Asaia 7:14; 9:1-7; 11:1-5; 42:1-4; 53:1-12

Lesson 364 - Junior

Memory Verse
“N’ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi” (Aisaia 9:6).
Notes

Messia Ekwerenánkwà

Mgbe amụrụ Jisọs Kraist na Betlehem, emezuru ọtụtụ nkwà nke Chineke. Site n’oge nwoke mbụ na nwanyị mbụ ahụ, ka ekwere nkwà nke Onyenzọpụta. Mgbe Adam na Iv mehiesịrị, Onyenwe anyị gwara agwọ ahụ sị: “Irọ ka M’gētinye kwa n’etiti gi na nwanyị ahụ, na n’etiti nkpuru-gi na nkpuru-ya: nkpuru ahu gēchifia gi n’isi, gi onwe-gi gēchifia kwa ya n’ikiri-ukwu” (Jenesis 3:15).

Nke a nkwà mbụ ekwere banyere Messia (Onye Etere Manụ). Onye-nzọpụta ahụ nke gaazọpụta mmadụ site ná mmehie ha (Matiu 1:21).

Emesia, Chineke ekwe Abraham nkwà sị: “Agāgọzi kwa gburu nile nke uwa gi” (Jenesis 12:3), nke emezuru na Jisọs Kraist. Site na mgbe ahụ ga n’iru ka anaechetara ndị Ju ọgbụgbandụ nke Chineke na Abraham gbara. Ndị amụma gwara ha ọtụtụ ugbò banyere Messia nke gaje ịbịa. Kraist onye amụma ọ bụla ọzọ, Asaia buru amụma banyere ọbịbịa Kraist.

Onye Amụma

Aisaia bụ onye amụma nke Juda. O kwusara nkwusa ya n’otù oge ahụ dịka Emọs na Hosea kwusara. Ọ bụ onye amụma nke Onyenwe anyị kwesịrị ntụkwasịobi site n’oge Uzaia rue ụbọchị Hezekaia (Aisaia 1:1). Akụkọ ụwa naagwa anyị na egburu Aisaia n’ihi ihe ndi o kwupụtara banyere Chineke.

Ibu amụma pụtara ikwu ihe gaeme eme mgbe ọ naemebeghị maọbụ ikwusa nkwusa. Chineke gosịrị ndịamụma Ya ihe ndị gaji ịbịa, ma kwa ka ha kwue ma dee ihe Chineke gaje ime. Anyị naagụ nime Baịbụl banyere ọtụtụ amụma na mgbe ọtụtụ nime ha mezuru.

Ọmụmụ Kraist

Ka anyị tụgharịa uche n’amụma Aisaia ụfọdụ banyere Kraist. Aisaia dere okwu nke Onyenwe anyị ndịa: “N’ihi nka Onye-nwe-ayi Onye-Ya gēnyere unu ihe-iriba-ama; le, nwa-agbọghọ ahu di ime, ọ gaje imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel” Nke a gaabụ iheịrịbaàmà igosi na nwantà ahụ bụ Messia nke ekwere na nkwà. Apụghị ime ihe nke a ma ọ bụghị site n’ezi ọlụ ebube. Ime nke a gaabụrị site n’ezi Ọluebube n’ihi na odighị ụzọ ọzọ apụrụ isi me ya. Jisọs bụ Ọkpara Chineke, mmadụ gaele kwa anya na ọmụma Ya aghaghi idi ebube na ịtụn’anya, dị ka iche n’ọmụmụ nwantà ọ bụla ọzọ. Amụma dị otù a ọ pụrụ imezu?

O mezuru. Banyere, ọmụma Jisọs anyị naagụ na otù Mmụọozi gwara Meri, nwaagbọghọ náamaghịnwoke na ọ bụ ya gaabụ nne otù nwata nwoke onye ọ gaakpọ aha ya “JISỌS” (Luk 1:27, 31).

Mgbe oge ruru, Meri mụrụ Jisọs (Matiu 2:1, 11). “Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n’ọnụ onye amụma-Ya wee mezu” (Matiu 1:22).

N’ihi na ụmụmmadụ apụghị ịghọta ihe ebube nke dị n’ọmụmụ Jisọs, ha achọghị ikwere ya. Ma Baịlụ bụ eziokwu, ndị ahụ hụkwara Onyenae anyị n’anya naekwere ihe Ọ naekwu. Jisọs dị nsọ, ọ bụ kwa náánị Ya bụ onye pụrụ imezu amụma nke a. Jisọs abụghị mmadụ efu Ọ bụ Ọkpara Chineke.

