Matiu 28:18-20; 9:38

Lesson 365 - Junior

Memory Verse
“Welienu anya-unu elu, kiri ubi, na ha chara acha ugbu a ka ewere ihe di nime ha” (Jọn 4:35).
Notes

“Jisọs hụr’ụmụnta n’anya,

Ha niile bụkwa nke Ya;

Uhie n’ojii na ọcha,

Ha di-ok’ọnụ n’anya Ya;

Jisọs hụrụ ụmụnta dum n’ụwa n’anya.”

Anyị bụ ndị naeje Ụlọakwụkwọ nke ụbọchị ụkọ n’ụbọchị ụkọ niile enweghị ike ịghọtazu na igwe ụmụntakịrị n’ọtụtụ akụkụ ụwa anụbeghị banyere Jisọs. Ha enweghị ebe anaamụ ihe Ọmụmụ nke ụbọchị ụkọ. Ọ dịghị onye gwaworo ha na Jisọs nwụrụ ịzọpụta ndị mmehie na Ọ nachọ ka ha binyere Ya n’Eluigwe. Ha nọ nime ọchịchịrị, náechere ìhè nke Oziọma ka ọ mụkwasị ha. Ọtụtụ gaanwụ ma fue kwa. Òlee ụzọ agaesi gụọanyị ná ndị ikpe námaghị n’iru Chineke, ma ọbụrụ na anyị ajụ ịgwa ha banyere Jisọs!

N’oge náadịghị anya tupu Jisọs arịgo n’Eluigwe Ọ kpọkọtara ndị nesoụzọ Ya wee gwa ha ihe ọlụ ha gaabụ. Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n’aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ: nēzi ha ia ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M’nyere unu n’iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwụgwụ oge a” (Matiu 28:19, 20).

Ọtụtụ ndịozi ndị náejegharị ebe dị icheiche ejewo n’ọtụtụ mba dị anya ịgwa ndị ahụ náamaghị ihe Ọ bụla banyere Jisọs, atụgharịwo kwa Akwụkwọ ọgụgụ nke Oziọma n’asụsụ dị icheiche, ma zipụkwa ha ga n’obodo niile nke ụwa; ma anaasị na ihe ra ka ụzọ abụọ n’ụzọ atọ ndị bị n’elu ụwa anụbeghị akụkọ banyere Jisọs. Ànyị naeme ihe niile anyị pụrụ ime imezu iwu nke Jisọs mgbe Ọ sịrị, “Ganu n’uwa nile?”

Ike Nke Ijéozi

Mgbe Jisọs nyere ndị naesoụzọ Ya iwu ka ha nọgide na Jerusalem tutu ha enwetazuo ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ ahị, Ọ sịrị na ha gaanata ike ịbụ ndịàmà Ya “ru kwa ebe uwa sọturu” (Ọlu Ndi-ozi 1:8). Ihe ha gaje ịnata gaenyere ha aka ịkọ akụkọ banyere Jisọs nye ọtụtụ mmadụ ndị nọ n’ebe dị anya site n’obodo Jerusalem.

Nsogbu

Ọtụtụ nzukọ dị ebube sochitere ụbọchị Pentikọst ahụ, mgbe narị na iri mmadụ abụọ nime ndị naesoụzọ Ya nwetara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ ahụ. Pita we ghọ onye nkwusa dị egwu n’otù ntabianya ahụ, emekwara puku mmadụ atọ (3,000) ka ha chègharịa n’otù ụbọchị. Ndị naesoụzọ ahụ nọ naañụrị ọñụ maka nwụpụ nke Mmụọ nke Chineke ma náagbaghị agụgụ ndịKraist niile gaenweworị obiụtọ ịnọgide na Jerusalem maka ọtụtụ ngọzi ọzọ. Ma Jisọs asịwo, “Ganu”

Ndị naesoụzọ ahụ nwe ike ha amataghị na oge ezuwo ịga, ma mgbe Ndị Farisi malitere ịtụba ụfọdụ mmadụ n’ụlọ mkpọrọ ma gbue kwa ha mgbe ụfọdụ, n’ihi na ha kwere na Jisọs, ha si na Jerusalem gbasa ga n’ọtụtụ mba dị icheiche. “Ndi ahu we pua, kwusa ebe n’ile, Onye-nwe-ayi nēso kwa ha n’ilu ọku, nēme okwu-ha ka o guzosie ike site n’ihe-iriba-ama di iche iche nke nēso”(Mak 16:20).

