ndu-ya.”

Obiọma

“Ọnụ-ya ka ọ sagheworo n’amam-ihe; iwu nke ebere dikwasi kwa n’ire-ya” (ama-okwu 26). Lee ọtụtụ ugbò ụmụmmadụ naechezọ ime ebere! “Ihu-n’anya nwere ogologo-ntachi-obi, Ọ new-kwa-ra obi ọma” (I Ndi Kọrint 13:4). O nwere obiọma, ọ bughị náánị n’ebe ndị eyi ya, ma ọbụ n’ebe ndi nọ ya nso ya na ha naemekọrịta nọ, ọ bụghị kwa na mgbe ụfọdụ. Obiọma dị ya ka iwu enyere enye. Ọ naeme obiọma ọ na eme ebere n’echeghị ya échìchè. Ọ na emere onye ọ bụla ebere ọbụná ma ndị naakpọ ya asị. Ọ pụrụ ikpere ndị na ekwutọ ya ekpere. Ịhụn’anya adịghị ekwo ekworo “Ihu-n’anya adigh-anya isi, ọ digh-afuli onwe-ya elu”

“Nkpuru nke Mọ Nsọ bu ihu-n’anya, ọñụ, udo, ogologo-ntach-obi, obi-ọma, idi-nma, ikwesi-ntukwasi-obi, idi-nwayo, imeru-ihe-n’okè” (Ndi Galetia 5:22, 23). Ọ bụ uche Chineke ka anyị mịa ọtụtụ mkpụrụ dị otú ahụ. Ọ bụ náánị obi nke jupụtara n’ịhụn’anya nke Chineke ka mkpụrụ dị otú ahụ gaesi apụta.

Ịgaziagazi

Pọl onyeozi gwara anyị sị: “Jegharia dika Ọ kwesiri ọkpukpọ nke akpọrọ unu, n’obi di ume-ala na idi-nwayọ nile, n’ogologo-ntachi-obi, nānagiderita ibe-unu nime ihu-n’anya: nānu ọku n’obi idebe idi-n’otù nke Mọ Nsọ nime ihe-okike nke bu udo” (Ndi Efesọs 4:1-3).

Ọ bụrụ na anyị asị na anyị bụ nke Kraist, anyị gaegosipụta ya site na ndụ anyị naebi. Ihe nwa Chineke naachọzi ike n’obi ya bụ ịnọ ná njikere mgbe Jisọs gaabịa. Ọ naagbalị inyere onweya aka kwa ụbọchị itoeto ka o we nwezue ntozu okè niile ahụ achọrọ.Ọ naagụ amaokwu dị otú a: “Eme-kwa-la ihe gēwuta Mọ Nsọ nke Chineke, onye akara unu akàrà nime Ya rue ubọchi ngbaputa. Ka ewepu ihe-ilu na ọnuma na iwe na iti-nkpu na nkwulu nile, ha na obi ọjọ nile, n’etiti unu” (Ndi Efesọs 4:30, 31). Ọ naarịọ Chineke ka O nyere ya aka ka ya we new ike me ka ndụ ya dị n’usoro dịka Okwu ahụ si dị. Ọ dịghị achọ maọbụ n’ekwu banyere ihe náadịghị mma dị n’omume ndịọzọ.

“Achọla ntụpọ ka i na ejeghari nime ndu a, Ọbụná mgbe i huru ha, Ọ di mma buru kwa ihe ziri ezi ime ka aga-asi na ihụghi ha Ma na ele idi mma di ya na-azu”

“Ya mere, dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n’anya yikwasinu obi ebere [ma-ọbu obi omiko], obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntach” (Ndi Kọlọsi 3:12). Ihe ndị dị otú ahụ bụ omume nke nwanyị anaalụ ọhụ nke Kraist.

Ọlụ Nke Nwanyị Anaalụ ọhụ

“Mọ Nsọ na nwayi ahu analu ọhụ nke Kraist ịlụ. Ya na Mmụọ Nsọ naalụkọ ọlụ ịọ ndị mmehie ka ha chegharịa. Ọ naenweta “nri ya site n’ebe di anya” (Ilu 31:14), naeji kwa ihe nke eluigwe naazụ mkpụrụobi ya. Ọ dịghị kwa enwe mmasị n’ihe nke uwa a karị kwa ịnọgide n’ọlụ rue mgbe Jisọs, Onye bụ onye ọlụlụ nwunye nke obi ya naachọ, gaabịa.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị ka anyị mara banyere oge Jisọs gaabịa?

  2. 2 Gịnị naeme anyị mgbe agụrụ anyị ná ndị eziomume?

  3. 3 Gịnị ka odudonsọ naemere anyị?

  4. 4 Gịnị ka Jisọs kwuru na Mmụọ Nsọ gaagwa anyị?

  5. 5 Ugbu a ka okwukwe, olileanya na ịhụn’anya náanọgide; òle nke kachasị ukwu?

  6. 6 Gịnị ka Jisọs kwuru na ọ bụ ihe ihe na adịghị mma nime nzukọ n’Efesọs?

  7. 7 Gịnị ka onye amam ihe ahụ kwuru banyere obi ebere nke nwanyị ahụ ná ejide onweya nke ọma?

  8. 8 Gịnị bụ mkpụrụ dị icheiche nke Mmụọ Nsọ?

  9. 9 Gịnị bụ ọlụ nke nwanyị analụ ọhụ nke Kraist?