Aha Ya Niile

Jisọs bụ ụdị Mmadụ dị ebube nke mere na akpọrọ Ya ọtụtụ aha. Onye amụma ekwuworị na aha Ya gaabụ Immanuel, nke pụtara “Chineke nọnyere ayi.” Mmụọozi ahụ kwuru sị: “I gākpọ kwa aha-Ya JISỌS: n’ihi na Ya onwe-Ya gāzọpụta ndị nke Ya na nmehie nile ha” (Matiu 1:21). Jisọs nwe-kwa-ra aha ndịọzọ. Aisaia onye amụma kwuru sị: “A gākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndụm-ọdụ, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mgbe nile ebigh-ebi, Onye-isi Udo”. Nime abụ na n’okwu Chineke n’ụbọchị ta, anyị naakpọkarị Jisọs otù nime aha ndia. Náánị otù aha apụghị ikọwa Jisọs. Ọ naenwe ọtụtụ nime ha iji kọwa ịdị ukwu Ya. Ọbụná Jisọs tụkwasịrị aha ndịọzọ n’ọnụọgụgụ ndịa. Ọ sịrị: “Mu onwem bu onye-ọzụzụ-aturu ọma” (Jọn 10:11); “Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu” (Jọn 14:6); na “Mu onwem bu ọnu-uzọ ahu” (Jọṅ 10:9). Eleghịanya ị pụrụ ịtụkwasị aha n’ọnụọgụgụ ekwupụtaworo n’ebe a. Otù onye agụkọtawo ihe karịrị otù narị (100) aha nime Baịbụl, bụ aha anaakpọ Jisọs.

Alaeze Ya

Aisaia buru amụma banyere Alaeze Jisọs na ọchịchị Ya. Ọ bụ Eze nime obi anyị ta, bụrụ kwa Onye naachịachị nime ndụ anyị niile. Ụbọchị ahụ naabịa mgbe Jisos gaewer ọnọdụ Ya dịka onye Naachị ihe niile “EZE kachasi ND-EZE nile, NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile” (Nkpughe 19:16).

Alaeze nke Kraist agaghi enwe ọgwụgwụ. Ọ gaachị ọchịchị rue mgbe ebighịebi (Ndi Hibru 1:8, Nkpughe 11:15).

Alaeze Ya gaabụ nke udo na eziomume. Jeremaia onye amụma kwukwara okwu banyere alaeze Kraist, Jeremaia kwuru sị: “Otù Eze gābu kwa eze, ọ gēnew kwa uche, me ihe epere n’ikpe na ezi omume n’ala nka” (Jeremaia 23:5).

Alaeze Kraist gaadị iche site na nke mmadụ. “N’ezie-okwu ka ọ gēme ka ikpé puta. Ọ gagh-enwu inyogh-inyogh, agaghị eme ka ọ daa mgba n’obi rue mgbe ọ gedoworị ikpe n’ụwa” (Aisaia 42:3, 4). Ọ bụghị otú ọ si hụ ihe ka O si ekpe ikpe, maọbụ otú O chere na ihe ahụ si dị, kama ọchịchị Ya gaabụ nke eziomume na nke ikwesị ntụkwasịobi “Ọ bugh kwa dika anya-ya abua si ahụ ka ọ gēkpe ikpe, ọ bugh kwa dika nti-ya abua si anu ka ọ gāba nba: kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnwegh ike ikpe, ọ gēji kwa izi-eze ba nba banyere ndi di ume-ala n’obi n’uwa” (Aisaia 11:3, 4). Ikpe Ya gaabụ nke eziomume n’ihi na “Mọ nke JEHOVA gēnew kwa ọnọdu-Ya n’aru ya” naenye Ya Mọ nke amam-ihe na nghọta, Mọ nke ndum-ọdu na idi-ike. Mọ nke ihe ọmuma na egwu JEHOVA”

Obiomiko

Eburu ya n’amụma banyere Kraist na Ọ gaenwe obiomiko. “Ọ gagh-akpaji ami apiara apia.” Mgbe Jisọs nọ n’elu-uwa, O nwere obi-ebere n’ebe ndi ahụ naata ahụhụ nọ. Ọ gwọrọ ọtụtụ ndị arụ ha naadịghị ike. Ọ kariri ndị chọrọ Ya obi nyekwara ha aka. N’ụbọchị ta, mgbe ndị ahụ ebowro ibu dị arọ na ndị naahụjuanya kpọkuru Ya n’ekpere, Ọ naeme ka ha nwere onwe ha. Onye dere Abù Ọma kwuru sị: “Jehova nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa; Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha” (Abù Ọma 34:18).

Ahụhụ Ya

Aisaia bukwara amụma banyere Onyenzọpụta ahụ hụrụ ahụhụ. Ọtụtụ arọ tupu akpọgide Kraist n’obe, Aisaia kwuru okwu ndịa dịka agaasị na ha emeworị eme: “Ya onwe-ya bu onye amapuworo site na njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n’ajọ omume nile nke ayi: ahụhụ-nmehie nke uso-ayi di n’aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike.” Jisọs wụsịrị Ọbara Ya iji hichapụ mmehie nke ndị ahụ náechègharị náekwere kwa. O nyere ndụ nke Ọbara Ya ka ewe new ike ịgwọ mmadụ ọrịa ya na nrịanrịa ya. Mgbe ụfọdụ ndụ Jisọs adịghị ezi ụtọ. Akpọrọ Ya asị leda kwa Ya anya. “Ma ndi-Farisi, ndi nāhu ego n’anya, nuru ihe ndia nile; ha we me Ya ihe-ọchi” (Luk 16:14). “Ndi-obodo-ya kpọrọ ya asị, ha we zie ndi-ozi ga n’azu ya, si, Ayi achọgh ka nwoke a buru eze-ayi” (Luk 19:14). Jisọs gwara ndị naeso ụzọ Ya sị” “Ọ buru na uwa akpọ unu asi, unu mara na ọ kpọwo Mu onwem asi mgbe ọ kakpọgh unu asi” (Jọn 15:18).