Jisọs asịworị na Ya gaeso ha jee, O mekwara otú a.

Ọkpụkpọòkù Ịga Europe

Mgbe Pọl onyeozi chègharịrị ọ gara njém izi Oziọma ugbò atọ. Ebe niile ọ gara ọ gwara ụmụmmadụ banyere Jisọs. Otù abalị mgbe ọ nọ na Traos, nime ọhụ ọ hụrụ otù nwoke náabịa site na Masedọnia, “Gabita na Masedọnia, yere ayi aka” (Ọlu Ndi-ozi 16:9). O metụrụ Pọl mgbe ahụ na ọ bụ ozi nke si n’Onyenwe anyị bịa, ya na ndị naenyere ya aka atụfughị oge ijé Masedọnia. Nke ahụ bụ mmalite ikwu Oziọma na Europe.

Azọpụtara ọtụtụ mmadụ site na nkwusa ha kwuru ma ọ bụghị mmadụ niile nabatara ihe ha kwuru. Iwe were ụfọdụ mmadụ nke mere na ha tụbara Pọl na Sailas n’ụlọ mkpọrọ, ma ha akwụsịghị nkwusa ha. Chineke ezigawo ha ikwusara ụmụmmadụ ndị naamaghị banyere Jisọs, ha mekwara ihe ha pụrụ ime ezi Oziọma ahụ, náagbanyeghị ahụhu ha gaahụ.

Ịjụ Onweonye

Mmadụ iji onweya chụọàjà oge niile bụ ụdị mmụọ nke ezigbo onye nkwusa nke Oziọma. Ọ dị njikere ịhụ ahụhụ maka Jisọs ma ọbụrụ na ọ dị mkpà. Ọ dịghị achọ ụgwọọlụ ọ bụla nke ụwa. “Náánị ihụ ka onye azọpụtaworo naañụrị ọñụ bụ nááṅị ihe naakpọlị Mmụọ ya ịlụ ọlụ a” Ọ dị njikere ịrapụ ezi na. Ụlọ ya tinyere ihe ụtọ niile dị na ya, rapụkwa ndị enyì ya, na ndị ụmụnne ya ma jee ebe Chineke kpọrọ ya ka o jee.

Ime ka mmadụ bụrụ onye nkwusanjégharị nke naerita úrù nye Jisọs, ọ ghaghị ịbụ onye azọpụtaworo (onye agba-agharaworo mmehie ya niile); ma bụrụ kwa ihe asachara (onye emeworo ka ọ dị ọcha nime obi) site na odudonsọ. O kwesịkwara ka o nweta ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ dịka ndị naesoụzọ Jisọs chọkwara ya n’ụbọchị Pentikọst tupu ha amalite ịbụ ndịozi nke Oziọma.

Mgbe ahụ mmadụ agaghị inwe ịhụn’anya n’ebe mkpụrụ obi nọ, obiebere nye ndị furuefu. Ndịozi nke Oziọma asịwo na dịka ha naalụ ọlụ na ezigbo ịhụn’anya nye ndịmmadụ abụghị ihe anaeyikwasị uwe. Mmadụ nwereike mee ka agaasị na ọ hụrụ ndị ọ naekwusara okwu n’anya, ma ndị ahụ pụrụ ịmata ma ọ naalụ ọlụ ya dịka onyeozi site n’obi ya n’ihi ịhụn’anya o nwere n’ebe ha nọ maọbụ n’ihi ihe ọzọ.

Onye ozi ahụ agaghị ịghọta na ndị ahụ ọ naekwusara bụ ndikom, ndinyom na ụmụntakịrị ndị Jisọs nwụrụ ọnwụ maka ha. Ọ bụghị ọchịchọ nke Jisọs ka onye ọ bụla n’ụwa nwụọ ma fue dịka onye mmehie. O nyere ndụ Ya ịzọpụta anyị, Ọ chọkwara ka anyị nye ndụ anyị site n’ijere ndịọzọ ozi. Agọziri anyị ka anyị wee bụrụ ngọzi nye ndịọzọ. Anyị aghaghị inwe njikere ịhụkọ ahụhụ anyị na ndị ahụ anyị naachọ inyereaka. Nke ahụ abụghị ịrịọ óké ihe.

Jisọs rapụrụ ebe obibi Ya dị ebube n’Eluigwe ebe ndị Mmụọozi naenye Ya ekele, ma bịa n’ụwa ibindụ dị umeala, ọ bụghị n’obíeze Ya na ndịeze maọbụ n’ebe obibi maramma. Ya na ndị ọgaranya, ma O biri n’okpuru ụlị dị ala, Ya na ndị nnalụ ọlụ, ndị náegbu azụ bụ ndị akpọrọ asị n’iru ndị dị elu nke ụwa a. Ọ bụ ihe nlereanya anyị, O gwawo kwa anyị ka anyị naeso Ya.

Ọtụtụ Asụsụ

Mgbe ndịozi nke Oziọma malitere ịga nime obodo ndị náekpere arụsị ihe ra ka narị arọ (100) garaaga maọbụ karịa, ha chọpụtara ọtụtụ nnụkwu mmadụ ndị anaedebeghị asụsụ ha n’akwụkwọ. Ha enweghị ike ịgụ Baịbụl maọbu akwụkwọ ọgụgụ ndịọzọ nke ndịKraist. Onyeozi ahụ wee biri n’etiti ndị mba ahụ tutu ọ mụta asụsụ ha ịkpanyere ha ụkà. Oge ahụ ọ naede asụsụ ahụ n’akwụkwọ, ime ka ọ bụrụ ihe dedereede. Mgbe nke a gasịrị, o wee were ihe ahụ o dereede tụgharịa Baịbụl, maọbụ akụkụ ya. Mgbe ụfọdụ anaatụghị ihe edere na Baịbụl ka ya na ihe anaahụ n’ebe ahụ bụrụ otù. N’ụzọ ịmaàtụ, atụrụ adịghị n’obodo Iceland. Ndị ala ahụ enweghị kwa ike ịghọta ihe bụ ịkpọ Jisọs Nwaatụrụ nke Chineke. N’ihi nke a, ndị tụgharịrị okwu ahụ na mbụ jiri mkpụrụ okwu “seal” Enwere ọtụtụ seal n’ọtụtụ mmiri dị n’akụkụ obodo Iceland, ndị obodo ahụ pụkwara ịghọta ihe àtụ ahụ, “seal nke Chineke.” Mgbe ahụ ndịozi ahụ gaakụziri ndị ahụ ịgụ okwu Chineke. Ọ bụ ụzọ náewere nnukwu oge, nke náadịghị kwa aga ngwangwa; o were ha ọtụtụ arọ nke nnukwu iheọmụmụ, na nnukwu ekpere na inyeaka site na Chineke ime ka ede asụsụ n’akwụkwọ, na inye ndị nwere asụsụ ahụ Okwu Chineke ka ha gụọ. Ndịozi ahụ mere ya n’ihi na ha hụrụ mkpụrụ obi ụmụmmadụ n’anya, ma chọkwa ka ha mara ụzọ nke ndụ ebighịebi. Ọtụtụ mmadụ anapụghị ịgụta ọnụ ndị nwe asụsụ na okwu dị icheiche naagụ Baịbụl n’ụbọchị taa, n’ihi ịkwesị ntụkwasịobi n’ọlụ nke ndịozi mbụ ahụ lụrụ. Anyị pụrụ izigara ha akwụkwọ ọgụgụ nke oziọma inyere ha aka ịghọ ndịKraist n’ihi na mmadụ akụziworo ha otú esi agụ akwụkwọ.