Nye Anyị

Agwara Jisọs ka Ọ rapụ obodo ndi Gerasa (Mak 5:17). Emere Ya iheihere, “onye nwere ọtutu ihe-ngbu na onye mara ọria nke-ọma.” Kraist hụrụ ihe niile ndịa anyị we new nzọpụta na ndụ ebighịebi. Ọ hụrụ ahụhụ n’ihi mmehie anyị -- “onye ezi omume n’ihi ndi ajọ omume” (I Pita 3:18).

“Achiri ya n’ihe-ike, ma ya onwe-ya wedara onwe-ya n’ala, we ghara isaghe ọnu-ya.” Jisọs atamughi ntamu maọbụ kwupụta na Ya naahụrụ ndịọzọ ahụhụ. Ụfọdụ mmadụ naachọ ebere naatamu kwa ntamu ọbụná mgbe ha wetara onweya ahụhụ na iheihere. Jisọs onye naamaghị mmehie ghọrọ mmehie n’ihi anyị. Eboro Jisọs ebubo ụgha jụọ kwa Ya ajụjụ, ma Jisọs agbalịghị ikpepụta onweYa; ọtụtụ ugbò, O kwughị otù okwu (Matiu 26:63; 27:14; Luk 23:9).

Jisọs were nnọ onweYa nye n’ihi ndịọzọ. Emere ka mmehie anyị niile dịkwasị Ya. Ọ hụrụ ahụhụ n’ihi anyị. Ma gịnị ka anyị meere Ya? Mgbe anyị naenye ndịọzọ onyinye n’oge ememe nke ncheta nke ọmụmụ Kraist a, anyị naewere ndụ anyị na abù otuto anyị nye Ya dịka onyinye? Chineke nyere onyinye ahụ kachasị ukwu mgbe O nyere Ọkpara Ya. Ị pụrụ inwe ndụ ebighịebi site na Ya? Ị pụrụ inwe nzọpụta. Ị nere ya ta? Ị pụrụ inwe ya site n’ikpe ekpere, n’ikwupụta, na irapụ mmehie gị nile, na ikwere nkwa Ya niile.

Ọnwụ Jisọs

Enwere amụma ndịọzọ eburu mezuru n’oge ọnwụ Jisọs. “Ebipuru ya n’ala ndi di ndu: site na njehie nke ndim ka iheotiti diri ya” “Ya na ndị naemebi iwu nọ kwa” “n’ọnwu Ya” -- n’etiti madu abụa ndi naapụnara madu ihe (Matiu 27:38) -- na “ya na ogaranya” -- n’ílì ọhu nke Josef (Matiu 27:59, 60).

Jisọs Kraist, Ọkpara Chineke, mezure amụma mgbe amụrụ Ya na Betlehem nke Judia. O mezuru amụma mgbe O nyere ndụ Ya, O “bapuru nmehie ọtutu madu.” Ọbụná ugbua, Kraist na-emezu amụma, n’ihi na Ọ nọ n’aka-nri Chineke, na-arịọrọ ayi aririọ (Ndi Rom 8:34). “O site-kwa-ra na nka pu izọputachasi ndi nēsita n’aka Ya abiakute Chineke, ebe Ọ nādi ndu mgbe nile iriọ aririọ n’ihi ha” (Ndi Hibru 7:25).

Aisaia bụ onye nke Chineke, onye biri Chineke nso, lụkwara Chineke ọlụ. O nwere ohere dị ebube ibu amụma banyere Kraist, Ọkpara Chineke. Nime Baịbụl, anyị agụwo na ọtụtụ nime amụma ya emezuwo. Ndiọzọ gaemezu kwa n’otùaka ahụ dịka ụfọdụ mezuwororị. Ka anyị, site n’ekpere na nrubeisi jikere onweanyị maka Alaeze Kraist ka anyị we nwe ike nọnyere Ya n’ebe ahụ. Ka anyị me otú ahụ ta site n’ife Nwa-ọhụ nke Betlehem òfùfè.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Gịnị bụ onyeamụma?

  2. 2 Kpọ aha ndị amụma ụfọdụ.

  3. 3 Òlee onye kwuru ihe banyere Kraist karịa?

  4. 4 Gịnị mere ọmụmụ Jisọs ji dị ebube na ịtụn’anya?

  5. 5 Gịnị bụ aha nne Jisọs?

  6. 6 Gịnị mere Jisọs jiri hụ ahụhụ ma nwụọ?

  7. 7 Òlee amụma Aisaia nke mezuru n’ọnwụ Jisọs?

  8. 8 Òlee akụkụ amụma Aisaia buru banyere Kraist nke náakaemezughị?