Ọlụ ahụ ka naaga kwa n’iru. Site n’arọ rue n’arọ anaetinye asụsụ ọhụ ọzọ, atụgharịwo kwa Baịbụl taa n’ihe ra ka narị asụsụ na okwu iri itegheete na asaa (197). Ihe ra ka otù puku asụsụ na iriise na itegheete enwewo ọbụná otù Akwụkwọ nke Baịbụl. Ma náagbanyeghị nke a anaasị na ọnụọgụgụ asụsụ ra ka otù puku na narị asaa (1,700) enwebeghị okwu nke oziọma n’asụsụ ha.

Ụfọdụ ndịozi enwewo ibu nime obi ha iji igwè náekwu okwu gwa ndị náekweghịekwe banyere Jisọs okwu. Ụfọdụ ndị náanọchite anya ha ejewo ebe dị icheiche nke ha naejegharị na mbụ ebe anaedeghị asụsụ ha ede maọbụ ebe anatụgharịbeghị Baịbụl n’asụsụ ha, ha achọtawo kwa mmadụ onye pụrụ ịsụ asụsụ ndị ebe ahụ ma sụkwa nke onyeozi ahụ naasụ. Mgbe ahụ ọ gatụgharị kwa ozi nke Oziọma ma tinye kwa ya n’igwè náekwu okwu bụ ebe ha gaesi zipụ ha nye ndị ahụ náanụbeghị banyere Oziọma n’asụsụ ha. Ndịozi naeji igwè náekwu okwu apụrụ itinye n’akpa weta nkwusa nke Oziọma ahụ nke nzọpụta site ná mmehie nye ndị ahụ kpafuruakpafu ndị náaghọtabeghị na mbụ.

Mmụọ Ahụ Náekwu Okwu

Náagbanyeghị ụzọ eji gwa ndịmmadụ banyere Jisọs, Mmụọ Chineke aghaghị ikpanyere mkpụrụobi ụka ime ka azọpụta onye ahụ naege ntị. Mmụọ ahụ achọghị onye gaatụgharịrị ya asụsụ ọ bụla. Onyeozi nwereike ịnọ náekpere ekpere ya na onye náekweghịekwe, onye náenweghị kw aike ide ihe maọbụ gụpụta, onye náenweghị kwa ike ịghọta ihe ndịọzọ naasụ, ma Mmụọ nke Chineke pụrụ ime ka mkpụrụ obi ha n’otù n’otù dị nrò, ime ka ha nweta udo ahụ nke Jisọs naenye mgbe Ọ gbagharaworo onye mmehie nke náechegharị.

Ijéozi Nke Oziọma N’ụlọ

Ijéozi nke Oziọma anyị nwe ike ịmalite n’azụ ụlọ anyị. Onye agbataobi anyị nwere ike náechere ka mmadụ gwa ya banyere Jisọs. Gịnị gaewere ọnọdụ maọbụrụ na anyị arapụ ịgwa ya na Jisọs gaazọpụta ya site ná mmehie ya niile, o wee ga n’ọkụ ala mụọ? Ka anyị niile kpesie ekpere ike ka Chineke gosi anyị onye anyị gaagwa banyere Jisọs, ịkpọ ya ka ọ bịa Chọọchị. N’isi ụtụtụ niile, ka anyị gwa Jisọs ka O duzie anyị izuta onye naachọ ka azọpụta ya ma nyekwara anyị aka ikwu ihe o kwesịrị ka anyị kwuo. Nke ka nke ka anyị bie ndụ n’ụzọ ndịọzọ pụrụ ịhụ na anyị bụ ụmụ Chineke. Anyị naanọchite anya Alaeze Eluigwe. Ànyị naakpa agwa dịka ndị nke Eluigwe?

Ọ naemetụ ụfọdụ anyị n’obi na anyị nwere mmasị ijé obodo dị anya inye ndụ anyị inyere ndịọzọ aka ka azọpụta ha, ma ohere adịghị. Òlee ihe anyị pụrụ ime? Anyị pụrụ ikpe ekpere maka ndị ahụ nwere ohere ijé, anyị pụkwara inye ego anyị kwagide ha, na ibipụta Baịbụl na Akwụkwọ ọgụgụ nke Oziọma n’asụsụ dị icheiche. Ọtụtụ ụmụntakịrị naechebe ụfọdụ ego ha n’ụlọ ebe anaechebe ego maka ndịozi dị icheiche. Ha naahụ ụmụaka ndị ala ọzọ n’anya n’ihi na Jisọs hụrụ ha n’anya, ha chọkwara inyere ha aka ka azọpụta ha.

Ekpere niile anyị aghaghị ịbụ nke ekpesịrị ike na nke ekpere ná ntụkwasịobi. Ka Chineke nyere anyị aka ịkwaákwá maka ndị mmehie, ma rịọkwa Chineke ka O zite onye gaenyere ha aka tupu Jisọs abịa. O kwesị kwara ka anyị naeke ekpere náechèghị náánị banyere onwe anyị, “Leem Onye-nwe-ayi, zi ga m.”

Otù nwa okorọbịa ji inụọkụ n’obi naalụ ọlụ ịkpalị mmụọ ụmụ okorọbịa na ụmụagbọghọbịa ndịọzọ n’ọlụ ijéozi nke Oziọma. O wee kpe ekpere, “Leem, Onye-nwe-ayi, zigam.” Mgbe ahụ ndịọzọ dịka ihe ilereanya wee nye onwe ha ijé ebe ọ bụla Onyenwe anyị gaeziga ha. O jigidesịrị ụdị ijiobi chụọ a ike, ugbu a kwa o nọ n’ọbọdọ India naefe Chineke naagwa ndị mmehie banyere Jisọs.

Isi N’oge Kwadobe

Ọ dịghị onye ọ bụla n’etiti anyị bụ nnọọ nke nwata ijikere anyị maka ọlụ ijéozi nke oziọma. Mgbe anyị natasịrị onyinye amara atọ mbụ ahụ, anyị pụrụ ịdị naekpe ekpere ka Chineke nyere anyị aka ịmụ Okwu Ya karị, nye kwa anyị amaihe, ka anyị nweike ghọta ndị ahụ anyị nwere ibu arọ n’obi maka ha. Anyị pụrụ ịmụ ihe banyere omenaala na asụsụ ndị obodo ahụ o metụrụ anyị n’obi na Chineke naakpọ anyị ijé. Ma mgbe niile anyị aghaghị ikpe ekpere ka Chineke due anyị. Ọ dị ọtụtụ ihemmụta nke Chineke gaakụziri anyị ka oge naaga, na site kwa na nwapụta dị icheiche nke anyị gaenwe. Mgbe anyị naerubere Chineke isi, naenye kwa Ya onweanyị ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ka anyị mee, Ọ pụ kwara idozi anyị maka ọlụ ahụ.

“Ya mere, nāriọnu onye-nwe owuwe-ihe ubi ahu, ka o

zipu ndi-ọlu bà n’owuwe-ihe ubi Ya” (Matiu 9:38)

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1 Òlee obodo ndi Jisọs zigara ndi naeso ụzọ ya?

  2. 2 Gịnị mere Jisọs jiri gwa ndị naeso ụzọ Ya ka ha chere na Jerusalem?

  3. 3 Gịnị mere ndị naesoụzọ ahụ jịrị rapụ Jerusalem?

  4. 4 Gịnị bụ okù ahụ akpọrọ na Masedọnia nke Pọl nụrụ?

  5. 5 Gụpụta ntozuòkè ụfọdụ agaeji mata ezi onye ozi nke oziọma.

  6. 6 Ngọzi ra aña ka Jisọs nyere anyị?

  7. 7 Ụzọ dị añaa ka enyeworo ndị náekweghịekwe Baịbụl?

  8. 8 Òlee ebe olụ ijéozi anyị nwereike ịmalite?

  9. 9 Òlee ụzọ anyị gaeji malite ọlụ ijéozi nke oziọma n’ụlọ?